Ị̀ Na-echeta?
Ì nwewo mmasị ịgụ mbipụta ndị ọhụrụ nke Ụlọ Nche? Ọdịmma, lee ma ị ga-azali ajụjụ ndị na-esonụ:
▫ Enyemaka dị aṅaa dị irè ka a pụrụ inye ndị ọrịa na ndị agadi n’ime ọgbakọ taa?
N’ọgbakọ oge ochie nke ndị Kraịst, e mere ndekọ nke ndị inyom di ha nwụrụ nọ ná mkpa nkwado ihe onwunwe. (1 Timoti 5:9, 10) N’otu aka ahụ taa, ndị okenye pụrụ ime ndekọ nke ndị ọrịa na ndị agadi nọ ná mkpa nlekọta pụrụ iche. Otú ọ dị, e kwesịghị ịhapụrụ ya nanị ndị okenye ibu ụzọ mee ihe n’akụkụ nke a. Mmadụ nile nọ n’ọgbakọ aghaghị ịmata banyere mkpa ndị dị otú ahụ. (1 Timoti 5:4-8)—8/15, peji nke 28-29.
▫ Akụkọ Bible banyere Jona ịbụ onye anụ mmiri loro ọ̀ bụ ihe a na-apụghị ikwere ekwere?
Ee e, azụ sperm whale, nnukwute shark ọcha, ma ọ bụ whale shark pụrụ ilo mmadụ. Ọzọ, Jisọs n’onwe ya gbara akaebe na ihe ndekọ Jona bụ eziokwu. (Matiu 12:39, 40)—8/15, peji nke 32.
▫ Mmerụ ahụ dị aṅaa na-abịa site n’iji ọgwụ nchebe na ọgwụ isi ọma eme ihe n’ihi ịtụ egwu na-enweghị isi?
Iji ha eme ihe na-eme n’ezie ka ndị mmadụ ghara inwe mmasị iji ọgụgụ isi chee nsogbu ha ihu ma na-agba ha ume ilega anya n’isi ọma maka ihe ngwọta nye ihe nile. Ha na-enyekwa onye ji ha eme ihe echiche ụgha nke ịnọ ná nchebe. Nke kakwa mkpa, onye tinyere okwukwe n’ike nke ọgwụ nchebe majik na ọgwụ isi ọma pụrụ inyefe nchịkwa nke ndụ ya n’aka ike ndị mmụọ ọjọọ a na-adịghị ahụ anya.—9/1, peji nke 4.
▫ Gịnị bụ ihe anọ pụrụ ime ka alụmdi na nwunye dịtee anya?
Ndị a bụ ịdị njikere ịṅa ntị, ikike ịrịọ mgbaghara, ikike ịnọgide na-enye nkwado mmetụta uche, na ọchịchọ siri ike imetụ aka n’ịhụnanya. (1 Ndị Kọrint 13:4-8; Ndị Efesọs 5:33; Jemes 1:19)—9/1, peji nke 20.
▫ Olee otu ụzọ Jehova si enye ndị na-ezute ule ntachi obi?
Jehova na-eme nke a site n’ihe nlereanya nke ntachi obi ndị e dekọrọ n’Okwu ya, Bible. (Ndị Rom 15:4) Ka anyị na-atụgharị uche na ndị a, a na-agba anyị ume ịtachi obi, anyị na-amụtakwa ihe dị ukwuu banyere ụzọ isi tachie obi.—9/15, peji nke 11-12.
▫ Gịnị bụ nsọpụrụ Chineke?
Nsọpụrụ Chineke na-ezo aka ná nsọpụrụ e nyere Jehova nke na-akwali anyị ime ihe na-atọ ya ụtọ, ọbụna n’ihu ule siri ike, n’ihi na anyị hụrụ Chineke n’anya site n’obi.—9/15, peji nke 15.
▫ Olee otú anyị kwesịrị isi lee ebere Chineke anya?
Anyị ekwesịghị mgbe ọ bụla iwere oké ebere Chineke n’ihe dị nta. Anyị kwesịrị ịdị ka Pọl ma gosi obi ekele anyị site n’ịdị na-agba mgba megide ezughị okè ndị nke anyị. (1 Ndị Kọrint 9:27) N’ụzọ dị otú a anyị ga-egosipụta, ọbụna n’ihu ihe isi ike, na anyị nwere ọchịchọ ziri ezi ime ezi ihe.—10/1, peji nke 23.
▫ N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na Pọl depụtara ogologo ntachi obi dị ka akụkụ mbụ nke ịhụnanya?
E kwuwo na a pụghị inwe ihe ọ bụla dị ka mkpakọrịta ndị Kraịst ma e nweghị ogologo ntachi obi, ma ọ bụ ma e nweghị iji ndidi na-anagiderịta ndị ọzọ. Nke a bụ n’ihi na anyị nile bụ ndị na-ezughị okè, ezughị okè anyị na njehie anyị nile kwa na-anwale ndị ọzọ. Ya mere, ogologo ntachi obi bụ ihe dị oké mkpa ma ọ bụrụ na ịhụnanya ga-adị n’etiti ụmụnna.—10/15, peji nke 21.
▫ Ndị Kraịst mbụ hà jiri aha Chineke mee ihe?
Ihe àmà na-asị ee. Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpegara Chineke ekpere sị: “Ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Ná ngwụsị nke ozi ya kwa o kpere ekpere, sị: “Emere m ka aha Gị pụta ìhè nye ndị I nyere m site n’ụwa.” (Jọn 17:6) E wezụga nke ahụ, akwụkwọ Septuagint ndị mbụ nwere aha Chineke n’ụdị Tetragrammaton nke Hibru.—11/1, peji nke 30.
▫ Ihe atụ ndị dị aṅaa nke Bible na-egosi na ụzọ anyị si mee ihe banyere ihie ụzọ anyị pụrụ imetụta ndụ anyị?
Eze Sọl gbara isi akwara jụ ndụmọdụ, ihie ụzọ ya mụbakwara, mesịa duba n’ọnwụ ya n’enweghị nnwapụta Chineke. (1 Samuel 15:17-29) N’aka nke ọzọ, n’agbanyeghị ihie ụzọ na mmehie ya nile, Eze Devid ji nchegharị nakwere mgbazi olu ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova. Ihe atụ ndị a nke Bible na-egosi na anyị ịnakwere ihe ndị anyị mehiere na-enyere anyị aka ịnọgide na-eso Chineke na-enwe mmekọrịta dị mma nakwa n’ihi ya nwee olileanya nke ndụ ebighị ebi. (Abụ Ọma 32:1-5)—11/15, peji nke 29-30.
▫ Olee otú Jehova si enyere ndị ya aka mgbe ha nọ n’ihe isi ike n’ihi ọdachi ndị na-emere onwe ha ma ọ bụ ndị ihe ndị ọzọ kpatara?
Jehova na-enye aka, ọ bụghị site n’iji ụzọ ọrụ ebube chigharịa ikike ndị ahụ sitere n’okike ma ọ bụ n’ụzọ ụfọdụ karịrị mmadụ mee ihe, kama site n’ikike ọzọ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na-adịghị aghọta n’ezie—ịhụnanya. Ee, Jehova hụrụ ndị ya n’anya n’ezie, ọ zụlitewokwa n’etiti ha ịhụnanya otu onye n’ebe ibe ya nọ nke siri ike nke ukwuu nke na o nwere ike ịrụzuru ha ihe yiri ọrụ ebube. (1 Jọn 4:10-12, 21)—12/1, peji nke 10.