Ihe Nketa Ndị Kraịst nke Dị Ụkọ
DỊ KA BLOSSOM BRANDT SI KỌỌ
Snow na-ada na San Antonio, Texas, na January 17, 1923, ụbọchị a mụrụ m. Oyi na-atụ n’èzí, ma a nabatara m n’ógwè aka ndị na-ekpo ọkụ nke nne na nna na-ahụ n’anya bụ́ ndị Kraịst, Judge na Helen Norris. Malite n’ihe ndị mbụ m pụrụ icheta, ihe nile ndị mụrụ m na-eme dabeere n’ofufe ha na-efe Jehova Chineke.
NA 1910 mgbe Mama dị afọ asatọ, ndị mụrụ ya si nso Pittsburgh, Pennsylvania, kwaga n’otu ugbo dị ná mpụga Alvin, Texas. N’ebe ahụ ha nwere ọṅụ ịmụta eziokwu Bible site n’aka onye agbata obi ha. Mama tinyere ihe fọrọ ná ndụ ya n’ịchọ ịdọrọ mmasị ndị mmadụ gaa n’olileanya Alaeze ahụ. E mere ya baptism na 1912 mgbe ezinụlọ ahụ kwagaworo Houston, Texas.
Mama na ndị mụrụ ya zutere Charles T. Russell, onye isi oche mbụ nke Watch Tower Bible and Tract Society, nke mbụ ya mgbe o letara ọgbakọ ha na Houston. Ọtụtụ mgbe ezinụlọ ahụ na-ele ndị nnọchianya na-ejegharị ejegharị nke Society, ndị a na-akpọ ndị pilgrim mgbe ahụ, ọbịa n’ụlọ ha. Afọ ole na ole n’ihu, Mama so ndị mụrụ ya kwaga Chicago, Illinois, Nwanna Russell gajekwa ileta ọgbakọ dị n’ebe ahụ.
Na 1918, Mama Nnukwu butere ahụ ọkụ si Spain, n’ihi mmetụta ya na-emebi ahụ ike ya, ndị dọkịta tụrụ aro ka o biri n’ebe e nwere okpomọkụ. Ebe ọ bụ na Papa Nnukwu na-arụrụ ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè bụ́ Pullman ọrụ, na 1919 ọ natara akwụkwọ e ji zighachi ya Texas. N’ebe ahụ, na San Antonio, Mama zutere otu onye na-anụ ọkụ n’obi n’ọgbakọ bụ́ Judge Norris. Ha dọọrọ mmasị ibe ha ozugbo, mgbe oge na-agakwa, Judge ghọrọ nna m.
Papa Amụta Eziokwu Bible
E nyere Judge (ọkàikpe) aha ya nke pụrụ iche mgbe a mụrụ ya. Mgbe nna ya hụrụ ya na nke mbụ, ọ sịrị: “Ihu nwa ahụ siri ike ka nke ọkàikpe,” nke ahụ ghọkwara aha ya. Na 1917, mgbe Papa dị afọ 16, e nyere ya traktị ndị ahụ bụ́ Where Are the Dead? na What Is the Soul? ndị Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara. Nna Papa anwụwo n’afọ abụọ bu ụzọ, traktị ndị ahụ nyekwara ya azịza ndị ọ nọworo na-achọ banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, ọ malitere ịga nzukọ Ndị Mmụta Bible, dị ka a maara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ.
Papa chọrọ ozugbo ahụ ikere òkè n’ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ. Ọ natara ókèala ebe ọ pụrụ ime nkwusa, mgbe a gbasakwara akwụkwọ, ọ ga-agbara ígwè gaa ikesa traktị. O mikpuru onwe ya kpam kpam n’ikesa olileanya Alaeze ahụ, na March 24, 1918, o gosipụkwara nraranye ya nye Jehova site na baptism ime mmiri.
N’afọ na-esonụ mgbe Mama kwafetara na San Antonio, a dọọrọ mmasị Papa gaa n’ihe ọ kpọrọ “ihu ọchị kasị ụtọ na anya kasị acha anụnụ anụnụ” nke ọ hụtụworo. N’oge na-adịghị anya ha mere ka a mara na ha chọrọ ịlụ onwe ha, ma o siiri ha ike ime ka ndị mụrụ Mama kwere. Ma, n’April 15, 1921, agbamakwụkwọ ahụ weere ọnọdụ. Ha abụọ nwere ozi oge nile dị ka ihe mgbaru ọsọ ha.
Mmalite Dị Ngwa n’Ozi Ahụ
Mgbe Mama na Papa nọ na-eme nkwadebe ịga mgbakọ Cedar Point, Ohio, na 1922, ha chọpụtara na Mama dị ime m. Ngwa ngwa mgbe a mụsịrị m, mgbe Papa dị nanị 22 afọ, a họpụtara ya ịbụ onye nlekọta ije ozi ọgbakọ. Nke a pụtara na ọ na-eme ndokwa nile maka ije ozi ubi. Nanị n’ime izu ole na ole, Mama kpọọrọ m gaa ozi ụlọ n’ụlọ. N’ezie, nne na nna m ochie nwekwara mmasị ịkpọrọ m gaa ozi.
Mgbe m dị nanị afọ abụọ, ndị mụrụ m kwagara Dallas, Texas, ha malitekwara ozi oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ mgbe afọ atọ gasịrị. N’abalị ha na-ehi ụra n’ihe ndina nta n’akụkụ ụzọ ma kusa m n’oche azụ nke ụgbọ ala. Otú ọ dị, echere m na nke a na-atọ ụtọ, ma n’isi nso o doro anya na ha adịbeghị njikere maka ndụ ndị ọsụ ụzọ. Ya mere Papa malitere otu azụmahịa. Mgbe oge na-aga, o wuru otu ụlọ ụgbọ na-adọkpụ ná nkwadebe maka ịmalite ịsụ ụzọ ọzọ.
Tupu m malite akwụkwọ, Mama kụziiri m ide ihe na ịgụ ihe, m makwaara ịmụba ọnụ ọgụgụ ruo n’anọ. Ihe na-adị n’uche ya mgbe nile bụ inyere m aka ịmụta ihe. Ọ na-eme ka m guzoro n’oche dị ya n’akụkụ ka m wee hichapụ mmiri dị n’arịa nri mgbe ọ na-asapụta ha, ọ na-akụzikwara m iburu akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche n’isi ma bụọ abụ Alaeze, ma ọ bụ ukwe dị ka anyị na-akpọ ha mgbe ahụ.
Isoro Ndị Mụrụ M Na-ejere Chineke Ozi
Na 1931 anyị nile gara mgbakọ ahụ na-akpali akpali na Columbus, Ohio, ebe anyị natara aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ezie na m dị nanị afọ asatọ, echere m na ọ bụ aha makarịsịrị mma m nụtụworo. Ngwa ngwa mgbe anyị lọtara ụlọ, ọkụ gbapịara azụmahịa Papa, Papa na Mama wekwaara nke a dị ka “uche Onyenwe anyị” ka ha maliteghachi ịsụ ụzọ. Ya mere, na-amalite n’oge okpomọkụ nke 1932, anyị tinyere ọtụtụ afọ n’ozi oge nile.
Ndị mụrụ m sụrụ ụzọ n’ebe etiti Texas iji nọrọ ndị mụrụ Mama m nso, bụ́ ndị ka nọ na San Antonio. Ịkwagharị site n’otu ebe e kenyere anyị ọrụ gaa n’ọzọ pụtara na m ga na-agbanwe ụlọ akwụkwọ ọtụtụ mgbe. Mgbe ụfọdụ ndị enyi na-adịghị eche echiche ga-asị, “Gịnị mere unu agaghị anọ otu ebe ma nwee ebe obibi maka nwa a,” dị ka à ga-asị na a dịghị elekọta m nke ọma. Ma echere m na ndụ anyị bụ nke na-akpali akpali, nakwa na m na-enyere Papa na Mama aka n’ozi ha. N’ezie, a na-azụ m ma na-akwadebe m maka ihe gaje ịbụ ụzọ ndụ nke m.
Ruo ọtụtụ ọnwa m nọgidere na-agwa Papa na Mama na m chọrọ ka e mee m baptism, ha gwakwara m okwu banyere ya ọtụtụ ugbo. Ha chọrọ ijide n’aka na m maara otú mkpebi m siruru n’ike. Na December 31, 1934, ụbọchị rutere maka oké ihe omume a ná ndụ m. Otú ọ dị, n’abalị tupu ụbọchị ahụ, Papa hụrụ na m gakwuuru Jehova n’ekpere. Mgbe ahụ o mere ihe magburu onwe ya. O mere ka anyị nile pụta gbuo ikpere n’ala, o wee kpee ekpere. Ọ gwara Jehova na ya nwere obi ụtọ nke ukwuu banyere mkpebi obere nwa ya nwanyị ịrara ndụ ya nye Ya. Ya doo gị anya na n’ọgbọ nile ga-abịa, ọ dịghị mgbe m ga-echefu abalị ahụ!
Ọzụzụ Site n’Aka Nne na Nna M Ochie
N’agbata 1928 na 1938, m tinyere oge dị ukwuu n’ileta nne na nna m ochie na San Antonio. Usoro ime ihe ha dịcha nnọọ ka nke ndị mụrụ m. Mama Nnukwu abụwo colporteur, dị ka a na-akpọ ndị ọsụ ụzọ mgbe ahụ, e mesịakwa ọ ghọrọ onye ọsụ ụzọ nwa oge. A họpụtara Papa Nnukwu ịbụ ọsụ ụzọ na December 1929, ya mere ozi ubi bụ mgbe nile ihe a na-eme kwa ụbọchị.
Papa Nnukwu ga-ejide m n’aka ya n’abalị ma kụziere m aha kpakpando dị iche iche. Ọ ga-ekwere m ukwe ndị o bu n’isi. Mụ na ya ji ụgbọ okporo ígwè Pullman mee njem mgbe ọ na-arụrụ ụlọ ọrụ okporo ígwè ọrụ. Ọ bụ mgbe nile onye m pụrụ ichigharịkwuru mgbe m nwere nsogbu; ọ na-akasi m obi ma na-ehichapụ anya mmiri m. Ma, mgbe e nyere m ahụhụ n’ihi ịkpa àgwà ọjọọ, m wee gakwuru ya maka ịgụgụ m, nanị ihe ọ ga-ekwu bụ (okwu ndị m na-aghọtaghị mgbe ahụ, ma ụda ha doro anya nke ọma): “Nne, ụzọ nke onye njehie dị oké ike.”
Afọ Ndị E Nwere Mkpagbu
Na 1939, Agha Ụwa nke Abụọ malitere, ndị Jehova nwetakwara mkpagbu na ime ihe ike nke ìgwè ndị arụrụala. Ka ọ na-eru ọgwụgwụ nke 1939, Mama rịara ọrịa nke ukwuu, e mesịakwa ọ dịrị mkpa ịwa ya ahụ, ya mere anyị kwafeghachiri San Antonio.
Ìgwè ndị arụrụala ga-ezukọ ka anyị na-arụ ọrụ magazin n’okporo ụzọ ndị e nwere na San Antonio. Ma kwa izu, dị ka ezinụlọ, anyị nọ n’ebe ahụ, onye ọ bụla n’akụkụ ebe e kenyere ya. Ọtụtụ mgbe m na-anọ na-ele anya ka ha kpụụrụ Papa gawa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii.
Papa gbalịrị ịnọgide na-asụ ụzọ ọ bụ ezie na ọ dịrị mkpa Mama ịkwụsị. Otú ọ dị, ọ pụghị ịrụta ego na-ezu site n’ịrụ ọrụ nwa oge, ya mere ọ dịkwara mkpa ya ịkwụsị. M gụsịrị akwụkwọ na 1939, mụ onwe m malitekwara ọrụ.
Aha Papa bụ́ Judge (ọkàikpe) bara uru n’afọ ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, otu ìgwè ndị enyi gara ịgba àmà n’otu obodo ukwu dị nnọọ n’ebe ugwu San Antonio, onye isi ndị uwe ojii malitekwara ịtụnye ha nile n’ụlọ nga. O jideworị ihe dị ka 35 mmadụ, gụnyere nne na nna m ochie. Ha ziteere Papa ozi, ọ gbakwaara ụgbọ ya gaa n’ebe ahụ. Ọ banyere n’ụlọ ọrụ onye isi ndị uwe ojii ahụ wee sị: “Abụ m Judge Norris nke sitere San Antonio.”
“Nnọọ Ọga, Judge, ọ̀ dị ihe m pụrụ imere gị?” ka onye isi ndị uwe ojii ahụ jụrụ.
“Abịara m ịhụ maka ịkpọpụta ndị a n’ụlọ nga,” ka Papa zaghachiri. Mgbe o kwuru nke ahụ onye isi ndị uwe ojii ahụ hapụrụ ha n’enweghị onye ébé—n’ajụghịkwa ajụjụ ọzọ!
Ọ na-atọ Papa ụtọ ịrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị dị ná ndịda obodo, ọ na-enwekarịkwa mmasị ịkpọtụrụ ndị ọkàikpe na ndị ọkàiwu. Ọ ga-agwa onye na-anabata ndị ọbịa, sị: “Abụ m Judge Norris, abịakwara m ịhụ Ọkàikpe Onye Dị Otú A.”
E mesịa, mgbe o zutere ọkàikpe ahụ, ọ na-ebukarị ụzọ asị: “Biko, tupu m kwuo banyere nzube m ji bịa, m chọrọ ibu ụzọ kọwaa na abụwo m Ọkàikpe ogologo oge karịa gị. Abụwo m ya ná ndụ m nile.” Mgbe ahụ ọ ga-akọwa otú o si nweta aha ya. Nke a na-eme ka ha malite okwu dị ka ndị enyi, o wulitekwara ọtụtụ mmekọrịta dị mma n’etiti ya na ndị ọkàikpe n’ụbọchị ndị ahụ.
Ekele Maka Nduzi Nne na Nna
M nọ n’afọ ọgba aghara ndị ahụ nke agbata iri na atọ na iri na itoolu, m makwaara na ọtụtụ ugbo obi na-etisi Papa na Mama ike ka ha na-ele anya ma na-echegbu onwe ha banyere ihe ọzọ m ga-eme. Dị ka ụmụaka nile na-eme, anwalere m Papa na Mama ọtụtụ ugbo, na-arịọ ka e mee otu ihe ma ọ bụ gaa otu ebe ma buru ụzọ mara na azịza ha ga-abụ ee e. Mgbe ụfọdụ anya mmiri na-agba m. N’ezie, m gaara enwewo oké obi erughị ala a sị na ọ dị mgbe ha kwuru, sị: “Gawa, mee ihe ị chọrọ. Anyị achọghị ịma.”
Ịmara na m pụghị ime ka ha gbanwee ụkpụrụ ha dị iche iche nyere m mmetụta nke ịnọ ná nchebe. N’ezie, nke a mere ka ọ dịrị m mfe karị mgbe ndị ọzọ na-eto eto ga-atụ aro maka ihe ntụrụndụ amamihe na-adịghị na ya, n’ihi na m pụrụ ikwu sị: “Papa m agaghị ekwe.” Mgbe m dị afọ 16, Papa hụrụ na m mụtara ịkwọ ụgbọ ala nakwa na m nwetara laịsensị m maka ịkwọ ụgbọ ala. Ọzọ, n’ihe dị ka n’oge a o nyere m otu mkpịsị ugodi e ji abata ụlọ anyị. Ọ masịrị m nke ukwuu na ọ tụkwasịrị m obi. Adịrị m ka onye toworo nnọọ eto, o nyekwara m echiche nke ibu ọrụ na ọchịchọ siri ike ịghara imechu ha ihu n’ihe ha tinyere n’aka m.
N’ụbọchị ndị ahụ a dịghị enyekebe ndumọdụ banyere alụmdi na nwunye, ma Papa maara Bible na ihe o kwuru banyere ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) O mere ka o doo m anya na ọ bụrụ na mụ akpọta nwata nwoke ụwa ọ bụla n’ụlọ, ma ọ bụ ọbụna lee otu anya, mmechuihu ọ ga-enwe ga-adị ukwuu. Amaara m na ihe o kwuru ziri ezi, n’ihi na ahụwo m obi ụtọ na ịdị n’otu dị n’alụmdi na nwunye ha n’ihi na ha lụrụ “n’ime Onyenwe anyị.”
Na 1941, mgbe m dị afọ 18, echere m na m nwere ịhụnanya n’ebe otu nwa okoro nọ n’ọgbakọ anyị nọ. Ọ bụ ọsụ ụzọ ma na-agụ akwụkwọ ịbụ ọkàiwu. Enwere m mkpalị dị ukwuu. Mgbe anyị gwara ndị mụrụ anyị na anyị chọrọ ịlụ, kama igosi enweghị nkwado ma ọ bụ kụdaa anyị obi, nanị ihe ha kwuru bụ: “Anyị ga-achọ ịrịọ otu ihe n’aka gị, Blossom. Anyị chere na ị ka bụ nnọọ nwata, anyị ga-achọkwa ịrịọ gị ka i chere ruo otu afọ. Ọ bụrụ na unu nwere ịhụnanya n’ezie, otu afọ agaghị abụ ihe ọ bụla.”
Enwere m ekele nke ukwuu na m ṅara ntị n’okwu ndụmọdụ ahụ amamihe dị na ya. N’ime otu afọ ahụ, m tozukwuru etozu ma malite ịhụ na nwa okoro a enweghị àgwà ndị a chọrọ maka ezigbo di. O mesịrị hapụ nzukọ a, m gbanahụkwara ihe gaara abụ ọdachi ná ndụ m. Lee ka o si bụrụ ihe dị ebube inwe nne na nna maara ihe bụ́ ndị a pụrụ ịdabere n’echiche ha!
Ọlụlụ Di na Ọrụ Njegharị
N’oge oyi nke 1946, mgbe m nọworo afọ isii na-asụ ụzọ ma na-arụ ọrụ nwa oge, nwa okoro kasị mma m hụtụworo jeere bata n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị. E kenyewo Gene Brandt isonyere onye ozi njegharị anyị nke na-ejere ụmụnna ozi, dị ka a na-akpọ onye nlekọta sekit mgbe ahụ. Anyị abụọ dọọrọ mmasị ibe anyị, n’August 5, 1947, anyị gbakwara akwụkwọ.
N’oge na-adịghị anya, Papa na Gene mepere ụlọ ọrụ ngụzi ego. Ma Papa gwara Gene, sị: “Ụbọchị ụlọ ọrụ a mere ka anyị ghara ịga nzukọ ma ọ bụ ọrụ ọchịchị Chineke, m gaje ịkpọchi ụzọ ya ma tụfuo mkpịsị ugodi ya.” Jehova gọziri echiche ime mmụọ nke a, ụlọ ọrụ ahụ nyekwara ihe zuru ezu maka mkpa anụ ahụ anyị ma nye ohere maka ịsụ ụzọ. Papa na Gene bụ ndị maara anya azụmahịa, ọ gaara adịwokwa mfe ka anyị baa ọgaranya, ma ọ dịghị mgbe nke a bụ ihe mgbaru ọsọ anyị.
Na 1954, a kpọrọ Gene ịbanye ọrụ sekit, nke pụtara mgbanwe dị ukwuu ná ndụ anyị. Olee otú ọ ga-adị nne na nna m? Ọzọkwa, nchegbu ha abụghị maka onwe ha kama maka ọdịmma Alaeze Chineke na maka ọdịmma ime mmụọ nke ụmụ ha. Ọ dịghị mgbe ha gwara anyị, sị: “Gịnị mere unu agaghị enye anyị ụmụ ụmụ?” Kama, ọ bụ mgbe nile: “Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nyere unu aka n’ije ozi oge nile?”
Ya mere mgbe ụbọchị ruru ka anyị hapụ, e nwere nanị okwu agbamume na ịṅụrị ọṅụ maka oké ihe ùgwù anyị. Ọ dịghị mgbe ha mere ka ọ dị anyị ka anyị na-agbahapụ ha kama mgbe nile ha kwụ anyị n’azụ n’akụkụ nile. Mgbe anyị hapụrụ, ha nọgidere n’ọrụ ịsụ ụzọ ruo afọ iri ọzọ. A họpụtara Papa ịbụ onye nlekọta obodo nke San Antonio, bụ́ ọnọdụ nke ọ nọ na ya ruo 30 afọ. O nwere ọṅụ ịhụ ka e si n’otu ọgbakọ n’obodo ahụ n’afọ ndị 1920 toruo 71 tupu ọ nwụọ na 1991.
Nye mụ na Gene, ndụ jupụtara n’ihe mkpali. Anyị nwere ọṅụ dị ukwuu n’ijere ezi ụmụnna anyị ndị ikom na ndị inyom ozi n’ihe karịrị 31 steti na, ma eleghị anya, ihe kasị pụta ìhè n’ime ha dum, ihe ùgwù nke ịga klasị nke 29 nke ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead na 1957. E mesịa anyị lọghachiri n’ọrụ njegharị. Na 1984, mgbe 30 afọ nke ọrụ sekit na distriktị gasịrị, Society ji obi ọma nye Gene ọrụ sekit na San Antonio, ebe ọ bụ na ndị mụrụ m nọ n’afọ ndị 80 ha, ahụ esichakwaghị ha ike.
Ilekọta Ndị Mụrụ M
Ọ bụ nanị otu afọ na ọkara mgbe anyị lọtasịworo na San Antonio ka Mama tụbọtụrụ wee nwụọ. O mere ngwa ngwa nke ukwuu nke na enweghị m ohere ikwu ụfọdụ n’ihe ndị m chọrọ ịgwa ya. Nke a kụziiri m ikwunyere Papa okwu nke ukwuu. Mgbe 65 afọ nke alụmdi na nwunye gasịrị, ọnwụ Mama metụrụ ya n’ahụ nke ukwuu, ma anyị nọ ebe ahụ inye ịhụnanya na nkwado.
Ihe nlereanya ogologo ndụ nile nke Papa n’ịga nzukọ ndị Kraịst, ọmụmụ ihe, na ije ozi dịgidere ruo mgbe ọ nwụrụ. O nwere mmasị ịgụ ihe. Ebe ọ bụ na ọ ga-anọ nanị ya mgbe anyị nọ n’ozi, m ga-alọta ụlọ jụọ sị, “Owu ọ̀ mara gị?” O nọwo na-agụ akwụkwọ ma na-amụ ihe, nke na echiche ahụ agbatabeghịdị ya n’uche.
E nwere àgwà ọzọ o nwere ná ndụ ya nile nke anyị jigidere. Papa ekwuwo mgbe nile ka ezinụlọ na-erikọ nri ọnụ, karịsịa n’oge nri ụtụtụ mgbe a na-atụle akụkụ Akwụkwọ Nsọ dịịrị ụbọchị. Ọ dịghị mgbe e kwere ka m hapụ ụlọ n’emeghị ya. Mgbe ụfọdụ m ga-asị: “Ma Papa, m gaghị aga akwụkwọ (ma ọ bụ ọrụ) n’oge.”
“Ọ bụghị ihe mmụta dịịrị ụbọchị na-eme ka ị ghara ịga n’oge; i tetaghị ụra n’oge,” ka ọ ga-ekwu. M ghaghị ịnọrọ ma soro mee ya. Ọ hụrụ na ezi ihe nlereanya ya dịgidere ruo ụbọchị ndị ikpeazụ nke ndụ ya. Nke a bụ ihe nketa ọzọ ọ hapụụrụ m.
Papa dịgidere nkọ n’ụbụrụ ruo ná ngwụcha. Ihe mere ka ilekọta ya dịrị mfe karị bụ na ọ dịghị mgbe o nyere nsogbu ma ọ bụ na-eme mkpesa. Oo, mgbe ụfọdụ ọ na-ehota ọrịa arthritis ji ya, ma m ga-echetara ya na ihe na-arịa ya n’ezie bụ “ọrịa Adam,” ọ ga-achịkwa ọchị. Ka mụ na Gene nọ n’akụkụ ya, Papa ji nwayọọ daa n’ụra ọnwụ n’ụtụtụ November 30, 1991.
Agafewo m 70 afọ ugbu a, m ka na-eritekwa uru n’ezi ihe nlereanya nke nne na nna m na-ahụ n’anya bụ́ ndị Kraịst. Ọ bụkwa ekpere m si n’ala ala obi na m ga-egosipụta ekele m zuru ezu maka ihe nketa nke a site n’iji ya mee ihe n’ọgbọ nile na-abịanụ.—Abụ Ọma 71:17, 18.
[Foto dị na peeji nke 5]
Mụ na Mama
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
1. Mgbakọ mbụ m gara: San Marcos, Texas, September 1923
2. Mgbakọ ikpeazụ Papa gara: Fort Worth, Texas, June 1991 (Papa nọ n’oche)
[Foto dị na peeji nke 9]
Gene na Blossom Brandt