Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/96 p. 5-6
  • Ime Ka Ìhè Anyị Nọgide Na-enwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ime Ka Ìhè Anyị Nọgide Na-enwu
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu”
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • “Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu”
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • “Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu” Ka E Too Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Gbasoo Ìhè Nke Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 7/96 p. 5-6

Ime Ka Ìhè Anyị Nọgide Na-enwu

1 Gịnị bụ ìhè? Akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa ya dị ka “ihe na-eme ka ịhụ ụzọ kwe omume.” Ma n’ezie, n’agbanyeghị nkà na ụzụ ya gaworo nnọọ n’ihu, mmadụ amabeghị n’ụzọ zuru ezu azịza nye ajụjụ Jehova jụrụ dị ka e dekọrọ na Job 38:24. Ànyị pụrụ ịga n’ihu ma ọ bụrụ na ìhè adịghị? Anyị apụghị ịdị adị ma ọ bụrụ na ìhè adịghị. Ìhè dị mkpa maka ịhụ ụzọ nkịtị, Bible na-agwakwa anyị na n’ụzọ ime mmụọ, “Chineke bụ ìhè.” (1 Jọn 1:5) Anyị na-adabere kpam kpam n’Onye ahụ ‘na-enye anyị ìhè.’—Abụ Ọma 118:27.

2 Nke a bụ eziokwu n’ụzọ anụ ahụ, ma ọ dịkwa otú ahụ ọbụna karị n’ụzọ ime mmụọ. Okpukpe ụgha eduhiewo ọha mmadụ, na-ahapụ ha n’ọchịchịrị ime mmụọ, “na-asọgharị ìsì ná mgbidi dị ka ndị ìsì.” (Aịsa. 59:9, 10) N’ịbụ onye ịhụnanya na ọmịiko ya na-enweghị ihe karịrị ha kpaliri, Jehova ‘na-ezipụta ìhè na eziokwu ya.’ (Abụ Ọma 43:3) N’ụzọ nkịtị ọtụtụ nde ndị nwere ekele azaghachiwo, na-esi “n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.”—1 Pita 2:9.

3 Jisọs Kraịst na-eje ozi dị oké mkpa n’iwebata ìhè a n’ime ụwa. Ọ sịrị: “Mụ onwe m abịawo n’ụwa ịbụ ìhè, ka onye ọ bụla nke kwere na Mụ wee ghara ịnọgide n’ọchịchịrị.” (Jọn 12:46) O chere ike, ume, na ihe onwunwe ya nile ihu n’ime ka a mata ìhè nke eziokwu. O mere njem n’akụkụ nile nke ala a mụrụ ya, na-eme nkwusa ma na-ezi ihe n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’obodo ukwu na n’obodo nta nile. Ọ tachiri obi ná mkpagbu na-akwụsịghị akwụsị nke sitere n’akụkụ nile, ma ọ nọgidesịrị ike n’ọrụ ya nke ịgbasa ìhè nke eziokwu.

4 Jisọs lekwasịrị anya n’ịhọpụta, ịzụ, na ịhazi ndị na-eso ụzọ, na-eburu n’uche otu nzube kpọmkwem. Na Matiu 5:14-16 anyị na-agụ ntụziaka o nyere ha: “Unu onwe unu bụ ìhè nke ụwa. . . . Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu Nke bi n’eluigwe.” Dị nnọọ ka Jisọs, ha ga-abụ “ndị na-enye ìhè n’ụwa,” na-agbasa ìhè nke eziokwu n’ebe nile. (Fil. 2:15) Ha ji ọṅụ nakwere ibu ọrụ ahụ, na-ewere ya dị ka nzube ha bụ isi ná ndụ. Ná mkpirikpi oge n’ikpeazụ, Pọl nwere ike ikwu na ozi ọma ahụ abụrụwo “nke e kwusara n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” (Kọl. 1:23) Ọgbakọ ndị Kraịst dum dị n’otu n’ịrụzu oké ọrụ ahụ.

5 Anyị kwesịrị inwe ekele na anyị esorowo n’etiti ndị ‘yipụworo ọrụ nile nke ọchịchịrị’ taa. (Rom 13:12, 13) Anyị pụrụ igosi ekele anyị site n’iṅomi ihe nlereanya Jisọs na ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi n’oge gara aga setịpụrụ. Mkpa maka ndị ọzọ ịnụ eziokwu ahụ dị ngwa ma dị oké mkpa ugbu a karịa n’oge ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme mmadụ. E nweghị ọrụ ọzọ a pụrụ ịmalite iji na-atụnyere ọrụ a n’ịdị ngwa na n’abamuru nke na-emetụta ihe dị ukwuu.

6 Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Na-enwu Dị Ka Ndị Na-enye Ìhè? Ụzọ bụ isi isi eme ka ìhè anyị na-enwu bụ ikere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze. Ọgbakọ ọ bụla nwere ndokwa dị n’usoro, nke a haziri ahazi maka ikwusa ozi ọma n’ókèala e kenyere ya. A na-eweta ọ̀tụ̀tụ̀ bara ụba nke akwụkwọ n’ụdị dịgasị nnọọ iche iche nakwa n’ọtụtụ asụsụ. A na-enye mmụta sara mbara site ná nzukọ dị iche iche, ndị nwere ahụmahụ na-enyekwa aka n’inye ndị ọzọ ọzụzụ n’onwe ha. Ohere ghere oghe nye ndị ikom, ndị inyom, ndị agadi, na ọbụna ụmụaka ikere òkè. A na-akpọ onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ òkù ikere òkè n’ọkwá ọ bụla ikike na ọnọdụ ya nyere ohere ya. Ọrụ nile nke ọgbakọ na-elekwasị anya n’ime nkwusa, na-eme ndokwa iji nyere onye òtù ọ bụla aka ikere òkè n’ụzọ ụfọdụ. Mkpakọrịta chiri anya a na-eso ọgbakọ enwe mgbe nile bụ ụzọ kasị mma isi jide n’aka na ìhè anyị nọgidere na-enwu.

7 Anyị pụrụ inwu enwu n’ụzọ nwere ike ghara ịgụnye iji ọnụ agba àmà. Anyị pụrụ ịdọrọ mmasị ndị ọzọ site nanị n’àgwà anyị. Nke ahụ bụ ihe Pita bu n’obi mgbe ọ gbara ume, sị: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ; ka ha wee site n’ọrụ ọma nile unu, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto.” (1 Pita 2:12) Ọtụtụ na-ekpe ọrụ ma ọ bụ òtù ikpe site n’àgwà nke ndị na-esonyere ya. Mgbe ndị na-ekiri ihe na-emenụ na-ahụ ndị mmadụ dị ọcha n’omume, na-akwụwa aka ọtọ, dị n’udo, ma na-erubere iwu isi, ha na-ele ndị dị otú ahụ anya dị ka ndị dị iche, na-ekwubikwa na ha na-agbaso ụkpụrụ ndị dị n’ọnọdụ ka nnọọ elu karịa nke ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-agbaso. Ya mere di na-eme ka ìhè ya na-enwu mgbe ọ na-asọpụrụ ma jiri nwunye ya akpọrọ oké ihe n’ụzọ ịhụnanya; nwunye na-eme otu ihe ahụ site n’ịkwanyere ịbụisi di ya ùgwù. Ụmụaka na-eguzopụ dị ka ndị dị iche mgbe ha na-erubere ndị mụrụ ha isi ma na-ezere mmekọahụ rụrụ arụ na iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. A na-ewere onye e were n’ọrụ nke ji ọrụ ya kpọrọ ihe, na-akwụwa aka ọtọ, ma na-echebara ndị ọzọ echiche dị ka onye bara oké uru. Site n’igosipụta àgwà ndị Kraịst ndị a, anyị na-eme ka ìhè anyị na-enwu, na-ezi ndị ọzọ ụzọ anyị si adị ndụ.

8 Ime nkwusa bụ ịgwa ndị ọzọ okwu banyere ihe anyị mụtaworo site n’Okwu Chineke. A na-eme nke ahụ site n’ebe ikpo okwu ọha mmadụ ma ọ bụ n’ọnụ ụzọ, ma a kparaghị ya ókè maka nanị oge dị otú ahụ ma ọlị. Ọrụ anyị kwa ụbọchị na-eme ka anyị na ọtụtụ ndị mmadụ na-emekọrịta ihe. Ugboro ole n’ụbọchị ka ị na-agwa ndị agbata obi bidewere gị okwu? Ugboro ole ka mmadụ na-akụ aka n’ọnụ ụzọ gị? Mmadụ ole dị iche iche ka gị na ha na-emekọrịta ihe mgbe ị na-eje ịzụta ihe, nọ na bọs, ma ọ bụ na-arụ ọrụ n’ọrụ ego gị? Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto nọ n’ụlọ akwụkwọ, ị̀ pụrụ ịgụ ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ n’otu n’otu ị na-agwa okwu kwa ụbọchị? Ohere ịgwa ndị ọzọ okwu dị nnọọ ọtụtụ. Nanị ihe ọ dị gị mkpa ime bụ iburu echiche Akwụkwụ Nsọ ole na ole n’uche, debe Bible na traktị ụfọdụ n’ebe aka ga-eru ha ngwa ngwa, na-ebutekwa ụzọ n’ikwu okwu mgbe i nwere ohere ya.

9 Ọ bụ ezie na ịgba àmà mberede dị nnọọ mfe, ụfọdụ na-ala azụ ịnwale ya. Ha pụrụ ịnọrọ duu, na-agbakwasị ụkwụ na ha na-eme ihere gabiga ókè ma ọ bụ na ahụ na-ama ha jijiji ịgakwuru ndị ha na-amaghị ndị ha bụ. Ụjọ pụrụ ijide ha banyere ịdọta mmasị n’ebe onwe ha nọ ma ọ bụ inweta nzaghachi na-akpasu iwe. Ndị nwere ahụmahụ n’ịgba àmà mberede pụrụ ịgwa gị na o siri ike inwe ihe mere a ga-eji nwee nchegbu. Ndị ọzọ dị nnọọ ka anyị n’ụzọ bụ isi; ha nwere otu mkpa ndị ahụ, na-enwe otu nchegbu ndị ahụ, na-enwekwa otu ọchịchọ ahụ maka ha onwe ha na ezinụlọ ha. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ga-eji obi ọma zaghachi ezi mmụmụ ọnụ ọchị ma ọ bụ ekele enyi na enyi. Iji malite, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i ‘nwee nkwuwa okwu.’ (1 Tesa. 2:2) Otú ọ dị, ozugbo ị malitere, ihe si na ya pụta pụrụ iju gị anya ma nye gị obi ụtọ.

10 Anyị Bụ Ndị A Gọziri Agọzi Mgbe Anyị Na-eme Ka Ìhè Anyị Na-enwu: Ndị a bụ ihe atụ ụfọdụ nke ahụmahụ na-enye ume ọhụrụ ndị na-esite n’ịgba àmà mberede: Otu nwanyị dị 55 afọ na-agbalị ịgafere okporo ámá. Ka ọ fọrọ nke nta ka otu ụgbọ ala kụọ ya, otu nwanna nwanyị dọtara ya n’aka ma kpụga ya n’ebe na-adịghị ize ndụ, na-asị: “Biko lezie anya. Anyị na-ebi n’oge dị oké ize ndụ!” Mgbe ahụ ọ kọwara ihe mere oge ndị a ji dị ize ndụ otú a. Nwanyị ahụ jụrụ sị, “Ị̀ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova?” Ebe ọ nataworo nwanne ya nwanyị otu n’ime akwụkwọ anyị, nwanyị ahụ chọrọ izute otu n’ime Ndịàmà Jehova, nzute a mekwara ka o kwe omume.

11 Otu nwanna nwanyị na otu nwanyị malitere mkparịta ụka n’otu ụlọ nchere dị n’ọfịs dọkịta. Nwanyị ahụ gere ntị nke ọma, mgbe ahụ kwuo, sị: “Eri oge ụfọdụ, anọwo m na-ezute Ndịàmà Jehova; ma ọ bụrụ na mụ onwe m aghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova n’ọdịnihu, ọ ga-abụ n’ihi ihe ị ka gwapụrụ m. Ige gị ntị yiri ka ịmalite ịhụ ìhè n’ebe gbara ọchịchịrị.”

12 Otu omume obi ọma pụrụ ịbụ ihe mgbakwasị ụkwụ iji nyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu. Ka ha ji ụkwụ si n’ozi ubi na-ala, ụmụnna nwanyị abụọ hụrụ otu agadi nwanyị yiri ka ahụ esighị ya ike mgbe o si na bọs rịtuo. Ha kwụsịrị ma jụọ nwanyị ahụ ma ọ chọrọ enyemaka. O juru ya anya nke ukwuu na mmadụ abụọ ọ na-amaghị ndị ha bụ ma ọlị ga-egosi mmasị n’ebe ọ nọ nke na o siri ọnwụ ịmata ihe kpaliri omume obi ọma dị otú ahụ. Nke a meghere ụzọ maka ịgba àmà. Nwanyị ahụ nyere adres ya n’egbughị oge, jirikwa ikpo ọkụ kpọọ ha ka ha bịa leta ya. A malitere ọmụmụ ihe. N’oge na-adịghị anya nwanyị ahu malitere ịbịa nzukọ, ọ na-esokwa ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu ahụ ugbu a.

13 Otu nwanna nwanyị meworo agadi na-eji ohere ịgba àmà isi ụtụtụ n’ụsọ oké osimiri eme ihe. Ọ na-ezute ndị odibo nwanyị, ndị ndekọ ụlọ akụ̀, na ndị ọzọ na-eme mkpagharị ụtụtụ ha na gburugburu ụsọ oké osimiri ahụ. Ọ na-anọdụ na bench na-eduzi ọmụmụ Bible. Ọtụtụ ndị amụtawo eziokwu n’ọnụ ya, bụrụkwa Ndịàmà Jehova ugbu a.

14 N’ebe ọrụ ego ya, otu nwanna nwanyị nụrụ ka onye ọrụ ibe ya na-ekwu banyere otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke o chere na ọ pụrụ ịgwọta nsogbu ụwa. Nwanna nwanyị ahụ kwuru okwu, na-akọ nkwa dị iche iche banyere ihe Alaeze Chineke ga-eme. Mkparịta ụka a e mere n’ebe ọrụ dugara n’ọmụmụ Bible chiri anya n’ebe obibi, nwanyị ahụ na di ya mesịkwara ghọọ Ndịàmà.

15 Echefula Mgbe Ọ Bụla na Ị Bụ Onyeàmà! Mgbe Jisọs kọwara ndị na-eso ụzọ ya dị ka “ìhè nke ụwa,” uche ya bụ na ha kwesịrị ịdị na-enyere ndị ọzọ aka irite uru site ná nghọta ime mmụọ nke Okwu Chineke. Ọ bụrụ na anyị etinye ndụmọdụ Jisọs n’ọrụ, olee otú anyị ga-esi were ozi anyị?

16 Mgbe ha na-achọ ọrụ, ụfọdụ ndị na-ahọrọ ọrụ nwa oge. Ha na-akpara oge na mgbalị ha ga-etinye na ya ókè n’ihi na ha na-ahọrọ iji ihe ka ukwuu n’oge ha na-achụso ọrụ ha hụrụ dị ka nke na-akwụghachi ụgwọ karị. Ànyị na-ele ozi anyị anya n’ụzọ yiri nke ahụ? Ọ bụ ezie na anyị pụrụ inwe echiche ibu ọrụ na ọbụna dịrị njikere isetịpụ oge ụfọdụ maka ozi ahụ, mmasị anyị bụ isi ò kwesịrị ịdị n’ebe ọzọ?

17 N’ịghọta na e nweghị ihe dị ka onye Kraịst nwa oge, anyị mere nraranye anyị, ‘na-ajụ onwe anyị’ ma na-ekwenye ‘ịnọgide’ na-eso Jisọs. (Mat. 16:24, NW) Ọchịchọ anyị bụ ịnọgide na-eji “obi dum” na-eje ozi, na-eji ohere ọ bụla dịnụ na-eme ka ìhè anyị na-enwu iji ruo ndị mmadụ n’ebe ọ bụla ha nọ. (Kọl. 3:23, 24) Anyị aghaghị ịnagide àgwà nke ụwa, jigide ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere ná mmalite, na-ejide n’aka na ìhè anyị nọgidere na-enwu zaa. Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ahapụwo ịnụ ọkụ n’obi ha ka ọ nyụọ, ìhè ha aghọọkwa nanị ire ọkụ na-anyụ anyụ, nke na-esi ike isite n’ebe dị anya na-ahụ. Enyemaka pụrụ ịdị onye dị otú ahụ mkpa iji nwetaghachi ịnụ ọkụ n’obi furu efu maka ozi ahụ.

18 Ụfọdụ pụrụ ịchọ ịla azụ n’ihi na ozi anyị adịghị amasị ọtụtụ ndị. Pọl sịrị na ozi banyere Kraịst “bụụrụ ndị na-ala n’iyi ihe nzuzu.” (1 Kọr. 1:18) Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ kwuru, ọ kpọsara n’ụzọ dị ike, sị: “Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m.” (Rom 1:16) Onye ihere na-eme na-eche na ya dị ala ma ọ bụ na ya erughị eru. Olee nnọọ otú ihere pụrụ isi na-eme anyị mgbe anyị na-ekwu banyere Eze Kasị Elu nke eluigwe na ala na ndokwa magburu onwe ha o meworo maka obi ụtọ ebighị ebi anyị? Ọ bụ ihe a na-apụghị ichetụ n’echiche na anyị ga-eche na anyị dị ala ma ọ bụ erughị eru mgbe anyị na-agwa ndị ọzọ eziokwu ndị a. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịbụ ndị a kpaliri ime ike anyị nile, na-egosipụta nkweta anyị na anyị ‘enweghị ihe ga-eme anyị ihere.’—2 Tim. 2:15.

19 Ìhè nke eziokwu nke na-enwu ugbu a n’ala ndị dị gburugburu ụwa ji ikpo ọkụ na-enye olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs ụwa ọhụrụ. Ka anyị gosi na anyị eburuwo n’obi ndụmọdụ ahụ bụ́ ime ka ìhè anyị nọgide na-enwu! Ọ bụrụ na anyị emee nke ahụ, anyị ga-enwe ihe mere anyị ga-eji aṅụrị ọṅụ dị nnọọ ka ndị na-eso ụzọ ahụ bụ́ ndị “na-adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs, na Ọ bụ Kraịst” kwa ụbọchị. (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Ọrụ 5:42.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya