Ụdị Ndị Dị Aṅaa Ka Ị Na-egosi Amara?
“ACHỌRỌ M NWUNYE. Ọ ga-adị ọcha, gharakwa ibu ibu, onye gụsịrị akwụkwọ ma ọ bụ karịsịa onye baghachiri ịgụkwu akwụkwọ. Ọ ghaghị isite n’ezinụlọ dị mma nke nwere ihe. Onye agbụrụ m ga-akasị mma.”
OTÚ a ka e si dee otu mkpọsa alụmdi na nwunye yiri ibe ya nke ị pụrụ ịhụ n’ime akwụkwọ akụkọ n’India. Ma eleghị anya, ị pụrụ ịhụ ihe yiri nke ahụ n’ọtụtụ akụkụ ndị ọzọ nke ụwa. N’India, ọ na-abụkarị ndị mụrụ onye na-achọ ịlụ nwanyị na-ewepụta ihe ịrịba ama ahụ. Nzaghachi pụrụ ịgụnye foto nke nwa agbọghọ ma ákwà sari na-acha ọbara ọbara, yirikwa ọtụtụ ọlaedo. Ọ bụrụ na ezinụlọ nwa okorobịa ahụ anabata, a ga-amalite ikwu okwu ọlụlụ.
Ụkpụrụ Omume Ndị Zuru Ebe Nile
N’India, ọchịchọ a na-achọ nwunye dị ọcha zuru ebe nile. Nke a bụ n’ihi otu nkwenkwe gbara mkpọrọgwụ dị omimi nke na ndị a na-akpọ agbụrụ dị ala nke ndị Hindu nwere akpụkpọ ahụ dị oji. N’oge na-adịbeghị anya gara aga, otu ihe omume na telivishọn ndị India kọrọ otu akụkọ banyere ụmụ agbọghọ abụọ, otu dị ọcha, nke ọzọ dịkwa oji. Nwa agbọghọ ahụ nke dị ọcha nwere obi ọjọọ, na-akpakwa ajọ àgwà; nwa agbọghọ ahụ nke dị oji nwere obi ọma, dịkwa nro. Otu mmegharị majik weere ọnọdụ, nwa agbọghọ ahụ dị ọcha jiwere oji dị ka ahụhụ ọ natara, ebe nwa agbọghọ ahụ dị oji chawara ọcha dị ka nkwughachi ụgwọ. O doro anya na ihe mmụta omume dị n’akụkọ ahụ bụ na ọ bụ ezie na ịdị mma mesịrị nwee mmeri, akpụkpọ ahụ dị ọcha bụ nkwụghachi ụgwọ a na-achọsi ike.
Ọtụtụ mgbe mmetụta agbụrụ dị otú ahụ na-agba mkpọrọgwụ dị omimi karịa otú mmadụ chere. Dị ka ihe atụ, onye Esia pụrụ ije ná mba Ọdịda Anyanwụ Ụwa ma mee mkpesa na e mesoro ya omume na-adịghị mma n’ihi ụcha akpụkpọ ahụ ya ma ọ bụ anya ya gbara uhie. Omume ndị dị otú ahụ na-enye ya nsogbu n’obi, ọ na-enwe mmetụta nke ịbụ onye a na-emegbu. Ma mgbe ọ latara n’ala nna ya, ọ pụrụ imeso ndị si n’agbụrụ dị iche n’otu ụzọ ahụ. Ọbụna taa ụcha akpụkpọ ahụ na agbụrụ mmadụ si pụta na-ekere òkè bụ isi n’ụzọ ọtụtụ ndị si ele uru onye ọzọ bara anya.
“Ego na-azakwa ihe nile,” ka Eze Solomọn oge ochie dere. (Eklisiastis 10:19) Lee ka nke ahụ si bụrụ eziokwu! Akụ na ụba na-emetụtakwa ụzọ e si ele ndị mmadụ anya. Ụzọ e si kpata akụ abụghị ihe a na-ajụkarị ase ya. Mmadụ ọ̀ bawo ọgaranya n’ihi ịrụsi ọrụ ike ma ọ bụ ijizi ihe nke ọma ma ọ bụ emeghị ihe n’eziokwu? Nke ahụ adịchaghị mkpa. Akụ, ma è nwetara ya n’ụzọ ọjọọ ma ọ bụ na e nwetaghị, na-eduga ọtụtụ n’ịchọ amara uru efu n’ebe onye ahụ nwere akụ nọ.
E debewokwa agụmakwụkwọ dị elu n’ọkwá dị elu n’ime ụwa nke a e nwere ịsọ mpi. Ozugbo a mụpụtara nwatakịrị, a na-agba ndị mụrụ ya ume idokọ ego buru ibu maka agụmakwụkwọ. Ka ọ na-eru afọ abụọ ma ọ bụ atọ, ha na-enwe nchegbu banyere inwetara ya ezigbo ụlọ akwụkwọ nọzịrị ma ọ bụ ọta akara dị ka nzọụkwụ mbụ n’ogologo njem ahụ na-eduga n’akara ugo mmụta mahadum. O yiri ka ụfọdụ na-eche na diplọma dị ùgwù na-eme ka e nwee ikike inweta amara na nkwanye ùgwù site n’aka ndị ọzọ.
Ee, ụcha akpụkpọ ahụ, agụmakwụkwọ, ego, agbụrụ mmadụ si pụta—ndị a aghọwo ụkpụrụ ndị ọtụtụ ndị ji atụle ma ọ bụ, kama nke ahụ, ekpebi ihe onye ọzọ bụ. Ndị a bụ isi ihe na-ekpebi onye ha na-egosi amara nakwa onye ha na-agaghị egosi ya. Gịnị banyere gị? Ònye ka ị na-egosi amara? Ị̀ na-eche na onye nwere ego, akpụkpọ ahụ dị ọcha, ma ọ bụ agụmakwụkwọ dị elu ruru eru karị inweta amara na nkwanye ùgwù? Ya bụrụ otú ahụ, ọ dị mkpa ka ị tụlee nke ọma ihe ndabere nke mmetụta gị.
Ndị A Hà Bụ Ụkpụrụ Ndị Dị Mma?
Akwụkwọ bụ́ Hindu World na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla nọ n’agbụrụ dị ala nke gburu onye brāhmin pụrụ ịbụ onye e mekpara ahụ ruo mgbe ọ nwụrụ na onye a kwakọọrọ ihe onwunwe ya, a makwara mkpụrụ obi ya ikpe ruo mgbe ebighị ebi. Onye brāhmin nke gburu onye ọzọ pụrụ ịbụ onye e riri nanị nhà, a dịghịkwa ama ya ikpe ọnwụ.” Ọ bụ ezie na akwụkwọ ahụ na-ekwu banyere oge ochie, gịnị banyere taa? Ịkpọasị agbụrụ na ọgba aghara ógbè emewo ka ọbara na-asọ ka osimiri ọbụna na narị afọ nke 20. Ọ bụghịkwa nanị n’India ka nke a meworo. Ịkpọasị na ime ihe ike nke ịkpa ókè agbụrụ meworo ka ọ dịgide na South Africa, ịkpọasị agbụrụ na United States, ịkpọasị ịhụ mba n’anya ná mba ndị dị na Baltic—ndepụta ahụ adịghị agwụ agwụ—bụcha ihe ndị mmetụta e ji mụọ mmadụ nke ịka ndị ọzọ kpatara. N’ezie, ngosi dị otú ahụ a na-egosi otu onye amara megide onye ọzọ n’ihi agbụrụ ma ọ bụ mba amịpụtabeghị mkpụrụ ndị dị mma, nke udo.
Olee banyere akụ na ụba? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ ndị na-aba ọgaranya site n’ime ihe n’eziokwu, ịrụsi ọrụ ike. Otú ọ dị, akụ buru ibu abụwo nke ndị omekome na-eme mpụ, ndị na-azụ ahịa iwu, ndị na-ebugharị ọgwụ ọjọọ, ndị na-ere ngwá agha megidere iwu, na ndị ọzọ kpatara. N’eziokwu, ụfọdụ n’ime ndị a na-enye ndị nọ n’ọnọdụ imere ebere onyinye ma ọ bụ na-akwado atụmatụ dị iche iche iji nyere ndị ogbenye aka. Otú o sina dị, omume ime mpụ ha ewetawo ọtụtụ ntaramahụhụ na nhụjuanya nye ndị ha wakwasịrị. Ọbụna ndị na-eme ụmụ obere mpụ, dị ka ndị na-ana aka azụ ma ọ bụ na-ekere òkè n’omume azụmahịa a na-enyo enyo, akpatawo nkụda mmụọ, mmerụ ahụ, na ọnwụ mgbe ngwá ahịa ma ọ bụ ije ozi ha mebiri ma ghara ịrụ ọrụ. N’ezie, inwe akụ na ụba n’onwe ya abụghị ihe ndabere maka ịnakwere mmadụ nke ọma.
Mgbe ahụ, gịnị banyere agụmakwụkwọ? Ndepụta toro ogologo nke akara ugo mmụta na utu aha ndị e denyere n’aha mmadụ hà bụ ihe mgbakwasị ụkwụ na ọ na-eme ihe n’eziokwu ma bụrụ onye ziri ezi? Ọ̀ pụtara na e kwesịrị iji amara na-ele ya anya? N’ezie, agụmakwụkwọ pụrụ ime ka ihe ọmụma mmadụ saa mbara, ọtụtụ ndị jiwokwara ihe ha gụtara n’akwụkwọ mee ihe iji baara ndị ọzọ uru kwesịrị inweta nsọpụrụ na nkwanye ùgwù. Ma akụkọ ihe mere eme jupụtara n’ọtụtụ ihe atụ nke nrigbu na mmegbu nke ndị gụrụ akwụkwọ meworo ọha na eze. Tụleekwa ihe na-eme n’ụlọ akwụkwọ kọleji na mahadum n’oge a. Ogige ụlọ akwụkwọ jupụtara ná nsogbu nke ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ọrịa ndị a na-ebute ná mmekọahụ, ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na-edebanye aha ha nanị iji chụsoo ego, ike, na aha. Nanị agụmakwụkwọ mmadụ abụghị ihe a tụkwasịrị obi nke na-egosi otú àgwà ya dị n’ezie.
Ee e, ụcha akpụkpọ ahụ, agụmakwụkwọ, ego, agbụrụ mmadụ si pụta, ma ọ bụ isi ihe ndị ọzọ dị otú ahụ abụghị ihe ndabere dị mma nke e ji amata uru onye ọzọ bara. Ndị Kraịst ekwesịghị imikpu onwe ha n’ihe ndị a ná mgbalị iji nweta amara site n’aka ndị ọzọ. Mgbe ahụ, gịnị ka mmadụ kwesịrị ichegbu onwe ya banyere ya? Ụkpụrụ ndị dị aṅaa ka mmadụ kwesịrị iji na-eme ihe?