Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 8/1 p. 20-24
  • Ihe Nketa Ime Mmụọ Anyị Bara Ụba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Nketa Ime Mmụọ Anyị Bara Ụba
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndụ Nwata nke Nna M
  • Gaa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa
  • Nzụlite n’Ụzọ Ndị Kraịst Site n’Ịhụnanya
  • Ikwesị Ntụkwasị Obi ruo Ọgwụgwụ
  • Nne na Nna Anyị Kụziiri Anyị Ịhụ Chineke n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ihe Nketa Ndị Kraịst nke Dị Ụkọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ịgbaso Nzọụkwụ nke Ndị Mụrụ M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Ahụ́ Adịghị Mama M ma Ọ Bụ Papa M?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 8/1 p. 20-24

Ihe Nketa Ime Mmụọ Anyị Bara Ụba

DỊ KA PHILLIP F. SMITH SI KỌỌ

A mụnyewo ọwa nke ga-enwu n’Africa gbakarịsịrị itiri.” Lee ka obi si dị anyị ụtọ ịgụ okwu ndị ahụ na peji nke 75 nke 1992 Yearbook of Jehovah’s Witnesses! Okwu ndị ahụ bụ nna anyị ochie bụ́ Frank W. Smith dere ha na 1931, n’akwụkwọ ozi o degaara Nwanna Joseph F. Rutherford, bụ́ mgbe ahụ onye isi oche nke Watch Tower Society. Nna mụ ochie dere ihe ahụ iji kọọ banyere njem nkwusa nke ya na nwanne ya nwoke mere.

AKWỤKWỌ 1992 Yearbook ahụ kọwara, sị: “Gray Smith na nwanne ya nwoke tọrọ ya bụ́ Frank, ndị ozi ọsụ ụzọ abụọ nwere obi ike si Cape Town [South Africa], gawara Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa nke nọ n’okpuru Britain ịchọpụta ohere ndị e nwere ịgbasa ozi ọma ahụ. Ha ji otu ụgbọ ala, De Soto nke ha rụgharịworo ịbụ ụlọ ndọkpụ (ụgbọ ala bụ́ ụlọ), buba ya n’ime ụgbọ mmiri tinyere 40 katọn nke akwụkwọ, ma kwọpụ ụgbọ mmiri ha gawa Mombasa, ọdụ ụgbọ mmiri nke Kenya.”

N’akwụkwọ ozi o degaara Nwanna Rutherford, nna mụ ochie kọwara njem ahụ e si Mombasa gaa Nairobi, isi obodo Kenya: “Anyị malitere njem moto kasị na-eyi egwu m metụworo. O were anyị ụbọchị anọ, na-agba ụbọchị nile, ịgbazu 580 kilomita . . . Kwa kilomita m ghaghị ịpụta jiri shọvel kpasaa ùkwù aja, kpochie okukoro dị iche iche, sụdasịakwa ahịhịa achara, gbutusịakwa osisi iji nwee ebe ụgbọ ala ga-agbado ụkwụ gafere.”

Mgbe ha ruru Nairobi, Frank na Gray rụrụ ọrụ ruo 21 ụbọchị n’akwụsịghị akwụsị iji kesaa akwụkwọ ha ndị dabeere na Bible. “Dị ka akụkọ ndị anyị na-anụ si dị,” ka nna mụ ochie dere, “ọrụ ahụ akpaliela ndị Nairobi nwere mmasị n’okpukpe.” Mgbe nke ahụ gasịrị, nna mụ ochie nwere oké mmasị ịlaghachi ụlọ ịhụ ọkpara ya dị afọ abụọ, Donovan, na nwunye ya, Phyllis, bụ́ onye dị ime nwa nke abụọ ha, bụ́ nna anyị, Frank. Nna mụ ochie gbara ụgbọ mmiri mbụ ọ hụrụ site Mombasa, ma ọ nwụrụ n’ihi ọrịa ịba tupu ya erute ụlọ.

Ka nwanne m nwanyị, nwanne m nwoke, na mụ onwe m na-atụgharị uche n’ihe ndekọ Yearbook ahụ, uche anyị gara n’ebe ezi nna anyị nọ. Na May 1991, nanị ọnwa ole na ole tupu anyị anata 1992 Yearbook ahụ, ọ nwụworị site ná nsogbu nke ahụ a wara ya n’obi. Ọ bụ ezie na o zutetụbeghị nna ya ma ọlị, o nwere ụdị ịhụnanya miri emi nke nna ya nwere n’ebe Jehova nọ. Lee ka nna mụ ochie gaara esiworị ṅụrịa ọṅụ ịmara na 28 afọ n’ihu, na 1959, nwa ya nwoke ga-eso nzọụkwụ ya dị ka onye ozi ndị Kraịst gaa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa!

Ndụ Nwata nke Nna M

A mụrụ nna anyị na July 20, 1931, na Cape Town, ọnwa abụọ mgbe nna ya nwụsịrị, bụ onye a gụrụ nna m aha ya. Site na nwata, papa m gosiri ịhụnanya ya n’ebe Jehova nọ. Mgbe ọ gbara nanị afọ itoolu, o guzoro n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè bụ́ isi nke Cape Town na-arụ ọrụ ịgba àmà obodobo kaadị ebe ụmụ akwụkwọ ibe ya na-eji ya eme ihe ọchị. N’afọ nke 11 ya, o gosipụtara nraranye ya nye Jehova site na baptism ime mmiri. Mgbe ụfọdụ a na-ekenye papa m ịrụ okporo ámá nile nanị ya n’ozi. Ka ọ na-erule mgbe ọ gbara afọ 18, ọ nọwo na-eduziri ìgwè ụmụnna nwanyị bụ́ ndị Kraịst Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’ime ime obodo Cape Town.

Na 1954 Watch Tower Society mara ọkwa na a ga-enwe mgbakọ mba nile na Europe n’afọ na-esonụ. Papa nwere ọchịchọ dị ukwuu ịga, ma o nweghị ego zuru ezu isi Cape Town gaa ebe ahụ. Ya mere ọ nakweere ịrụ ọrụ ruo ọnwa atọ dị ka onye na-emepụta mmiri ọgwụ n’ebe a na-egwupụta copper na Northern Rhodesia (nke bụ Zambia ugbu a). Ebe a na-enyocha ihe e gwupụtara dị n’ime ime ọhịa Africa.

Papa maara na e nwere ọnụ ọgụgụ buru ibu nke Ndịàmà bụ́ ndị Africa na Northern Rhodesia, ya mere mgbe o rutere ọ chọtara ha ma mata ebe ha na-enwe nzukọ ha. Ọ bụ ezie na ọ pụghị ịsụ asụsụ obodo ahụ, o sonyekwaararị ha ma jee nzukọ nke Ọgbakọ Mine nke Ndịàmà Jehova mgbe nile. Ndị Europe nọ n’ebe ahụ a na-egwupụta ihe nwere ịkpọasị agbụrụ, na-egosikwa ịkpọasị ha site n’ikpọ ndị Africa iyi ọtụtụ mgbe. Otú ọ dị, papa m nwere obi ọma mgbe nile.

N’ọgwụgwụ nke ọnwa atọ ahụ, otu onye ọrụ bụ́ onye Africa, onye na-abụghị Onyeàmà bịakwutere Papa ma jụọ, sị: “Ị̀ maara ihe anyị na-akpọ gị?” Nwoke ahụ chịrị ọchị ma sị: “Anyị na-akpọ gị Bwana [Mazị] Ụlọ Nche.”

Na 1955, papa m nwere ike ịga Mgbakọ “Alaeze nke Na-enwe Mmeri” na Europe. N’ebe ahụ o zutere Mary Zahariou, onye ghọrọ nwunye ya n’afọ na-esonụ. Mgbe ha lụsịrị, ha biri na Parma, Ohio, U.S.A.

Gaa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa

N’oge otu mgbakọ distrikti e nwere na United States, a kpọrọ ndị bịara mgbakọ òkù ije ozi n’ebe mkpa maka ndị ozi ka ukwuu. Nne na nna anyị kpebiri ịga n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa. Ha mere kpọmkwem ihe Watch Tower Society tụrụ aro ya. Ha chekwara ego zuru ezu iji zụta tiketi ha ga-eji aga ma lọtakwa a dịghị ama ama ọ bụrụ na papa m enweghị ihe ịga nke ọma n’inweta ọrụ, ebe ọ bụ nanị ndị nwere akwụkwọ ikike ịrụ ọrụ ka a na-ekwe ibi n’ókèala ahụ.

Mgbe ha nwetasịrị akwụkwọ ikike ngafe, visa, na ọkụ aka, na July 1959, papa m na mama m gbara ụgbọ mmiri ndị ahịa site New York City gaa Mombasa na-agbafe Cape Town. Njem ahụ were ha izu anọ. Na Mombasa ụmụnna bụ́ ndị Kraịst buru ha ụzọ bịa ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu nabatara ha nke ọma n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. Mgbe ha bịarutere Nairobi, papa m hụrụ akwụkwọ ozi na-eche ya. Ọ bụ nzaghachi nye arịrịọ ya maka ọrụ dị ka onye na-emepụta mmiri ọgwụ n’ụlọ Ngalaba Nnyocha Ọdịdị Ime Ala n’Entebbe, Uganda. Papa m na mama m gbara ụgbọ okporo ígwè gaa Kampala, Uganda, bụ́ ebe a gbara Papa ajụjụ ọnụ ma were ya n’ọrụ. N’oge ahụ, e nwere nanị otu Onyeàmà ọzọ na gburugburu Entebbe na Kampala, George Kadu.

Gọọmenti ndị ọcha kwụrụ ụgwọ ka Papa mụọ asụsụ obodo ahụ, bụ́ Luganda. Obi tọrọ ya ụtọ, ebe ọ bụ na ọ kwadoworị ịmụgharị ya ka o wee nwee ike ịdịkwu irè n’ozi ahụ. Ka oge na-aga, papa m ọbụna nyere aka n’ịsụgharị akwụkwọ nta bụ́ “Ozi Ọma nka nke Ala-Eze” gaa n’asụsụ Luganda.

Papa anaghị atụ egwu ịgbara ndị ọzọ àmà. Ọ gwara ndị Europe nile nọ ná ngalaba ọrụ ya okwu, o kerekwaara òkè n’ụzọ chiri anya n’ikwusara ndị Uganda ozi ọma. Ọbụna na ọ gbaara onye Africa bụ́ ọkàiwu kasị ukwuu nke Uganda àmà. Ọ bụghị nanị na nwoke ahụ gere ntị n’ozi Alaeze ahụ kama ọ kpọrọ papa m na mama m òkù isoro ya rie nri.

A mụrụ nwanne m nwanyị, bụ́ Anthe, na 1960, a mụkwara m na 1965. Ezinụlọ anyị nọ nnọọ ụmụnna nwoke na nwanyị nọ n’ọgbakọ dị nta ma na-eto eto n’isi obodo ahụ, bụ́ Kampala, nso. Dị ka nanị ndị ọcha bụ́ Ndịàmà n’Entebbe dị nso, anyị nwere ahụmahụ ụfọdụ na-atọ ọchị. N’otu mgbe otu enyi papa m mere nkwụsịtụ a na-atụghị anya ya n’Entebbe ma gbalịa ịkpọtụrụ papa m. O nweghị ihe ịga nke ọma ruo mgbe ọ jụrụ: “Ị̀ maara di na nwunye ahụ bụ́ ndị Europe nọ n’ebe a bụ́ Ndịàmà Jehova?” Onye ahụ ozugbo kwọọrọ ya n’ụgbọ ala bịa kpọmkwem n’ụlọ papa m na mama.

Anyị nwekwara ahụmahụ ndị siri ike, tinyere ịdị ndụ gabiga nkwatu ọchịchị abụọ ahụ. Ndị agha gọọmenti n’otu mgbe na-agba onye ọ bụla si n’otu agbụrụ égbè. N’ehihie na abalị nile, a na-enwe ịgba égbè na-adịghị akwụsị akwụsị. Ebe e nwere iwu apụla èzí site n’elekere 6:00 nke uhuruchi ruo n’elekere 6:00 nke ụtụtụ, a na-enwe nzukọ nile n’ehihie n’ebe obibi ndị mụrụ m n’Entebbe.

E mesịa, mgbe iwu apụla èzí ahụ kwụsịrị, papa m ji ụgbọ ala kwọga anyị na Kampala maka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Otu onye soja tụdoro anyị égbè, kwụsị ụgbọ ala anyị, ma chọọ ịma ebe anyị na-aga. Abụ m mgbe ahụ nanị nwa ọhụrụ, Anthe dịkwa afọ ise. Mgbe papa m nyere nkọwa n’olu dị ala, na-egosi onye soja ahụ Bible na akwụkwọ anyị, ọ hapụrụ anyị ka anyị gawa.

Na 1967, mgbe anyị nọsịrị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ asatọ na Uganda, ndị mụrụ anyị kpebiri ịlaghachi United States n’ihi nsogbu ahụ ike na ibu ọrụ ezinụlọ. Anyị ghọrọ akụkụ nke Ọgbakọ Canfield, Ohio, ebe papa m jere ozi dị ka onye okenye. N’ebe ahụ ndị mụrụ m malitere ịhụ ụmụnna ahụ n’anya nke ukwuu dị ka ha hụrụ ọgbakọ ntakịrị ahụ dị na Kampala.

Nzụlite n’Ụzọ Ndị Kraịst Site n’Ịhụnanya

Na 1971 a mụrụ nwanne m nwoke bụ́ David. Ka anyị na-etolite, a zụlitere anyị n’ọnọdụ ebe obibi jupụtara n’ịhụnanya na ikpo ọkụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a sitere ná mmekọrịta ịhụnanya nke ndị mụrụ anyị na-enwerịta.

Mgbe anyị dị na nwata, papa m ga-agụrụ anyị akụkọ Bible mgbe nile mgbe anyị na-aga ihi ụra, kpee ekpere, ma mgbe ahụ, n’ịbụ nke mama m na-amaghị, nye anyị swiiti chocolate e ji akwụkwọ ọlaedo na-egbuke egbuke fụchie. Anyị na-amụkọta Ụlọ Nche anyị ọnụ dị ka otu ezinụlọ mgbe nile, n’agbanyeghị ebe anyị nọ. Mgbe anyị nọ ezumike ezinụlọ, anyị mụrụ ya otu mgbe n’akụkụ ugwu na n’oge ọzọ mgbe anyị na-elepụ anya n’oké osimiri. Papa na-ekwukarị mgbe mgbe na ndị ahụ bụ ụfọdụ n’ime oge ndị kasị mee ya obi ụtọ. Ọ sịrị na ya na-emere ndị na-adịghị enweta oké ọṅụ nke ọmụmụ ihe ezinụlọ pụrụ iweta ebere.

Mgbe a bịara n’igosi ịhụnanya n’ebe Jehova nọ, papa m ji ihe nlereanya kụzie ihe. Mgbe ọ bụla mbipụta ọhụrụ nke magazin Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! bịara ma ọ bụ anyị anata mbipụta ọzọ nke Watchtower, papa m ga-eji ịnụ ọkụ n’obi gụchapụ ihe dị n’ime ya. Anyị mụtara n’aka ya na eziokwu Bible ekwesịghị ịbụ ihe e lere anya dị ka ihe na-adịchaghị mkpa kama ka ọ bụrụ ihe e ji kpọrọ ihe dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Otu n’ime ihe kasị dị oké ọnụ ahịa anyị nwere bụ Reference Bible nke papa m. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ihe ndị o deturu site n’ọmụmụ ihe ya kpuchiri peji ọ bụla. Ugbu a mgbe anyị na-agụ okwu ndị o dere n’akụkụ peji, ọ na-afọ nke nta ka ọ bụrụ na anyị ka pụrụ ịnụ ka ọ na-akụziri anyị ihe ma na-adụ anyị ọdụ.

Ikwesị Ntụkwasị Obi ruo Ọgwụgwụ

Na May 16, 1991, mgbe ọ nọ n’ozi ubi, papa m nwere obi nkụchi. Izu ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, a wara ya ahụ n’obi nke yiri ka ọ gara nke ọma. Otú ọ dị, n’abalị nke na-eso ịwa ahụ ahụ, anyị natara òkù fon site n’ụlọ ọgwụ ahụ. Papa na-agba ọbara, ndị dọkịta ahụ nwekwara oké nchegbu. A waghachiri ya ahụ ugboro abụọ n’abalị ahụ iji gbalịa ịkwụsị ịgba ọbara ahụ ma o nweghị isi. Ọbara Papa adịghị ekechi ekechi.

Ụbọchị na-esonụ, ka ọnọdụ papa m dịwanyere njọ ngwa ngwa, ndị dọkịta ahụ na mbụ kpọpụrụ nne m, e mesịakwa nwanne m nwoke nke m tọrọ n’akụkụ iji rụgide ha ikwere ka a mịnye papa m ọbara. Ma, papa m ebuworị ụzọ gwa ndị dọkịta ahụ na ya agaghị anakwere mmịnye ọbara n’okpuru ọnọdụ ọ bụla. Ọ kọwaara ha ihe ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ mere o ji na-ajụ ọbara ma kwuo na ya ga-anabata ihe ọ bụla ọzọ na-enweghị ọbara.—Levitikọs 17:13, 14; Ọrụ 15:28, 29.

Mmegide zoro ezo n’akụkụ nke ndị òtù ọrụ ahụ ike mere ka e nwee ọnọdụ ahụ erughị ala n’ime ngalaba ICU (ebe a na-elekọta ọnọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa). Nke a, tinyere ọnọdụ papa m na-akawanye njọ, mgbe ụfọdụ yiri ihe anyị na-apụghi idili. Anyị kpegaara Jehova ekpere maka enyemaka ma gbalịakwa itinye aro ndị dị irè anyị natara n’ọrụ. Ya mere mgbe anyị na-aga eleta ICU ahụ, anyị na-ejike nke ọma ma na-akwanyere ndị ọrụ ahụ ike ahụ ùgwù mgbe nile. Anyị gosipụtara mmasị dị ukwuu n’ọnọdụ papa m site n’ịjụ ajụjụ ndị bara uru, anyị kelekwara onye òtù ọrụ ọ bụla aka ya dị n’ilekọta Papa.

Ndị ọrụ ahụ ike ahụ hụrụ mgbalị anyị. N’ụbọchị ole na ole, ọnọdụ ahụ erughị ala ahụ gbanwere ịghọ nke obi ọma. Ndị nọọsụ ahụ lekọtara papa m ga-anọgide na-ele otú ọganihu ya dị ọ bụ ezie na e nyekwaghị ha ọrụ ilekọta ya. Otu dọkịta nke mesoburu anyị nnọọ n’ụzọ obi ọjọọ ọbụna dịrị nro ruo n’ọnọdụ nke ịjụ mama m otú o si na-anagide. Ọgbakọ anyị na ndị ikwu anyị kwadokwara anyị n’ịhụnanya. Ha zitere nri na kaadị ndị na-akasi obi, ha kpekwara ekpere n’ihi anyị.

N’ụzọ dị mwute, ahụ papa m anabataghị usoro ọgwụgwọ ahụ ma ọlị. Ọ nwụrụ abalị iri ka a wasịrị ya ahụ mbụ ahụ. Anyị na-eruru papa m újú n’ụzọ dị omimi. Mgbe ụfọdụ, mmetụta nke onye mmadụ nwụnahụrụ na-anyịgbu anyị. Ihe ọma mere na Chineke anyị na-ekwe nkwa na ‘kwa ụbọchị Ọ na-eburu anyị ibu,’ anyị amụtawokwa ịdabere na ya otú anyị na-emetụbeghị mbụ.—Abụ Ọma 68:19.

Anyị nile ekpebiwo na anyị onwe anyị kwa ga-anọgide na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ka anyị wee nweta ọṅụ nke ịhụ papa m n’ụwa ọhụrụ ahụ.—Mak 5:41, 42; Jọn 5:28; Ọrụ 24:15.

[Foto dị na peeji nke 21]

Frank Smith na nne ya, Phyllis, na Cape Town

[Foto dị na peeji nke 22]

Papa m na mama m n’oge ha lụrụ di na nwunye

[Foto dị na peeji nke 23]

Maka baptism mbụ e mere n’Entebbe, ụmụnna gbazitere ọdọ mmiri nke otu onye Africa bụ́ chiifu

[Foto dị na peeji nke 23]

Ikele ekele n’ụzọ omenala

[Foto dị na peeji nke 24]

Papa m na mama m nwa oge tupu ọnwụ papa m

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya