Nye Eze nke Mgbe Ebighị Ebi Otuto!
“Jehova bụ Eze ruo mgbe nile ebighị ebi.”—ABỤ ỌMA 10:16.
1. Ajụjụ dịgasị aṅaa na-ebilite banyere mgbe ebighị ebi?
MGBE ebighị ebi—gịnị ka ị ga-asị na ọ bụ? Ì chere na oge pụrụ n’ezie ịga n’ihu ruo ebighị ebi? N’ezie, ihe ịrụ ụka adịghị ya na oge na-agbatịpụ ruo ebighị ebi laa azụ n’oge gara aga. Ya mere gịnị mere na ọ gaghị agbatịpụ ruo ebighị ebi gaa n’ọdịnihu? N’ezie, nsụgharị Bible nke New World Translation na-ezo aka n’ebe Chineke nọ dị ka onye a na-enye otuto “site na mgbe ebighị ebi ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 41:13) Gịnị ka okwu a pụtara? A pụrụ inyere anyị aka ịghọta ya ma ọ bụrụ na anyị ezoo aka n’isiokwu yiri ya—mbara igwe.
2, 3. (a) Olee ajụjụ ndị metụtara mbara igwe, na-enyere anyị aka ịghọta mgbe ebighị ebi? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chọọ ife Eze nke mgbe ebighị ebi ofufe?
2 Ruo ókè hà aṅaa ka mbara igwe bururu n’ibu? Ò nwere nsọtụ ọ bụla? Ruokwa 400 afọ gara aga, e chere na ụwa anyị bụ etiti nke eluigwe na ụwa. E mesịa Galileo rụpụtara ígwè telescope, na-eme ka a hụ eluigwe n’ụzọ buru ibu karị. Ugbu a Galileo pụrụ ịhụkwu ọtụtụ kpakpando, ọ pụkwara igosi na ụwa na mbara ụwa ndị ọzọ na-agba anyanwụ gburugburu. Milky Way adịkwaghị acha otú e si chee ya. Ọ bụ ụyọkọ kpakpando, ihe dị ka otu narị ijeri n’ọnụ ọgụgụ. Anyị apụghị ịgụ kpakpando hà otú ahụ ọnụ ma ọlị, ọbụna n’oge ndụ nile. Ka oge na-aga, ndị na-enyocha mbara igwe gara n’ihu ịchọpụta ebe ọtụtụ ijeri nke ụyọkọ kpakpando dịcha. Ndị a gbasapụrụ n’ụzọ na-enweghị ọgwụgwụ n’ime mbara igwe, ruo n’ókè ígwè telescope ndị kasị ike pụrụ ịchọpụta. O yiri ka mbara igwe enweghị nsọtụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa mgbe ebighị ebi—o nweghị nsọtụ.
3 Echiche nke mgbe ebighị ebi yiri ka ọ karịrị nghọta nke ụbụrụ mmadụ anyị nke a kpaara ókè. Otú ọ dị, e nwere Onye ghọtazuru ya. Ọ pụrụ ịgụ, ee, ọbụnakwa kpọọ aha ọtụtụ ijeri kwuru ijeri nke kpakpando na-enweghị nsọtụ n’ime ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando ha! Onye a na-asị: “Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ Ònye kere ihe ndị a? ọ bụ Onye ahụ Nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka Ọ na-akpọ; site n’ịba ụba nke ike Ya, na n’ihi na O nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị. Ị́ maghị? ị́ nụghị? Chineke nke mgbe nile ka Jehova, Onye keworo nsọtụ nile nke ụwa, bụ; Ọ dịghị ada mbà, ike adịghị agwụkwa Ya; ọ dịghị ngwupụta a na-egwupụta nghọta Ya.” (Aịsaịa 40:26, 28) Lee Chineke dị ebube ọ bụ! N’ezie, ọ bụ Chineke nke anyị kwesịrị ịchọ ife ofufe!
“Eze Ruo Mgbe Nile Ebighị Ebi”
4. (a) Olee otú Devid si kwupụta ekele ya maka Eze nke mgbe ebighị ebi? (b) Gịnị ka otu n’ime ndị ọkà mmụta sayensị kasị ukwuu e nwere n’akụkọ ihe mere eme kwubiri banyere mmalite nke eluigwe na ala?
4 N’Abụ Ọma 10:16, Devid na-ekwu banyere Onye Okike, bụ́ Chineke, sị: “Jehova bụ Eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” Nakwa n’Abụ Ọma 29:10, ọ na-ekwughachi, sị: “Jehova wee nọdụ dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi.” Ee, Jehova bụ Eze nke mgbe nile! Ọzọkwa, Devid na-agba akaebe na Eze a e buliworo elu bụ Omenkà na Onye Mere ihe nile anyị na-ahụ na mbara igwe, na-ekwu n’Abụ Ọma 19:1, sị: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka Ya ka mbara eluigwe na-egosi.” Ihe dị ka 2,700 afọ n’ihu, onye ọkà mmụta sayensị a ma ama bụ́ Sir Isaac Newton kwupụtara nkweta o kwetara ihe Devid kwuru, na-ede, sị: “Usoro a kasị maa mma nke anyanwụ, mbara ụwa na comet pụrụ nanị ibilite site ná nzube na ọbụbụeze nke onye maara nke a na-akọ, nke dịkwa ike.”
5. Gịnị ka Aịsaịa na Pọl dere banyere Isi Iyi nke amamihe?
5 Lee otú o kwesịrị isi weda anyị ala ịmara na Eze Onyenwe anyị Jehova, bụ́ onye ọbụna “eluigwe na eluigwe nke eluigwe” sara mbara “agaghị anagide,” na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi! (1 Ndị Eze 8:27) Jehova, bụ́ onye a kọwara n’Aịsaịa 45:18 dị ka onye “Nke keworo eluigwe, . . . Onye kpụworo ụwa, mee ya,” bụ Isi Iyi nke amamihe nke karịrị nke ụbụrụ ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ pụrụ ịghọta. Jehova kwuru, dị ka e mere ka ọ pụta ìhè ná 1 Ndị Kọrint 1:19: “M ga-ala amamihe nke ndị maara ihe n’iyi, M ga-ajụkwa nghọta nke ndị nwere nghọta.” Pọl onyeozi gbakwụnyere ihe na nke a n’amaokwu nke 20, sị: “Olee ebe onye maara ihe nọ? olee ebe odeakwụkwọ nọ? olee ebe onye oge a, onye ya na ibe ya na-ajụrịta ajụjụ, nọ? Chineke [ó] meghị ka amamihe ụwa bụrụ ihe nzuzu?” Ee, dị ka Pọl gara n’ihu ikwu, n’isi nke 3, amaokwu nke 19, “amamihe nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.”
6. Gịnị ka Eklisiastis 3:11 na-egosi banyere “mgbe ebighị ebi”?
6 Ihe ndị dị n’eluigwe bụ akụkụ nke ihe ndị e kere eke nke Eze Solomọn zoro aka na ha, sị: “Ihe nile ọ bụla ka [Chineke] meworo ka ọ maa mma na mgbe ya: ọzọ, mgbe ebighị ebi ka O tinyeworo n’obi ha, ma ka O si tinye ya mmadụ agaghị achọpụta ọrụ ahụ nke Chineke rụworo site ná mmalite wee ruo ná nsọtụ.” (Eklisiastis 3:11) N’ezie, a kụnyere ya n’ime obi mmadụ ịgbalị ịchọpụta ihe “mgbe ebighị ebi” pụtara. Ma ọ̀ dị mgbe ọ pụrụ inweta ụdị ihe ọmụma ahụ?
Olileanya Magburu Onwe Ya nke Ndụ
7, 8. (a) Olee olileanya magburu onwe ya nke ndụ nke dị n’ihu ihe a kpọrọ mmadụ, oleekwa otú a pụrụ isi nweta ya? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji ṅụrịa ọṅụ na izi ihe Chineke ga-aga n’ihu ruo mgbe nile ebighị ebi?
7 Jisọs Kraịst gwara Jehova n’ekpere, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Olee otú anyị pụrụ isi nweta ụdị ihe ọmụma ahụ? Ọ dị anyị mkpa ịmụ Okwu Chineke, bụ́ Bible Nsọ. Anyị pụrụ isi otú a nweta ezi ihe ọmụma banyere nzube nile dị ebube nke Chineke, tinyere ndokwa ahụ e mere site n’Ọkpara ya maka ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Nke ahụ ga-abụ “ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie” nke e zoro aka na ya na 1 Timoti 6:19. Ọ ga-ekwekọ n’ihe Ndị Efesọs 3:11 na-akọwa dị ka ‘izu nke mgbe nile ebighị ebi nke Chineke zubere n’ime Kraịst anyị, bụ́ Jisọs Onyenwe anyị.’
8 Ee, anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-eme mmehie pụrụ inweta ndụ ebighị ebi site n’izi ihe Chineke na okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs. Ruo oge hà aṅaa ka izi ihe a ga-anọgide? Ọ ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi ka e ji nwayọọ nwayọọ na-ezi ihe a kpọrọ mmadụ ihe n’amamihe nke Onye Okike anyị. Amamihe Jehova enweghị nsọtụ. N’ịghọta nke a, Pọl onyeozi tiri mkpu, sị: “Aa! omimi nke akụ̀ nke amamihe na nke ihe ọmụma kwa nke Chineke! lee otú a na-enweghị ike ịchọpụta ikpe Ya nile, otú a na-enweghịkwa ike ịtụpụta ụzọ Ya nile!” (Ndị Rom 11:33) N’ezie, o kwesịrị ekwesị na 1 Timoti 1:17 kpọrọ Jehova ‘Eze nke mgbe ebighị ebi’!
Amamihe Nkepụta Ihe nke Jehova
9, 10. (a) Olee ọrụ ndị dị ebube Jehova rụzuru n’ịkwadebe ụwa dị ka onyinye ya nye ihe a kpọrọ mmadụ? (b) Olee otú e si gosipụta amamihe kasị elu nke Jehova n’ihe ndị o kere? (Lee igbe.)
9 Tụlee ihe nketa magburu onwe ya nke Eze nke mgbe ebighị ebi nyeworo anyị bụ́ mmadụ. Abụ Ọma 115:16 na-agwa anyị, sị: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova nwere; ma ụwa ka O nyeworo ụmụ mmadụ.” Í cheghị na nke ahụ bụ ihe magburu onwe ya e nyefere anyị n’aka ilekọta? Kpọmkwem! Leekwa otú anyị si jiri nlepụanya pụrụ iche nke Onye Okike anyị n’ịkwadebe ụwa dị ka ebe obibi kpọrọ oké ihe!—Abụ Ọma 107:8.
10 Ihe omume ndị dị ebube weere ọnọdụ n’ụwa n’ime “ụbọchị” okike isii nke Jenesis isi nke 1, ụbọchị nke ọ bụla na-adịru ọtụtụ puku afọ. Ihe okike ndị a nke Chineke ga-emesịa n’ikpeazụ jiri kapet nke ahịhịa ndụ, oké ọhịa ndị mara mma, na okooko osisi ndị tụrụ àgwà mara mma kpuchie ụwa dum. Ọ ga-ejupụta n’ọtụtụ ìgwè ihe okike ndị ọhụrụ bi n’osimiri, ìgwè nnụnụ mara mma, na ụbara nke anụ ụlọ na anụ ọhịa, nke ọ bụla ọ na-amụpụta “dị ka ụdị ya si dị” (NW). Ka o nyesịrị nkọwa banyere okike nke nwoke na nwanyị, Jenesis 1:31 na-akọ, sị: “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.” Lee gburugburu ebe obibi mara mma nke gbara mmadụ mbụ ndị ahụ gburugburu! Ọ̀ bụ na anyị adịghị achọpụta amamihe, nlepụanya, na nlekọta nke Onye Okike na-ahụ n’anya n’ihe okike ndị a nile?—Aịsaịa 45:11, 12, 18.
11. Olee otú Solomọn si bulie amamihe nkepụta ihe nke Jehova elu?
11 Otu onye nke nwere ihe ijuanya n’amamihe nke Eze nke mgbe ebighị ebi ahụ bụ Solomọn. Ugboro ugboro ọ dọọrọ uche gaa n’amamihe nke Onye Okike. (Ilu 1:1, 2; 2:1, 6; 3:13-18) Solomọn na-emesi anyị obi ike na “ụwa na-eguzoru mgbe ebighị ebi.” Ọ ghọtara ebube nile nke okike, tinyere òkè nke urukpuru mmiri na-ekere n’imezi ụwa anyị. N’ihi ya, o dere, sị: “Osimiri nile na-erudaru oké osimiri, ma oké osimiri ejughị eju, ruo ebe osimiri na-eruda, ruo ebe ahụ ka osimiri ahụ na-erughachi ọzọ.” (Eklisiastis 1:4, 7) Otú a ka o si bụrụ na mgbe mmiri ozuzo na osimiri mezisịrị ụwa, a na-eweghachi mmiri ha site n’oké osimiri gaghachi n’ime urukpuru. Gịnị ka ụwa a ga-adị ka ya, oleekwa ihe ga-abụ ọnọdụ anyị ma ọ bụrụ na e nweghị usoro mweghachi a nke mmiri na usoro ime ka ọ dịghachi ọcha?
12, 13. Olee otú anyị pụrụ isi gosi ekele maka ihe okike Jehova?
12 Anyị kwesịrị iji ọrụ kwadoo ekele anyị maka nhazi dị n’okike, dị ka Eze Solomọn kwuru n’okwu mmechi nke Eklisiastis, sị: “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile. N’ihi na ọrụ ọ bụla ka Chineke ga-eme ka ọ baa n’ikpe, ya na ihe ọ bụla zoro ezo, ma ọ bụ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ.” (Eklisiastis 12:13, 14) Anyị kwesịrị ịtụ egwu ime ihe ọ bụla na-agaghị atọ Chineke ụtọ. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịchọ iji egwu nsọpụrụ rubere ya isi.
13 N’ezie, anyị kwesịrị ịchọ inye Eze nke mgbe ebighị ebi otuto maka ọrụ okike ya dị ebube! Abụ Ọma 104:24 na-ekwupụta, sị: “Lee ka ọrụ gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! N’amamihe ka I meworo ha nile: ụwa jupụtara n’ihe I nwetara.” N’ọṅụ, ka anyị nakwere amaokwu ikpeazụ nke abụ ọma a site n’ịgwa onwe anyị na ndị ọzọ, sị: “Gọzie Jehova, mkpụrụ obi m. Toonụ Ja.”
Ihe Okike Elu Ala nke Kasị Elu
14. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ihe okike Chineke nke bụ́ mmadụ si karịa anụmanụ n’ụzọ dị ukwuu?
14 Ihe okike nile nke Jehova bụ ọkpọka. Ma ihe okike kasị pụọ iche n’ụwa bụ anyị—ihe a kpọrọ mmadụ. Adam, e mesịa Iv, bụ ndị e kere dị ka ihe kachasịnụ n’ụbọchị okike nke isii nke Jehova—ihe okike nke karịrị azụ, nnụnụ, na anụmanụ n’ụzọ dị ukwuu! Ọ bụ ezie na ọtụtụ n’ime ihe ndị a maara ihe nke ukwuu, e nyere ihe a kpọrọ mmadụ ikike nke ịtụgharị uche, akọ na uche nke pụrụ ịma ọdịiche dị n’ezi ihe na ihe ọjọọ, ikike nke ime atụmatụ maka ọdịnihu, na ọchịchọ siri ike ife ofufe. Olee otú ihe a nile si mee? Kama isi n’anụ ọhịa na-amaghị ihe rịpụta, e kere mmadụ n’onyinyo Chineke. N’ihi ya, nanị mmadụ pụrụ igosipụta àgwà nke Onye Okike anyị, bụ́ onye kọwara onwe ya dị ka “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.”—Ọpụpụ 34:6.
15. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji jiri ịdị umeala n’obi too Jehova?
15 Ka anyị too ma kelee Jehova n’ihi ụzọ pụrụ iche o si mee ahụ anyị. Ọbara nke na-erugharị anyị n’ime ahụ, nke dị mkpa maka ndụ, na-agazu ahụ nile n’ime 60 sekọnd ọ bụla. Dị ka Deuterọnọmi 12:23 na-ekwu, “ọbara bụ ndụ”—ndụ anyị—nke dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke. Ọkpụkpụ ndị siri ike, uru ahụ ndị dị nro, na usoro nzirịta ozi nke ụbụrụ na akwara nke na-azaghachi ngwa ngwa bụ ndị e ji ụbụrụ karịrị ụbụrụ nke anụmanụ ọ bụla nke ukwuu mezuo, bụ́ nke nwekwara ikike nke kọmputa hà ka ụlọ elu dị oké elu na-apụghị ịnagide. Nke a ọ́ dịghị ewetu gị ala? O kwesịrị. (Ilu 22:4) Tụleekwa nke a: Akpa ume anyị, nkọlọ, ire, ezé, na ọnụ na-arụkọ ọrụ ọnụ iji mepụta okwu mmadụ na nke ọ bụla n’ime ọtụtụ puku asụsụ. Devid bụọrọ Jehova abụ kwesịrị ekwesị, na-asị: “M ga-ekele Gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ Gị nile dị; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma.” (Abụ Ọma 139:14) Ka anyị sonyere Devid n’iji ekele na-enye Jehova, bụ́ onye Omenkà na Chineke anyị dị ebube otuto!
16. Abụ dị aṅaa ka onye a ma ama na-agụ egwu bụrụ n’ito Jehova, ọkpụkpọ òkù dịkwa aṅaa na-arụgide arụgide ka anyị pụrụ ịzaghachi na ya?
16 Akwụkwọ abụ nke narị afọ nke 18 nke egwú ukwe Joseph Haydn haziri na-ekwu n’ito Jehova, sị: “Keleenụ Ya, unu nile bụ́ ọrụ Ya dị ebube! Bụọnụ abụ nsọpụrụ Ya, bụọnụ abụ otuto Ya, gọzienụ ma bulie Aha Ya elu! Otuto Jehova na-anọru mgbe ebighị ebi, Amen, Amen!” Ọbụna ihe mara mma karị bụ okwu ndị ahụ e kwuru ọtụtụ ugboro site n’ike mmụọ nsọ n’ime Abụ Ọma ndị ahụ, ndị dị ka ọkpụkpọ òkù ahụ a kpọrọ ugboro anọ n’Abụ Ọma nke 107, sị: “Ka ha kelee Jehova ekele banyere ebere Ya, na oké ọrụ Ya nile nke Ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ!” Ị̀ na-esonye n’otuto ahụ? I kwesịrị, n’ihi na ihe ọ bụla nke mara mma n’ezie nwere Jehova, bụ́ Eze nke mgbe ebighị ebi, dị ka isi iyi ya.
Ọrụ Ndị Kakwa Ukwuu
17. Olee otú ‘abụ nke Mosis na nke Nwa atụrụ ahụ’ si eto Jehova?
17 N’ime puku afọ isii gara aga, Eze nke mgbe ebighị ebi amalitewo ọrụ ndị kakwa ukwuu. N’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, ná Mkpughe 15:3, 4, anyị na-agụ banyere ndị ahụ nọ n’eluigwe bụ́ ndị meriworo ndị iro bụ́ ndị mmụọ ọjọọ: “Ha na-abụkwa abụ nke Mosis, bụ́ ohu nke Chineke, na abụ nke Nwa atụrụ Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile; ụzọ Gị nile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Gị Eze nke mba nile. Ònye na-agaghị atụ egwu, Onyenwe anyị, tookwa aha Gị? n’ihi na nanị Gị dị ọcha n’obi; n’ihi na mba nile ga-abịa kpọọkwa isiala n’ihu Gị; n’ihi na e mere ka ezi omume Gị nile pụta ìhè.” N’ihi gịnị ka e ji kpọọ nke a ‘abụ nke Mosis na nke Nwa atụrụ ahụ’? Ka anyị lee.
18. Ọrụ dị aṅaa dị ukwuu ka a na-echeta n’abụ dị n’Ọpụpụ isi nke 15?
18 Ihe dị ka 3,500 afọ gara aga, mgbe ndị agha dị ike nke Fero nwụsịrị n’Osimiri Uhie, ụmụ Israel ji ekele too Jehova n’abụ. Anyị na-agụ n’Ọpụpụ 15:1, 18, sị: “Mgbe ahụ Mosis na ụmụ Israel na-abụkuru Jehova abụ a, ha kwuo, sị, Ka m bụkuo Jehova abụ, n’ihi na O biliwo elu nke ukwuu: ịnyịnya na onye ọ na-ebu, Ọ tụbawo ha n’oké osimiri. Jehova ga-abụ eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” E mere ka iwu ezi omume nke Eze nke mgbe ebighị ebi a pụta ìhè n’ikpe o kpere na ogbugbu o gburu ndị iro jụrụ ọbụbụeze ya.
19, 20. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji guzobe mba Israel? (b) Olee otú Nwa Atụrụ ahụ na ndị ọzọ siworo zaa ihe ịma aka Setan?
19 Gịnị mere nke a jiworo dị mkpa? Ọ bụ n’ogige Iden ka Agwọ ahụ dị aghụghọ dubara nne na nna anyị mbụ ná mmehie. Nke a rụpụtara ibufere ihe nile a kpọrọ mmadụ ezughị okè nke mmehie. Otú ọ dị, Eze nke mgbe ebighị ebi mere ihe ozugbo n’ikwekọ ná nzube mbụ ya, bụ́ nke ga-eduje n’ịchụpụ ndị iro ya nile na gburugburu ụwa na iweghachi ọnọdụ paradaịs. Eze nke mgbe ebighị ebi ahụ guzobere mba Israel ma nye Iwu ya iji mee ihe atụ otú ọ ga-esi mezuo nke a.—Ndị Galetia 3:24.
20 Otú ọ dị, ka oge na-aga, Israel n’onwe ya mibara n’ekwesịghị ntụkwasị obi, ọnọdụ a dị mwute rukwara nsọtụ ya mgbe ndị ndú ya raara Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya nye n’aka ndị Rom ịbụ onye a tara ahụhụ obi ọjọọ ma gbuo. (Ọrụ 10:39; Ndị Filipaị 2:8) Otú ọ dị, ịnọgidesi ike n’ezi ihe nke Jisọs ruo ọnwụ, dị ka “Nwa atụrụ Chineke” nke e ji chụọ àjà, gosiri n’ụzọ pụtara ìhè na ịma aka ahụ nke Onye Iro ochie nke Chineke, bụ́ Setan na-ama—na ọ dịghị mmadụ ọ bụla n’elu ụwa nke pụrụ ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’okpuru ule siri ike—abụghị eziokwu. (Jọn 1:29, 36; Job 1:9-12; 27:5) Ọ bụ ezie na ha na-eketa ezughị okè site n’aka Adam, ọtụtụ nde ụmụ mmadụ ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke agbasowo nzọụkwụ Jisọs n’ịnọgidesi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị mbuso agha nile nke Setan.—1 Pita 1:18, 19; 2:19, 21.
21. N”ikwekọ n’Ọrụ 17:29-31, olee ihe ọzọ a ga-atụle?
21 Ugbu a oge ahụ eruwo ka Jehova kwụghachi ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ụgwọ ọrụ ma kpee ndị iro nile nke eziokwu na ezi omume ikpe. (Ọrụ 17:29-31) Olee otú nke a ga-esi mee? Isiokwu anyị ọzọ ga-ekwu.
Igbe Ntụleghachi
◻ N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Jehova n’ụzọ ziri ezi “Eze nke mgbe ebighị ebi”?
◻ Olee otú e si egosipụta amamihe Jehova n’ihe ndị o kere eke?
◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ihe a kpọrọ mmadụ si bụrụ ọrụ okike magburu onwe ya?
◻ Ọrụ ndị dị aṅaa na-akpọ òkù maka ‘abụ nke Mosis na nke Nwa atụrụ ahụ’?
[Igbe dị na peeji nke 12]
Amamihe Kasị Elu nke Jehova
E gosipụtara amamihe nke Eze nke mgbe ebighị ebi n’ọtụtụ ụzọ n’ihe ndị o kere n’ụwa. Rịba ama okwu nke Agụa: “Okwu ọnụ ọ bụla nke Chineke bụ ihe a nụchaworo: ọta ka Ọ bụụrụ ndị na-agbaba n’ime Ya.” (Ilu 30:5) Mgbe ahụ Agụa na-ezo aka n’ọtụtụ ihe okike dị ndụ nke Chineke, ndị ukwu na ndị nta. Dị ka ihe atụ, n’amaokwu nke 24 ruo 28, ọ na-akọwa “ihe anọ dị nke dị nta n’elu ụwa, ma ihe ahụ maara ihe nke ukwuu.” Ndị a bụ ndanda, coney, igurube, na nche ụlọ.
Ha “maara ihe nke ukwuu”—ee, e mere anụmanụ ndị ahụ otú ahụ. Ha adịghị echepụta ihe dị ka ụmụ mmadụ na-eme kama ha na-adabere n’amamihe a kụnyere akụnye. Ì nwetụwo ihe ijuanya na nke a? Lee ihe okike dị n’usoro ha bụ! Dị ka ihe atụ, a haziri ndanda n’ọtụtụ ìgwè, nke gụnyere nke nne, ndị nke na-arụ ọrụ, na ndị nke óké. N’ụdị ha ụfọdụ, ndanda ndị na-arụ ọrụ ọbụna na-achịbata ụmụ ahụhụ ntakịrị n’ime ogige ndị ha wuworo. N’ebe ahụ ha na-amịrị ihe dị ụmụ ahụhụ ahụ n’ahụ, ebe ndanda ndị soja na-achụpụ ndị iro ọ bụla na-awakpo ha. E nyere ndụmọdụ ahụ n’Ilu 6:6, sị: “Jekwuru ndanda, onye umengwụ; lee ụzọ ya nile, wee mara ihe.” Ọ̀ bụ na ụdị ihe atụ ahụ ekwesịghị ịkpali anyị bụ́ mmadụ ịdị “na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè”?—1 Ndị Kọrint 15:58.
Mmadụ ewuwo ụgbọ elu ndị buru ibu. Ma lee ka nnụnụ, tinyere nnụnụ nzá, nke ịdị arọ ya na-erughị 30 gram, si na-eme ọtụtụ ihe dị ukwuu karị! Otu ụgbọ elu Boeing 747 aghaghị ịbụ nke a gbanyere 180,000 lita nke mmanụ ụgbọ elu, bụrụ nke òtù ndị a zụrụ azụ na-anya, ma jiri usoro dị mgbagwoju anya nke e ji amata ebe e chere ihu na-eme ihe iji fefere oké osimiri. Ma, nzá dị oké nta na-adabere n’otu ụzọ n’ụzọ iri atọ nke otu gram nke mmanụ ọkụ abụba isite n’Ugwu America buru ya, gafere Ọwa Mmiri Mexico, ma banye na Ndịda America. E nweghị oké ibu nke mmanụ ọkụ, e nweghị ọzụzụ ọ bụla n’ịnya ụgbọ elu, e nweghị chaatị ma ọ bụ kọmputa ndị dị mgbagwoju anya! Ikike a ò sitere n’usoro ihe ndapụta nke evolushọn? Ọ dịghị ma ọlị! Nnụnụ nta nke a maara ihe nke ukwuu, n’ịbụ nke Onye Okike ya, bụ́ Jehova Chineke, haziri otú ahụ site n’okike.
[Foto dị na peeji nke 10]
Ihe okike dịgasị iche iche nke “Eze nke mgbe ebighị ebi” na-eto ebube ya
[Foto dị na peeji nke 15]
Dị ka Mosis na ndị Israel nile mere ememe mmeri nke Jehova nwere n’Osimiri Uhie, a ga-enwe oké ịṅụrị ọṅụ mgbe Amagedọn gasịrị