Ikwu Okwu n’Asụsụ Dị Iche Iche—Ihe Omume Na-amụba Amụba
“OTU ike batara n’ime ire m, okwu ndị ahụ wee na-asọpụta ka mmiri. Lee ihe ọṅụ ọ bụ! Enwere m mmetụta nke ịdị ọcha magburu onwe ya. Kemgbe ahụ, agbanwere m kpam kpam,” ka otu onye nwere ahụmahụ pụrụ iche nke ikwu okwu ‘n’asụsụ ọ na-amaghị’ kwupụtara.
Nke ahụ bụ nkọwa nke otu onye nyere banyere ahụmahụ mbụ ya nke ikwu okwu ‘n’asụsụ ọ na-amaghị.’ ‘Ma gịnị ka nke ahụ bụ?’ ka ụfọdụ pụrụ ịjụ n’ụzọ ziri ezi. Ọ na-ezo aka n’ihe omume ma ọ bụ nkwenkwe dị na chọọchị ụfọdụ ebe ndị ikom na ndị inyom na-ekwu na mmụọ Chineke na-akpali ha ikwu okwu n’asụsụ ala ọzọ ma ọ bụ asụsụ ọhụrụ nke ha na-amaghị.
Ọ bụ ihe omume okpukpe na-amụba amụba. N’ịbụ nke e lere anya n’otu mgbe dị ka nke nanị ndị na-eje Chọọchị Pentecostal na-eme, ugbu a ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche agabigawo ókèala nile nke okpukpe ndị ahụ ọ bụ omume ha wee banye n’okpukpe Baptist, Episcopalian, Lutheran, Methodist, Presbyterian, na Roman Katọlik. A kọwawo ọnọdụ mmadụ mgbe ọ nọ n’ọnọdụ nke a dị ka oké mkpalị, ime ara ara, uche mkpafu, na amaghị onwe onye. Ọbụna na ụfọdụ na-akpọ ya ahụmahụ nke inwe oké mkpali. E nwere ihe omimi na ihe ndọrọ na-adị n’ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.
N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Ọchịchọ Maka Onyinye nke Asụsụ n’Oge A?
N’akwụkwọ ya bụ́ Tongues of the Spirit, Cyril G. Williams na-atụ aro na a pụrụ inwe “njikọ dị n’etiti echiche nke ọdịda, na ọchịchọ maka ‘asụsụ.’” Ọ na-akọwa ya dị ka usoro ntọhapụ nke nwere “ike ịgwọ ọrịa dị ka ihe na-ebelata nrụgide” na “ihe na-edozi ahụ ntakasị.” Inwe nkụda mmụọ n’ọrụ chọọchị, ihe isi ike nke ọnọdụ uche, enwetaghị ọrụ mmadụ chọrọ, onye mmadụ nwụnahụrụ, nrụgide ezinụlọ, ma ọ bụ ọrịa dị n’ezinụlọ bụ ihe ndị a na-akpọtụ uche dị ka isi ihe na-akpata okwu mkpali ndị dị otú ahụ.
N’otu aka ahụ, n’akwụkwọ bụ́ The Psychology of Speaking in Tongues, John P. Kildahl kwuru na “nchegbu bụ ihe dị oké mkpa n’ịzụlite ikike nke ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.” Site n’ime nnyocha onwe onye na iji nlezianya gbaa ajụjụ ọnụ, a chọpụtara na “ihe karịrị 85% nke ndị na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche enwewo nsogbu nke nchegbu pụtara ìhè tupu ha amalite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.” Dị ka ihe atụ, otu onye bụ nne chọrọ ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche ka o wee nwee ike ikpere nwa ya nwoke na-arịa ọrịa cancer ekpere. Otu nwoke malitere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche n’oge ọ na-enweghị ike ime mkpebi banyere ịnakwere mbuli e buliri ọkwá ya n’ọrụ. Otu nwanyị malitere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche n’ime otu izu mgbe di ya banyere n’òtù Alcoholics Anonymous [òtù na-enyere ndị aṅụrụma aka ịkwụsị mmanya].
Gịnị Ka Mmadụ Na-enwe Ahụmahụ Ya?
Onye ọzọ kwuworo okwu n’asụsụ dị iche iche na nke mbụ ya kọrọ, sị: “Enwere m mmetụta na-ere dị ka ọkụ n’ahụ m nile, na oké oyi na oké ọsụsọ gbara mkpụrụ mkpụrụ, ịma jijiji na ihe dị ka a kụjisịrị m ụkwụ na aka.” N’ịbụ ihe e jikọtara ya na ahụmahụ nke ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, a na-enwekarị omume na-adị iche nke na-enye ụfọdụ nsogbu n’obi. Dị ka ihe atụ, “ọ fọrọ nke nta ka asọ mmiri nke otu nwa agbọghọ gbagbuo ya ka ọ gbatịrị n’elu oche, na-atụla olu ya n’azụ oche ahụ, ikiri ụkwụ ya abụọ dịrị n’ala ụlọ, ụkwụ ya abụọ sie ike.” N’otu nzukọ chọọchị, “otu nwoke kpọgharịrị site n’otu akụkụ chọọchị gaa n’ọzọ.”
“Nye ndị ụfọdụ,” ka Professor William J. Samarin dere, “ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche bụ ọnọdụ na-egosi ịbụ onye e mere baptism ná Mmụọ Nsọ.” Ma ọ bụghị ya, ‘a na-eme ka ha chee na ha ezughị ezu.’ A na-elekwa ya anya “dị ka azịza nke ekpere, nkwa nke ịhụnanya na nnabata Chineke.” Ndị ọzọ ekwuwo na ọ na-eme ka ha nwee mmetụta nke ịdị jụụ, ọṅụ na udo nke dị n’ime, na inwe “echiche nke ịdị ike karị” na “echiche dị ike karị nke ihe mmadụ bụ.”
Okwu mkpali ọ̀ bụ n’ezie ihe na-egosi na mmụọ nsọ na-arụ ọrụ? Ahụmahụ ahụ ọ̀ na-eme ka a mata mmadụ dị ka ezi onye Kraịst? Ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche ọ̀ bụ akụkụ nke ofufe a na-anakwere n’oge a? Ajụjụ ndị a chọrọ ihe karịrị azịza e nyere n’elu elu. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị chọrọ ka ofufe anyị nwee nnwapụta na ngọzi Chineke.