Ngọzi Ndị Bara Ụba ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-enye Ìhè”
N’IHE dị ka 2,700 afọ gara aga, Aịsaịa onye amụma dere, sị: “Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 60:2) Lee ka okwu ndị ahụ siworo ghọọ eziokwu! Otú ọ dị, e nwere olileanya, n’ihi na Jehova emewo ka ìhè nwupụta. N’afọ gara aga, a kpọrọ ndị hụrụ ìhè nke Chineke n’anya òkù na-ekpo ọkụ ịbịa Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-enye Ìhè.”
E bu ụzọ mee ihe omume mgbakọ ahụ na June n’Ebe Ugwu America. N’ọnwa ndị na-esonụ, e mewokwa ya n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ na Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe, Ebe Etiti na Ebe Ndịda America, Africa, Esia, na agwaetiti nile nke oké osimiri. Ndị bịaworonụ ruru ọnụ ọgụgụ dị ọtụtụ nde. Leekwa aha oké oriri ime mmụọ ha riworo!
“Ùnu Abịala, Unu Ndị Nile Na-enye Ìhè!”
N’ihe ka ọtụtụ ebe, mgbakọ ahụ malitere na Friday ma mechie n’ehihie Sunday. Ka ndị ahụ bịara mgbakọ nọdụrụ n’oche ha n’ụtụtụ Friday, ha nwere obi ụtọ ịnụrụ ntụle dị mkpirikpi nke ụzọ ìhè Jehova siworo nwupụta nke ọma karị n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. Mgbe ahụ onye isi oche mgbakọ gbagoro n’ikpo okwu ikwu okwu. O mesiri ike na ezi ndị Kraịst kwesịrị ịbụ ndị na-enye ìhè ma kwuo n’ụzọ na-ekpo ọkụ, sị: “Ùnu abịala, unu ndị nile na-enye ìhè!” Ihe omume mgbakọ ahụ ga-enyere ndị bịaranụ aka ịnọgide na-egosipụta ìhè nke Jehova.
Okwu bụ isi setịpụrụ usoro maka ihe nile e mere ná mgbakọ ahụ. Ọkà okwu nke a chetaara ndị bịara mgbakọ na ìhè ndị ahụ nyụnahụrụ ihe a kpọrọ mmadụ laa azụ n’ubi a gbara ogige nke Iden. Kemgbe ahụ, Setan emewo ka ụmụ mmadụ kpuo ìsì n’ebe ìhè nke eziokwu dị. (2 Ndị Kọrint 4:4) Otú o sina dị, Jisọs bịara dị ka “ìhè nke mba nile.” (Aịsaịa 42:1-6) O kpughere ụgha nile nke okpukpe, mee ka a mata ajọ ọrụ nile nke ọchịchịrị, bulie ọkaaka Jehova elu, kwusaakwa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Ndị na-eso ụzọ Jisọs mere otu ihe ahụ—ha ka na-emekwa otú ahụ! (Matiu 28:19, 20) Ọkà okwu ahụ kwuru n’ụzọ na-akpali mmụọ, sị: ‘Anyị, dị ka Jisọs, pụrụ ịbụ ndị na-enye ìhè. Ọ dịghị ọrụ ọ bụla dị mkpa karịa ya n’oge anyị a. Ọ dịghịkwa ihe ùgwù dị ukwuu karịa ya.’
Kpọmkwem ka nnọkọ mbụ nke mgbakọ ahụ na-achọ imechi, e nwere ihe ịtụnanya. Onye isi oche mgbakọ bịaghachiri n’ikpó okwu wee maa ọkwa mwepụta nke traktị anọ ọhụrụ. E ji ịkụ aka kporo ọkụ nabata ihe omume nke a, e nyekwara onye ọ bụla bịaranụ otu mkpụrụ nke traktị ọ bụla.
N’ehihie Friday, ihe omume mgbakọ ahụ malitere inye ndụmọdụ bụ isi maka ndị Kraịst na-enye ìhè. Okwu abụọ ndị mbụ nyere ndụmọdụ dị mma n’ụzọ isi zere ịbụ ndị e merụrụ site n’ọchịchịrị nke ụwa. Ebe ọ bụ na Setan pụrụ iyi ka ọ bụ mmụọ ozi nke ìhè, ọ dị mkpa ịnọ na-enwe ọdịdị ime mmụọ ka ihe ndị na-adịghị ọcha nke ụwa ghara ịrafu anyị. (2 Ndị Kọrint 11:14) Pọl nyere ndụmọdụ, sị: “Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwogha unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa ya ezi ụtọ nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) Ndị bịara mgbakọ nụrụ na nnwogha nke onye Kraịst bụ ihe omume na-aga n’ihu n’ihu. A na-eme ka uche anyị na-adị ọcha mgbe mgbe, na-akpụzikwa ya ka anyị na-amụ Okwu Chineke ma na-etinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ. Otú a, anyị na-adịwanye ka Jisọs, bụ́ onye “jupụtara n’amara na eziokwu.”—Jọn 1:14.
Ndị Na-eto Eto Na-enye Ìhè
Akụkụ mmechi n’ehihie Friday lekwasịrị anya n’ebe ndị ntorobịa nọ. Okwu nke mbụ (“Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Na-achụso?”) jara ndị Kraịst na-eto eto mma bụ́ ndị bụ ihe nlereanya mara mma nke ikwesị ntụkwasị obi. Ma o chetaara ha na ha bụ kpọmkwem ebe Setan lekwasịrị anya. Ọbụna onye na-eme ihe egwuregwu a zụrụ nke ọma nwere mkpa nke onye ọzụzụ. N’otu ụzọ ahụ, ndị na-eto eto nwere mkpa enyemaka nke ndị mụrụ ha na nke ọgbakọ iji wee nọgide na-ejegharị n’ìhè.
E mesiri nke a ike site n’ihe nkiri ahụ mara mma bụ́ Ime Ihe Ziri Ezi n’Anya Jehova, nke mechiri ihe omume Friday ahụ. Ihe pụtara ìhè bụ ihe nlereanya nke Eze Josaịa. Ọbụna dị ka nwa okorobịa, o kpebisiri ike ijere Jehova ozi. E nwere ajọ mmetụta ndị gbara ya gburugburu, ma site ná nduzi nke onye isi nchụàjà bụ́ Hilkaịa nakwa n’ihi ịhụnanya ya onwe ya nwere maka Iwu Chineke, Josaịa mere ihe ziri ezi n’anya Jehova. Ka ndị Kraịst na-eto eto taa na-eme omume n’ụzọ yiri nke ahụ.
Kwe Ka Ìhè ahụ Na-enwu
Mgbe ha zusịrị ike n’abalị, ụmụnna ahụ bịara ná mgbakọ n’ụtụtụ Saturday dị njikere maka ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ na-ewuli elu. Olileanya ha adakpọghị. Mgbe a tụlesịrị ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ihe omume ahụ gara n’ihu site n’okwu ọtụtụ ndị kwuru nke gosipụtara ụzọ dị iche iche onye Kraịst pụrụ isi kwe ka ìhè ya na-enwu. (Matiu 5:14-16) Ime nkwusa bụ otu ụzọ dị mkpa, omume ọma na-ekerekwa òkè dị mkpa. Dị ka ọkà okwu ahụ kwuru, “ime nkwusa na-agwa ndị ọzọ ihe anyị kwere, ma inwe ịhụnanya na-egosipụta ya.”
Mgbe ahụ a kpọtụrụ uche ndị nọ ná mgbakọ gaa n’otu ihe na-enye aka n’ime nkwusa—traktị. Ebe ọkwa ahụ a mara n’ụbọchị bu ụzọ ka dị ọhụrụ n’uche onye ọ bụla, ụmụnna nụrụ ahụmahụ ndị na-egosi ụzọ ngwá ọrụ ndị a dị nta si dị ike. A gbara ụmụnna ume ịdị na-eji traktị n’oge nile, na-adị njikere maka oge ọ bụla.
Ọzọ a dọọrọ uche gaa n’ebe ndị ọsụ ụzọ nọ, bụ́ ndị nkwusa Alaeze oge nile, ndị na-arụsi ọrụ ike n’inye ìhè. Lee otú anyị si enwe ekele inwe ndị ọsụ ụzọ na-arụsi ọrụ ike! Ọnụ ọgụgụ ha na-amụbakwa. Ọbụna n’ala ebe e nyeworo nnwere onwe ife ofufe n’oge na-adịbeghị anya, ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ anyị na-arị elu. A gbara ndị ọsụ ụzọ ume iwere ihe ùgwù ha dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. A gbara ndị na-amalitebeghị ọrụ ọsụ ụzọ ume ịtụle ọnọdụ ha. Ma eleghị anya ha onwe ha pụrụ ịhazi ihe omume ha ikwe ka ìhè ha na-enwu n’ozi oge nile.
Ịbụ onye na-enye ìhè na-emetụtakarị ịchụ àjà, e mere ka nke a pụtakwa ìhè n’okwu na-esonụ, “Ijere Jehova Ozi Site ná Mmụọ nke Iji Onwe Onye Chụọ Àjà.” Pọl rịọrọ, sị: “Unu chee ahụ unu n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ.” (Ndị Rom 12:1) Ndị na-atachi obi ná mkpagbu na-egosi mmụọ nke iji onwe onye achụ àjà. Ndị ọsụ ụzọ na-eji ọtụtụ ihe achụ àjà kwa ụbọchị iji wee nọgide n’ozi oge nile. N’ezie, ezi ndị Kraịst nile na-eji ọtụtụ ihe achụ àjà, na-emikpu onwe ha n’ozi Jehova kama ịbụ ná nchụso ọdịmma onwe onye, nke ịhụ ihe onwunwe nke ụwa nke a n’anya. Ịgbaso ụzọ dị otú ahụ na-arụpụta ngọzi bara ụba site n’aka Jehova.
Okwu ahụ ghọrọ okwu mmeghe kwesịrị ekwesị maka ihe sochirinụ—okwu baptism. Ndị e mere baptism ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-enye Ìhè” agaghị echefu okwu a n’ezie. Baptism ha ga-anọgide na-abụ isi ihe ná ndụ ha. E chetaara ha na ha na-agbaso ihe nlereanya nke Jisọs Kraịst, bụ́ onye e mere baptism n’oge ọ dị 30 afọ. Ọzọkwa, ndị e mere baptism nwere obi ụtọ icheta na ha ‘eyipụwo ọrụ nile nke ọchịchịrị,’ meekwa mkpebi ‘ịbụ ohu Jehova.’ (Ndị Rom 12:11; 13:12) N’ụzọ na-enye ọṅụ, ha biliri ọtọ n’ihu ìgwè ndị nọ ná mgbakọ wee mee nkwupụta ihu ọha dara ụda tupu ha agaa maka baptism. (Ndị Rom 10:10) Anyị na-ekpe ekpere ka ngọzi Jehova dịkwasị ndị ahụ nile gosipụtara nrara ha raara onwe ha nye ya site n’ime baptism ime mmiri n’oge Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-enye Ìhè.”
Ehihie Saturday bụ oge maka ịdọ aka ná ntị ụfọdụ sitere n’obi eziokwu. Ndị a bịara n’ụdị okwu ndị a kpọrọ “Zere Ọnyà Ndị ahụ nke Anyaukwu,” “Ò Dị Onye Na-emebi Omume Ọma Gị?” na “Chebe Onwe Gị Pụọ n’Ụdị Nile nke Ikpere Arụsị.” Okwu atọ ndị a mere ka a mata ụfọdụ n’ime ụzọ akọ Setan na-eji eme ihe ime ka onye Kraịst daa mbà. Judas Iskariọt bụ onyeozi, ma ọ raara Jisọs nye n’ihi ego. Samuel na-eto eto tolitere kpọmkwem n’ebe bụ isi ná mba ahụ maka ofufe Jehova, ma n’ụzọ ọ na-apụghị izere, e kpughere ya nye mkpakọrịta ụfọdụ dị nnọọ njọ. (1 Samuel 2:12, 18-20) Ikpere arụsị pụrụ ịgụnye ihe ndị dị ka mmekọahụ rụrụ arụ na ọchịchọ ọjọọ. (Ndị Efesọs 5:5; Ndị Kọlọsi 3:5) Ee, anyaukwu, mkpakọrịta ọjọọ, na ikpere arụsị dị ize ndụ, a ghaghịkwa izere ha.
Mgbe ahụ ihe omume mgbakọ ahụ gbanwere ọnọdụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Okwu nke na-esonụ welitere ọtụtụ ajụjụ Bible na-akpali mmasị ma zaa ha. Dị ka ihe atụ, ị̀ pụrụ ịkọwa ma à ga-eme ka ndị na-anakwereghị eziokwu ahụ wee nwụọ tupu mkpagbu ukwu ahụ si n’ọnwụ bilie? Gịnị ka onye Kraịst pụrụ ime mgbe ọ na-enweghị ike ịchọta di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ekwesị? Iji mee ka ihe ọmụma Bible ha nwere dịwanye omimi, a gbara ndị bịara mgbakọ ume iji Watch Tower Publications Index na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu, karịsịa n’okpuru isiokwu bụ “Questions From Readers” [Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ].
Ọnụnọ na Mkpughe nke Kraịst
Akụkụ mmechi nke ihe omume ụbọchị Saturday chere ihu n’amụma site n’okwu ọtụtụ ndị kwuru nke a kpọrọ “Ịmụkwasị Ìhè n’Ọnụnọ na Mkpughe nke Kraịst.” A tụleghachiri akụkụ dị iche iche nke “ihe ịrịba ama” ahụ ndị na-egosi ọnụnọ nke Jisọs Kraịst. (Matiu 24:3) N’akụkụ nke abụọ, a tụlere ọrụ nile nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-arụ n’oge a. (Matiu 24:45-47) A rụtụrụ aka na kemgbe 1919 òtù ohu ahụ ejiwo ikwesị ntụkwasị obi na-ebute ụzọ n’ọrụ ime nkwusa banyere ozi ọma nke Alaeze ahụ. Mgbe ahụ a chịkọtara oké ìgwè mmadụ site ná mba nile isoro ndị Kraịst e tere mmanụ na-ekere òkè n’igosipụta ìhè nke Jehova. Ọkà okwu ahụ kwubiri, sị: “Ka mmadụ nile jiri ịnụ ọkụ n’obi nọgide na-akwado ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche. Ọ bụ nanị site n’ime nke a ka ndị nile yiri atụrụ ga-enwe ike ịnụ, n’otu ụbọchị nke dị ezi nso, okwu obi ụtọ ndị ahụ na-asị: ‘Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site ná ntọala nke ụwa.’”—Matiu 25:34.
Ọkà okwu ikpeazụ tụlere ihe mkpughe nke Jisọs Kraịst pụtara na ihe ndị o metụtara. (1 Ndị Kọrint 1:7) Lee aha ahụmahụ nke mkpughe ahụ ga-abụ! A ga-ebibi Babilọn Ukwu ahụ. Oké agha ahụ na-aga n’etiti ụwa Setan na Jisọs na ndị mmụọ ozi ya ga-akwụsị ná mbibi nke usoro ihe a. N’ikpeazụ, a ga-atụba Setan n’onwe ya n’ime abyss wee napụ ya ike ịrụ ọrụ. Ma a ga-enwe izu ike nye ndị Chineke, site n’ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ n’eluigwe na nguzobe nke ụwa ọhụrụ. Ọkà okwu ahụ mere ndị na-ege ya ntị obi ụtọ site n’iwepụta akwụkwọ nta ọhụrụ ahụ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? Lee ọmarịcha ihe enyemaka nke ahụ ga-abụ nye ndị dị umeala n’obi bụ́ ndị ọ dị mkpa ịmara banyere Onye Okike anyị nke na-echebara anyị echiche na nzube ya maka anyị!
Ezinụlọ Ndị Kraịst
Sunday, bụ́ ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ, abịaruwo ugbu a. Otú ọ dị, a ka nwere ọtụtụ ihe a ga-ekwu. Mgbe a tụlesịrị ihe mmụta dịịrị ụbọchị, e lekwasịrị anya n’ezinụlọ ndị Kraịst site n’okwu ọtụtụ ndị kwuru bụ́ “Ịhụrịta Maka Mkpa Ibe Anyị n’Ezinụlọ Ndị Kraịst.” Akụkụ nke mbụ nyeere ndị bịara mgbakọ aka ịghọta isi ihe dị n’inwe ihe ịga nke ọma n’ezinụlọ ndị Kraịst: idebe ihe ime mmụọ n’ọnọdụ mbụ. Akụkụ nke abụọ gbara ezinụlọ nile ume imekọ ihe ọnụ, ma nke ahụ ò metụtara ịbịa nzukọ, ozi ubi, ọmụmụ ihe ezinụlọ, ma ọ bụ ntụrụndụ. Akụkụ nke atọ nke okwu ahụ ọtụtụ ndị kwuru chetaara ụmụnna banyere ihe ùgwù na ibu ọrụ ha nwere ilekọta ndị meworo agadi. “Ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị meworo agadi bụ ngwá ọrụ bara uru nye ọgbakọ,” ka ọkà okwu ahụ kwuru. Ka anyị were ahụmahụ ha dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa ma ṅomie iguzosi ike n’ezi ihe ha.
Ihe ọzọ a tụlere bụ ihe okwu ahụ bụ́ “uche zuru okè” pụtara. (1 Pita 4:7) Onye nwere uche zuru okè na-eche echiche ziri ezi, nwee uche, mara ezi ihe, dị umeala, ma na-eme ihe ziri ezi. Ọ pụrụ ịmata ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ, eziokwu na ụgha. Ọzọkwa, ọ na-agbalị ịnọ na-enwe ezi ahụ ike ime mmụọ.
Okwu ikpeazụ e kwuru n’usoro ihe omume nke ụtụtụ Sunday tụlere ọnụnọ anyị nọ n’okpuru Chineke na Kraịst. “Ịdị mkpa nke iji ịnọgidesi ike n’ihe na-anọ n’okpuru Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, apụghị ịbụ nke a ga-ekwubiga ókè,” ka ọkà okwu ahụ kwuru. Ọ gara n’ihu igosi ụzọ nke a si emetụta akụkụ ọ bụla nke ndụ anyị. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-anọ n’okpuru? Àgwà anọ: ịhụnanya, egwu Chineke, okwukwe, na ịdị umeala n’obi.
Ehihie Sunday
N’otu ntabi anya, oge ehihie Sunday ruru, o wee bụrụ oge maka nnọkọ ikpeazụ nke mgbakọ ahụ. Nye ọtụtụ, o yiri ka mgbakọ ahụ ọ ka malitere amalite, ma ka ọ dịrịị ọ na-abịaru ná ngwụsị ya.
Isiokwu nke okwu ihu ọha ahụ bụ́ “Gbasoo Ìhè nke Ụwa.” E mere ka ndị nọ ya gere nkọwa na-akpali akpali nke òkè ìhè nkịtị na-ekere n’ime ka ndụ nọgide na-aga n’ihu. Mgbe ahụ ọkà okwu ahụ gosiri ịdị mkpa ka ukwuu karị nke ìhè ime mmụọ. Ìhè nkịtị na-edebe anyị ndụ ruo iri afọ ole na ole, ma ìhè ime mmụọ pụrụ idebe anyị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Otu isi ihe pụtara ìhè n’okwu ahụ bụ ntụle nke amaokwu ruo n’amaokwu nke Jọn 1:1-16, bụ́ ebe a kọwara Jisọs dị ka ìhè nke ụwa. Taa, n’afọ ndị ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a, ọ dị ngwa karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịgbaso Jisọs n’ọnọdụ nke a.
Mgbe nchịkọta Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche e kenyere maka izu ahụ gasịrị, oge ruru maka okwu mmechi. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọkà okwu ahụ gosiri na a gaje inwe ọtụtụ ihe a ga-atụ anya ha n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, ọ mara ọkwa banyere kaseti a na-egere egere, ihe nkiri ahụ bụ́ Doing God’s Will With Zeal. Ọ bụghịkwa nanị nke ahụ. A gaje inwe usoro kaseti ọhụrụ ndị a na-ekiri ekiri nke a kpọrọ The Bible—A Book of Fact and Prophecy, nke mbụ n’isiokwu ahụ bụ The Bible—Accurate History, Reliable Prophecy.
N’ikpeazụ, ọkà okwu ahụ mara ọkwa na 1993 a ga-enwe mgbakọ distrikti ụbọchị anọ, gụnyere nnọkọ ndị pụrụ iche nke mba nile n’Africa, Esia, Europe, na n’Ebe Ndịda America. Ọ bụ ezie na Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-enye Ìhè” na-achọ ịgwụsị, ụmụnna pụrụ ịmalite ime atụmatụ maka afọ na-abịanụ.
Mgbe ahụ oge ruru maka ụmụnna bịara mgbakọ ịla. N’ezie, ha kpebisiri ike karịa mgbe ọ bụla ịnọgide na-egosipụta ìhè n’ime ụwa nke a gbara ọchịchịrị. Mgbe ụbọchị atọ ahụ jupụtara n’ihe ime mmụọ mara mma gasịrị, okwu ndị dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ikpeazụ e hotara n’okwu ikpeazụ enwewo oké ihe ọ pụtara: “Chineke ka Jehova bụ, o nyewokwa anyị ìhè. . . . Keleenụ Jehova; n’ihi na ọ dị mma: n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka ebere ya dị.”—Abụ Ọma 118:27, 29.
[Foto dị na peeji nke 15]
Usoro ihe omume mgbakọ n’asụsụ Russia
[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]
Ndị so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu n’ọtụtụ mgbakọ
Ụmụnna ndị sitere Japan so n’etiti ndị zukọrọ na St. Petersburg, Russia
Ihe nkiri Bible na-akpali akpali mesiri ike mkpa ọ dị ime ihe ziri ezi n’anya Jehova
Ndị ọhụrụ na-enye ìhè gosipụtara nrara ha raara onwe ha nye Jehova site n’ịbụ ndị e mere baptism
Ndị bịara mgbakọ uche ha nile dị n’ihe omume ahụ na St. Petersburg
[Foto dị na peeji nke 18]
Ụmụnna nwere obi ụtọ ịnata akwụkwọ nta ọhụrụ ahụ bụ́ “Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?”