Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/01 p. 1
  • “Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu”
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu”
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • “Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu” Ka E Too Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ìhè Chineke Na-eme Ka Ọchịchịrị Ghara Ịdị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Gbasoo Ìhè Nke Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 1/01 p. 1

“Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu”

1 Ụwa nke gbara anyị gburugburu nọ n’ọchịchịrị n’ụzọ omume na n’ụzọ ime mmụọ. Ìhè nke eziokwu na-ekpughe “ọrụ nke ọchịchịrị nke na-amịghị mkpụrụ,” ka e wee nwee ike izere ihe mkpọbi ụkwụ ndị a na-akpata ọnwụ. Ya mere, Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ume, sị: “Na-ejegharịnụ dị ka ụmụ nke ìhè.”—Efe. 5:8, 11.

2 “Mkpụrụ nke ìhè ahụ” dị nnọọ iche n’ọchịchịrị nke ụwa. (Efe. 5:9) Ịmịpụta mkpụrụ a na-achọ ka anyị na-abụ ihe nlereanya pụtara ìhè n’ibi ndụ ndị Kraịst, ụdị ndị Jisọs na-anwapụta. Anyị aghaghịkwa igosipụta àgwà ndị dị ka iji obi dum eme ihe, obi eziokwu, na ịnụ ọkụ n’obi maka eziokwu ahụ. Ọ dị mkpa ka a na-egosipụta mkpụrụ a ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị nakwa n’ozi anyị.

3 Na-enwu n’Ohere Ọ Bụla: Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ.” (Mat. 5:16) N’iṅomi Jisọs, anyị na-egosipụta ìhè Jehova site n’ikwusa banyere Alaeze Chineke na nzube ya. Anyị na-enwu dị ka ndị na-enye ìhè mgbe anyị na-aga n’ebe obibi ndị mmadụ na mgbe anyị na-ekwusa eziokwu ahụ n’ụlọ ọrụ anyị, n’ụlọ akwụkwọ, n’etiti ndị agbata obi anyị, ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ anyị nwere ohere ya.—Fil. 2:15.

4 Jisọs kwuru na ụfọdụ ndị ga-akpọ ìhè ahụ asị. (Jọn 3:20) N’ihi ya anyị adịghị enwe nkụda mmụọ mgbe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ jụrụ ikwe ka “inye ìhè nke oziọma nke ebube Kraịst” wakwasị ha. (2 Kọr. 4:4) Jehova na-enyocha obi ihe a kpọrọ mmadụ, ọ dịghịkwa achọ ka ndị na-eme ajọ omume nọrọ n’etiti ndị ya.

5 Mgbe anyị na-agbaso ụzọ Jehova ma na-enwe ìhè ime mmụọ, anyị pụrụ igbukepụrụ ya ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ha esite n’omume anyị ghọta na anyị ‘nwere ìhè nke ndụ,’ mgbe ahụ a pụrụ ịkpali ha onwe ha kwa ime mgbanwe ndị dị mkpa iji ghọọ ndị na-enye ìhè.—Jọn 8:12.

6 Site n’ime ka ìhè anyị na-enwu, anyị na-ewetara Onye Okike anyị otuto ma na-enyere ndị nwere obi eziokwu aka ịbịa mara ya na inweta olileanya nke ndụ ebighị ebi. (1 Pita 2:12) Ebe anyị nwere ìhè ahụ, ka anyị jiri ya nyere ndị ọzọ aka ịhụ ụzọ isi pụta n’ọchịchịrị ime mmụọ ma rụọ ọrụ ndị kwekọrọ n’ìhè ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya