Isoro Chineke Na-ejegharị—Na-eburu Mgbe Ebighị Ebi N’uche
“Anyị . . . ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.”—MAỊKA 4:5.
1. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ Jehova “Eze nke mgbe ebighị ebi”?
JEHOVA CHINEKE enweghị mmalite. A kpọrọ ya “Onye ochie ahụ” n’ụzọ dabara adaba, ebe ọ bụ na ọ nọwo na-adị laa azụ n’oge na-enweghị nsọtụ. (Daniel 7:9, 13) Jehova ga-anọkwa ruo ebighị ebi n’ọdịnihu. Nanị ya bụ “Eze nke mgbe ebighị ebi.” (Mkpughe 10:6; 15:3, NW) N’anya ya kwa, otu puku afọ dị “ka ụnyaahụ mgbe ọ na-aga, na dị ka otu nche n’abalị.”—Abụ Ọma 90:4.
2. (a) Gịnị bụ nzube Chineke maka ụmụ mmadụ na-erube isi? (b) Na gịnị ka anyị kwesịrị ime ka olileanya na atụmatụ anyị hiwe isi?
2 Ebe ọ bụ na Onye Na-enye ndụ na-adịru ebighị ebi, ọ pụrụ inye mmadụ abụọ mbụ, bụ́ Adam na Iv, olileanya nke ndụ na-enweghị ngwụsị na Paradaịs. Otú ọ dị, n’ihi nnupụisi, Adam tụfuru ikike ịdị ndụ ebighị ebi, na-ebufere ụmụ ya mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Ma, nnupụisi Adam emebighị nzube mbụ nke Chineke. Ọ bụ uche Jehova na ụmụ mmadụ na-erube isi ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ gajekwa imezu nzube ya n’adaghị ada. (Aịsaịa 55:11) Mgbe ahụ, lee ka o si kwesị ekwesị na anyị ga-eme ka olileanya na atụmatụ anyị hiwe isi n’ijere Jehova ozi na-eburu mgbe ebighị ebi n’uche. Ọ bụ ezie na anyị chọrọ iburu “ụbọchị ahụ nke Chineke” n’uche, ọ dị mkpa icheta na ihe mgbaru ọsọ anyị bụ isoro Chineke na-ejegharị ruo mgbe ebighị ebi.—2 Pita 3:12.
Jehova Na-eme Ihe n’Oge Ọ Kara Aka
3. Olee otú anyị si mara na Jehova nwere “oge” maka imezu nzube ya?
3 Dị ka ndị so Chineke na-ejegharị, anyị nwere mmasị siri ike n’imezu uche ya. Anyị maara na Jehova bụ Onye Ukwu Na-edebe Oge, anyị nwekwara obi ike na ọ dịghị ada mgbe ọ bụla n’imezu nzube ya n’oge ọ kara aka. Dị ka ihe atụ, “mgbe oge ahụ zuru, Chineke zipụtara Ọkpara Ya.” (Ndị Galetia 4:4) A gwara Jọn onyeozi na e nwere “oge” maka mmezu nke ihe amụma ndị ahụ ọ hụrụ n’ihe ịrịba ama. (Mkpughe 1:1-3) E nwere “oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe.” (Mkpughe 11:18) Ihe karịrị afọ 1,900 gara aga, e nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ikwu na Chineke ‘edebewo otu ụbọchị, nke Ọ ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume n’ime ya.’—Ọrụ 17:31.
4. Olee otú anyị si mara na Jehova na-achọ iweta ajọ usoro ihe a ná njedebe?
4 Jehova ga-eweta ajọ usoro ihe a ná njedebe, n’ihi na a na-akọcha aha ya n’ụwa nke taa. Ndị ajọ omume amụbawo. (Abụ Ọma 92:7) Site n’okwu na omume ha, ha na-akparị Chineke, ọ na-ewutekwa ya ịhụ ka a na-ekwutọ ma na-akpagbu ndị ohu ya. (Zekaraịa 2:8) Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji kpebie na a ga-eweta nzukọ Setan dum ná njedebe n’isi nso! Chineke ekpebiwo kpọmkwem mgbe nke a ga-eme, mmezu amụma Bible na-emekwa ka o doo anya na anyị na-ebi na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a.” (Daniel 12:4) Ọ ga-eme ihe n’isi nso maka ịgọzi ndị nile hụrụ ya n’anya.
5. Olee otú Lọt na Habakọk si lee ọnọdụ ndị gbara ha gburugburu anya?
5 Ọ gụsiri ndị ohu Jehova nke oge ochie agụụ ike ịhụ ọgwụgwụ nke ajọ omume. Lọt onye ezi omume bụ onye ‘ibi obi n’agụụ ịkwa iko nke ndị ahụ ndị na-emebi iwu na-ewute nke ukwuu.’ (2 Pita 2:7) N’ịbụ onye ọnọdụ ndị gbara ya gburugburu wutere, Habakọk onye amụma rịọrọ, sị: “Jehova, ruo ole mgbe ka m ga na-etiku Gị, ma Ị dịghị anụ? m na-etiku Gị mkpu, sị, Ihe ike! ma Ị dịghị azọpụta. N’ihi gịnị ka Ị na-eme ka m hụ ajọ ihe? n’ihi gịnị ka Ị na-elegide mmegbu? ma ịpụnara mmadụ ihe ma ihe ike dị n’ihu m: ịlụ ọgụ wee dị, esemokwu na-ebulikwa onwe ya.”—Habakọk 1:2, 3.
6. Gịnị ka Jehova kwuru ná nzaghachi nye ekpere Habakọk, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta na nke a?
6 N’otu akụkụ, Jehova zaghachiri Habakọk n’okwu ndị a: “Ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike, ọ gaghị ekwukwa okwu ụgha: ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakọk 2:3) Chineke si otú a mee ka a mara na ya ga-eme ihe na “mgbe a kara aka.” Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ka ọ na-ala azụ, Jehova ga-emezurịrị nzube ya!—2 Pita 3:9.
Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-adịghị Adalata Adalata Na-eje Ozi
7. Ọ bụ ezie na Jisọs amaghị kpọmkwem mgbe ụbọchị Jehova ga-abịa, olee otú o si rụọ ọrụ ya?
7 Ịmara kpọmkwem oge Jehova maka ihe omume ọ̀ bụ ihe dị oké mkpa iji jiri ịnụ ọkụ n’obi soro Chineke na-ejegharị? Ee e, ọ bụghị. Tụlee ihe atụ ụfọdụ. Jisọs nwere mmasị siri ike n’oge a ga-eme uche Chineke n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe. N’ezie, Kraịst kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ. Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:9, 10) Ọ bụ ezie na Jisọs maara na a ga-aza arịrịọ a, ọ maghị kpọmkwem oge ọ ga-abụ. N’amụma ukwu ya banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe a, ọ sịrị: “Ma ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge awa ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.” (Matiu 24:36) Ebe ọ bụ na Jisọs Kraịst bụ isi sekpụ ntị ná mmezu nke nzube Chineke, ọ ga-etinye aka kpọmkwem n’ibibi ndị iro Nna ya nke eluigwe. Otú ọ dị, mgbe Jisọs nọ n’elu ala, ọbụna ya onwe ya amaghị mgbe Chineke ga-eme ihe. Nke ahụ ò mere ka ịnụ ọkụ n’obi ya n’ozi Jehova belata? O meghị ma ọlị! Mgbe ha hụrụ ka Jisọs ji ịnụ ọkụ n’obi mee ka ụlọ nsọ ahụ dị ọcha, “ndị na-eso ụzọ Ya chetara na e dere ya rịị n’akwụkwọ nsọ, sị, Ekworo ụlọ Gị ga-eripịa m.” (Jọn 2:17; Abụ Ọma 69:9) Jisọs nọgidere na-arụ ọrụ ahụ e zitere ya ịrụ, o jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-adịghị adalata adalata rụọ ya. O jekwaara Chineke ozi na-eburu mgbe ebighị ebi n’uche.
8, 9. Mgbe ndị ahụ na-eso ụzọ jụrụ banyere mweghachi nke Alaeze ahụ, gịnị ka a gwara ha, oleekwa otú ha si meghachi omume?
8 Otú a ka ọ dịkwa ndị na-eso ụzọ Kraịst. Jisọs sooro ha zukọọ kpọmkwem tupu ọ rịgoo n’eluigwe. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Ya mere mgbe ha gbakọrọ, ha jụọ Ya, sị, Onyenwe anyị, ọ̀ bụ n’oge a ka Ị na-enyeghachi Israel alaeze?” Dị ka Onyenwe ha, ọ na-agụsi ha agụụ ike ka Alaeze ahụ bịa. Ma, Jisọs zaghachiri, sị: “Ọ bụghị ihe dịịrị unu ịma oge ma ọ bụ ụbọchị, nke Nna m debere n’ike nke aka Ya. Ma unu ga-anata ike, mgbe Mmụọ Nsọ ga-abịakwasịworị unu: unu ga-abụkwa ndị àmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.”—Ọrụ 1:6-8.
9 Ọ dịghị ihe gosiri na nzaghachi a mere ka ndị ahụ na-eso ụzọ nwee nkụda mmụọ. Kama nke ahụ, ha ji ịnụ ọkụ n’obi nọgide n’ọrụ ime nkwusa. N’ime izu ole na ole, ha ejiriwo ozizi ha mejuo Jerusalem. (Ọrụ 5:28) N’ime afọ 30 kwa, ha agbasapụwo ọrụ nkwusa ha ruo n’ókè nke na Pọl pụrụ ikwu na e kwusara ozi ọma ahụ “n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” (Ndị Kọlọsi 1:23) Ọ bụ ezie na ‘e nyeghachighị Israel’ Alaeze ahụ dị ka ndị ahụ na-eso ụzọ tụrụ anya ya n’ihie ụzọ, e guzobeghịkwa ya n’eluigwe n’oge ndụ ha, ha nọgidere jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi na-eburu mgbe ebighị ebi n’uche.
Inyocha Ebumnobi Anyị
10. Amaghị mgbe Chineke ga-ebibi usoro ihe Setan na-enye anyị ohere igosipụta gịnị?
10 Ọ na-agụsikwa ndị ohu Jehova nke oge a agụụ ike ịhụ ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a. Otú ọ dị, isi nchegbu anyị abụghị mgbapụta anyị baa n’ụwa ọhụrụ Chineke e kwere ná nkwa. Anyị chọrọ ịhụ ka e doro aha Jehova nsọ, wepụkwa ọbụbụeze ya n’ụta. N’ihi nke a, anyị pụrụ ịṅụrị ọṅụ na Chineke agwabeghị anyị ‘ụbọchị ma ọ bụ awa’ nke e setịpụrụ maka ibibi usoro ihe Setan. Nke a na-enye anyị ohere inye ihe àmà na anyị kpebisiri ike iso Chineke na-ejegharị ruo mgbe ebighị ebi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, ọ bụghịkwa n’ihi na anyị nwere ihe mgbaru ọsọ ndị ga-adịru nwa oge, ndị dabeere n’ọdịmma onwe onye nanị.
11, 12. N’ụzọ dị aṅaa ka e si maa iguzosi ike n’ezi ihe Job aka, oleekwa otú ihe ịma aka ahụ si metụta anyị?
11 Anyị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke na-enyekwa aka igosi na Ekwensu ghara ụgha mgbe o boro ebubo na Job bụ́ onye ziri ezi—nakwa ụmụ mmadụ ndị dị ka ya—na-ejere Chineke ozi n’ihi ọdịmma onwe onye. Mgbe Jehova kọwasịrị ohu ya bụ́ Job dị ka nwoke zuru okè, zie ezi, nke na-atụ egwu Chineke, Setan ji obi ọjọọ boo ebubo, sị: “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke? Ọ́ bụghị Gị onwe gị gbawooro ya, gbaakwara ụlọ ya, gbaakwara ihe nile o nwere, ogige gburugburu? Ị gọziwo ọrụ aka ya abụọ, ihe nnweta ya agbasawokwa n’ala. Ma otú ọ dị, biko, setịpụ aka Gị, metụ ihe nile o nwere, ọ ghaghịkwa ịgbakụta Gị azụ n’ihu Gị.” (Job 1:8-11) Site n’ijigide iguzosi ike n’ezi ihe ya n’ule, Job gosiri na nzọrọ obi ọjọọ a bụ ụgha.
12 Site n’iguzosi ike n’ezi ihe n’ụzọ yiri nke ahụ, anyị pụrụ igosi na ebubo ọ bụla Setan na-ebo na anyị na-ejere Chineke ozi nanị n’ihi na anyị maara na ụgwọ ọrụ dị nso, bụ ụgha. Amaghị kpọmkwem oge maka ịbọ ọ́bọ̀ Chineke n’isi ndị ajọ omume na-enye anyị ohere igosi na anyị hụrụ Jehova n’anya n’ezie ma chọọ ijegharị n’ụzọ ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ na-egosi na anyị na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke ma tụkwasị obi n’ụzọ o si edozi okwu. Ọzọkwa, amaghị ụbọchị na awa ahụ na-enye aka ime ka anyị nọrọ na nche ma mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ n’ihi na anyị matara na ọgwụgwụ pụrụ ịbịa mgbe ọ bụla, dị ka onye ohi n’abalị. (Matiu 24:42-44) Site n’isoro Jehova na-ejegharị kwa ụbọchị, anyị na-eme ka obi ya ṅụrịa, na-enyekwa nzaghachi maka Ekwensu, bụ́ onye na-ata ya ụta.—Ilu 27:11.
Mee Atụmatụ Maka Mgbe Ebighị Ebi!
13. Gịnị ka Bible na-egosi banyere ime atụmatụ maka ọdịnihu?
13 Ndị so Chineke na-ejegharị maara na ọ bụ ihe amamihe dị na ya ime atụmatụ ndị ezi uche dị na ha maka ọdịnihu. N’ịmara banyere nsogbu na ịkpa ókè nke ịka nká, ọtụtụ ndị na-agbalị iji oge ntorobịa na ume ha mee ihe n’ụzọ ziri ezi ka ha wee nwee ego ga-ezuru ha n’oge agadi ha. Gịnịzi banyere ọdịnihu ime mmụọ anyị nke dị oké mkpa karị? Ilu 21:5 na-asị: “Echiche nile nke onye dị nkọ na-eduba nanị n’uru: ma echiche nile nke onye ọ bụla nke na-eme ngwa na-eduba nanị n’ịkọ ụkọ.” Ime atụmatụ maka ọdịnihu na-eburu mgbe ebighị ebi n’uche bara uru n’ezie. Ebe ọ bụ na anyị amaghị kpọmkwem mgbe ọgwụgwụ nke usoro ihe a ga-abịa, ọ dị anyị mkpa ichebatụrụ mkpa ndị anyị ga-enwe n’ọdịnihu echiche. Ma ka anyị nwee ezi nguzo ma bute ọdịmma Chineke ụzọ ná ndụ. Ndị na-enweghị okwukwe pụrụ ikwubi na mmadụ ime ka mmasị ya dabere nanị n’ime uche Chineke bụ elepụghị anya n’ihu. Ma, ọ̀ bụ ya?
14, 15. (a) Olee ilu Jisọs tụrụ banyere ime atụmatụ maka ọdịnihu? (b) N’ihi gịnị ka ọgaranya nke ilu Jisọs ji bụrụ onye na-elepụghị anya n’ihu?
14 Jisọs tụrụ otu ilu na-enye ihe ọmụma n’akụkụ a. Ọ sịrị: “Ala otu ọgaranya mịrị mkpụrụ hie nne: o wee tụgharịa n’obi ya, sị, Gịnị ka m ga-eme, n’ihi na enweghị m ebe ikpokọta mkpụrụ m? O wee sị, Nke a ka m ga-eme: m ga-eweda ọba m, wuokwa nke ka ukwuu; n’ebe ahụ ka m ga-ekpokọta ọka m nile na ezi ihe m nile. M ga-asịkwa mkpụrụ obi m, Mkpụrụ obi, i nwere ọtụtụ ezi ihe e debere nye gị ruo ọtụtụ afọ; na-ezu ike, na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ka obi na-atọ gị ụtọ. Ma Chineke sịrị ya, Onye na-enweghị uche, n’abalị a ka a na-achọ mkpụrụ obi gị n’aka gị; ma ihe i doziri, ònye ga-enwe ha? Otú a ka ọ dị, bụ́ onye na-akpadoro onwe ya àkụ̀, ma ọ bụghị ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”—Luk 12:16-21.
15 Jisọs ọ̀ na-ekwu na ọgaranya ahụ ekwesịghị ịrụworị ọrụ ná mgbalị iji nwee ihe onwunwe ga-ezuru ya n’ọdịnihu? Ee e, n’ihi na Akwụkwọ Nsọ na-agba ume ịrụsi ọrụ ike. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:10) Ihie ụzọ nke ọgaranya ahụ bụ na o meghị ihe kwesịrị ekwesị iji bụrụ “ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” Ọ bụrụgodị na o nwewo ike ịnụ ụtọ ihe onwunwe ya ruo ọtụtụ afọ, ọ gaara emesị nwụọ. O lepụghị anya n’ihu, ọ dịghị eche banyere mgbe ebighị ebi.
16. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji were obi ike dabere na Jehova maka ọdịnihu nwere nchebe?
16 Isoro Jehova na-ejegharị na-eburu mgbe ebighị ebi n’uche bụ ma ihe ezi uche dị na ya ma ilepụ anya n’ihu. Ọ bụ ụzọ kasị mma isi mee atụmatụ maka ọdịnihu. Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe amamihe dị na ya ime atụmatụ ndị dị irè banyere ụlọ akwụkwọ, ọrụ, na ibu ọrụ ezinụlọ, anyị kwesịrị icheta mgbe nile na ọ dịghị mgbe Jehova na-ahapụ ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe. Eze Devid bụrụ abụ, sị: “Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Abụ Ọma 37:25) N’otu aka ahụ, Jisọs mesiri obi ike na Chineke ga-enye ndị nile buru ụzọ na-achọ Alaeze ahụ ma na-ejegharị n’ụzọ ezi omume Jehova ihe ndị dị ha mkpa.—Matiu 6:33.
17. Ànyị si aṅaa mara na ọgwụgwụ dị nso?
17 Ọ bụ ezie na anyị bu mgbe ebighị ebi n’uche na-ejere Chineke ozi, anyị ka na-eburu ụbọchị Jehova n’uche. Mmezu nke amụma Bible na-agba akaebe n’ụzọ doro anya banyere ịdị nso nke ụbọchị ahụ. E jiriwo agha, ọrịa na-efe efe, ala ọma jijiji, na ụnwụ nri, tinyekwara mkpagbu nke ezi ndị Kraịst na nkwusa zuru ụwa ọnụ nke ozi ọma Alaeze Chineke, mara narị afọ a. Ihe ndị a nile bụ akụkụ nke oge ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a. (Matiu 24:7-14; Luk 21:11) Ụwa jupụtara ná “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:1-5) Na mgbe ikpeazụ a dị oké egwu, ndụ na-esiri anyị ike dị ka ndị ohu Jehova. Lee ka anyị si atụsi anya ike maka ụbọchị ahụ mgbe Alaeze Jehova ga-azachapụ ihe ọjọọ nile! Ka ọ dị ugbu a, ka anyị kpebisie ike isoro Chineke na-ejegharị na-eburu mgbe ebighị ebi n’uche.
Ije Ozi Na-eburu Ndụ Na-enweghị Ngwụsị n’Uche
18, 19. Gịnị na-egosi na ndị kwesịrị ntụkwasị obi nke oge ochie jeere Chineke ozi na-eburu mgbe ebighị ebi n’uche?
18 Ka anyị so Jehova na-ejegharị, ka anyị buru okwukwe Ebel, Ịnọk, Noa, Abraham, na Sera n’uche. Mgbe ọ kpọtụsịrị ha aha, Pọl dere, sị: “Ndị a nile nwụrụ n’ụzọ okwukwe, ebe ha anataghị nkwa ahụ, kama ha hụrụ ha rịị, sikwa n’ebe dị anya kelee ha, wee kwupụta na ha bụ ndị ọbịa na ndị nọ dị ka ọbịa n’elu ụwa.” (Ndị Hibru 11:13) Ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi “na-agbaso ala ka mma, nke ahụ bụ, ala dị n’eluigwe.” (Ndị Hibru 11:16) N’okwukwe, ha lepụrụ anya maka ebe ka mma n’okpuru ọchịchị nke Alaeze Mesaịa nke Chineke. Anyị pụrụ ijide n’aka na Chineke ga-eji ndụ ebighị ebi kwụghachi ha ụgwọ n’ebe ahụ ka mma—Paradaịs elu ala n’okpuru ịchịisi Alaeze.—Ndị Hibru 11:39, 40.
19 Maịka onye amụma kwupụtara mkpebisi ike nke ndị Jehova ife Chineke ofufe ruo mgbe ebighị ebi. O dere, sị: “Ndị nile dị iche iche na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha nke chi ya, anyị onwe anyị ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Maịka 4:5) Maịka ji iguzosi ike n’ihe jeere Jehova ozi ruo ọnwụ ya. Mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, obi abụọ adịghị ya na onye amụma ahụ ga-anọgide soro Chineke na-ejegharị ruo mgbe nile ebighị ebi. Lee ihe nlereanya mara mma ọ bụụrụ anyị bụ́ ndị na-ebi n’ime ime oge ọgwụgwụ!
20. Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebisi ike anyị?
20 Jehova na-aghọta ịhụnanya anyị na-egosi n’ebe aha ya dị. (Ndị Hibru 6:10) Ọ maara na ọ na-esiri anyị ike ijigide iguzosi ike n’ezi ihe anyị n’ebe ọ nọ n’ime ụwa a Ekwensu na-achị. Ọ bụ ezie na “ụwa na-agabiga,” otú ọ dị, “onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17; 5:19) Ya mere, site n’enyemaka Jehova, ka anyị kpebisie ike ịtachi obi n’ule ndị anyị na-eche ihu site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị. Ka echiche na ụzọ ndụ anyị lekwasị anya ná ngọzi ndị dị ebube nke Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya kwere ná nkwa. Ndị a pụrụ ịbụ nke anyị ma ọ bụrụ na anyị anọgide soro Chineke na-ejegharị na-eburu mgbe ebighị ebi n’uche.—Jud 20, 21.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ Gịnị bụ nzube Chineke maka ụmụ mmadụ na-erube isi?
◻ N’ihi gịnị ka Jehova na-ejibeghị mee ihe iji weta ụwa a na-adịghị asọpụrụ Chineke ná njedebe?
◻ N’ihi gịnị ka amaghị kpọmkwem mgbe Chineke ga-eme ihe na-ekwesịghị iji belata ịnụ ọkụ n’obi anyị?
◻ Gịnị bụ abamuru ụfọdụ ndị dị n’iso Chineke na-ejegharị na-eburu mgbe ebighị ebi n’uche?
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Isoro Chineke na-ejegharị na-achọ ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi jeere ya ozi dị ka ndị na-eso ụzọ mbụ nke Kraịst mere