Jehova Lekọtara Anyị n’Okpuru Mmachibido—Akụkụ nke 3
Ọ BỤ March 14, 1990. N’ụbọchị ahụ dị mkpa, eso m ná ndị nọ ya mgbe onye ọrụ gọọmenti n’ụlọ ọrụ Ministri Na-ahụ Maka Okpukpe n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Berlin nyere akwụkwọ iwu na-enye Ndịàmà Jehova nkwado iwu n’ihe a na-akpọ mgbe ahụ German Democratic Republic, ma ọ bụ East Germany. N’oge ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ, echeghachiri m echiche azụ n’oge m ghọrọ Onyeàmà ma tụgharịa uche n’oge ndị siri ike anyị nweworo.
N’etiti afọ ndị 1950, mgbe Margarete, Onyeàmà mụ na ya na-arụkọ ọrụ, gwara m okwu mbụ banyere okwukwe ya ndị dabeere na Bible, mkpagbu Ndịàmà Jehova na East Germany kpụ ọkụ n’ọnụ. Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, ọ hapụrụ ịga rụọ ọrụ ebe ọzọ, m wee soro Onyeàmà ọzọ malite ịmụ Bible. E mere m baptism na 1956, mụ na Margarete lụkwara di na nwunye n’otu afọ ahụ. Anyị nọ n’Ọgbakọ Lichtenberg dị na Berlin. O nwere ihe dị ka 60 ndị nkwusa Alaeze na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa.
Afọ abụọ mgbe e mesịrị m baptism, ndị ọrụ gọọmenti bịara n’ebe obibi onye na-edu ndú n’ọgbakọ anyị. Ha chọrọ ijide ya, ma ọ nọ ọrụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Berlin. Ezinụlọ ya gbalịrị mee ka ozi ruo ya aka ịnọgide n’ebe ahụ, mgbe ọnwa ụfọdụ gasịkwara ha sonyeere ya n’Ebe Ọdịda Anyanwụ. Ọ bụ ezie na adị m nanị 24 afọ, e nyere m mgbe ahụ ibu ọrụ dị arọ n’ọgbakọ. Enwere m ekele na Jehova na-enye amamihe na ume dị mkpa iji lekọta ọrụ ndị dị otú ahụ.—2 Ndị Kọrint 4:7.
Inye Nri Ime Mmụọ
Mgbe e guzobere Mgbidi nke Berlin n’August 1961, e kewapụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’Ọwụwa Anyanwụ ná mberede pụọ n’ebe ụmụnna ha ndị nọ na Ọdịda Anyanwụ nọ. Otú a ka oge iji aka anyị ebipụta akwụkwọ dị iche iche si malite, mbụ site n’ígwè e ji edepụta mkpụrụ akwụkwọ, e mesịakwa site n’ígwè e ji eme ka ọ dị ọtụtụ. Malite na 1963, anọrọ m afọ abụọ na-arụzi ebe nzopụ n’ime ụlọ anyị iji rụọ ọrụ obibi akwụkwọ nke a. Mgbe m rụsịrị ọrụ ụbọchị dum dị ka onye na-emepụta ngwa ọrụ, arụrụ m ọrụ n’abalị nile ibipụta ọtụtụ Ụlọ Nche site n’enyemaka nke ọtụtụ ụmụnna ndị ọzọ. Ndị ọchịchị tinyere isi n’ala ịchọpụta otu nhazi obibi akwụkwọ anyị si arụ ọrụ, ma Jehova nyeere anyị aka nke na nri anyị, dị ka anyị kpọrọ ya, pụtara n’oge.
Ibipụta ọnụ ọgụgụ magazin anyị ga-ezu chọrọ ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke akwụkwọ ndị e ji ebipụta akwụkwọ, ma inweta ọnụ ọgụgụ ndị a adịghị mfe. A sị na anyị nọ na-azụrụ akwụkwọ ndị e ji ebipụta akwụkwọ n’ebe ọ dị ukwuu, nke a pụrụ ịdọtaworịị uche nke ndị ọchịchị. N’ihi ya anyị kwere ka ụfọdụ Ndịàmà n’otu n’otu zụta akwụkwọ ndị e ji ebipụta akwụkwọ n’ọnụ ọgụgụ ndị dị nta ma weta ya n’ìgwè ọmụmụ Bible anyị. Site n’ebe ahụ a na-ewega ya n’ebe anyị na-ebipụta magazin. Mgbe ahụ, Ndịàmà ndị ọzọ na-ekesazị magazin ndị ahụ e bisịworo.
Ebe ndị ọrụ ọchịchị chere na m so n’ibipụta akwụkwọ ndị a dị iche iche, ha chere m nche n’ụzọ chịrị anya. Ná mgwusị nke 1965, a chọpụtara m na ha na-esogharị m karị otú ha si eme ná mbụ, ghọtakwa na ọ dị ihe ha na-eme atụmatụ ya. Ná mberede, ha bịara n’isi ụtụtụ nke otu ụbọchị.
Nlanarị E Jisiri Ike Nwee
N’ụtụtụ nke oge oyi ahụ anọ m na-aga ọrụ. Ọ bụ tupụ chị abọchaa, ejisịrị m ike na-ejikwa onwe m n’oké oyi ahụ. Ka m na-aga, ahụtara m isi mmadụ anọ si n’ebe ha zoro tụpụta. Ndị ikom anọ ahụ hịpụtara n’ụzọ wee soro ụzọ ahụ na-abịa m n’ihu. Egwu tụrụ m mgbe m matara ha dị ka ndị ọrụ gọọmenti. Ole ihe m ga-eme?
E kupụwo snow miri emi n’akụkụ iji nye ohere maka ụzọ dị nta. Anọgidere m na-eje. Ka m wedatara isi, e legidere m anya n’ala na-aga. N’olu dị nta ekpere m ekpere dị ngwa. Ndị ikom ahụ na-abịaru m nso nso. Hà amatala m? A pụghị ikweta ihe na-eme, ka anyị na-abịarute nso ma na-agaferekwa onwe anyị n’ụzọ nta ahụ dị warara. Anọgidere m na-ejesikwu ike. “Heị,” ka otu n’ime ha tiri ná mkpu, “onye ahụ bụ ya. Kwụsị!”
Agbasiri m ọsọ ike otu m nwere ike. Ka m na-agba n’akụkụ, e si m n’ọgba onye agbata obi m wụfee n’azụ ụlọ nke m. Agbabara m n’ime ụlọ m ngwa ngwa, a kwachiri ụzọ ma kpọchie ya. “Onye ọ bụla si n’akwa bilie!” ka m tiri mkpu kwuo. “Ha nọ ebe a ijide m.”
Margarete gbaturu n’ala ngwa ngwa ma kwụrụ n’ọnụ ụzọ. Ná ntakịrị oge anọ m n’ime ọnụ ụlọ ahụ dị n’okpuru ala na-awụju ihe n’ọkụ stov. Eweere m akwụkwọ ndekọ nile nke ọgbakọ dị n’aka m ma tinye ha n’ime ọkụ ahụ na-enwu enwu.
“Meghepụ ụzọ!” ka ndị ikom ahụ jiri olu ike kwuo. “Meghee ụzọ ahụ! Anyị bụ ndị na-ahụ banyere ikpe ọha na eze.”
Margarete aṅaghị ha ntị ka m na-esurepụ ihe ahụ nile n’ọkụ. Mgbe ahụ esonyeere m Margarete ma feere ya n’isi ka o meghee ụzọ. Ndị ikom ahụ mabatara n’ime ụlọ.
“N’ihi gịnị ka iji gbapụ ọsọ?” bụ ajụjụ ha jụrụ.
N’oge na-adịghị anya ndị ọrụ ọchịchị ga-enyere ha aka bịaruru, e wee nyochaa ụlọ ahụ nile. Isi ihe bụ nchegbu m bụ ọnụ ụlọ ahụ dị n’ime ala ebe e debere ígwè obibi akwụkwọ anyị na 40,000 ùkwù mpempe akwụkwọ ndị e ji ebiputa akwụkwọ. Ma ha achọpụtaghị ọnụ ụzọ ahụ zoro ezo e si abanye na ya. Ọ bụ ezie na ịgba ajụjụ ọnụ ahụ gara n’ihu ruo ọtụtụ hour, Jehova nyeere m aka ịnọ duu. Ahụmahụ ahụ dọtara anyị nso Nna nke eluigwe na-ahụ n’anya karị ma wusiekwa anyị ike ịtachi obi.
N’ime Ụlọ Mkpọrọ ma Nwee Nwere Onwe
Ná ngwụsị nke afọ ndị 1960, e deteere m akwụkwọ ịbịa maka ịrụ ọrụ ndị agha. Ebe akọ na uche m na-agaghị ekwe m jee, amanyere m ịbụ onye e ji eji na ịrụ oké ọrụ n’ụlọ mkpọrọ ruo ọnwa asaa. E nwere Ndịàmà 15 n’ime ụlọ ndị agha ahụ dị na Cottbus, bụ ọdịda anyanwụ nke ndịda Berlin. Anyị nile nọ n’ebe ahụ n’ihi nnọpụiche anyị nke ndị Kraịst. (Aịsaịa 2:2-4; Jọn 17:16) Ụbọchị ndị anyị na-arụ ọrụ na-adị ogologo bụrụkwa nke ọrụ ike. Anyị na-ebili na 4:15 nke ụtụtụ a na-akpọrọkwa anyị pụọ n’ezi nke ụlọ ndị agha ahụ gaa ịrụ ọrụ n’okporo ụzọ tren. Otú ọ dị, n’ụlọ mkpọrọ, anyị nwere ohere dị iche iche ịgwa ndị ọzọ ihe banyere Alaeze Jehova.
Dị ka ihe atụ, anyị na mmadụ abụọ na-agba afa nọ na Cottbus. Otu ụbọchị anụrụ m na nke nta chọsiri ike ịgwa m okwu. Gịnị pụrụ ịbụ ihe ọ na-achọ? Ọ kọọrọ m ihe nile dị ya n’obi. Nne ya ochie bụ nwanyị na-agba afa, o nwetakwara ụdị ike ahụ ka ọ gụsịrị akwụkwọ ya dị iche iche. Ọ bụ ezie na nwoke a nwere ọchịchọ siri ike inwere onwe ya pụọ n’ike ndị a na-achị ya, ọ na-atụ egwu maka ọbọ ha. Ọ nọgide na-akwa àkwà. Ma olee otú ihe a nile si gbasa m?
Ka mkparịta ụka anyị na-aga n’ihu, ọ kọwara na e mebiri ike o nwere iji kọọ ọdịnihu ka ọ nọ n’etiti Ndịàmà Jehova. Akọwaara m ya na e nwere ndị mmụọ na-adịghị mma, ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ, na mmụọ ndị dị mma, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ziri ezi. N’iji ihe atụ nke ndị Efesọs oge ochie ghọrọ ndị Kraịst mee ihe, ekwusiri m okwu ike banyere mkpa ọ dị ịtụfu ihe nile jikọtara ịgba afa ma ọ bụ omume ọ bụla ọzọ metụtara ndị mmụọ ọjọọ. (Ọrụ 19:17-20) “Mgbe ahụ kpọtụrụ Ndịàmà,” ka m gwara ya. “E nwere Ndịàmà n’ebe nile.”
Nwa okoro ahụ hapụrụ ụlọ ndị agha ahụ ụbọchị ole na ole n’ikpeazụ, anụghịkwa m ihe ọ bụla ọzọ banyere ya. Ma ahụmahụ nke nwoke ahụ ụjọ ji nke a na-apụghịkwa ịkasi obi bụ́ onye nwere mkpa nke nnwere onwe mere ka ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ mikwuo emi. Anyị bụ́ Ndịàmà 15 nọ n’ebe obibi ndị agha n’ihi okwukwe anyị, ma anyị nweere onwe anyị n’ụzọ ime mmụọ. A tọhapụwo nwa okorobia ahụ n’ụlọ mkpọrọ, ma ọ ka nọ n’agbụ nke otu “chi” bụ́ onye na-eyi ya egwu. (2 Ndị Kọrint 4:4) Lee ka anyị bụ́ Ndịàmà sị kwesị inwe ekele maka nnwere onwe ime mmụọ anyị!
E Lee Ụmụ Anyị Ule
Ọ bụghị nanị na ndị toworo eto ga-egusosi ike n’ihi nghọta ha dabeere na Bible, otú a ka ọ dịkwa ndị na-eto eto. A rụgidere ha ịgọnarị okwukwe ha ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ụlọ ọrụ. Ụmụ anyị anọ kwesịrị iguzosi ike n’okwukwe ha n’ihi ihe ha kwere na ya.
E nwere ihe omume nke ikele ọkọlọtọ n’ụlọ akwụkwọ kwa Monday ọ bụla. Ụmụaka na-akwụ n’ahịrị n’ezi, bụọ abụ, ma nye ekele n’aha Thälmann ka a na-akwụba ọkọlọtọ ahụ. Ernst Thälmann bụ́ onye Kọmunist nke Germany nke ndị SS nke Nazi gburu na 1944. Mgbe agha ụwa nke abụọ gasịrị, Thälmann ghọrọ onye a ma ama na East Germany. N’ihi nghọta anyị na ọ bụ nanị Jehova Chineke kwesịrị ịnara ofufe nke dị nsọ, mụ na nwunye m kuziiri ụmụ anyị iguzo n’ụzọ nkwanyere ùgwù n’oge emume ahụ nile n’ekereghị òkè na ya.
A kụzikwaara ụmụ akwụkwọ abụ dị iche iche nke ndị Kọmunist. Mụ na Margarete jere n’ụlọ akwụkwọ ụmụ anyị ma kọwaa ihe kpatara ha agaghị agụ abụ ndị ahụ dị iche iche nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Otú ọ dị, anyị kwuru na ha ga-enwe mmasị ịmụ ụdị abụ ndị ọzọ. Ya mere, site n’oge ha dị na nwata, ụmụ anyị mụtara ka e si eguzosi ike ma dịpụ iche n’ebe ndị ọgbọ ha nọ.
Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke afọ ndị 1970, nwa anyị nwanyị nke kasị okenye nwere ọchịchọ nke ịmụ ọrụ n’otu ọfis. Otú ọ dị, a chọrọ ka nwa ọ bụla na-amụ ọrụ buru ụzọ jee ọzụzụ ndị agha ruo ụbọchị 14. Ebe akọ na uche nke Renate na-agaghị ekwe ya kere okè na nke a, o jiri anya ike guzosie ike ma n’ikpeazụ e wepụrụ ya n’ibu ọrụ nke ịnata ọzụzụ ahụ.
N’oge nke ịmụ ọrụ ya, Renate jere klasị ebe a kpọrọ ya ka ọ soro n’ihe ọmụmụ ịgba égbè. “Renate, ị ga-abịakwa ihe ọmụmụ ịgba égbè,” ka onye nkụzi ahụ kwuru. Onye nkụzi ekwetaghị n’ọjụjụ ọ jụrụ. “Ọ gaghị adị gị mkpa ịgba égbè,” ka o kwere ná mkwa. “Ị ga-ahụ maka ihe oriri na ọṅụṅụ.”
N’uhuruchi ahụ, anyị kwurịtara ihe nile dị ka otu ezinụlọ. Anyị chere na ọnụnọ Renate n’ebe ahụ a na-amụ ka e si agba égbè adịghị mma, ọbụna ma a sị na ọ dịghị ekere òkè kpọmkwem. N’ịbụ onye e nyere ume ọhụrụ site ná mkparịta ụka ahụ na site n’ekpere, o kweghị ka egwu jide ya. Lee ihe agbamume ọ bụ nye anyị ịhụ ka nwa anyị nwanyị guzosiri ike n’ụkpụrụ ndị ziri ezi!
Ịmụba Ọrụ Nkwusa Ihu Ọha Anyị
Mgbe e wepụrụ nguzogide megide ọrụ anyị ná ngwụsị nke afọ ndị 1970, a malitere inweta akwụkwọ anyị dị iche iche n’ókè dị ukwuu site n’ebe ọdịda anyanwụ. Ọ bụ ezie na nke a bụ ọrụ dị ize ndụ, ụmụnna nwere obi ike nyere onwe ha n’afọ ofufo ime ya. Anyị nwere ekele maka inweta akwụkwọ ndị a ná mgbalị nile nke ndị mere ka o kwe mee. Mgbe mkpagbu siri ike n’oge mmalite nke afọ ndị mmachibido, ọrụ ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ ihe ịma aka n’ezie. N’eziokwu, egwu nke ahụhụ ndị ọchịchị dubara ụfọdụ n’iwepụ aka n’ọrụ a. Ma ka oge na-aga ọrụ nkwusa ihu ọha anyị rịrị elu n’oké dị egwu. N’afọ ndị 1960, nanị 25 pasenti na-ekerechi okè anya n’ozi ụlọ ruo n’ụlọ. Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ na-ekerechi okè anya n’ọrụ a arịwo elu ruo 66 pasenti ka ọ na-erule n’afọ ndị ikpeazụ nke 1980! N’oge ahụ ndị ọchịchị nwere mmasị dị nta n’ebe ọrụ nkwusa anyị nọ.
N’otu oge nwanna nke mụ na ya na-arụ ọrụ n’ọrụ nkwusa kpọrọ nwa ya dị nta bịa. N’ịbụ onye ọbịbịa nke nwata a masịrị, otu agadi nwanyị anyị na ya kwurịtara okwu sịrị ka anyị bata n’ime ụlọ. Ọ nabatara okwu anyị dabere n’Akwụkwọ nsọ ma kwere ka anyị bịaghachi ọzọ. E mesịrị m nyefee ya nwunye m, onye maliteere nwanyị ahụ ọmụmụ Bible ebe obibi ngwa ngwa. N’aghanyeghị afọ ndụ ya gamiri agami na enweghị ezi ahụ ike ya, nwanyị a ghọrọ nwanna anyị nwanyị ma nọgidekwa na-anụ ọkụ n’obi n’ozi Jehova.
Ime Mgbanwe Dị Iche Iche ka Nnwere Onwe Na-eru
Jehova kwadebere anyị maka oge mgbe anyị ga-enwe nnwere onwe ka ukwuu. Iji maa atụ: Oge na-adịghị anya e wepụrụ mmachibido ahụ, a dụrụ anyị ọdụ ka anyị gbanwee ụzọ anyị si agwarịta otu onye na ibe ya okwu ná nzukọ dị iche iche. N’ihi nchebe, anyị na-akpọ otu onye na ibe ya n’aha ndị mbụ anyị. Ọtụtụ ndị maara otu onye na ibe ha n’afọ ndị gara aga amataghị ihe bụ aha ikpeazụ nke onye kwere ekwe ibe ha. Otú ọ dị, ná nkwadebe maka ịnabatakwu ọtụtụ ndị ọzọ nwere mmasị ná nzukọ anyị dị iche iche, a gbara anyị ume ka anyị na-akpọ onye ọ bụla n’aha ezinụlọ ha. Nye ụfọdụ, nke a yiri ka ọ dịghị onye a na-akpọ ya, ma ndị ahụ gbasoro ndụmọdụ ahụ mere mgbanwe ngwa ngwa n’ikpeazụ karị mgbe anyị nwetara nnwere onwe anyị.
A gbakwara anyị ume ka anyị jiri abụ na-amalite nzukọ anyị nile. N’ụzọ dị otu a usoro ọgbakọ ndị dị ebe ndị ọzọ si eme ihe were anyị ahụ. Mgbanwe ọzọ e mere bụ n’ọnụ ọgụgụ nke ìgwè ọmụmụ ihe anyị dị iche iche. Ha jiri nke nta nke nta rịa elu site na mmadụ anọ ha dị n’afọ ndị 1950 ruo asatọ. N’ikpeazụ ha mụbara ruo 10 na n’ikpeazụ ruo 12. Ọzọkwa, e mere nnyocha nke ọnọdụ ahụ iji jide n’aka na e debere ebe ọgbakọ ọ bụla na-ezukọ n’etiti ebe ihe ka ọtụtụ Ndịàmà bi.
Mgbe ụfọdụ anyị na-ahụta amamihe nke dị n’aro a tụrụ maka mgbanwe nanị mgbe e mere ya eme. Lee ka Jehova si egosipụtakarị onwe ya dị ka Nna maara ihe nke nwekara nchegbu! O jiri nke nta nke nta nyere anyị aka ikwekọ n’ihe fọdụrụ ná nzukọ elu ala ya, anyị ghọkwuru akụkụ nke òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke ndị ya. N’ezie, Jehova Chineke ejiwo ịhụnanya chebe ndị ya n’oge nile ahụ ruru ihe dị ka 40 afọ nke ha rụrụ ọrụ n’okpuru mmachibido iwu na East Germany. Lee ka anyị si aṅụrị ọṅụ ugbu a inwe nkwado nke iwu!
Taa, e nwere 22,000 ma ọ bụ karịa bụ Ndịàmà Jehova n’ihe nke a maara ná mbụ dị ka East Germany. Ha nọ dị ka ihe àmà nye nduzi amamihe dị na ya nke nlekọta ịhụnanya Jehova Chineke. Nkwado ya n’afọ ndị ahụ anyị nọ n’okpuru mmachibido na-egosi na ọ pụrụ ịgbanwe ọnọdụ ọ bụla. N’agbanyeghị ngwa agha ọ bụla nke a kpụrụ megide ndị ya, ọ gaghị aga nke ọma. Mgbe nile Jehova na-elekọta ndị ahụ na-atụkwasị ya obi. (Aịsaịa 54:17; Jeremaịa 17:7, 8)—Dị ka Horst Schleussner kọrọ.
[Foto dị na peeji nke 1]
Horst na Margarete Schleussner na gburugburu ogige Society dị na East Berlin