Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 9/15 p. 28-31
  • Ị Pụrụ Ịnagide Nkụda Mmụọ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Pụrụ Ịnagide Nkụda Mmụọ!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Ụfọdụ isi Nagide Nkụda Mmụọ
  • Ịdị Ike n’Agbanyeghị Nkụda Mmụọ
  • Ihe Ngwọta Dịịrị Nkụda Mmụọ—N’isi Nso!
  • N’ihi Gịnị Ka Anyị Ga-eji Na-enwe Ezi Uche n’Atụmanya Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ị Pụrụ Ịnagide Ejighị Ihe n’Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ụzọ Isi Nweta Olileanya n’Oge Obi Nkoropụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • N’ihi Gịnị Ka Nne Ma Ọ Bụ Nna M Na-ejighị Hụ M n’Anya?
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 9/15 p. 28-31

Ị Pụrụ Ịnagide Nkụda Mmụọ!

TỤLEE ọnọdụ mwute nke otu nwoke dị 23 afọ. Ọ gụrụ akwụkwọ nanị nke nta ma na-arụ ọrụ na-enye ya obere ego. Echiche nke ịlụ nwunye na ibi ndụ na-eju afọ yiri ihe na-agaghị eme eme nye ya. Ka a sịkwa ihe mere nne ya ji kwuo, sị: “Ọ na-enwe oké mwute na nkụda mmụọ.” Ọnọdụ nke nwa okorobịa a yiri nke ọtụtụ nde ndị ọzọ. N’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, ndị nọ n’ọnọdụ dị iche iche nke ndụ na-enwe nkụda mmụọ.

Nkụda mmụọ bụ “oké mmetụta dị omimi ma ọ bụ ọnọdụ nke enweghị nchebe, enweghị agbamume, na enweghị afọ ojuju nke na-ebilite site n’ọchịchọ ndị a na-emezughị, ahụ ntakasị, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ a na-edozighị edozi.” (Webster’s Third New International Dictionary) Anyị na-enwe nkụda mmụọ mgbe anyị na-agbalịsi ike imezu otu ihe ma ghara inwe ike imezu ya. Anyị na-enwe mmetụta ịbụ ndị a nọchiiri ụzọ mgbe ọ bụla anyị mere mgbalị, dị ka à ga-asị na anyị na-akụ isi anyị ná mgbidi nkume, n’enweghị ohere ọ bụla nke inwe ihe ịga nke ọma. Anyị nile maara otú mmetụta ahụ si adị.

Ndị na-arụ ọrụ ndị yiri nke na-adịghị eweta afọ ojuju pụrụ inwe mmetụta nke ịbụ ndị na-abaghị uru. Ọ bụrụ na e lelịa ha, ndị bụ nwunye na nne bụ́ ndị na-adọlị site ná nchegbu na-adị kwa ụbọchị na ọrụ ndị na-agwụ ike pụrụ inwe mmetụta nke onye na-arụzughị ihe, onye a na-adịghị enye ekele. Ndị na-eto eto bụ́ ndị na-ezute ọnwụnwa n’ụlọ akwụkwọ pụrụ inwe nkụda mmụọ ná mgbalị ha ịbụ ndị gụrụ akwụkwọ. Ndị so n’ìgwè ndị a ka n’ọnụ ọgụgụ pụrụ inwe mgbakasị ahụ, na-ekwenyesi ike na ha bụ ndị a na-emegbu n’ụzọ ịkpa ókè na-ezighị ezi. Ndị ji ego achụ ego bụ́ ndị ji ime ihe n’eziokwu na-agbalị ire ngwá ahịa ma ọ bụ ịrụ ọrụ ndị dị mma pụrụ ịbụ ndị ndị ahịa ibe ha na-arụ arụrụala na ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu wetaara njọ ahịa. Ahụmahụ ndị a na ndị yiri ha na-akpata nkụda mmụọ, na-eme ka ọtụtụ nọrọ na-enwe mmetụta nke enweghị olileanya.

Otu nwoke maara ihe nke dịrị ndụ n’ọtụtụ narị afọ gara aga kwupụtara nkụda mmụọ n’ụzọ nke anyị pụrụ ịghọta. Eze Israel bụ́ Solomọn kwuru, sị: “Mụ onwe m wee chee ọrụ m nile nke aka m abụọ rụrụ ihu, echekwara m ndọgbu nke m dọgburu onwe m n’ọrụ ime ihu: ma, lee, ihe nile bụ ihe efu na ịchọ ijide ifufe, ọ dịghịkwa ihe fọdụụrụ mmadụ n’okpuru anyanwụ. N’ihi na gịnị ka mmadụ nwere ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, na n’ime nchegbu nke obi ya, nke ya onwe ya na-adọgbu onwe ya n’ọrụ n’ime ya n’okpuru anyanwụ? N’ihi na ụbọchị ya nile bụ nanị ihe mgbu, mkpasu iwe ka mweda n’ala ya bụkwa; ọbụna n’abalị obi ya edinaghị ịrahụ ụra. Nke a bụkwa ihe efu.” (Eklisiastis 2:11, 22, 23) Okwu Solomọn na-akọwa ndakpọ olileanya nke ọtụtụ ndị na-enwe n’ịgbalị ịnagide nkụda mmụọ ndị na-anapụ ha ndụ nke na-akwụghachi ụgwọ.

Ndị nwere nkụda mmụọ pụrụ ọbụna ịbụ ndị ike ụwa gwụrụ. N’ọnọdụ ndị dị oké njọ, ụfọdụ akwụsịwo ịgba mbọ, na-ewezụga onwe ha n’etiti ọha mmadụ ibi ndụ a jụrụ ajụ. Iji nweta ihe ha cheere ruuru ha, ụfọdụ amalitewo ime mpụ na ime ihe ike. Nrụgide ndị na-adịghị akwụsị akwụsị etikpọwo alụmdi na nwunye na njikọ ezinụlọ.

Ọ pụrụ ịdị mkpa ka ọtụtụ n’ime anyị tinye oké mgbalị n’ịchọta ụzọ isi nagide nkụda mmụọ. N’agbanyeghị ihe anyị na-eme, ọ pụrụ iyi ka ihe ọ̀ na-akawanye njọ. Ilu 13:12 na-asị: “Nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa.” Ọdịmma anụ ahụ na nke ime mmụọ anyị pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ. Ọ̀ bụ na olileanya adịghị n’ọnọdụ ahụ? Ànyị ga-anọgide na-enwe nkụda mmụọ dị ka ụgwọ anyị na-akwụ maka adịghị ike ma ọ bụ amaghị eme anyị? Ọ̀ dị ihe ụfọdụ dị irè a pụrụ ime iji nagide nkụda mmụọ ka anyị wee na-ebi ndụ nwere afọ ojuju karị? Ka anyị lee.

Ụzọ Ụfọdụ isi Nagide Nkụda Mmụọ

Mgbe anyị nwere nsogbu ma chọọ ndụmọdụ, anyị na-agakwukarị onye maara ihe, nke nwere ahụmahụ, bụ́ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi. Ilu 3:5, 6 na-atụ aro, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.” A pụrụ ịchọta ndụmọdụ ndị dị irè n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Tụlee ihe atụ ụfọdụ nke ezi uche ndị ọ na-enye.

Nkụda mmụọ pụrụ ịbụ n’ihi ịkpata ihe e ji adị ndụ. Dị ka ihe atụ, ọrụ ego anyị pụrụ ịbụ nke na-enye afọ ojuju, ma ụgwọ ọrụ dị ala pụrụ ịbụ ihe na-eweta ịda mbà n’obi. Anyị hụrụ ezinụlọ anyị n’anya ma chọọ imere ha ihe kasị mma. Ma, o yiri ka nchegbu banyere imezu ihe ndị anyị chọrọ iji ego mee adịghị agwụ agwụ. Anyị pụrụ ịrụkwu ọrụ ma a gbasaa ọrụ, ọbụnakwa na-enweta ọrụ nke abụọ. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ndụ na-eyi usoro siri ike nke iri ihe, ihi ụra, na ịrụ ọrụ. Ma, ụgwọ a ga-akwụ na-amụba, ụgwọ e ji eji na-arị elu, nkụda mmụọ na-adịkwa ukwuu.

Nzube bụ isi nke ọrụ ego bụ iji gboo mkpa anyị. Ma ihe ole dị anyị mkpa? Pọl onyeozi dere, sị: “Anyị ewetaghị ihe ọ bụla n’ụwa, ọ bụkwa n’ihi na anyị apụghị iwere ihe ọ bụla pụọ n’ime ya; ma ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a.” Ànyị na-agbalị inweta ihe karịrị nke ahụ na inwezu ihe ndị ọzọ nwere ma ọ bụ imezu ihe ha mere? Ya bụrụ otú ahụ, anyị pụrụ ịdị na-aghọrọ mkpụrụ nke ihe ndị si na ya pụta n’ụdị nke nkụda mmụọ. Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpu n’ime mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, e wee duhie ha n’okwukwe anyị, ha werekwaara ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.” (1 Timoti 6:7-10) Iji obi eziokwu tụleghachi ihe onwunwe ndị anyị na-achụso pụrụ ikpughe ihe ụfọdụ ndị na-adịchaghị mkpa. Ime mgbanwe ole na ole ezi uche dị na ha n’ụzọ e si emefu ego na ibikwu ụzọ ndụ nke imeru ihe n’ókè pụrụ inye aka nke ukwuu n’ibelata nkụda mmụọ.

Ọchịchọ ebumpụta ụwa ndị a na-emezughị akpatawo oké nkụda mmụọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ihe e bu pụta ụwa nwa agbọghọ inwe ọchịchọ siri ike ịlụ di ma nwee nchebe na ịhụnanya na-ekpo ọkụ nke na-adị ná ndụ ezinụlọ. Ọ pụrụ ime ọtụtụ ihe iji mee onwe ya ka ọ dị mma ile anya site n’iji ejiji ndị kasị pụta ọhụrụ ma ọ bụ inwe ihe ịchọ mma dị iche iche, ọ pụkwara ịbụ onye na-agụchapụ akwụkwọ ndị na-apụta mgbe mgbe bụ́ ndị na-enye ndụmọdụ maka onye na-achọ onye ihe ya ga-amasị. Nwanyị ahụ pụrụ ịga ọtụtụ nnọkọ oriri n’olileanya nke izute onye dị ya mma—n’enweghị ihe ịga nke ọma. Ka afọ na-agabiga, nkụda mmụọ pụrụ ịghọ nke a na-apụghị ịnagide. N’ịbụ onye ike ụwa gwụrụ, ọ pụrụ ịbụ onye a nwara ịlụ onye na-adịghị ya mma. Dịkwa ka nke ka njọ, iji mezuo agụụ ya maka ịhụnanya, ọ pụrụ itinye aka n’omume rụrụ arụ.

N’ọnọdụ dị otú ahụ, inwe ndidi na ezi echiche dị mkpa. Mmadụ ịlụ onye na-adịghị ya mma—karịsịa onye na-enweghị okwukwe na Jehova—ga-abụ oké imehie ihe. (1 Ndị Kọrint 7:39; 2 Ndị Kọrint 6:14, 15) Omume rụrụ arụ na-edubakarị kpọmkwem n’obi mgbawa na ịda mbà. (Ilu 6:32, 33) Iji eziokwu mee nnyocha onwe onye, ya na iji ezi uche leba anya n’okwu ahụ pụrụ inye aka. “Mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo” pụrụ ịdọta ụdị onye kwesịrị ekwesị mmadụ chọrọ ịlụ n’ụzọ dị mma karịa ka uwe ndị na-ewu ewu ma ọ bụ ihe ntecha ndị pụrụ iche pụrụ ime. (1 Pita 3:3, 4) Kama ịdabere na ndụmọdụ ndị na-adịghị adabakarị n’ọnọdụ mmadụ nile ma ọ bụ ndị na-adịghị mkpa nke ndị ọkà nke ụwa na-enye, ọ dị mkpa ịgakwuru Onye Malitere alụmdi na nwunye ịmụta banyere ihe dị mkpa iji bụrụ nwunye nke a hụrụ n’anya na nke e ji kpọrọ ihe. (Ilu, isi nke 31) Ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị na-alụbeghị nwunye ma ọ bụ di kwesịrị ịgbalị igosipụta àgwà ndị ahụ ha ga-achọ ka onye ha ga-alụ nwee. Lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya iso ndị na-akwanyere ụkpụrụ nile nke Bible ùgwù na-enwe mkpakọrịta dị mma. Ọ bụrụ na anyị etinye ihe ndị a ná ndụ, olileanya ndị anyị nwere maka alụmdi na nwunye obi ụtọ ga-aka mma nke ukwuu. Ọbụna ma à sị na alụmdi na nwunye esighị na ya pụta ozugbo, ime ihe kwekọrọ n’Akwụkwọ nsọ ga-eweta ọṅụ ma mee ka ndụ nke alụghị di ma ọ bụ nwunye bụrụ ihe na-akwụghachi ụgwọ.

Inwe ibu ọrụ dị arọ pụrụ iweta anyị n’ọnọdụ nke ịnọ ná mkpasu iwe. A pụrụ inwe nrụgide site n’akụkụ nile. Anyị na-enwe nchegbu banyere mkpa ndị chọrọ nlebara anya n’ezinụlọ anyị, onye were anyị n’ọrụ pụrụ ịbụ onye afọ na-adịghị eju mgbe ọ bụla. Ndị ikwu anyị pụrụ ịtụ anya ka anyị nye aka mgbe ọ bụla e nwere ihe isi ike. N’ihi ọtụtụ nrụgide, ọtụtụ ihe onwe onye ndị e lefuworo anya nọ na-eche ka anyị leba ha anya. Ọ pụrụ iyi ka anyị ga-eji oge na ike anyị mee ihe n’ọtụtụ akụkụ dị iche iche n’otu mgbe. Nkụda mmụọ pụrụ ịghọ mkpasu iwe, anyị pụkwara inwe mmetụta nke ịda mbà. Ya mere, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

Anyị ga-abụ ndị maara ihe inyochagharị ihe ndị anyị na-ebutere ụzọ. Ebe ọ bụ na anyị apụghị ime ihe nile, ọ gaghị ekwe omume imezu ihe nile ndị ọzọ chọrọ ka anyị mee. Ọ dị mkpa ka anyị họrọ nanị ‘ihe ka ibe ha mkpa.’ (Ndị Filipaị 1:10) E kwuwerị, ‘nkịta dị ndụ dị mma karịa ọdụm nwụrụ anwụ.’ (Eklisiastis 9:4) Ụfọdụ ibu ọrụ dị oké mkpa, bụrụkwa ndị a na-apụghị ịhapụ ruo mgbe ọzọ, ebe ndị na-adịchaghị mkpa pụrụ ichere ruo mgbe ọzọ. Ọ pụrụ ịbụ na nanị anyị anakwerewo iburu ibu ọrụ nke ụfọdụ ndị ọzọ kwesịrị ikere òkè na ha. Ibu ọrụ ụfọdụ pụrụ ịbụ ndị a hapụrụ kpam kpam ma ọ bụrụ na ha adịghị mkpa. Ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịkpata ihe isi ike ná mmalite ma ọ bụ ime ihe ndị ọzọ na-atụghị anya ya, ọ dị mkpa ka anyị ghọta ebe ike anyị ruru n’ụzọ anụ ahụ na n’ụzọ mmetụta uche.

Ọrịa nke na-amịkọrọ ume mmadụ pụrụ iweta nkụda mmụọ na-egbu oké mgbu, n’ihi na ọ pụrụ idebe anyị n’àkwà ọrịa ruo ọtụtụ ụbọchị ma ọ bụ izu n’otu oge. Oké ihe mgbu pụrụ ime ka anyị hụsie anya. N’ịchọ ọgwụgwọ, anyị pụrụ ịga na nke ndị dọkịta dị iche iche ma ọ bụ anyị pụrụ ịṅụ ọtụtụ ọgwụ ma ọ bụ vitamin n’olileanya nke na ha ga-eme ka ọ dị mma. Ma, anyị pụrụ ịnọgide na-arịa, anyị pụkwara ịmalite iche ma ndụ ò kwesịrị mbọ a na-agba maka ya.

Nke a pụrụ ịbụ nsogbu nke a pụrụ ịgwọta nanị n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. (2 Pita 3:13; tụlee Aịsaịa 33:24.) Ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ ezughị okè, ndị dọkịta na ọgwụ apụghị ịgwọta ihe nile. N’ọnọdụ ụfọdụ, anyị pụrụ ịnakwere nhụjuanya anyị dị ka akụkụ nke ndụ. Pọl onyeozi nwere “ogwu n’anụ ahụ,” ma eleghị anya nsogbu anya ma ọ bụ akụkụ ọzọ nke ahụ ya, nke ahụ nyere ya nsogbu nke na ọ nọgidere na-ekpe ekpere ka o belata. (2 Ndị Kọrint 12:7-10) Ma Chineke agwọghị Pọl, eleghị anya onyeozi ahụ nọgidere na-agwọ nsogbu ahụ ruo mgbe ọ nwụrụ. Ọ nagidere nhụjuanya ya, ọ rịọghị ka a na-emere ya ebere, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ọ tụfuru ọṅụ ya. (2 Ndị Kọrint 7:4) Ọ bụ ezie na nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job tara oké ahụhụ, o jigidere okwukwe ya na Jehova, nke a dugakwara ná nkwụghachi ụgwọ bara ụba. (Job 42:12, 13) Ọ bụrụ na anyị bụ ndị ohu Chineke, anyị pụrụ ịchọta ume iji nọgide na-aga n’ihu site n’ịtụgharị uche n’ihe atụ ndị a ma na-ekpe ekpere maka enyemaka Jehova.—Abụ Ọma 41:1-3.

Ịdị Ike n’Agbanyeghị Nkụda Mmụọ

Ndị Jehova pụrụ ịdị ike n’ime mmụọ n’agbanyeghị nkụda mmụọ ọ bụla. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịtachi obi n’ọrịa, anyị pụrụ ịnọgide ‘na-enwe ezi ndụ n’ime okwukwe’ site n’iji ndokwa ime mmụọ nile nke Chineke na-eme ihe bara uru. (Taịtọs 2:1, 2) Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịda ogbenye ihe onwunwe n’ụzọ na-akụda mmụọ, anyị pụrụ ịba ọgaranya dị ebube n’ụzọ ime mmụọ.

Site n’ịdabere n’ebe Chineke nọ maka amamihe na ume, anyị pụrụ ịnagide nkụda mmụọ ndị pụrụ ibilite n’ọnọdụ ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Abigail, bụ́ nwunye Nebal. Ọ bụ nwoke “siri ike n’obi, jọọkwa njọ n’omume nile,” aha ya kpọmkwem pụtakwara “Enweghị Uche; Onye Nzuzu.” Lee ihe na-akụda mmụọ ọ na-aghaghị ịbụ iso nwoke dị otú ahụ biri! Ma, Abigail nọgidere ‘na-enwe ezi uche,’ ọ daghịkwa mbà. N’ezie, okwu ya na omume ya bụ nke ezi uche dị na ha n’oge otu ọgba aghara nke na o mere ka Devid kweta na ọ gaghị akwụghachi Nebal ụgwọ maka mkparị na enweghị ekele ya site n’ịwụfu ọbara na enweghị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ.—1 Samuel 25:2-38.

Ọbụna ma à sị na ọnọdụ nke metụtara otu onye na-esonyere ọgbakọ ndị Kraịst na-akpatara anyị nkụda mmụọ, anyị pụrụ ịtachi obi n’ume nke Jehova na-enye. E gosipụtara nke a site n’eziokwu ahụ bụ na omume Diọtrefis nke pụrụ ịkpata nkụda mmụọ emeghị ka nwoke ahụ na-asọpụrụ Chineke bụ́ Gaiọs kwụsị ime ihe ọma, sikwa otú a na-aghọ mkpụrụ nke obi ụtọ na nkwụghachi ụgwọ ime mmụọ bara ụba.—Ọrụ 20:35; 3 Jọn 1-10.

Nkụda mmụọ pụrụ ịmalite ma ọ bụrụ na anyị enwee ọchịchọ ijere ndị kwere ekwe ibe anyị ozi n’ọgbakọ ma bụrụ ndị a na-echefu mgbe a na-ahọpụta ndị ọzọ dị ka ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi. Otú ọ dị, kama ikwere ka ndakpọ olileanya rikpuo anyị, ka anyị chọọ ụzọ isi gbaa onwe anyị ume n’ime mmụọ ma kwere ka mmụọ Chineke mịpụta mkpụrụ ọma ya n’ime anyị ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu karị. (Ndị Galetia 5:22, 23) N’ime 40 afọ ndị ahụ Mosis nọrọ na Midian, Chineke zụlitere n’ime ya ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu karị nke ịdị umeala n’obi, ndidi, na àgwà ndị ọzọ dị mkpa iji nagide ihe isi ike na nkụda mmụọ nile ọ ga-ezute dị ka onye ndú nke ụmụ Israel. N’otu aka ahụ, Jehova pụrụ ịdị na-akwadebe anyị maka ihe ùgwù ije ozi ọdịnihu nke anyị pụrụ inweta ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-adị ike n’ime mmụọ ma ghara ịdaba ná nkụda mmụọ.

Ihe Ngwọta Dịịrị Nkụda Mmụọ—N’isi Nso!

N’agbanyeghị ụdị nke ọ bụ, ọ̀ dị mgbe nkụda mmụọ anyị ga-akwụsị? Nye anyị, ọnọdụ anyị pụrụ iyi nke olileanya na-adịghị ma ọ dịghị otú ahụ nye Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke. Ọ dịghị enwe nkụda mmụọ. Site n’ọnụ onye amụma ahụ bụ́ Aịsaịa, Chineke kwuru, sị: “Otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe m zigara ya.” (Aịsaịa 55:11) Ebe ọ bụ na Jehova nwere ike na ikike ime ihe nile, ọ dịghị ihe na-agaghị ekwe ya omume. (Mak 10:27) Nkwa nile o kwere iweta ngọzi ndị na-adịghị agwụ agwụ nye ndị ya ga-emezurịrị.—Joshua 21:45.

Obi abụọ na ejighị n’aka bụ isi ihe na-akpata nkụda mmụọ. Otú ọ dị, n’ụzọ megidere nke ahụ, “okwukwe bụ ndabere nke ihe a na-ele anya.” (Ndị Hibru 11:1) Inwe okwukwe na Chineke na-enye ihe mgbakwasị ụkwụ nke na olileanya anyị nile dabeere na Bible ga-enwe mmezu zuru ezu. Isiokwu bụ isi nke Bible na-eme ka nkwa Jehova banyere ọchịchị Alaeze pụta ìhè, nke ụwa ga-anọ n’ime ya ghọọ paradaịs zuru okè bụ́ ebe ndị ezi omume ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ọṅụ. (Abụ Ọma 37:11, 29) Ajọ ihe ọ bụla—gụnyere nkụda mmụọ—agaghị adịkwa, n’ihi na Chineke ‘ga-emezu ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ.’—Abụ Ọma 145:16.

Ruo mgbe ngọzi ndị ahụ mezuru, anyị nile ga-enwe òkè anyị nke nkụda mmụọ. Ma olileanya dabeere n’Akwụkwọ nsọ pụrụ inye anyị obi ike na agbamume ịnọgidesi ike. Ezi ndụmọdụ ndị anyị na-achọta na Bible pụrụ igosi anyị ụzọ isi jiri ezi echiche na ezi uche mee ihe n’ụzọ ga-eme ka anyị guzosie ike ná ndụ anyị na-adị, wetakwara anyị udo nke obi. N’agbanyeghị ihe bụ ndakpọ olileanya anyị, anyị pụrụ inweta “udo nke Chineke, nke kachasị uche nile.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ya mere, agha a na-alụ megide nkụda mmụọ abụghị nke olileanya na-adịghị na ya. Site n’enyemaka Jehova, anyị pụrụ ịnagide ya n’oge a ma merie ya n’ọdịnihu.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 31]

Chineke pụrụ inyere gị aka ịnagide nkụda mmụọ, ọbụna dị ka o nyeere Job, Mosis, Abigail, na Pọl aka

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya