ISI NKE 23
Nkwa Ndị Izrel Kwere Jehova
Ihe dị ka ọnwa abụọ ndị Izrel hapụchara Ijipt, ha ruru n’Ugwu Saịnaị ma maa ụlọikwuu ha n’ebe ahụ. Jehova gwara Mosis ka ọ gbagoro n’ugwu ahụ. Mgbe Mosis gbagooro, ọ gwara ya, sị: ‘M napụtala ndị Izrel. Ọ bụrụ na ha erubere m isi ma debe iwu m, ha ga-abụrụ m ndị pụrụ iche.’ Mosis laghachiri n’ebe ndị Izrel nọ ma kọọrọ ha ihe Jehova kwuru. Olee ihe ndị Izrel kwuru? Ha kwuru, sị: ‘Anyị ga-eme ihe niile Jehova gwara anyị mee.’
Mosis gaghachiri n’ugwu ahụ. Jehova gwaziri ya, sị: ‘N’ụbọchị nke atọ, m ga-agwa gị okwu. Gwa ndị Izrel ka ha ghara ịgbago n’Ugwu Saịnaị.’ Mosis gakwuuru ndị Izrel ma gwa ha ka ha jikere ịnụ ihe Jehova ga-agwa ha.
N’ụbọchị atọ, ndị Izrel hụrụ ígwé ojii n’ugwu ahụ, hụkwa ka àmụ̀mà na-egbu na ya. Ha nụkwara ụda égbè eluigwe na ụda opi na-adasi ike. Jehova jizi ọkụ gbadata n’ugwu ahụ. Ezigbo ụjọ tụwara ndị Izrel nke na ha mawara jijiji. Ugwu ahụ niile nọ na-akwụ anwụrụ ọkụ ma na-ama jijiji. Ụda opi ahụ nọkwa na-adasikwu ike. Chineke gwaziri ha, sị: ‘Abụ m Jehova. Unu efela chi ọ bụla ọzọ.’
Mosis gaghachiri n’ugwu ahụ, Jehova enye ya iwu ọ ga-enye ndị Izrel gbasara otú ha kwesịrị isi na-efe ya na otú ha kwesịrị isi na-akpa àgwà. Mosis dere iwu ndị ahụ ede ma gụọrọ ha ndị Izrel. Ha kwere nkwa, sị: ‘Anyị ga-eme ihe niile Jehova gwara anyị mee.’ Ihe a bụ otú ndị Izrel si kwe Chineke nkwa. Ma, hà ga-emezunụ ya?
“Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi gị niile na uche gị niile hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” —Matiu 22:37