Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 5/15 p. 9
  • Pọl Megide Plato n’Okwu Mbilite N’ọnwụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Pọl Megide Plato n’Okwu Mbilite N’ọnwụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Pleto
    Teta!—2013
  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Nkwenye Gị ná Mbilite n’Ọnwụ Siruru n’Ike?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • “A Gaje Ime Ka Ọnwụ Ghara Ịdị Irè”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Nwere Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 5/15 p. 9

Pọl Megide Plato n’Okwu Mbilite N’ọnwụ

PỌL onyeozi dere banyere mbilite n’ọnwụ ná 1 Ndị Kọrint 15:35-58 na 2 Ndị Kọrint 5:1-10. N’ime nke ahụ, ọ̀ gbasoro echiche anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi nke Plato na ndị ọkà ihe ọmụma Grik, ka ò kwenyere ná nkụzi Jisọs na n’ihe ndị ọzọ e dere n’Akwụkwọ nsọ?

Akwụkwọ nta bụ́ Immortality of the Soul or Resurrection of the Individual: St. Paul’s View with Special Reference to Plato, nke e dere na 1974, nke achịbishọp nke Chọọchị Greek Orthodox nke Ebe Ugwu na Ebe Ndịda America bịanyekwara aka na ya, na-enye azịza na-ekpughe ihe. Mgbe ọ tụlesịrị otú mbilite n’ọnwụ ga-adị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e hotara n’elu na mmetụta nile nke echiche ndị Grik n’oge ahụ, onye dere akwụkwọ ahụ ruru nkwubi okwu na-esonụ:

“Plato na-akụzi na mkpụrụ obi na-anọgide n’ịdị adị na-adịghị agwụ agwụ na nke na-adịru ebighị ebi, n’anọghị n’ime ahụ. Nye Plato, mkpụrụ obi nwere anwụghị anwụ n’ime onwe ya, n’ụzọ a na-apụghị ikewapụ ekewapụ . . . St. Pọl akụzighị echiche dị otú ahụ ma ọ bụ mee nzọrọ ọ bụla ime otú ahụ . . .

“Anwụghị anwụ nke mmụọ dị ka akụkụ ndị dịpụrụ iche ma nọọrọ onwe ha agbasaghị Pọl onyeozi kama ihe gbasara ya bụ mbilite n’ọnwụ nke njikọ dum ahụ nke mkpụrụ obi na mmụọ nke mmadụ dị ka ihe sitere ná mbilite n’ọnwụ Kraịst. Nchepụta Pọl banyere ahụ a ga-enwe ná mbilite n’ọnwụ enweghị ihe ọ bụla jikọrọ ya na inyeghachi anụ ahụ ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị nọ n’ili, ndụ.

“A pụrụ ịkọwa nchepụta ya nke mbilite n’ọnwụ ahụ n’ụzọ ka mma dị ka mgbanwegharị, nkegharị, na mwugharị, nke ịdị n’otu mmadụ n’ozuzu ya, nke otu onye ahụ, nke ọdịdị mmadụ ahụ, nke ihe ahụ jikọrọ ahụ na uche, nke onye ahụ nwere àgwà nke uche na nke anụ ahụ a na-ahụ anya site n’ike Chineke. Mbilite n’ọnwụ anyị n’ọdịnihu ga-ewere ọnọdụ ọ bụghị dị ka ihe onwunwe nke onwe anyị site n’okike, kama dị ka oké onyinye sitere n’aka Chineke.”

Ee, anwụghị anwụ abụghị ihe onwunwe e kenyere mmadụ ọ bụla. Kama nke ahụ, ọ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa na nke dị ebube Jehova nyere ndị mejupụtara ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ site n’aka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.—1 Ndị Kọrint 15:20, 57; Ndị Filipaị 3:14.

[Foto dị na peeji nke 9]

Onye ọkà ihe ọmụma Grik bụ́ Plato

[Ebe E Si Nweta Foto]

Vatican Museum photograph

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya