Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 9/1 p. 4-7
  • À Pụrụ Inwe Ezi Nchebe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Pụrụ Inwe Ezi Nchebe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụdị nke Ikpere Arụsị
  • Ọnyà nke Mgbaasị
  • Ịdọbi Agbụ Nile nke Nkwenkwe Ụgha
  • Inweta Nchebe Chineke
  • Ọgwụ Isi Ọma Hà Pụrụ Ichebe Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Itinye Aka n’Anwansi—Gịnị Dị Njọ na Ya?
    Teta!—2002
  • Gịnị Dị Njọ n’Ime Mgbaasị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Nabata Aka Jehova Na-enyere Anyị Iji Guzogide Ndị Mmụọ Ọjọọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 9/1 p. 4-7

À Pụrụ Inwe Ezi Nchebe?

ONYE edemede bụ́ Ralph Waldo Emerson nwere mgbe o kwuru, sị: “Ndị umengwụ na-ekwenye n’isi ọma . . . Ndị dimkpa na-ekwenye n’ihe mere ihe na ihe o mere.” Ee, onye na-etinye okwukwe n’ike nke ọgwụ nchebe na ọgwụ isi ọma na-ahapụrụ ike ndị a na-adịghị ahụ anya nchịkwa nke ndụ ya. Ọ na-eleghara ezi uche na nchezi echiche anya ma nakwere egwu nzuzu, nke nkwenkwe ụgha.

Otú ọ dị, Bible pụrụ ime ka mmadụ pụọ n’ohu egwu ndị dị otú ahụ. Ọ na-egosi na ọgwụ nchebe na ọgwụ dị iche iche enweghị isi, ha enweghị ike. N’ụzọ dị aṅaa? Dị ka akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, “e chere na ọgwụ nchebe na-enweta ike ha site ná njikọ ha na, [gụnyere ihe ndị ọzọ], ikike dị iche iche nke okike.” Ikike ndị a pụrụ ịbụ ‘mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ’ ma ọ bụ ‘ike nke isi ọma.’ Ma Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Ya mere, e nweghị mmụọ ọ bụla nke ndị nwụrụ anwụ nke pụrụ inyere ndị dị ndụ aka ma ọ bụ merụọ ha ahụ; e nweghịkwa ikike ọ bụla a na-adịghị ahụ anya dị ka isi ọma nke pụrụ ịrụ ọrụ maka abamuru gị.

N’oge Bible, Chineke katọrọ ndị na-ahapụ ya, ndị na-echezọ ugwu nsọ ya, “ndị na-edoro Gad [“chi Isi Ọma,” NW] table n’usoro, ndị na-agbajuru Meni [“chi Akara Aka,” NW] mmanya gwara ọgwa.” Kama inweta nchebe, e kenyere ndị ahụ na-akwado isi ọma ịga ná mbibi. “M ga-agụkọta unu nye mma agha,” ka Jehova Chineke sịrị.—Aịsaịa 65:11, 12.

Site n’ime majik, mba oge ochie bụ́ Babilọn n’otu aka ahụ tinyere okwukwe ná nchebe nke ikike ndị dị omimi. Ma Babilọn ka nwetakwara ọdachi. “Nọgide n’ịkọ ọgwụ gị na oké mgbaasị gị,” ka Aịsaịa onye amụma mara aka. “Eleghị anya ị pụrụ inweta enyemaka site n’aka ha . . . Ma ee e! n’agbanyeghị ọtụtụ aghụghọ gị nile ị dịghị ike.” (Aịsaịa 47:12, 13, The New English Bible) Mgbe oge na-aga mba ahụ kwụsịrị ịdị adị ma ọlị. Itinye okwukwe ná mgbaasị ghọrọ ihe efu. N’otu aka ahụ, ọ dịghị ọgwụ nchebe ma ọ bụ ọgwụ isi ọma, ma ọ bụ ọtụmọkpọ ọ bụla pụrụ ime ihe iji nyere gị aka ma ọ bụ chebe gị.

Ụdị nke Ikpere Arụsị

Ka o sina dị, ọtụtụ ma eleghị anya agaghị ahụ ihe dị njọ n’ibu nkume crystal, ụkwụ òké bekee, ma ọ bụ medal okpukpe a na-anya n’olu. Ọ̀ bụ na ihe ndị a abụghị nanị ọla oyiyi na-adịghị emerụ ahụ? Ọ bụghị, n’echiche nke Bible. Ọ na-asị na ihe omume mgbaasị abụghị ma ọlị ihe na-adịghị emerụ ahụ.

Iji ọgwụ nchebe eme ihe bụ otu ụdị nke ikpere arụsị—ihe a katọrọ n’ụzọ doro anya n’Okwu Chineke. (Ọpụpụ 20:4, 5) N’eziokwu, mmadụ pụrụ iche na ya adịghị efe ọgwụ nchebe ma ọ bụ ọtụmọkpọ kpọmkwem. Ma ọ̀ bụ na mmadụ nanị inwe ya adịghị egosi àgwà nsọpụrụ, nke ofufe n’ebe ike mgbaasị ndị a na-adịghị ahụ anya dị? Ọ̀ bụkwa na ọ bụghị eziokwu na a na-enyekarị ọgwụ ndị ahụ n’onwe ha nlebara anya ofufe (dị ka isutu ọnụ)? Ma Bible, na 1 Jọn 5:21, na-adụ ndị Kraịst ọdụ, sị: “Cheenụ onwe unu nche ka unu ghara ikpere arụsị.” Ọ̀ bụ na nke a agaghị agụnye ihe ndị a na-ele anya dị ka ọgwụ isi ọma ma ọ bụ ọgwụ nchebe?

Ọnyà nke Mgbaasị

Site n’iji ọgwụ nchebe eme ihe, mgbaasị na-amatakwa ọtụtụ ndị n’ọnyà. N’eziokwu, ụfọdụ pụrụ ibu nkume crystal ma ọ bụ ngwakọta majik dị ka ihe omenala karịa ịbụ site ná nkwenye ha. Ma dị nnọọ ka iso onye akwụna na-eme mgbaratụ pụrụ iduga n’iburu ọrịa AIDS, ịdị na-etinye aka ná mgbaasị pụkwara ịkpata ihe ọdachi dị iche iche. Ọ bụ ezi ihe mere Chineke ji machie ndị Israel ime majik, ịjụ ndị mmụọ ase na ịkọ ọdịnihu. “Ihe arụ nke Jehova ka onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ,” ka Bible na-adọ aka ná ntị.—Deuterọnọmi 18:10-14.

Gịnị kpatara mmachibido nke a siri ike? N’ihi na ikike ndị a na-adịghị ahụ anya nọ n’azụ ihe omume ndị dị otú ahụ abụghị ma mmụọ ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ ike nke isi ọma kama ọ bụ Setan Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya.a E jikọkwara iji ọgwụ nchebe eme ihe kpọmkwem n’ofufe ndị mmụọ ọjọọ. Akwụkwọ bụ́ Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words na-asị: “Ná mgbaasị, iji ọgwụ, ma ọ bụ nke nkịtị ma ọ bụ nke dị ike eme ihe, bụ nke ya na ịgọ mmụọ na ịrịọ ikike mgbaasị dị iche iche arịrịọ na-esokarị, na-eji ọgwụ, ọgwụ nchebe, na ihe ndị ọzọ, eme ihe.”

Ya mere, onye nwere ọgwụ anwansị na-etinye aka ná mgbaasị. Ọ nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye e webatara n’okpuru ajọ mmetụta na nchịkwa nke “chi nke oge a”—bụ́ Setan Ekwensu. (2 Ndị Kọrint 4:4) Mgbe ahụ ọ bụ ezi ihe mere Bible ji nye anyị iwu izere ụdị nile nke mgbaasị.—Ndị Galetia 5:19-21.

Ịdọbi Agbụ Nile nke Nkwenkwe Ụgha

Ka o sina dị, akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Ma eleghị anya nkwenkwe ụgha ga na-ekere òkè ná ndụ ogologo oge nile ndị mmadụ na-atụ ibe ha egwu, gharakwa iji ọdịnihu ha n’aka.” Ma Ndịàmà Jehova na-enyere ọtụtụ mmadụ aka inwere onwe ha pụọ na nkwenkwe ụgha ndị na-emerụ ahụ. Otu nwanyị bụ́ onye South Africa na-echeta, sị: “Ndị mmụọ ọjọọ nyere m nsogbu, ụlọ m jupụtakwara na muti iji chebe m megide ha.” Ndịàmà Jehova nyeere ya aka ịhụ ihe ize ndụ nke iji anwansị egwu egwu. Gịnị bụ nzaghachi ya? “M malitere ịtụfusị ihe ọ bụla m nwere nke e jikọrọ ya na ofufe ndị mmụọ ọjọọ,” ka ọ na-ekwu. “Ahụ ike m dịwanyere mma. M raara ndụ m nye ijere Jehova ozi, e mekwara m baptism.” Ugbu a o nwerewo onwe ya pụọ n’ohu nkwenkwe ụgha na mgbaasị.

Tụleekwa otu dibịa mkpọrọgwụ bụ onye Nigeria, nke gwakọtara mgbaasị n’ọrụ ịgwọ ọrịa ya. Ọtụtụ mgbe na-eji iyi egwu na ịkpọ iyi eme ihe, ọ na-ejikarị ike achụpụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ ya mgbe ha ga-akpọtụrụ ya. Ọbụna na n’otu mgbe ọ kwadebere otu ngwọkọta pụrụ iche, gọọ mmụọ n’elu ya, wee fụọ ya n’ihu otu Onyeàmà! “N’ụbọchị asaa ị ga-anwụ!” ka o tiri mkpu kwuo. Mgbe ụbọchị asaa gasịrị Onyeàmà ahụ lọghachiri, na-eme ka dibịa mkpọrọgwụ ahụ gbapụta, na-ekwere na ya ahụwo mmụọ! Ebe e kpugheworo majik ya dị ka ihe na-enweghị isi, o kwere ka e duziere ya ọmụmụ Bible, ma mesịakwa ghọọ Onyeàmà n’onwe ya.

A pụkwara ime ka gị onwe gị pụọ n’ohu nke ihe nkegide nile nke egwu na nkwenkwe ụgha. Anyị kwere na nke a pụrụ ịbụ ihe na-adịghị mfe. Ma eleghị anya i tolitewo n’ọdịnala ebe onye ọ bụla na-eji ọgwụ nchebe na ọgwụ isi ọma dị iche iche eme ihe. Ndị Kraịst n’Efesọs oge ochie chere ihe ịma aka dị otú ahụ ihu. Ha biri n’etiti ọdịnala nwere oké mmetụta nke mgbaasị. Gịnị ka ha mere mgbe ha mụtara eziokwu nke Okwu Chineke? Bible na-asị: “Ọ dịghịkwa mmadụ ole na ole n’etiti ndị na-eme mgbaasị kpokọtara akwụkwọ ha, rechapụ ha ọkụ n’ihu ọha: ha wee gụọ ọnụ ahịa ha, wee hụ na ọ bụ [iri puku ọlaọcha ise].”—Ọrụ 19:19.

Inweta Nchebe Chineke

Ọ bụrụ na i wepụ akụkụ nile nke nke anwansị n’ebe ị nọ, ọ̀ bụ na ị gaghị anọ n’enweghị nchebe? N’ụzọ megidere nke ahụ, “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike, o mewo ka a chọta ya n’inye aka nke ukwuu ná mkpagbu nile.” (Abụ Ọma 46:1) Nchebe Chineke ga-apụta ìhè karịsịa mgbe ọ ga-ebibi ajọ usoro ihe nke a. “Onyenwe anyị matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke, na idebe ndị ajọ omume n’ahụhụ mmehie ruo ụbọchị ikpe.”—2 Pita 2:9; tụlee Abụ Ọma 37:40.

Ka ọ dị ugbu a, ‘mgbe na ihe ndapụta na-adabara anyị nile.’ (Eklisiastis 9:11) Chineke adịghị ekwe nkwa na ndị na-ejere ya ozi ga-ebi ndụ nke e ji “ọgwụ” chebe ma ọ bụ na ya ga-ekpuchi ha pụọ ná mmerụ ahụ onwe onye. Ka o sina dị, ọ na-ekwe nkwa ichebe ọnọdụ ime mmụọ anyị na mmekọrịta anyị na ya. (Abụ Ọma 91:1-9) N’ụzọ dị aṅaa? Otu ihe bụ na ọ na-enye anyị iwu na ụkpụrụ ndị pụrụ ịbara anyị uru ma chebe anyị pụọ ná mmetụta na-emerụ emerụ nke Setan. (Aịsaịa 48:17) Site n’anyị inweta ihe ọmụma nke ụzọ Jehova, ‘izuzu ga na-eche anyị nche, nghọta ga-echebe anyị’—dị ka ihe atụ, pụọ n’ihe omume ndị na-adịghị eweta uru ma ọ bụ na-emerụ ahụ.—Ilu 2:11.

Ụzọ ọzọ Chineke si echebe anyị bụ site n’inye “ọkịka nke ike” n’oge ule. (2 Ndị Kọrint 4:7) Mgbe ọnọdụ yikwara egwu irikpu onye Kraịst, Ọ na-enye “udo nke Chineke, nke kachasị uche nile” iche obi na echiche uche ya nche. (Ndị Filipaị 4:7) Ee, a na-akwadebe onye Kraịst “iguzogide ihe nile Ekwensu na-ezupụta.”—Ndị Efesọs 6:11-13.

Olee otú ị pụrụ isi nweta nchebe dị otú ahụ? Malite site n’ịnara ihe ọmụma banyere Jehova na Ọkpara ya, Jisọs Kraịst. (Jọn 17:3) Ndịàmà Jehova pụrụ ime ihe dị ukwuu inyere gị aka na nke a. Ka ị na-azụlite mmekọrịta chiri anya n’ebe Jehova nọ, ị ga-amalite inweta nchebe obi ọma ya. Chineke na-ekwu, dị ka anyị na-agụ n’Abụ Ọma 91:14, sị: “N’ihi na ọ hụwo m n’anya sie ike, m ga-emekwa ka ọ gbapụta: m ga-eme ka ọ nọọ n’ebe dị elu, n’ihi na ọ mawo aha m.”

N’ezie, ọ bụrụ na ị na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya, Chineke ga-emesịa jiri ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ gọzie gị. Jehova na-ekwesi nkwa ike maka ndị ga-adị ndụ n’oge ahụ, sị: “Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.” (Maịka 4:4) Ọrịa na ọnwụ agaghị adịkwa. (Mkpughe 21:4) Ma, ọbụna ugbu a, ị pụrụ inwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nchebe—ma ị zụlite mmekọrịta chiri anya n’ebe Jehova nọ. Dị ka ọbụ abụ ahụ, ị ga-enwe ike ikwu sị: “Inye aka m na-esi n’aka Jehova bịa, Onye Meworo eluigwe na ụwa.”—Abụ Ọma 121:2.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ nta bụ́ Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., na-ebipụta.

[Foto dị na peeji nke 6]

Ndị Kraịst nọ n’Efesọs bibisịrị ihe nile metụtara anwansị

[Foto dị na peeji nke 7]

N’okpuru Alaeze Chineke, egwu agaghị adịkwa ọzọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya