Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 1/1 p. 3-5
  • Onye Okike Anyị Dị Ebube Na Ọrụ Ya Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Okike Anyị Dị Ebube Na Ọrụ Ya Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nkàọrụ Okike Kasị Mma nke Chineke
  • Ebere Onye Okike Anyị
  • Nye Eze nke Mgbe Ebighị Ebi Otuto!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Jehova Chineke Hụrụ Anyị n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 1/1 p. 3-5

Onye Okike Anyị Dị Ebube Na Ọrụ Ya Nile

LEE ka ha si dị ebube! Mmiri ji oké ike si n’elu na-awụdata n’Iguaçú ma ọ bụ na Niagara, nnukwute ndagwurugwu ndị nke Arizona ma ọ bụ Hawaii, osimiri ndị dị n’etiti ugwu nke Norway ma ọ bụ New Zealand​—⁠lee ka ihe ebube ndị a sitere n’okike si kwesị ịgba nkiri! Ma hà bụ nanị ihe mpụta mberede nke ihe a na-akpọ Nne nke Okike? Ee e, ha karịrị nnọọ nke ahụ! Ha bụ oké ọrụ ndị na-atụ n’anya nke Onye Okike Dị Ebube, Nna eluigwe nke na-ahụ n’anya nke Eze Solomọn nwere amamihe dere banyere ya, si: “Ihe nile ọ bụla ka o meworo ka ọ maa mma na mgbe ya: ọzọ, mgbe ebighị ebi ka o tinyeworo n’obi ha, ma ka o si tinye ya mmadụ agaghị achọpụta ọrụ ahụ nke Chineke lụworo site ná mmalite wee ruo nsọtụ.” (Eklisiastis 3:11) N’eziokwu, ọ ga-ewe ụmụ mmadụ oge ruru mgbe ebighị ebi iji chọpụta ọrụ ebube nile Onye Okike anyị jiworo mejupụtara eluigwe na ala nile.

Lee aha Onye Okike Dị Ebube anyị nwere! Leekwa ka anyị si nwee obi ụtọ na Chineke nke a nwere ike ime ihe nile ‘agwawo anyị okwu n’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a n’ime Ọkpara, onye o doro onye nketa nke ihe nile, onye o sitekwara n’aka ya mee ụwa nile.’ (Ndị Hibru 1:2) Ọkpara nke a, bụ́ Jisọs Kraịst, jiri ọmarịcha ihe ndị Nna ya kere kpọrọ ihe. O zoro aka na ha mgbe mgbe n’inye ihe atụ nzube dị iche iche nke Nna ya na n’ịgwa ndị na-ege ya ntị okwu agbamume. (Matiu 6:​28-⁠30; Jọn 4:​35, 36) Ọtụtụ ejiwo “okwukwe” ghọta na “e werewo okwu Chineke dozie” ihe ijuanya nile dị n’okike. (Ndị Hibru 11:3) Ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị kwesịrị igosipụta okwukwe dị otú ahụ.​—⁠Jemes 2:​14, 26.

Ihe okike nile nke Chineke anyị dị ebube n’ezie. Ha na-egosipụta n’ụzọ dị ebube amamihe ya, ike ya, ezi omume ya, na ịhụnanya ya. Dị ka ihe atụ, Ọ kwachatụrụ ụwa anyị ma mee ka ọ na-agba anyanwụ gburugburu, ka ihe ọ ga-eke n’ọdịnihu, bụ́ mmadụ, nwee ike ịnụ ụtọ nke usoro oge ihu igwe dị iche iche ndị na-enye obi ụtọ. Chineke sịrị: “Ruo ụbọchị nile nke ụwa, ọghịgha mkpụrụ na owuwe ihe ubi, na oyi na okpomọkụ, na udu mmiri na ọkọchị, na ehihie na abalị, agaghị ebi.” (Jenesis 8:22) Ọzọkwa, Chineke ji mmesapụ aka kwajuo akụ ndị a na-egwute n’ala n’ụwa anyị. Karịsịa, ọ kwadebere ụba nke mmiri, nke ga-emesịa bụrụ ihe bụ isi mejupụtara ihe nile dị ndụ n’ala akọrọ, na-akwadokwa ha.

N’ụzọ dị n’usoro nke ‘ụbọchị okike ihe’ isii, nke ọ bụla ọtụtụ puku afọ n’ogologo, “ike ọrụ Chineke” gara n’ihu ịkwadebe ụwa maka mmadụ ibi na ya. Ìhè nke anyị ji ahụ ụzọ, ikuku anyị na-ekuru, ala akọrọ anyị bi n’elu ya, ihe ọkụkụ, usoro nke anyasị na ehihie, azụ, nnụnụ, anụmanụ dị iche iche​—⁠Onye Okike anyị Dị Ebube wepụtara ha n’usoro ka ha baara mmadụ uru, nyekwa ya ọṅụ. (Jenesis 1:​2-⁠25) N’ezie anyị pụrụ isonyere onye ọbụ abụ ahụ n’iti mkpu, sị: “Lee ka ọrụ gị nile si baa ụba nke ukwuu, Jehova! N’amamihe ka i meworo ha nile: ụwa jupụtara n’ihe i nwetara.”​—⁠Abụ Ọma 104:24.

Nkàọrụ Okike Kasị Mma nke Chineke

Ka “ụbọchị” okike nke isii na-eru ngwụsị ya nso, Chineke mere nwoke na onye ibe ya na-enyere ya aka, bụ́ nwanyị. Lee aha ọrụ nkà o ji weta okike ihe elu ala ya ná njedebe, nke dị ebube nke ukwuu karịa ihe nile e kere eke a na-ahụ anya ndị bu ya ụzọ! Abụ Ọma 115:16 na-eme ka anyị mara na: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova nwere; ma ụwa ka o nyeworo ụmụ mmadụ.” N’ihi ya, Jehova haziri anyị bụ́ mkpụrụ obi bụ́ mmadụ ka anyị wee nwee ike ịnụ ụtọ na iji ihe ndị o kere n’elu ụwa mee ihe. Lee ka anyị kwesịrị isi nwee ekele maka anya anyị​—⁠dị mgbagwoju anya karịa kamera kasị mma⁠—​nke pụrụ ịhụ ụwa dị anyị gburugburu nke jupụtara n’ụcha dị iche iche! Anyị nwere ntị anyị​—⁠makarịrị ígwè okwu ọ bụla mmadụ mere​—⁠iji nyere anyị aka inwe mkparịta ụka, igere egwú, na abụ ndụ na-atọ ụtọ nke nnụnụ dị iche iche. Anyị nwere usoro ikwu okwu e wunyere anyị n’ime, gụnyere ire ahụ pụrụ ime ọtụtụ ihe. Akụkụ ire ndị na-ahụ maka ịnụ ụtọ, tinyere ike nke ịnụ ísìsì, na-enye aka iji obi ụtọ na-eri ụdị nri dị iche iche na-adịghị agwụ agwụ. Leekwa ka anyị si enwe mmasị ná mbitụ aka ịhụnanya! N’ezie anyị pụrụ ikele Onye Okike anyị, dị ka ọbụ abụ ahụ mere, bụ́ onye sịrị: “M ga-ekele gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ gị nile dị; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma.”​—⁠Abụ Ọma 139:14.

Ebere Onye Okike Anyị

Onye ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Keleenụ Jehova; n’ihi na ọ dị mma: . . . Onye nanị ya na-arụ oké ọrụ dị iche iche: n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka ebere ya dị.” (Abụ Ọma 136:​1-⁠4) Ebere ahụ na-akpali ya ugbu a ịrụ ọrụ ndị bụ oké ọrụ karịa ihe okike nile anyị ka tụlesịrị. Ee, ọbụna ka ọ na-ezu ike site n’okike ihe ndị a na-ahụ anya, ọ na-eke ihe n’ọnọdụ ime mmụọ. Nke a ka ọ na-eme ná nzaghachi nye ịma aka obi ọjọọ nke a mara ya n’atụghị egwu. N’ụzọ dị aṅaa?

E tinyere nwoke na nwanyị mbụ na paradaịs dị ebube, bụ́ Iden. Otú ọ dị, otu mmụọ ozi na-enupụ isi, bụ́ Setan, guzobere onwe ya dị ka chi ma duba mmadụ abụọ ahụ ná nnupụisi megide Jehova. N’ụzọ ikpe ziri ezi, Chineke mara ha ikpe ọnwụ, nke kpatara na a mụpụtawo ụmụ ha, bụ́ agbụrụ mmadụ dum, n’ọnọdụ mmehie, nke ịnwụ anwụ. (Abụ Ọma 51:5) Ihe ndekọ Bible banyere Job na-egosipụta na Setan mara Chineke aka, na-azọrọ na ọ dịghị onye pụrụ iguzosi ike n’ezi ihe nye Ya n’okpuru ule. Ma Job nwapụtara na Setan bụ ajọ onye ụgha, dị ka ọtụtụ ndị ọzọ ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi n’oge Bible na ruo ụbọchị anyị meworo. (Job 1:7-⁠12; 2:2-⁠5, 9, 10; 27:5) Jisọs, dị ka nwoke zuru okè, gosiri ihe nlereanya nke iguzosi ike n’ezi ihe n’enweghị ntụpọ ọ bụla.​—⁠1 Pita 2:​21-⁠23.

Otú a, Jisọs pụrụ ikwu, sị, “Onyeisi nke ụwa nke a [Setan] adịghị ihe o nwere n’ime m.” (Jọn 14:30) Ma, ruo taa “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ebe ọ rụworo izi ezi nke ọkaaka Jehova ụka, e nyewo Setan ihe dị ka 6,000 afọ iji gosipụta ma ịbụisi nke ya n’isi ihe a kpọrọ mmadụ ọ̀ ga-enwe ihe ịga nke ọma. Lee ka o siworo daa ajọ ọdịda, dị ka ọnọdụ ụwa ndị na-akawanye njọ nọgidere na-agba akaebe! Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, ga-ewepụ usoro ihe a nke ụwa rụrụ arụ, na-eguzobe ọkaaka ya ziri ezi n’elu ụwa. Lee ihe ntụrụndụ obi ụtọ nke ahụ ga-ewetara ụmụ mmadụ na-achọsi ịchịisi nke udo, nke ezi omume, ike!​—⁠Abụ Ọma 37:9-⁠11; 83:17, 18.

Otú ọ dị, ọ gwụbeghị! A ka ga-egosipụtakwa ebere Chineke n’ihe ndabere nke okwu Jisọs ndị dị na Jọn 3:16: “Chineke hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Mweghachi nke a a ga-eweghachiri ihe a kpọrọ mmadụ olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ụwa gụnyere ike ihe ndị ọhụrụ. Gịnị bụ ihe ndị a? Olee otú ha si abara ụmụ mmadụ na-asụ ude uru? Isiokwu anyị na-esonụ ga-akọwa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya