“Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu”
1. Olee onyinye pụrụ iche Chineke nyere anyị, bụ́ nke anyị kwesịrị ime ka o ruo ndị ọzọ aka?
1 Ọmarịcha ìhè anyị na-enwe malite n’ụtụtụ ruo ná mgbede na-ewetara Jehova Chineke otuto. Ma, ọ bụghị ìhè nkịtị ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha nwee kama ọ bụ “ìhè nke ndụ.” (Jọn 8:12) Ebe ọ bụ na Chineke nyere anyị onyinye pụrụ iche, ya bụ, ìhè nke eziokwu dị na Baịbụl, anyị ekwesịghị ijichi ya. Jizọs kwuru, sị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ.” (Mat. 5:16) Anyị mee ihe a Jizọs kwuru, ndị ọzọ ga-erite uru. Ebe ọ bụ na ndị mmadụ nọ n’ọchịchịrị, anyị kwesịrị ime ka ìhè a na-enwu n’ebe ha nọ. Ugbu a ka ọ kacha dị mkpa ime nke a! Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ìhè anyị na-enwuru ndị ọzọ otú ahụ Kraịst mere?
2. Olee otú Jizọs si gosi na ọ dị mkpa ime ka ìhè anyị nwuoro ndị ọzọ?
2 Ikwusa Ozi Ọma: Jizọs ji oge ya, ike ya, na ihe niile o nwere mee ka ìhè nke eziokwu dị na Baịbụl na-enwuru ndị mmadụ. Ọ gakwuuru ha n’ụlọ ha, n’ámá ha, n’elu ugwu, ya bụ, n’ebe ọ bụla ha nọ. Ọ ma na ọ bụrụ na ya akụziere ha eziokwu dị na Baịbụl, ọ ga-abara ha ezigbote uru. (Jọn 12:46) Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi bụrụ “ìhè nke ụwa,” ka ha nwee ike inyere ọtụtụ ndị ọzọ aka. (Mat. 5:14) Omume ọma ha mesoro ndị agbata obi ha na ozi ọma ha ziri ha bụ ụzọ ha si mee ka ìhè ha nwuoro ha.
3. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ìhè eziokwu Chineke nyere anyị?
3 Ndị ohu Chineke ejighị ọrụ e nyere ha ikwusara ndị ọzọ ozi ọma egwu egwu, n’ihi na a gwara ha, sị: “Na-ejenụ ije dị ka ụmụ nke ìhè.” (Efe. 5:8) Ha na-achọ ndị mmadụ aga n’ebe ọ bụla ha nwere ike ịhụ ha. Ọ bụrụ na i wepụta ohere n’oge e ji eri nri ehihie n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ na-agụ Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’ebe ndị ọzọ ga-ahụ gị, o nwere ike ime ka ndị ọzọ chọọ ka gị na ha kwurịta ihe dị na Baịbụl. Otú ahụ ka otu nwanna nwaanyị mere wee malite ịmụrụ mmadụ Baịbụl, nyekwa mmadụ iri na abụọ na klas ha akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl.
4. Olee ihe mere ịkpa àgwà ọma ji soro n’otú anyị si eme ka ‘ìhè anyị na-enwuru’ ndị ọzọ?
4 Ịkpa Ezigbo Àgwà: Otú ọzọ anyị si eme ka ìhè anyị na-enwuru ndị ọzọ bụ ịkpa ezigbo àgwà kwa ụbọchị. (Efe. 5:9) Ọ bụrụ na anyị ana-akpa àgwà ọma n’ebe anyị na-arụ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ebe ndị ọzọ anyị nọ, ọ ga-eme ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ozi ọma anyị na-ezi. (1 Pita 2:12) Dị ka ihe atụ, ọ bụ àgwà ọma nwatakịrị dị afọ ise na-akpa n’ụlọ akwụkwọ mere onye nkụzi ya ji kpọọ ndị mụrụ ya ka ha bịa ka ha na ya hụ. Ọ gwara ha, sị: “Ahụtụbeghị m nwata na-akpa ezigbo àgwà ka nwata a!” N’eziokwu, ozi ọma anyị na-ezi na àgwà ọma anyị na-akpa na-eme ka ndị mmadụ kwe ka “ìhè nke ndụ” na-enwu n’ebe ha nọ, ọ na-ewetakwara Chineke otuto.