Onyinye nke Asụsụ Ọ̀ Bụ Akụkụ nke Ezi Iso Ụzọ Kraịst?
“M NA-ENWE mmetụta, ka m na-ege ntị mgbe ọ na-ekpe ekpere n’asụsụ dị iche iche, dị ka e nwere ike ọdụdọ eletrik n’ikuku,” ka Bill kwuru, mgbe ya na mmadụ isii ndị ọzọ zukọsịrị n’ihu onye na-ekwu okwuchukwu n’ebe dịdebere ọlta chọọchị. Ahụmahụ ndị dị otú ahụ ò yiri ịrụ ọrụ nke mmụọ nsọ nke mere na narị afọ mbụ? Hà na-eme ka a mata okpukpe nke Bible? Anyị pụrụ ịchọta azịza ndị na-eju afọ site n’iji nlezianya nyochaa Akwụkwọ nsọ.
Ihe ndekọ Bible na-ekpughe na mgbe e nyefere onyinye ọrụ ebube ọ bụla nke mmụọ nsọ, ya dịkarịa ala otu n’ime ndị ozi 12 ma ọ bụ Pọl onyeozi nọ ya. Nke mbụ n’ime ugbo atọ e dekọrọ banyere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche mere n’etiti 120 ndị na-eso ụzọ Jisọs, bụ́ ndị zukọtara na Jerusalem na Pentikọst 33 O.A. (Ọrụ 2:1-4) Afọ atọ na ọkara mgbe nke ahụ gasịrị, ka ìgwè ndị Itali a na-ebighị úgwù na-ege Pita ntị ka ọ na-ekwusa ozi ọma, ha natara mmụọ nsọ wee malite ‘ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, na-eme ka Chineke dị ukwuu.’ (Ọrụ 10:44-48) Afọ 19 mgbe Pentikọst gasịrị, n’ihe dị ka 52 O.A., Pọl gwara otu ìgwè mmadụ okwu n’Efesọs wee bikwasị aka ya n’isi ndị na-eso ụzọ 12. Ha wee “kwuo okwu n’asụsụ dị iche iche ọzọ, buokwa amụma.”—Ọrụ 19:6.
N’ihi Gịnị Ka E Ji Nye Onyinye nke Asụsụ?
Kpọmkwem tupu ọ rịgoo n’eluigwe, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-anata ike, mgbe mmụọ nsọ ga-abịakwasịworị unu: unu ga-abụkwa ndịàmà m n’ime Jerusalem . . . ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Ọrụ 1:8) Rịba ama na o si otú a nye ihe na-egosi nnọọ ụzọ a ga-esi rụzuo oké ọrụ ịgba àmà nke a—site n’enyemaka nke mmụọ nsọ.
Nkanụzụ nzirịta ozi ọgbara ọhụrụ ndị na-enyere anyị aka izipụ ozi n’ụwa nile n’ọtụtụ asụsụ adịghị laa azụ n’oge ahụ. A ghaghị ịgbasa ozi ọma ahụ n’ụzọ bụ isi site n’okwu ọnụ, n’imekwa nke a, onyinye ọrụ ebube nke ikwu okwu n’asụsụ ala ọzọ ga-abụ nnọọ oké ihe inyeaka. Nke ahụ bụ ihe mere mgbe ndị Kraịst narị afọ mbụ kwusara ozi ọma gwa ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ha nọ na Jerusalem na Pentikọst 33 O.A. Ndị Patia, ndị Midia, ndị Ilam, ndị Krit, ndị Arebia, ndị bi na Mesopọtemia, Judia, Kapadọsia, Pọntọs, na ókèala nke Esia, tinyekwara ndị ọbịa si na Rom bịa, nụrụ “banyere oké ọrụ nile nke Chineke” n’asụsụ nke ha, ghọtakwa ihe e kwuru. Ngwa ngwa 3,000 ndị mmadụ ghọrọ ndị kwere ekwe.—Ọrụ 2:5-11, 41.
Otu eziokwu a na-elefurukarị anya bụ na ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche bụ nanị otu n’ime ọrụ itoolu nke mmụọ nsọ na-arụ nke Pọl onyeozi hotara n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kraịst nọ na Kọrint. Ọ bụ ezie na Pọl lere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche anya dị ka onyinye dị ala karị, ọ baara ọgbakọ oge gboo ahụ oké uru n’ịgbasa ozi ọma banyere Alaeze eluigwe nke Chineke. Ọ bụ otu n’ime “onyinye” ndị keere òkè ná mmụba ọnụ ọgụgụ na mwulite nke ọgbakọ ndị Kraịst ọhụrụ ahụ.—1 Ndị Kọrint 12:7-11; 14:24-26.
Ọrụ dị iche iche nke mmụọ nsọ rụrụ na narị afọ mbụ, tinyere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, bụkwa ihe àmà pụtara ìhè nke na-egosi na Chineke adịghị ejikwa ọgbakọ Israel ahụ dị 1,500 afọ eme ihe dị ka ndị ya pụrụ iche. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ugbu a nnwapụta ya na-adịkwasị n’ọgbakọ ndị Kraịst ọhụrụ ahụ, nke Ọkpara ọ mụrụ nanị guzobere.—Tụlee Ndị Hibru 2:2-4.
Ihe ndị a nke mmụọ nsọ mere bụ isi ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’iguzobe ọgbakọ ndị Kraịst ọhụrụ ahụ na n’inyere ya aka itopụta dimkpa. Pọl kọwara na mgbe ha mezuru nzube ha, onyinye ọrụ ebube ndị a ga-akwụsị: “Ọ bụrụ na ibu amụma dị, a ga-eme ka ha ghara ịdị irè; ọ bụrụkwa na asụsụ dị iche iche dị, ha ga-agwụ.”—1 Ndị Kọrint 13:8.
Ee, Bible mere ka ọ pụta ìhè na onyinye nke asụsụ ga-akwụsị. Ma ọ̀ bụ n’olee mgbe? Ọrụ Ndị Ozi 8:18 na-ekpughe na a natara onyinye nke mmụọ nsọ “site n’ibikwasị aka nke ndị ozi.” Mgbe ahụ, o doro anya na mgbe onyeozi ikpeazụ nwụrụ, nnyefe nke onyinye nke mmụọ nsọ ga-akwụsị—tinyere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche. Ya mere, mgbe ndị ahụ natara onyinye ndị a site n’aka ndị ozi ahụ hapụkwara elu ala a, onyinye ọrụ ebube ahụ ga-akwụsị. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, ọgbakọ ndị Kraịst ga-enweworị ohere ịghọ nke e guzobere nke ọma, ọ ga-abụwokwarị nke gbasara n’ọtụtụ ala.
“Asụsụ Ndị A Na-amaghị” na Nkọwa Ha
Mpụtaghachi nke ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche n’oge a abụwo nke “ụfọdụ lere anya dị ka mmetụta uche gabigara ókè nke ndị na-agbanwe agbanwe bụ́ ndị na-achọ ịdọta mmasị ndị ọzọ n’ebe ha nọ, ebe ndị ọzọ na-akọwa ya dị ka ihe yiri ihe omume nke ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche nke oge Ndị Ozi.” Ná nzukọ chọọchị oge ugbu a ebe ikwu okwu ‘n’asụsụ ndị a na-amaghị’ na-ewere ọnọdụ, ọ na-abụkarị oké iti mkpu mkpali nke ụda okwu ndị na-enweghị isi. N’ikwekọ na nke ahụ, otu onye kwupụtara, sị: “Ana m eji onyinye m nke asụsụ eme ihe karịsịa n’oge nanị m nọ maka ntụgharị uche nke onwe m. . . . Ntakịrị ihere na-eme m ma m nọrọ n’ihu ndị ọzọ.” Onye ọzọ kwuru, sị: “Ana m anụ ihe m na-ekwu, adịghị m aghọta ha, ma m na-enwe mmetụta nke na a na-akpali ire m ikwu okwu.”
Ihe ọmụma dị aṅaa bara uru ka a na-eji asụsụ ndị dị otú ahụ nke a na-amaghị ewepụta, gịnịkwa banyere nkọwa ya? Ndị na-azọrọ na ha na-akọwa ikwu okwu nke a enyewo nkọwa dị iche iche banyere otu nkwupụta okwu ahụ na-enweghị isi. N’ihi gịnị ka ha ji dị iche iche? Ha na-enye ihe ngọpụ maka ọdịiche dị otú ahụ site n’ikwu na “Chineke nyere otu onye otu nkọwa nke ikwu okwu ahụ, nyekwa onye ọzọ nkọwa ọzọ.” Otu onye kwetara, sị: “Arịbawo m ama oge ndị e nwere nkọwa na-abụghị nke ziri ezi.” D. A. Hayes, n’akwụkwọ ya bụ The Gift of Tongues, zoro aka n’otu ihe atụ ebe otu nwoke jụrụ ịkọwa ikwu okwu nke otu nwanyị bụ́ onye kwuru okwu n’asụsụ nke a na-amaghị n’ihi na “asụsụ ahụ rere ure karịa ihe ọ bụla rere ure.” Lee ka nke ahụ si dị iche n’ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche nke mere na narị afọ mbụ, nke ahụ bụkwa maka iji wulie ọgbakọ ahụ elu!—1 Ndị Kọrint 14:4-6, 12, 18.
Taa ụfọdụ na-ekwu na ha anụwo nkọwa ndị dị mma nke ukwuu, ha pụkwara iji ezi obi kwere na Chineke na-eji onyinye nke a eme ihe mgbe ọ “chọrọ izi ndị ya ozi kpọmkwem.” Ma ozi dị aṅaa sitere n’aka Chineke dị anyị mkpa taa nke Jisọs Kraịst na ndị ozi na-enyeghị anyị? Pọl, bụ́ onye e nyere onyinye nke mmụọ nsọ, kwuru, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.
Ihe bụ eziokwu bụ na, ọgbakọ ndị Kraịst abụkwaghị ihe ọhụrụ, ya mere mkpughe Chineke ma ọ bụ onyinye ọrụ ebube nke mmụọ nsọ adịkwaghị mkpa iji nwapụta izi ezi nke ọrụ ya. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ma a sịkwa na anyị onwe anyị, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi nke sitere n’eluigwe, ga-ezi unu ozi ọma ọzọ tụkwasị [“nke dị iche,” The New English Bible] ozi ọma nke anyị ziri unu, ya bụrụ anathema [“onye a bụrụ ọnụ,” NW].”—Ndị Galetia 1:8.
Ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche n’ụzọ ọrụ ebube adịkwaghị mkpa, ọ dịghịkwa ihe ndabere ọ bụla dị na Bible e nwere maka ikwere na ọ bụ akụkụ nke ezi Iso Ụzọ Kraịst taa. Ugbu a Bible zuru ezu, dịrịkwa n’ebe nile, anyị nwere ihe dị anyị mkpa n’Okwu Chineke. Ọ na-enye anyị ohere inweta ezi ihe ọmụma banyere Jehova na Ọkpara ya nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3; Mkpughe 22:18, 19.
Ọbụna na narị afọ mbụ, a kpaliri Pọl onyeozi idegara ọgbakọ ahụ dị na Kọrint akwụkwọ iji gbazie echiche ha n’ihe mere e ji nye ndị Kraịst oge gboo onyinye nke asụsụ. O yiri ka ụfọdụ aghọwo ndị a kpaliri mmasị ha n’onyinye nke asụsụ, ha wee na-eme omume ka ụmụntakịrị, ndị na-etozughị okè n’ime mmụọ. A malitere ile “asụsụ” anya dị ka ihe dị oké mkpa. (1 Ndị Kọrint 14:1-39) Pọl mesiri ya ike na ọ bụghị ndị Kraịst nile na narị afọ mbụ kwuru okwu n’asụsụ ọrụ ebube. Ọ dịghị mkpa maka nzọpụta ha. Ọbụna laa azụ n’oge ahụ ọ dị, onyinye nke asụsụ nọ n’ọkwá nke abụọ n’ebe ọrụ ebube nke ibu amụma dị. Ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche abụghị ihe a chọrọ n’aka ndị Kraịst iji nweta ndụ ebighị ebi.—1 Ndị Kọrint 12:29, 30; 14:4, 5.
Ike nke Na-akpali Asụsụ Ndị A Na-amaghị n’Oge A
Ụfoḍụ kwetara na ike nke na-akpali ndị oge ugbu a ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche bụ ndị ndú chọọchị mmụọ nsọ, bụ́ ndị na-akwali ndị so n’ìgwè atụrụ ha ka ha nweta ikike nke a. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ bụ nke mmetụta uche na enweghị ezi nguzo na-akpata. Cyril G. Williams, n’akwụkwọ bụ́ Tongues of the Spirit, na-ekwu na ọ ghọwo, “n’ọtụtụ ọnọdụ, ihe àmà nke ndị ka ibe ha n’ime otu ìgwè,” ọ na-enyekwa mmadụ “ùgwù na ike n’anya ìgwè ahụ nakwa n’anya nke onwe ha.” Ya mere, ihe na-akpali ya pụrụ ịbụ ọchịchọ nke iso n’ìgwè ndị ka ibe ha na-asụ asụsụ ndị a na-amaghị.
Mgbe ọ bụ onye isi oche nke Loyola University, Donald P. Merrifield kwuru na “asụsụ pụrụ ịbụ ahụmahụ mkpali, ma ọ bụ, dị ka ụfọdụ si kwuo, nke dị njọ.” Onye ụkọchukwu bụ́ Todd H. Fast kwuru, sị: “Asụsụ bụ ihe a na-arụ ụka. Ekwensu nwere ọtụtụ ụzọ o si agbalị inwe mmetụta n’ahụ anyị.” Bible n’onwe ya na-adọ aka ná ntị na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya nwere ike inwe mmetụta n’ahụ ndị mmadụ na ịchịkwa okwu ọnụ ha. (Ọrụ 16:17, 18) Jisọs mere ihe megide otu mmụọ ọjọọ nke kpaliworo otu nwoke iti mkpu na ịda n’ala. (Luk 4:33-35) Pọl dọrọ aka ná ntị na ‘Setan ga-eme onwe ya ka o yie mmụọ nke ìhè.’ (2 Ndị Kọrint 11:14) Taa, ndị na-achọ onyinye nke asụsụ bụ́ nke Chineke na-adịghịkwa enye ndị ya na-ekpughe onwe ha n’ezie nye nduhie nke Setan, bụ́ onye, dị ka a dọrọ anyị aka ná ntị, ga-eji ‘ọrụ nile dị ike na ihe ịrịba ama na ọrụ ebube nile ọ bụla’ mee ihe.—2 Ndị Tesalonaịka 2:9, 10.
Asụsụ—Na Ezi Iso Ụzọ Kraịst
Ndị Kraịst narị afọ mbụ bụ́ ndị natara onyinye nke ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche ji ya mee ihe ịkọwa oké ọrụ nile nke Chineke. E mesiri mkpa ọ dị ike ịkọwa n’ụzọ doro anya, ozi ahụ nke e nyere n’asụsụ dị iche iche ka mmadụ nile wee nwee ike ịghọta ya, ka o wee mee ka ọtụtụ bụrụ ndị e wuliri elu. (1 Ndị Kọrint 14:26-33) Pọl nyere ndụmọdụ, sị: “Ma ọ bụrụ na unu ejighị ire kwuo okwu dị mfe ịghọta, à ga-esi aṅaa mara ihe a na-ekwu? N’ihi na unu ga na-ekwu okwu nye ifufe.”—1 Ndị Kọrint 14:9.
Ọ bụ ezie na mmụọ Chineke nyere ndị Kraịst oge gboo onyinye nke asụsụ, o meghị ka ha na-ekwu ihe mmadụ na-apụghị ịghọta ma ọ bụ okwu na-enweghị isi nke a na-apụghị ịsụgharị asụgharị. N’ikwekọ n’okwu ndụmọdụ Pọl, mmụọ nsọ nyere okwu ndị mere ka ozi ọma ahụ bụrụ nke “e kwusara n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe” ngwa ngwa karị.—Ndị Kọlọsi 1:23.
Banyere ụbọchị ikpeazụ ndị a nke usoro ihe dị ugbu a, Jisọs Kraịst nyere iwu, sị: ‘A ghaghị ibu ụzọ kwusaa ozi ọma [banyere Alaeze ahụ e guzobeworo] n’ihu mba nile.’ (Mak 13:10) Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, ihe nile e kere eke aghaghị ịnụ ozi banyere Alaeze ahụ. Nke a ga-ekwe omume n’ihi na a sụgharịwo Bible ugbu a, n’ozuzu ya ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ, gaa n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 asụsụ. Otu mmụọ ahụ nke kpaliri ndị Kraịst oge gboo iji anya ike na obi ike kwuo okwu na-akwadokwa ugbu a, oké ọrụ ahụ dịkwa ebube nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke oge ugbu a na-arụ. Site n’okwu ọnụ na site n’iji nkanụzụ ọgbara ọhụrụ ndị e ji ebi akwụkwọ eme ihe iji mee ka eziokwu nke Akwụkwọ nsọ dịrị n’akwụkwọ e biri ebi, ha na-asụ ‘asụsụ ahụ dị ọcha.’ Ozi nke a na-aga n’ihe karịrị 200 mba na agwaetiti nke oké osimiri. Ndịàmà Jehova na-eguzopụ iche dị ka ndị mmụọ Chineke na-akpali ime ka mmadụ nile mara oké ọrụ nile nke Chineke.—Zefanaịa 3:9; 2 Timoti 1:13.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ na Japan
Ịgba àmà site n’ụgbọ mmiri ruo n’ụgbọ mmiri na Colombia
N’okpuru: Ọmụmụ Bible na Guatemala
N’ala: Ịgba àmà n’ime obodo na Netherlands