Jehova Lekọtara Anyị n’Okpuru Mmachibido—Akụkụ nke 2
N’OGE Agha Ụwa nke Abụọ, ihe e ji akpọchi belt uwe ndị agha Nazi nke m nwere ihe odide ahụ bụ́ “Chineke Nọnyeere Anyị.” Nye m, nke a abụwo ihe atụ ọzọ nke aka chọọchị na-etinye n’agha na ịwụfu ọbara. Akpọrọ m ya asị nke ukwuu. Ya mere tupu mmadụ abụọ bụ́ Ndịàmà Jehova esoro m nwee nkwurịta okwu na Limbach-Oberfrohna, East Germany, akpọwo m okpukpe asị, aghọwokwa m onye na-ekweghị na Chineke na onye kwenyere n’ozizi evolushọn.
“Unu echekwala na m ga-aghọ onye Kraịst,” ka m gwara Ndịàmà ahụ kpọtụrụ m. Ma ịrụ ụka ha mere ka m kwenye na e nwere Chineke. N’ịbụ onye chọrọ ịmụtakwu ihe, azụtara m otu Bible, mgbe oge na-agakwa, amalitere m isoro ha na-amụ ya. Nke ahụ bụ n’oge opupu ihe ubi nke afọ 1953, mgbe ọrụ Ndịàmà na East Germany nọwororị n’okpuru mmachibido nke ndị ọchịchị Kọmunist ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ.
Ụlọ Nche nke August 15, 1953 (Bekee), kọwara ọnọdụ nke Ndịàmà Jehova nọ na ya mgbe ahụ, na-asị: “Ọ bụ ezie na a na-enyogharị ha mgbe dum ma na-eyi ha egwu, ọ bụ ezie na ha enweghị ike ịkpọtụrụ ibe ha n’ebughị ụzọ jide n’aka na ọ dịghị onye na-esogharị ha, ọ bụ ezie na ịbụ onye e nwetara akwụkwọ ndị Watchtower n’aka ya pụtara ịga mkpọrọ afọ abụọ ma ọ bụ atọ maka ‘ikesa akwụkwọ na-akpali ọgba aghara’, ọ bụkwa ezie na ọtụtụ narị n’ime ụmụnna anyị ndị tozuru okè karị, bụ́ ndị nọworo na-ebute ụzọ, nọ n’ụlọ mkpọrọ, n’agbanyeghị ihe ahụ nile, ndị ohu Jehova nọ na East Germany nọgidere na-ekwusa ozi ọma.”
Na 1955, mụ na nwunye m, bụ́ Regina, gara mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova e mere na Nuremberg, West Germany, n’afọ na-esotenụ e mekwara anyị abụọ baptism na West Berlin. Otú ọ dị, nke ahụ bụ tupu Mgbidi Berlin amalite ịdị na 1961, na-ekewapụ East Germany pụọ na West Berlin. Ma ọbụna tupu m mee baptism, e tinyere iguzosi ike n’ihe m nye Jehova Chineke n’ule.
Ịnakwere Ibu Ọrụ
Ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova anyị maliteworo ịga na Limbach-Oberfrohna chọrọ onye ga-enwe ike ịdị na-ebute akwụkwọ Bible na West Berlin. Anyị nwere obere ahịa anyị na-azụ na ụmụ abụọ ka na-eto eto, ma ijere Jehova ozi abụworị ihe bụ isi ná ndụ anyị. Anyị meziwanyere ụgbọ ala anyị meworo ochie, nke mere ka o kwe omume izochi 60 akwụkwọ. Ịbụ onye na-ebu akwụkwọ bụ ọrụ dị ize ndụ, ma ọ kụziiri anyị ịdabere n’ebe Jehova nọ.
Iji ụgbọ ala site n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Berlin gaa n’akụkụ Ebe Ọdịda Anyanwụ adịghị mfe, ọtụtụ mgbe ana m echekwa banyere ụzọ anyị si nwee ike mee otú ahụ. N’otu mgbe n’akụkụ ahụ e nwere nnwere onwe, anyị butere akwụkwọ ahụ ma zoo ha n’ụgbọ ala tupu anyị agafe ókèala ịlaghachi East Germany.
N’otu oge, anyị ka zochisịrị akwụkwọ ndị ahụ mgbe otu onye anyị na-amaghị si n’ime ụlọ ya pụta. “Lee anya,” ka o tiri mkpu. Obi mapụrụ m. Ọ̀ nọwo na-ekiri anyị? “Ọ ga-aka mma ma unu gaa n’ebe ọzọ n’oge ọzọ. Ụgbọ ala nwere redio nke ndị uwe ojii East Germany na-adọ n’akụkụ ebe ahụ unu na-ele anya, ha pụkwara ijide unu.” Ekudara m ume. Ịgafe ókèala ahụ gara nke ọma, anyị anọ bụgidekwara abụ ruo mgbe anyị ruru ụlọ.
Ịkwadebe Maka Nnọpụiche
N’afọ ndị 1950, ụmụnna ndị East Germany dabeere n’ebe ụmụnna ndị West Germany nọ maka inweta akwụkwọ na nduzi. Ma n’afọ 1960 e mere mgbanwe dị iche iche iji nyere Onyeàmà ọ bụla nọ na East Germany aka isoro Ndịàmà ibe ya nọ n’ógbè ebe o bi na-ezirịta ozi. Mgbe ahụ na June 1961 e nwere klasị mbụ nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze maka ndị okenye na Berlin. Ejere m ọzụzụ nke mbụ a nwere izu anọ. N’ihe na-eruchaghị izu isii mgbe nke ahụ gasịrị, e kewapụrụ anyị na mberede pụọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ mgbe e wuru Mgbidi Berlin ahụ. Ugbu a ọ bụghị nanị na ọrụ anyị na-aga na nzuzo kamakwa anyị na-arụ ọrụ n’ebe dịpụrụ iche.
Ụfọdụ tụrụ ụjọ na ọrụ Ndịàmà Jehova na East Germany ga-eji nke nta nke nta kwụsị kpam kpam. Otú ọ dị, mgbanwe maka ime nhazi ndị a malitere itinye n’ọrụ n’ihe na-erughị otu afọ tupu nke ahụ emee nyeere anyị aka ijigide ịdị n’otu na ịdị ike n’ụzọ ime mmụọ. Tụkwasị na nke ahụ, ọzụzụ ahụ nke ndị okenye jere klasị mbụ nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze natara mere ka ha nwee ike inyefe ndị okenye ndị ọzọ ọzụzụ nke a. Ya mere Jehova kwadebere anyị maka nnọpụiche anyị, ọbụna dị ka ọ kwadebere anyị maka mmachibido ahụ na 1950 site ná mgbakọ distrikti ndị e nwere na 1949.
N’ịbụ ndị e kewapụrụ site n’Ebe Ọdịda Anyanwụ, ọ pụtara ìhè na anyị aghaghị ime ihe n’echeghị ka a gwa anyị agwa iji mee ka ọgbakọ na-aga n’ihu. Anyị degaara ụmụnna anyị ndị Kraịst nọ na West Berlin akwụkwọ ma tụọ aro anyị na ha izute n’otu okporo ụzọ awara awara dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ nke ndị njem sitere n’Ebe Ọdịda Anyanwụ na-ejikwa eme ihe. Anyị mere ka à ga-asị na ụgbọ ala mebiri emebi n’ebe a kara aka. Minit ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, ụmụnna ndị ahụ bịarutere, na-ewetara anyị akwụkwọ Bible. Ọ bụ ihe obi ụtọ na ha wetakwaara m akwụkwọ ọgụgụ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze m, ihe ndị m detuworo, na Bible m hapụrụ na Berlin n’ihi ihe metụtara nchebe. Lee ihe na-akpali akpali ọ bụ inwetaghachi ha! Ọ dịghị ka m si mara otú ihe ndị a ga-esi dị m mkpa n’afọ ole na ole na-abịanụ.
Ụlọ Akwụkwọ A Na-enwe na Nzuzo
Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, e nyere anyị ntụziaka ime ndokwa maka klasị nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze n’akụkụ nile nke East Germany. A họpụtara ndị nkụzi anọ, gụnyere m. Ma nye m, o yiri ibu ọrụ na-agaghị ekwe omume inye ndị okenye nile ọzụzụ mgbe anyị na-arụ ọrụ n’okpuru mmachibido. Iji mee ka a ghara ịmata ihe anyị na-eme, ekpebiri m ịhazi klasị ndị ahụ dị ka ndị na-eje mkpapụ ezumike.
Na klasị nke ọ bụla e nwere ụmụ akwụkwọ anọ na mụ onwe m dị ka onye nkụzi, gụnyere onye nke isii na-arụ ọrụ dị ka onye na-esi nri. Ndị nwunye anyị na ụmụ anyị na-anọkwa ya. Ya mere anyị na-adịkarị malite 15 ruo 20 mmadụ. Ebe dị mma maka ime mkpapụ yiri ihe na-agaghị ekwe omume, ya mere mụ na ezinụlọ m malitere ịchọ ebe dị mma ojije.
N’otu oge, mgbe anyị si n’otu ime obodo na-agbafe, anyị hụrụ otu ọwara ụzọ banyere n’otu ọhịa osisi dịpụrụ adịpụ site n’ebe e nwere okporo ụzọ. O yiri nke dị mma, ya mere ejekwuuru m onye isi obodo ahụ. “Anyị na-achọ ebe anyị ga-anọ mee mkpapụ ruo izu ole na ole, anyị na ezinụlọ ole na ole ndị ọzọ,” ka m kọwara. “Anyị chọrọ ịnọrọ onwe anyị ka ụmụ anyị wee nwee ike imesagharị ahụ. Ànyị pụrụ iji ọhịa osisi ndị dị n’ebe ahụ mee ihe?” O kwetara, ya mere anyị mere ndokwa.
N’ebe ahụ, anyị wuru ụlọ ntú anyị ma dọsa ụgbọ ala m dị ka ụlọ n’ụzọ ga-eme ka e nwee ohere dị n’etiti nke onye nọ n’èzí na-agaghị ahụ. Anyị ji ụgbọ ala ahụ dị ka ụlọ mere klasị. Anyị na-ezukọ na ya inwe ọmụmụ ihe hour 8 kwa ụbọchị ruo 14 ụbọchị. N’ime ohere ahụ e gechiri egechi e nwere oche na otu table, ndị a haziri a dịghị ama ama anyị enwee ndị ọbịa na mberede. Anyị nwekwara ndị ọbịa! N’oge ndị dị otú ahụ anyị nwere ekele n’ezie maka nkwado ịhụnanya nke ndị so n’ezinụlọ anyị.
Mgbe anyị nọ na klasị, ndị òtù ezinụlọ anyị na-eche nche. N’oge a kpọmkwem, a hụrụ onye isi obodo ahụ, onye bụkwa odeakwụkwọ nke òtù Communist Party nke obodo, ka o si n’ọwara ụzọ ahụ na-abịa n’ọhịa osisi ahụ anyị nọ na ya. Onye na-eche nche pịrị otu mgbịrịgba nke e ji waya jikọta n’otu ihe mgbaàmà dị n’ụgbọ ala ahụ dị ka ụlọ. Ozugbo ahụ anyị mịpụrụ site n’ụgbọ ala ahụ dị ka ụlọ ma gaa weere ọnọdụ n’ebe a gwara onye ọ bụla ka ọ nọdụ na table ahụ wee malite ịzụ kaadị. E nwere ọbụna otu ololo mmanya ọkụ iji mee ka ọnọdụ ahụ yie nke bụ eziokwu. Onye isi obodo ahụ bịara leta anyị dị ka enyi ma laghachi n’ebe obibi ya n’enyoghị ma ọ̀ dị ihe ọ bụla na-emenụ n’ezie.
E nwere klasị nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze n’ebe dị iche iche ná mba ahụ malite n’oge opupu ihe ubi nke afọ 1962 ruo n’akụkụ ikpeazụ nke 1965. Oké ọzụzụ a natara n’ebe ahụ, nke gụnyere ihe ọmụma banyere ụzọ e si anagide ụdị ọnọdụ anyị nọ na ya na East Germany, kwadebere ndị okenye ahụ maka nlekọta nke ọrụ nkwusa. Iji nwee ike ịga klasị ndị ahụ, ọ bụghị nanị na ndị okenye ahụ ji oge ezumike ha chụọ àjà, kama ha tinyekwara onwe ha n’ihe ize ndụ nke ịga mkpọrọ.
Abamuru nke Ụlọ Akwụkwọ Ahụ
Ndị ọchịchị ji nlezianya na-ekiri ọrụ anyị, ma n’akụkụ ikpeazụ nke afọ 1965, mgbe ihe ka ọtụtụ n’ime ndị okenye ahụ gasịworo ụlọ akwụkwọ ahụ, ha gbalịrị iweta ihe omume nke ọgbakọ anyị ná ngwụsị. Ha jidere Ndịàmà 15, bụ́ ndị e lere anya dị ka ndị na-ebute ụzọ n’ọrụ ahụ. Nke ahụ bụ ihe omume a kwadoro nke ọma, na-emetụta akụkụ nile nke ala ahụ. Ọzọ, ọtụtụ ndị chere na Ndịàmà ahụ ga-akwụsị ịrụ ọrụ. Ma site n’enyemaka Jehova anyị mere mgbanwe ikwekọ n’ọnọdụ ahụ ma na-aga n’ihu n’ọrụ anyị dị ka anyị na-emebu.
Ihe mere nke a ji kwe omume karịsịa bụ ọzụzụ ahụ ndị okenye ahụ nataworo n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze na ihe nkekọ nke ntụkwasị obi ha zụliteworo site ná mkpakọrịta ha nwetara n’oge a na-enwe klasị ndị a. Otú a, ọgbakọ anyị gosipụtara mmụọ ya nke ịdị ike. Lee otú o si bụrụ ihe dị mkpa na anyị ejiwo nrubeisi gbasoo ntụziaka ọgbakọ n’ụzọ chiri anya!—Aịsaịa 48:17.
Ọ pụtara ìhè n’ọnwa ndị na-esonụ na oké mgbochi nke sitere n’aka ndị ọchịchị gọọmentị enwewo ajọ mmetụta dị nta n’ọrụ anyị. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, anyị nwere ike ịmaliteghachi klasị nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. Mgbe ọ bụla ndị ọchịchị hụrụ na anyị anagidewo atụmatụ ha, a na-amanye ha ịgbanwe usoro ime ihe ha. Lee aha inwe mmeri nke ahụ bụ nye Jehova!
Ịrụsi Ọrụ Ike n’Ozi Ahụ
N’oge ahụ ndị na-anọ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ anyị na-adị ihe dị ka mmadụ ise. Onye ọ bụla n’ime anyị na-enweta akwụkwọ Bible nke ya site na ndokwa nke ọmụmụ akwụkwọ nke a, a na-ahazikwa ọrụ nkwusa site n’obere ìgwè ọmụmụ ihe ndị a. Site ná mmalite Jehova ji ọtụtụ ndị nwere ọchịchọ ịmụ Bible gọzie mụ na Regina.
A haziri ozi ụlọ ruo n’ụlọ n’ụzọ ga-echebe anyị pụọ n’ịbụ ndị a chọpụtara ma jide. Anyị na-aga n’otu ụlọ, mgbe ahụ hapụ ebe obibi ole na ole tupu anyị akụọ aka n’ọnụ ụzọ ọzọ. N’otu ụlọ, otu nwanyị kpọbatara mụ na Regina n’ime ụlọ. Anyị na ya na-atụle otu isiokwu Akwụkwọ nsọ mgbe nwa ya nwoke batara n’ime ụlọ. O kwuru nnọọ ihe bụ uche ya kpọmkwem.
“Ọ̀ dịtụwo mgbe ị hụrụ Chineke?” ka ọ jụrụ. “Achọrọ m ime ka ị mara na ana m ekwenye nanị n’ihe m hụrụ. Ihe ọ bụla ọzọ enweghị isi.”
“Agaghị m ekweta nke ahụ,” ka m zaghachiri. “Ọ̀ dịtụwo mgbe ị hụrụ ụbụrụ gị? Ihe ọ bụla ị na-eme na-egosi na ọ dị nke i nwere.”
Mụ na Regina nyere ọtụtụ ihe atụ nke ihe ndị ọzọ anyị na-anakwere n’ahụghị ha anya, dị ka ike eletrik. Nwa okorobịa ahụ ṅara ntị nke ọma, a malitekwaara ya na nne ya ọmụmụ Bible ebe obibi. Ha abụọ ghọrọ Ndịàmà. N’ezie, mmadụ 14 ndị mụ na nwunye m duziiri ọmụmụ ihe ghọrọ Ndịàmà. Ọkara nke ọnụ ọgụgụ ahụ bụ ndị anyị zutere n’oge anyị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ọkara nke ọzọkwa bụ ndị anyị bu ụzọ zute n’oge ịgba àmà mberede.
Ozugbo anyị malitere iduziri mmadụ ọmụmụ Bible ebe obibi n’ụzọ chiri anya ma lee onye ahụ anya dị ka onye a pụrụ ịtụkwasị obi, anyị na-akpọ onye ahụ òkù ịbịa nzukọ anyị. Otú ọ dị, ihe bụ isi anyị na-atụle bụ ma onye ahụ na-amụ ihe ọ̀ pụrụ itinye udo nke ndị Chineke n’ihe ize ndụ. Otú a, mgbe ụfọdụ ọ na-eru otu afọ ma ọ bụ karịa tupu anyị akpọọ onye na-amụ Bible òkù ịbịa nzukọ, n’oge ndị ọzọ, ọ na-ewekwa ogologo oge karị. Echetara m otu nwoke bụ onye a ma ama; ya na ndị isi nke òtù Communist Party nwere aha ha na-akpọrịta onwe ha. A mụụrụ ya Bible ruo afọ itoolu tupu e kwe ka ọ bịa nzukọ! Taa nwoke a bụ nwanna anyị onye Kraịst.
Ndị Ọchịchị Ka Na-achụkwa Anyị
Mgbe afọ 1965 gasịrị, anyị enweghịkwa ahụmahụ nke ịbụ ndị e jidere n’ìgwè, ma ọ dịghịkwa mgbe a hapụrụ anyị n’udo. Ndị ọchịchị ahụ nọgidere na-esogharị anyị ka ijiji. N’ihe dị ka n’oge a, amalitere m ikere òkè n’ụzọ chiri anya n’ihe omume nke ọgbakọ anyị, ya mere ndị ọchịchị tụkwasịrị uche pụrụ iche n’ebe m nọ. Ọtụtụ mgbe ha kpụụrụ m maka ịgba m ajụjụ, na-ebuga m na nke ndị uwe ojii ma na-agba m ajụjụ. “Ị pụrụ ichefu nnwere onwe gị ugbu a,” ka ha ga-agwa m. “Ọ bụ mkpọrọ ka ị na-aga.” Ma ha na-emesị hapụ m ka m laa.
Na 1972 ndị ọfịsa abụọ bịara leta m, n’amaghịkwa ama ha jara ọgbakọ anyị mma nke ọma. Ha anọwo na-aṅa ntị n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke ọgbakọ anyị. “Anyị chọpụtara na isiokwu ahụ na-ekwu ihe na-ewe mmadụ iwe,” ka ha kwuru ná mmegide. O doro anya na ihe bụ nchegbu ha bụ banyere ihe ndị ọzọ pụrụ iche banyere echiche ndị Kọmunist ma ọ bụrụ na ha gụọ isiokwu ahụ a na-atụle. “E kwuwerị,” ka ha kwuru, “a na-ekesa Ụlọ Nche n’ọnụ ọgụgụ ruru nde ise ma ọ bụ isii, a na-agụkwa ya ná mba ndị na-emepe emepe. Ọ bụghị nnọọ akwụkwọ a na-ebi otú ọ bụla.” Echere m n’ime obi m sị, ‘Lee ka ihe unu kwuru si bụrụ eziokwu!’
Ka ọ na-erule 1972 anyị anọwo n’okpuru mmachibido ruo 22 afọ, Jehova eduziwokwa anyị n’ụzọ ịhụnanya na n’ụzọ amamihe. Anyị ejiwo nlezianya gbasoo ntụziaka ya nile, ma ọ ga-erukwa 18 afọ ọzọ tupu Ndịàmà nọ na East Germany enwee nnabata nke iwu kwadoro. Lee ka anyị si nwee obi ụtọ ná nnwere onwe mara mma ndị anyị nwere ugbu a ife Chineke anyị, bụ́ Jehova!—Dị ka Helmut Martin si kọọ.