Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 9/1 p. 3-4
  • Ọgwụ Isi Ọma Hà Pụrụ Ichebe Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọgwụ Isi Ọma Hà Pụrụ Ichebe Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọchịchọ A Na-achọ Nchebe
  • Ike Aghụghọ nke Ọgwụ Nchebe
  • À Pụrụ Inwe Ezi Nchebe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ị̀ Na-echeta?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nkwenkwe Ụgha—n’Ihi Gịnị Ka O Ji Nnọọ Dịgide?
    Teta!—1999
  • Nkwenkwe Ụgha Ọ̀ Na-achịkwa Ndụ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 9/1 p. 3-4

Ọgwụ Isi Ọma Hà Pụrụ Ichebe Gị?

NKUME crystal e bu n’akpa uwe onye Brazil. Mkpụrụ ego isi ọma nke onye egwuregwu America. Obe Senti Brigid nke kokwasị n’elu àkwà n’ime ụlọ nke otu ezinụlọ ndị Ireland. Ọtụtụ nde mmadụ na-eji ihe ndị dị otú ahụ eme ihe dị ka ọgwụ isi ọma ma ọ bụ ọgwụ nchebe.a Ha kwenyere na inwe ọgwụ ndị a pụrụ igbochi mmerụ ahụ ma wetara ha isi ọma.

Tụlee Brazil, dị ka ihe atụ. Dị ka magazin bụ́ Veja na-ekwu, ọtụtụ ndị Brazil na-ebu “iberibe okwute na nkume ndị na-adịchaghị oké ọnụ ahịa ndị a sịrị na ha nwere ike ịdọta isi ọma na ume ndị dị mkpa nye ndị nwere ha.” N’ihi ịtụ egwu ịkparị ike anwansị ndị ahụ, ndị ọzọ n’ala ahụ na-edebe ihe oyiyi ma ọ bụ ihe odide okpukpe n’elu mgbidi ájá nke ebe obibi ha. Ụfọdụ ọbụna na-eji Bible emere ọgwụ dị nsọ; ha na-edokwasị ya n’elu table, mee ka o ghegide oghe n’Abụ Ọma nke 91.

N’ebe ndịda Africa, muti, ma ọ bụ ọgwụ ọdịnala, bụ nke a na-eji eme ihe n’otu aka ahụ, ọ bụghị nanị maka ike ọgwụgwọ ya dị iche iche, kama dị ka ihe nchebe megide isi ọjọọ. A na-echekarị na ọrịa, ọnwụ, mgbanwe n’ọnọdụ akụ na ụba, na ọbụna mmekọrịta ịhụnanya na-agaghị nke ọma, na-esite n’ọgwụ ndị iro kọrọ mmadụ ma ọ bụ site n’emeghị ka obi jụrụ ndị ikwu nwụrụ anwụ. A na-enwetakarị muti site n’aka dibịa afa obodo, onye na-agwọkọta ọgwụ site n’ihe ọkụkụ, osisi, ma ọ bụ akụkụ ahụ anụmanụ. Otú ọ dị, ọ dị mma ịmara na a kparaghị muti ókè ma ọlị n’ime ime obodo; omume ahụ gbasara ebe nile n’obodo ukwu ndị dị na South Africa. Ndị azụmahịa na ndị gụrụ akwụkwọ mahadum so ná ndị na-adabere na muti.

Ọchịchọ a na-achọ isi ọma jukwara ebe nile ná mba dị iche iche nke Europe. Akwụkwọ bụ́ Studies in Folklife Presented to Emyr Estyn Evans na-eme ka anyị mara na: “O siri ike inwe parish ma ọ bụ obodo dị na Ireland ebe a na-agaghị ahụ ebe e kegidere ígwè a na-agbanye ịnyịnya n’ụkwụ n’ahụ ma ọ bụ n’elu ibo ụzọ nke ebe obibi ụfọdụ ma ọ bụ ụlọ ndị a rụpụrụ iche.” Obe ndị e ji eriri osisi rush kpaa jupụtara ejupụta ọbụna karị, na-ekokwasị n’elu àkwà na n’elu ibo ụzọ iji na-eweta isi ọma. Ndị na-ahụ ihe na-aganụ sịrị na, n’elu elu, ọtụtụ ndị Ireland na-ewere nkwenkwe ụgha ndị dị otú ahụ dị ka ihe nta. Ma, ole na ole na-elefuru ha anya kpam kpam.

Ọchịchọ A Na-achọ Nchebe

Gịnị bụ ihe ndọrọ nke nkwenkwe ụg̣ha ndị dị otú ahụ? O yiri ka ha na-emeju mkpa bụ isi maka nchebe nke ndị mmadụ nwere. N’ezie, mmadụ ole na-anọ ná nchebe n’ụlọ ha, ya fọdụzịakwa ịga ije n’okporo ámá n’abalị? Gbakọnyere nke ahụ ndọlị nke inweta ihe e ji ebi ndụ na ilekọta ụmụaka. Ee, anyị na-ebi n’ihe Bible na-akpọ “oge nsogbu.” (2 Timoti 3:1, The New English Bible) Ya mere ọ bụ nnọọ ihe a ga-atụ anya ya na ndị mmadụ ga-enwe ọchịchọ siri ike maka nchebe.

Nke a pụrụ ịdị otú ahụ karịsịa n’ọdịnala ebe ụdị dị iche iche nke mgbaasị na majik na-ewu ewu. Egwu nke ihe ndị e chere na ha bụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ nke ịbụ onye dabara n’ọbụbụ ọnụ nke onye iro ya pụrụ ime ka nchebe ụgha nke ọgwụ ma ọ bụ ọgwụ nchebe yie ihe dị oké mkpa. Ka o sina dị, akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-asị: “Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ nwere egwu ndị na-eme ka ha ghara ịnọ ná ntụkwasị obi. Nkwenkwe ụgha na-enye aka imeri egwu ndị dị otú ahụ site n’inye ntụkwasị obi. Ha na-emesi ndị mmadụ obi ike na ha ga-enweta ihe ha chọrọ ma zere nsogbu.”

Ike Aghụghọ nke Ọgwụ Nchebe

Ya mere, ndị mmadụ gburugburu ụwa na-eyi, na-ebugharị, ma na-egosi ọgwụ nchebe, ọtụmọkpọ, na ọgwụ isi ọma dị iche iche. Ma ezi uche ọ̀ dị n’ikwere na ọgwụ mmadụ mere pụrụ inye nchebe ọ bụla bụ́ ezie? Ọtụtụ n’ime ihe ndị a na-ejikarị eme ihe dị ka ọgwụ bụ ihe ndị a na-emepụta n’ụba maka orire. Ọ̀ bụ na ọ dịghị emegide ezi uche na nchezi echiche ikwere na ihe a kwụkwụkọtara n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe pụrụ inwe ike majik? Ọbụnakwa ngwọkọta ọgwụ nke dibịa ime obodo mebere adịghị ihe ọzọ ọ bụ e wezụga ngwakọta nke ihe nkịtị dị iche iche—mkpọrọgwụ, akwụkwọ osisi, na ihe ndị yiri ha. Gịnị mere nchịkọta dị otú ahụ ga-eji nwee ikike majik? E wezụga nke ahụ, è nwere ezi ihe àmà ọ bụla nke na ndị na-eji ọgwụ nchebe eme ihe na-adị ogologo ndụ—ma ọ bụ nwee obi ụtọ—karịa ndị na-adịghị eji ha. Ọ̀ bụ na ndị na-eme ọgwụ nchebe ndị dị otú ahụ n’onwe ha adịghị adaba n’ọrịa na ọnwụ?

Kama inye ndị mmadụ ezi nchebe ọ bụla na mmetụta nke nchịkwa ná ndụ ha, iji ọgwụ nchebe na ọgwụ isi ọma dị iche iche eme ihe n’ụzọ nkwenkwe ụgha n’ezie na-akụda ndị mmadụ obi pụọ n’iche nsogbu ha ihu site n’ezi ọgụgụ isi ma na-agba ha ume ilegara isi ọma anya dị ka ihe ngwọta ihe nile. Ịtụkwasị obi n’ike ọgwụ nchebe pụkwara inye onye ji ya eme ihe echiche ụgha nke ịnọ ná nchebe. Nwoke mmanya na-egbu pụrụ ime nzọrọ na e nweghị mgbochi ọ bụla ná nzaghachi ahụ ya na ikike ya nile, ma ọ bụrụ na ọ nwaa ịkwọ ụgbọ, o yikarịrị ka ọ ga-emerụ onwe ya ma ọ bụ ndị ọzọ ahụ. Onye tinyere obi ike ya n’ike ọgwụ nchebe pụrụ n’otu aka ahụ imerụ onwe ya ahụ. Inwe echiche ụgha nke ịbụ onye e chebere, ọ pụrụ inwe mkpali ịnwale ihe nzuzu ndị dị ize ndụ ma ọ bụ ime mkpebi ndị amamihe na-adịghị na ha.

Ikwenye n’ike ọgwụ nchebe na-ewetakwa ihe ize ndụ ndị ọzọ dị oké njọ bụ́ ndị zoro ezo pụọ n’anya ọtụtụ nde ndị ji ha eme ihe. Gịnị bụ ihe ize ndụ ndị a, è nwekwara ụzọ dị mma isi gbochie mmerụ ahụ? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary na-akọwa “ọgwụ nchebe” dị ka “ọgwụ (dị ka ọla) nke a na-edekwasịkarị okwu ma ọ bụ ihe atụ majik iji chebe onye yi ya megide ihe ọjọọ (dị ka ọrịa ma ọ bụ amoosu) ma ọ bụ iji nyere ya aka.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya