Inwe Ekele Maka Onyinye Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Ndụ
NDỤ—lee ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa ọ bụ! E wezụga ya, anyị apụghị ime ihe ọ bụla. Ozugbo a tụfuru ya, ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke pụrụ iweghachi ya. Ọ bụrụ na ndụ anyị nọ n’ihe ize ndụ, anyị na-eme ihe nile anyị nwere ike iji chebe ya. Ee, ọbụna na ụfọdụ ga-arịọ maka enyemaka nke ike karịrị nke mmadụ mgbe ha nọ n’ihe isi ike!
A na-echetara anyị banyere ihe ndekọ nke Bible banyere otu ụgbọ mmiri nke oké ifufe na-ebugharị n’oké osimiri. Mgbe ọ na-achọ ikpu, “ndị ụgbọ wee tụọ egwu, wee tikuo, onye ọ bụla chi ya.” E mesịa, ha nile wee kpọkuo ezi Chineke ahụ, sị: “Biko, Jehova, biko, ekwela ka anyị laa n’iyi.” Ihe ndekọ Bible ahụ kwukwara, sị: “Ha wee tufuo ihe nile nke dị n’ụgbọ n’oké osimiri, ime ka ọ dị karị mfe n’ahụ ha.”—Jona 1:4-6, 14; tụlee Ọrụ Ndị Ozi 27:18, 19.
Ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ dị njikere ọbụna iji ihe onwunwe ndị ha hụrụ n’anya chụọ àjà ná mgbalị ichebe ndụ ha. Anyị pụrụ ịzụchi ihe onwunwe—ma ọ bụghị ndụ. N’ihi na anyị hụkwara ndụ anyị n’anya site n’ebumpụta, anyị na-agbara ihe ize ndụ ọsọ. Anyị na-azụ, na-eyikwasị uwe, ma na-elekọta ahụ anyị. Anyị na-achọ ọgwụgwọ ọrịa mgbe anyị na-arịa ọrịa.
Otú o sina dị, Onye ahụ na-enye ndụ chọrọ n’aka anyị ihe karịrị nanị ịgbaso mkpali ebumpụta nke na-echebe anyị. E kwuwerị, ndụ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa, o sitekwara n’aka Onye kasị dị mkpa n’eluigwe na ala dum. Site n’inwe ekele sitere n’ezi obi maka ma onyinye ahụ na Onye nyere ya, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịhụ ndụ n’anya? Ọ̀ bụkwa na nke ahụ agaghị agụnye iche echiche banyere ndụ ndị ọzọ?
Mgbe ahụ, o kwesịghị iju anyị anya na Iwu ahụ Jehova Chineke nyere mba Israel gụnyere iwu ndị a haziri iji chebe ndụ na ahụ ike nke ndị ọzọ. (Ọpụpụ 21:29; Deuterọnọmi 22:8) Ndị Kraịst taa kwesịrị n’otu aka ahụ ịdị na-eche echiche banyere izere mmerụ ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i nwere ndị na-eto eto n’ebe obibi gị, ị̀ na-eji elerughị anya ala na-ahapụ, n’ebe aka mmadụ pụrụ iru ha, pin, ma ọ bụ ihe ndị na-aghọ nkọ nke pụrụ ịkpata oké mmerụ ahụ nye nwatakịrị na-amaghị ihe ọ bụla nke ji ha na-egwuri egwu ma ọ bụ na-elo ha? À kwasara mmiri ọgwụ na ọgwụ ndị dị ize ndụ n’ebe aka ụmụaka na-agaghị eru ha? Ọ bụrụ na mmiri awụfuo n’ala ụlọ, ị̀ na-adị ngwa ihicha ya iji gbochie ihe ọghọm? Ị̀ na-arụzi ihe ndị na-eji ike eletrik arụ ọrụ ozugbo, bụ́ ndị na-enye nsogbu? Ị̀ na-edozi ụgbọ njem gị mgbe mgbe? Ị̀ bụ onye ọkwọ ụgbọ ala na-adịghị ize ndụ? Ọ bụrụ na i nwere ekele n’ezie maka ịdị oké ọnụ ahịa nke ndụ, a ga-akpali gị ime ihe mgbochi ndị ezi uche n’ebe ndị a na ndị yiri ha.
Otú ọ dị, ọ bụ ihe mwute ikwu na ụfọdụ adịghị eji ọbụna ndụ nke ha akpọrọ ihe ọ bụla. Dị ka ihe atụ, olee onye na-amaghị taa na ise siga adịghị mma maka ahụ ike? Ma, ọtụtụ nde mmadụ bụ ohu nke àgwà ahụ, ebe ahụ ike ha na-adakpọ mgbe ọ bụla ha kubara anwụrụ ọkụ ahụ na-egbu egbu. Ndị ọzọ na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ndị ọzọkwa na-aṅụ mmanya na-aba n’anya, ndị na-emerụ ha ahụ. AIDS bụ ọrịa na-egbu egbu nke a na-amabeghị ihe e ji agwọ ya. Ma ọtụtụ gaara ezerewo ibute ọrịa ahụ ma ọ bụrụ na ha jụrụ mmekọahụ na-ezighị ezi, ụdị ụfọdụ nke ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na mmịnye ọbara. Lee ka nke ahụ si bụrụ enweghị ekele maka ndụ bụ́ nke na-eweta ọdachi!—Ndị Rom 1:26, 27; 2 Ndị Kọrint 7:1.
Mgbanwe Ga-ekwe Omume!
Ndị ahụ nwere ekele maka Onye Okike Ukwu ha, bụ́ Jehova, nwere oké ihe mere ha ji ele ndụ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Ndụ bụ onyinye ya dị nsọ. Ya mere, ha dị njikere ime mgbanwe ọ bụla dị mkpa iji were ya dị ka onyinye sitere n’aka Chineke. Tụlee ahụmahụ nke Kwaku, bụ́ onye nkụzi na Ghana. N’ịbụ onye na-aṅụ oké mmanya, ọ na-ala ndụ ya n’iyi.
Kwaku chetara, sị: “Agbalịrị m ịmanya nwunye m ka ọ na-akwanyere m ùgwù, nke na-edugakarị n’arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ nakwa ọgụ, karịsịa mgbe mmanya na-egbu m. N’ihi ịṅụbiga mmanya ókè, ego adịghị afọdụ m n’akpa, ọtụtụ mgbe adịghịkwa m enwe ike iwepụta ego iji kwadoo ezinụlọ m. N’ụzọ kwere nghọta, nke a na-akpasu nwunye m iwe nke ukwuu. Mgbe ọ bụla ego gwụnahụrụ m (nke a na-emekwa ọtụtụ mgbe), ana m eme ihe ọ bụla m pụrụ ime iji na-aga n’ihu n’omume m. N’otu mgbe, obi kwere m iwere ego ndị m nakọtaworo ụmụ akwụkwọ m maka iji debanye aha ha n’akwụkwọ maka ule obodo mere mkpa m. Akpapụrụ m ịga ṅụọ mmanya, azụnyekwara m ndị enyi m mụ na ha na-aṅụ mmanya mmanya. N’oge na-adịghị anya, ụbọchị ime mpịazi ruru. Ma ọ bụghị n’ihi aka nke onye isi ụlọ akwụkwọ m tinyere n’oge, a gaara achụ m n’ọrụ.
“Ndụ m nọ n’ọnọdụ jọgburu onwe ya. Ihere mere m, ma n’oge na-adịghị anya akwụsịrị m ime ihere. Mgbe ahụ, amalitere m iche echiche igbu onwe m n’ihi na m chere na ọ dịghị ihe ọ bụla m dị mma ya ná ndụ. Ma, apụghị m iwepụ aka n’iri ahụ nke mmanya. Ma n’otu ụbọchị n’ụlọ mmanya, ekeere m òkè n’ọgụ ndị mmanya, a makwara m mma, nke ahụ mekwara ka m ghọta n’ụzọ na-egbu mgbu na ịhụnanya m nwere maka mmanya ga-anapụ m ndụ m n’otu ụbọchị.
“N’oge ahụ nile, Ndịàmà Jehova anọwo na-abịa n’ụlọ anyị site n’oge ruo n’oge, na-agbalị ime ka anyị nwee mmasị na Bible. Mụ na nwunye m na-ezerekarị izute ha n’ihi na anyị chere na ha na-enye mmadụ nsogbu. Otú ọ dị, n’otu oge ekpebiri m ịṅa ha ntị n’ihi ọmịiko m nwere n’ahụ ha. N’oge na-adịghị anya ọmụmụ Bible meghere anya m gaa n’olileanya dị ebube nke ibi ndụ ebighị ebi n’ime usoro ihe ọhụrụ nke Chineke. Ka m nọgidere na-amụ Bible site n’enyemaka nke Ndịàmà Jehova, m nọgidere na-enwe ekele miri emi karị maka Jehova dị ka Onye Na-enye anyị Ndụ nakwa maka onyinye ya nke ndụ, otú ahụkwa ka a na-akpali mmasị m site n’ọbụbụ nke ndụmọdụ Bible bụ ihe a pụrụ itinye n’omume. Nke a gbakwara m ume idozi ndụ m. Nke a adịghị mfe, ebe ọ bụ na m nọgidere na-eguzogide ịṅụ nkwụ [mmanya] tinyekwara ndị enyi ochie m. Jehova, bụ́ Onye Na-anụ ekpere, hụrụ mkpebisi ike nke obi m wee nụkwa olu m.a
“Ọ bụ ezie na nwunye m abụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova, ugbu a ọ na-akwanyere mụ na okpukpe m ùgwù dị elu n’ihi oké mgbanwe nke ọ na-ahụ ná ndụ m nakwa ná mmekọrịta alụmdi na nwunye anyị. Ọ dịkwaghị mkpa ndị agbata obi anyị igboro mụ na nwunye m ọgụ. Eji m udo nke uche m na-enweta ugbu a kpọrọ ihe. N’ezie, ikele Jehova Chineke dị ka Onye Na-enye anyị Ndụ, inwe echiche ya n’ịdị oké ọnụ ahịa nke ndụ, na irube isi ná ntụziaka ya nile banyere ụzọ e si ebi ndụ bụ nanị ụzọ ndụ nke kwesịrị ekwesị.”
Onyinye Chineke nke Ndụ Ebighị Ebi
Ọtụtụ puku, dị ka Kwaku, abụwo ndị Ndịàmà Jehova nyeere aka ‘iyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ, nke e kere dị ka Chineke si chọọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha.’ (Ndị Efesọs 4:24) Ha enwewo ekele, ọ bụghị nanị maka ndụ ha na-adị ugbu a, kamakwa maka olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ́ paradaịs. Bible na-ekwe nkwa na n’ime Paradaịs ahụ nke Chineke ga-eme, ọ dịghị onye ọ bụla bi n’elu ala nke ihe mgbu nke agụụ ga-anọgide na-enye nsogbu ọzọ, n’ihi na “Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba.”—Aịsaịa 25:6.
Ka ọ dị ugbu a, ndụ, ọ bụ ezie na ọ bụ onyinye dị ebube, na-adị nanị nwa oge. Onye ọ bụla na-eche ọnwụ ihu, leekwa aha ihe otiti dị ilu nke ọnwụ bụ! Ọ bụghị ikwubiga okwu ókè ịsị na ọ bụ ihe na-egbu mmụọ nke ukwuu ịhụ ka onye ị hụrụ n’anya hapụrụ ndị dị ndụ wee banye n’ime ili nke dị jụụ. Ma n’okpuru Alaeze Chineke, nke Kraịst ga-achị, nkwa Jehova ga-emezu: “Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.
N’oge ahụ, a ga-agbatị onyinye nke ndụ n’ụzọ dị ebube. Ndị lanarịrị mkpagbu ikpeazụ ahụ n’elu ala nke a ga-enwe ohere ịbanye n’ozuzu nke ndụ. Mgbe ahụkwa, site ná mbilite n’ọnwụ, nke bụ ịkpọghachi ná ndụ, Jehova Chineke ga-enyeghachi ndị ahụ nọ n’ụra nke ọnwụ onyinye ya nke dị oké ọnụ ahịa. (Jọn 5:24, 28, 29) Nke a ga-apụta nlọghachi nke ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ na ndị oge ochie na-atụ egwu Chineke!
Ihe ndị a nile ọ̀ mara oké mma nke na ọ bụghị ihe ga-eme eme? Ee e, n’ihi na “ọ dịghị “okwu ọ bụla si Chineke n’ọnụ pụta nke na-agaghị adị irè.”—Luk 1:37; tụlee Job 42:2.
Ọzọkwa, Jehova Chineke onwe ya enyewo ihe a kpọrọ mmadụ ihe ha ga-eji kwere na ihe ndị a nile ga-ewere ọnọdụ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’iji onye kasị dịrị ya n’obi, bụ́ Ọkpara ọ hụrụ n’anya, Jisọs Kraịst, chụọ àjà iji gbapụta anyị ná mmehie na ọnwụ. Ndị Rom 8:32 na-emesi anyị obi ike, sị: “Onye ahụ [Jehova Chineke] nke na-azọdoghị Ọkpara nke aka ya, kama ọ raara ya nye n’ihi anyị nile, ọ̀ ga-esi aṅaa ghara inyekwa anyị ihe nile n’amara?” Bible na-agwa anyị na nke a ga-agụnye ime ka ihe a kpọrọ mmadụ dị ọcha pụọ ná ndakpọ nke omume ọma na ikpochapụ ụdị nile nke ikpe na-ezighị ezi, imempụ, na ime ihe ike. (Aịsaịa 11:9) Ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla a ga-ele ndụ anya dị ka ihe na-adịghị oké ọnụ ahịa.
Ọbụna ugbu a, n’okpuru ọnọdụ ndị na-ezughị okè, ndụ pụrụ ịdị ụtọ nke ukwuu. Olee onye ọ na-adịghị amasị ịnụ ísì ụtọ nke ihe oriri, ịbụ onye ikuku dị jụụ fesara n’ahụ n’ụbọchị okpomọkụ, ịhụ ugwu dị oké elu, ịma mma nke ọdịda anyanwụ, iyi na-ekwo nwayọọ nwayọọ, ụcha okooko osisi na-akpali akpali, ụda nke egwú dị ụtọ, ma ọ bụ abụ nke ụmụ nnụnụ? Cheretụ nke nta. Chee echiche, gịnị ka ọ ga-adị ka ya ịma ụtọ nke ihe ndị dị otú ahụ ruo mgbe ebighị ebi?
Mgbe ahụ, ọ̀ dị ezi uche ọ bụla dị na ya ịtụfu ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ihi ihe ụtọ nwa oge nke ụzọ ndụ na-ezighị ezi, nke mmadụ ime ka o si masị ya pụrụ inye? (Tụlee Ndị Hibru 11:25.) Ọ bụ ihe amamihe dị na ya na Bible gbara anyị ume ‘ka anyị ghara ibi ihe fọdụrụ ná ndụ maka ime ihe ndị na-agụ mmadụ, kama ime ihe Chineke na-achọ.’ (1 Pita 4:2) Anyị ji obi anyị nile na-agba gị ume, ee, na-akpali gị ime otú ahụ site n’ịmụ Okwu Chineke, bụ́ Bible, na itinye ihe ndị ị na-amụta n’omume. (Jọn 13:17) Ị ga-esi otú ahụ nwee mmekọrịta dị mma n’ebe Jehova nọ, bụ́ Chineke nke jupụtara n’ịdị mma na obi ebere, bụ́ onye pụrụ iji ndụ ebighị ebi kwụghachi gị ụgwọ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ịhapụ mmanya bụ omume siri oké ike, nke na-achọkarị enyemaka onye ọkà. Lee nwanne magazin anyị, bụ́ Teta! nke August 8, 1992, maka ihe ọmụma na-enye aka n’isiokwu nke a.
[Foto dị na peeji nke 5]
Ụdị ndụ ị na-ebi ọ̀ na-egosipụta ekele ị nwere maka ndụ?
[Foto dị na peeji nke 7]
Ụwa ọhụrụ Chineke ga-ekwe ka anyị nwee ihe ụtọnile nke ndụ ruo mgbe ebighị ebi!