Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 12/1 p. 5-6
  • Ònye Nwere Amara Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Nwere Amara Chineke?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụkpụrụ Chineke Ndị Dị Elu Karị
  • Anyị Pụrụ Inweta Amara Chineke
  • Ụdị Ndị Dị Aṅaa Ka Ị Na-egosi Amara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Chineke Ọ̀ Na-emenyere Mba Ụfọdụ Karịa Ibe ha?
    Teta!—2005
  • Ị̀ Bụ “Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ọ̀ Bụ Iwu na Ndị Kraịst Ga-adarịrị Ogbenye?
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 12/1 p. 5-6

Ònye Nwere Amara Chineke?

ANYỊ nile chọrọ ka ndị anyị na ha na-akpakọrịta nwee mmasị n’ebe anyị nọ. Nye onye Kraịst ọchịchọ dị ike karị bụ inwe amara Chineke. Banyere Jehova Chineke, e kwuru n’Abụ Ọma 84:11, sị: “Amara na nsọpụrụ ka Jehova ga-enye: ọ gaghị egbochi ezi ihe n’ebe ndị na-ejegharị n’izu okè nọ.” N’oge a mụrụ Jisọs, mkpu ọṅụ ahụ ndị mmụọ ozi nke eluigwe tiri kwere nkwa “udo n’elu ụwa maka mmadụ ndị ọ na-egosi amara!”—Luk 2:14, Moffatt.

Ma ònye ka Chineke na-egosi amara? Ụkpụrụ Chineke hà bụ otu ihe ahụ dị ka nke mmadụ? N’ụzọ kwere nghọta, ha abụghị, dị ka e gosipụtara site n’ihe anyị tụlere n’isiokwu bu ụzọ. N’ezie, ebe ọ bụ na e nyere ndị Kraịst ndụmọdụ ‘ịbụ ndị na-eṅomi Chineke,’ ọ pụrụ ịdị mma ka onye ọ bụla n’ime anyị jụọ, sị, Àna m egosi amara nye ndị Chineke na-egosi amara, ka àna m enwe ọchịchọ ịgbaso ụkpụrụ ndị ụwa n’ụzọ m si ele ndị mmadụ anya? (Ndị Efesọs 5:1) Iji nweta amara na nnwapụta Jehova, anyị aghaghị ilezi anya ile ihe anya n’ụzọ o si ele ihe anya.

Ụkpụrụ Chineke Ndị Dị Elu Karị

“Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu,” ka Pita onyeozi kwuru, “kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye ọ na-anara nke ọma.” Ọzọkwa, Pọl onyeozi gbara àmà na Chineke ‘sitere n’otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ.’ (Ọrụ 10:34, 35; 17:26) Ya mere, ọ bụ nanị ihe ezi uche dị na ya ikwubi na mmadụ nile hà nhata n’ihu Chineke n’agbanyeghị ihe bụ ọdịdị elu ahụ ha. Ebe ọ dị otú ahụ, ọ gaghị ekwesị ekwesị onye Kraịst imere mmadụ amara na-erughịrị ya nanị n’ihi na onye ahụ sitere kpọmkwem n’otu ebe ma ọ bụ n’otu ụcha akpụkpọ ahụ ma ọ bụ site n’agbụrụ ọzọ. Kama nke ahụ, ọ ga-eme nke ọma ịgbaso Onye Nlere-anya ya, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ́ onye ọbụna ndị iro kwetara na o leghị mmadụ anya n’ihu.—Matiu 22:16.

Mgbe ụfọdụ a na-eji okwu ahụ bụ “elu ahụ” eme ihe ịkọwa ihe na-emighị emi ma ọ bụ na-adịghị mkpa. Ụcha akpụkpọ ahụ bụ nnọọ nke ahụ; ọ bụ nanị n’elu ahụ. Ụcha akpụkpọ ahụ mmadụ adịghị egosipụta n’ụzọ ọ bụla ọdịdị ya ma ọ bụ àgwà ya ndị dị n’ime. Mgbe a bịara n’ihe metụtara ịhọrọ ndị anyị ga-eso na-akpakọrịta, na-erikọ nri, ma ọ bụ na-ekwe n’aka, n’ezie anyị ekwesịghị ile anya karịsịa n’ụcha akpụkpọ ahụ. Cheta, nwa agbọghọ ahụ nke kpaliri ụfọdụ n’ime abụ ịhụnanya ndị kasị maa mma e deworo mgbe ọ bụla kwuru banyere onwe ya, sị: “Onye ojii ka m bụ, ma amara m mma, . . . mụ onwe m na-eji nji, n’ihi na anyanwụ achawo m.” (Abụ nke Abụ 1:5, 6) Ma agbụrụ ma ụcha enweghị nke bụ ihe ndabere ziri ezi maka igosi amara. Ihe dị mkpa karị bụ ma mmadụ ọ̀ na-atụ egwu Chineke ma na-arụ ọrụ ezi omume.

Olee ihe bụ uche Chineke banyere inwe akụ ihe onwunwe? N’ime ndị nile Chineke hụrụ n’anya ma na-egosi amara, Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ onye nke mbụ. Ma, mgbe ọ nọ n’elu ụwa, Jisọs “enweghị ebe ịtọgbọ isi ya.” (Matiu 8:20) O nweghị ala, ụlọ, ubi, osisi ndị na-amị mkpụrụ, ma ọ bụ ụmụ anụmanụ. Ma, Jehova nyere ya nsọpụrụ ma bulie ya elu gaa n’ọnọdụ kachasị nke onye ọ bụla ọzọ nọ n’eluigwe na ala ma e wezụga Chineke n’onwe ya.—Ndị Filipaị 2:9.

Jisọs Kraịst nwetara amara Chineke n’ihi na ọ bara ọgaranya, ọ bụghị n’akụ ihe onwunwe, kama n’ọrụ ọma. (Tụlee 1 Timoti 6:17, 18.) O nyere ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ, sị: “Unu akpadola akụ n’ụwa nye onwe unu, ebe nla na nchara na-erichapụ, ebe ndị ohi na-egwupukwa na-ezukwa ohi: kama kpadoonụ akụ n’eluigwe nye onwe unu, ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ, ebe ndị ohi na-adịghị egwupukwa, ha adịghị ezukwa ohi.” (Matiu 6:19, 20) Otú a, kama igosi amara nye nanị ndị ahụ bara ọgaranya n’akụ nke ụwa a, ndị Kraịst agaghị akpa ókè ọ bụla n’ihe ndabere nke ihe onwunwe ndị ụwa. Ha ga-achọ ndị ahụ bara ọgaranya n’ebe Chineke nọ n’agbanyeghị ma hà bụ ndị ọgaranya ma ọ bụ ndị ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe. Echezọla na “Chineke [họpụtara] ndị bụ ogbenye n’ihe nke ụwa ka ha bụrụ ndị ọgaranya n’okwukwe, bụrụkwa ndị nketa nke alaeze ahụ.” (Jemes 2:5) Ọ bụrụ na ị nọgide na-enwe echiche Chineke, ị gaghị adaba n’ọnyà nke omume ahụ zuru ebe nile nke ịchọ amara nke ndị bara ọgaranya n’ihe onwunwe.

Banyere agụmakwụkwọ, Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na Chineke na-agba anyị ume ịchọ ihe ọmụma na amamihe, na Jisọs Kraịst bụkwa onye ozizi kasị ukwuu nke biworo n’elu ụwa. (Ilu 4:7; Matiu 7:29; Jọn 7:46) Ma ọ bụghị amamihe ma ọ bụ agụmakwụkwọ ụwa ka e ji achọta amara Chineke. N’ụzọ megidere nke ahụ, Pọl na-agwa anyị na “ọ dịghị ọtụtụ ndị maara ihe dị ka anụ ahụ si mara ihe, . . . ka a kpọrọ: kama ọ bụ ihe nzuzu nke ụwa ka Chineke họpụtara, ka o wee mee ka ihere mee ndị maara ihe.”—1 Ndị Kọrint 1:26, 27.

Chineke na-egosi ndị ahụ amara, bụ́ ndị e nyere ọzụzụ nke ọma, ọ bụghị n’isiokwu ụwa ndị a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ ndị dị elu, kama ‘n’asụsụ dị ọcha’ nke eziokwu dị ka a na-achọta n’Okwu ya, bụ́ Bible. (Zefanaịa 3:9) N’ezie, Jehova n’onwe ya na-akụziri ndị ya ihe taa site n’ihe omume nkụzi nke na-agbasa ruo ná nsọtụ dị anya nke ụwa. Dị ka e buru ya n’amụma site n’ọnụ onye amụma bụ́ Aịsaịa, ndị sitere ná mba nile na-azaghachi site n’ikwu, sị: “Ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruo ụlọ Chineke nke Jekọb; ọ ga-ezikwa anyị ụzọ ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ ya nile.” Ya mere, kama ịdị na-eto agụmakwụkwọ ụwa, ndị Kraịst ga-achọ ndị ahụ gosipụtaworo site n’okwu na omume ha na ha bụ n’ezie “ndị mmụta Jehova.” Site n’ime otú ahụ, ha ga-enwe ‘udo bara ụba’ nke Chineke na-enye.—Aịsaịa 2:3; 54:13.

Anyị Pụrụ Inweta Amara Chineke

Ee, ụkpụrụ Chineke maka igosi ndị ọzọ amara dị iche n’ebe ndị nke mmadụ dị. Otú o sina dị, anyị aghaghị ịgba mbọ ịbụ ndị a na-eduzi site n’ụzọ ya nile ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta amara n’anya ya. Nke ahụ pụtara na anyị aghaghị ịmụta ile ndị ọzọ anya site n’ụzọ Chineke si ele ihe anya, ọ bụghị site n’ụkpụrụ nile nke mmadụ, ndị ọ pụrụ ịbụ na e metọrọ site n’ịchọ ọdịmma onwe onye na ịkpọasị. Olee ụzọ a pụrụ isi mee nke ahụ?

Jehova Chineke na-enyocha obi mmadụ ma na-egosi amara nye ndị ahụ na-egosipụta àgwà ndị dị ka ịhụnanya, ịdị mma, obi ọma, na ogologo ntachi obi. Anyị kwesịrị ime otú ahu. (1 Samuel 16:7; Ndị Galetia 5:22, 23) Ọ dị mkpa ka anyị lee anya ná mmadụ ime ahụ, ruo ókè anyị bụ́ ụmụ mmadụ pụrụ, ọ bụghịkwa n’ụcha akpụkpọ ahụ ya ma ọ bụ n’agbụrụ o si pụta. Kama ịchọ ndị ahụ bara ọgaranya n’ihe onwunwe, anyị ga-eme nke ọma iburu n’uche ihe bụ echiche Chineke na ịgbalịsi ike ‘ịbụ ndị ọgaranya n’ọrụ ọma, ime ka ndị ọzọ keta ihe anyị nwere, na ikwere ka ndị ọzọ soro anyi nwekọọ ihe.’ (1 Timoti 6:18) Iji nweta amara Chineke, anyị aghaghị ịnọgide na-achọ ezi ihe ọmụma banyere Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, na-aghọ ndị e nyere ọzụzụ nke ọma n’asụsụ ahụ dị ọcha nke eziokwu. (Jọn 17:3, 17) N’ime otú ahụ, anyị onwe anyị ga-esokwa ná ndị Chineke na-egosi amara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya