Bịa Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-enye Ìhè”
“LEE, ọchịchịrị na ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 60:2) Lee ka okwu ndị ahụ si bụrụ eziokwu taa! N’arụghị ụka ọ bụla, okpukpe ụgha na-eme ka ndị mmadụ nọrọ n’ọchịchịrị n’ihe banyere ụdị ofufe nke na-amasị Chineke. N’ihi gịnị? N’ihi na Setan, bụ́ chi nke usoro ihe nke a, ‘emewo ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì.’—2 Ndị Kọrint 4:4.
Ndịàmà Jehova dị nnọọ iche n’ebe ndị ahụ Setan mere ka ha kpuo ìsì nọ. A pụrụ iji okwu onye amụma Aịsaịa mee ihe banyere ha: “N’ahụ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ gị.” (Aịsaịa 60:2) Lee ka ha si nwee obi ụtọ isi n’ọchịchịrị pụta baa n’ìhè dị ebube nke Chineke! Ọ bụ ìhè ime mmụọ, bụ́ eziokwu nke Okwu Chineke na-enye nghọta, nke na ọbụna ndị ahụ kpuru ìsì n’ụzọ nkịtị pụrụ ịhụ eziokwu ahụ.
N’ezie, enyemaka dị mkpa. O yighị ihe ga-eme eme na onye na-agụ nanị Bible n’ejighị ihe enyemaka ndị Chineke na-enye mee ihe pụrụ ịghọta ìhè ahụ. Ọ bụ ya mere Jehova Chineke jiworo mee ka e nwee “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” nke e buru amụma ya na Matiu 24:45-47. Taa Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-anọchi anya “ohu” ahụ. Ọ bụ n’okpuru ntụziaka nke òtù a ka e meworo ndokwa maka Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-enye Ìhè.”
Nzube nke mgbakọ a bụ inyere ndị Jehova aka ịbụ ndị na-enye ìhè n’ụzọ ka mma, n’ikwekọ n’okwu Pọl ná Ndị Filipaị 2:15. N’ebe ahụ, a gwara ndị Kraịst ka ha na-enwu dị ka “ndị na-enye ìhè n’ụwa.”—Matiu 5:14, 16.
Na Nigeria, e mere atụmatụ na usoro ihe omume nke Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-enye Ìhè” ga-amalite na Friday, November 6. N’elekere 9:20 nke ụtụtụ, ihe omume olu ụtọ ga-enyere mmadụ nile aka ịnọ n’ọnọdụ obi na uche dị mma, na-adị njikere maka usoro ihe omume ime mmụọ dị n’ihu. Ụbọchị ọ bụla nwere isiokwu nke ya, isiokwu nke ụbọchị Friday bụkwa “Zipụta Ìhè Gị na Eziokwu Gị.”—Abụ Ọma 43:3.
Usoro ihe omume nke ụtụtụ Friday ga-enwe okwu bụ isi, “Ndị Na-enye Ìhè—N’ihi Nzube Dị Aṅaa?” N’ezie, ndị Kraịst abụghị ndị na-enye ìhè n’ihi ebumnuche onwe onye, nke na-achọ ọdịmma onwe onye nanị. Kama nke ahụ, ha na-eje ozi n’ihi otu ihe ahụ mere Jisọs Kraịst, bụ́ Onye Isi Na-enye Ìhè, ji bịa n’ụwa, ya bụ, ịgba àmà nye eziokwu na inye aha Onye Okike ahụ otuto. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Jisọs kwuru banyere onwe ya, sị: “Mgbe ọ bụla m nọ n’ụwa, abụ m ìhè nke ụwa.” (Jọn 9:5) Otú a, ọ hapụụrụ anyị ihe nlereanya ịgbaso nzọụkwụ ya n’ụzọ chiri anya. (1 Pita 2:21) Ehihie nke ụbọchị mbụ ahụ ga-eme ka otu okwu na ihe nkiri Bible na-akọ banyere Eze Josaịa pụta ìhè, bụ́ nke ga-amasị ndị ntorobịa n’ụzọ pụrụ iche.
Isiokwu nke ụbọchị Saturday bụ “Unu Onwe Unu Bụ Ìhè nke Ụwa . . . Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu.” (Matiu 5:14, 16) Usoro ihe omume nke ụtụtụ ga-enwe okwu ọtụtụ ndị ga-ekwu nke a kpọrọ “Ikwe Ka Ìhè Unu Na-enwu.” A ga-ewepụta ohere maka ndị ahụ rarawooro onwe ha nye Jehova ịbụ ndị e mere baptism. Usoro ihe omume nke ehihie ga-enwe okwu ọtụtụ ndị ga-ekwu na-enye nghọta a kpọrọ “Ịmụkwasị Ìhè n’Ọnụnọ na Mkpughe nke Kraịst.”
Isiokwu a họọrọ maka ụbọchị Sunday, bụ́ ụbọchị nke atọ na nke ikpeazụ nke mgbakọ ahụ, bụ “Na-ejegharịnụ dị ka Ụmụ nke Ìhè.” (Ndị Efesọs 5:8) Usoro ihe omume nke ụtụtụ ga-enwe okwu ọtụtụ ndị ga-ekwu nke a kpọrọ “Ịhụrịta Maka Mkpa Ibe Anyị n’Ime Ezinụlọ Ndị Kraịst,” bụ́ nke ga-akọ banyere ibu ọrụ dị iche iche nke ezinụlọ. A ga-enwekwa okwu na-akọwa ihe ọ pụtara mmadụ ido onwe ya n’okpuru Chineke na Kraịst.
Mgbakọ ahụ ga-eru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu n’ehihie Sunday site n’okwu ihu ọha ahụ isiokwu ya bụ “Gbasoo Ìhè nke Ụwa.” Okwu nke a ga-atụle ihe dị na Jọn 1:1-16, ọ ga-egosikwa mkpa ọ dị inwe ihe ọmụma Bible, na-emesi ya ike na Jisọs Kraịst bụ ìhè nke ụwa. Mgbakọ ahụ ga-emechi site n’okwu agbamume na-ekpo ọkụ nke bụ “Nọgidenụ Na-ejegharị n’Ìhè Ahụ.”
Gosi obi ekele i nwere maka oriri ime mmụọ nke a nke Jehova na-enye site n’ọgbakọ ya a na-ahụ anya. Nọrọ n’ebe ahụ malite n’oge a ga-abụ abụ mmeghe n’ụtụtụ Friday ruo n’oge a ga-ekpe ekpere mmechi n’ehihie Sunday. Gee ntị nke ọma n’ihe nile e kwuru site n’ikpó okwu. Na-edetu ihe iji nyere gị aka ịtụkwasị uche nakwa maka iji ya mee ihe n’ọdịnihu. N’ikpeazụ, mee atụmatụ ikere òkè n’ụdị ụfọdụ nke ije ozi afọ ofufo. Otú a, ị ga-enweta ọ bụghị nanị ngọzi nke ịnara ihe kama ọbụna ngọzi ka ukwuu nke inye ihe.—Ọrụ 20:35.