Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 10/1 p. 10-15
  • Chineke Ọ̀ Maara Gị N’ezie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ọ̀ Maara Gị N’ezie?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye ahụ nke Na-ahụ Ụzọ Anyị Nile
  • Ebe Ọ Bụla Anyị Nọ, Chineke Pụrụ Inyere Anyị Aka
  • Onye ahụ nke Na-aghọta Anyị n’Ezie
  • Jehova Maara Anyị Nke Ọma!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • ‘E Mere Anyị Ka Anyị Bụrụ Oké Ọrụ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Gbalịa Ịdị Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Jona Amụta Banyere Ebere Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 10/1 p. 10-15

Chineke Ọ̀ Maara Gị N’ezie?

“Jehova, . . . ọ bụkwa ụzọ m nile ka ị mawooro nke ọma.”—ABỤ ỌMA 139:1, 3.

1. Olee otú mmetụta nke bụ na ‘ndị ọzọ adịghị aghọta’ nchegbu, nsogbu, na nrụgide ndị anyị na-eche ihu siworo gbasaa?

Ọ̀ DỊ onye ọ bụla ghọtara n’ezie nchegbu, nrụgide, na nsogbu ndị ị na-eche ihu? Gburugburu ụwa e nwere ọtụtụ nde ndị mmadụ, ndị na-eto eto na ndị agadi, bụ́ ndị na-enweghị ezinụlọ ma ọ bụ ndị ikwu chọrọ ịma ihe na-eme ha. Ọbụna n’ime ọtụtụ ezinụlọ, ọtụtụ ndị nwunye—ee, nakwa ndị di—na-eche na ndị ha na-alụ adịghị aghọta n’ezie nrụgide ndị na-anyịgbu ha. Mgbe ụfọdụ, n’obi nkoropụ, ha na-eme mkpesa, sị: “Ma ị dịghị aghọta!” Ọtụtụ ndị na-eto eto ekwubiwokwa na ọ dịghị onye na-aghọta ha. Ma, n’etiti ndị chọworo nghọta dị ukwuu karị site n’aka ndị ọzọ, e nwere ụfọdụ ndị ndụ ha mesịworo nwee nzube mara mma. Olee ụzọ nke ahụ si kwe omume?

2. Gịnị pụrụ inyere ndị na-efe Jehova aka ibi ndụ nke na-enye nnọọ afọ ojuju?

2 Ọ bụ n’ihi na, n’agbanyeghị ma ụmụ mmadụ ibe ha hà ghọtazuru mmetụta ha ma ọ bụ na ha aghọtaghị, ha nwere obi ike na Chineke na-aghọta ọnọdụ ha nọ na ya, na dịkwa ka ndị ohu ya, ha agajeghị iche nsogbu ha ihu nanị ha. (Abụ Ọma 46:1) Ọzọkwa, Okwu Chineke nakwa enyemaka nke ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-enwe nghọta na-enyere ha aka ịhụ ihe karịrị nsogbu onwe ha. Akwụkwọ Nsọ na-enyere ha aka ịghọta na ozi ntụkwasị obi ha na-eje dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke, na e nwekwara ọdịnihu e ji n’aka maka ndị na-atụkwasị olileanya ha n’ebe ọ nọ na ná ndokwa ndị o meworo site n’aka Jisọs Kraịst.—Ilu 27:11; 2 Ndị Kọrint 4:17, 18.

3, 4. (a) Olee otú ịghọta eziokwu ahụ bụ na ‘Jehova bụ Chineke’ nakwa na o ‘mere anyị,’ pụrụ isi na-enyere anyị aka inweta ọṅụ n’ozi ya? (b) N’ihi gịnị ka anyị ji nwee obi ike zuru ezu ná nlekọta ịhụnanya Jehova?

3 Ọ pụrụ ịbụ na ị maara ihe dị n’Abụ Ọma 100:2, nke na-asị: “Werenụ ọṅụ fee Jehova ofufe; werenụ iti mkpu ọṅụ bịa n’ihu ya.” Mmadụ ole na-efe Jehova ofufe n’ezie n’ụzọ dị otú ahụ? E nyere ezi ihe ndị mere a ga-eji mee otú ahụ n’amaokwu nke 3, nke na-echetara anyị, sị: “Maranụ na Jehova, ya onwe ya bụ Chineke: ya onwe ya emewo anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị; anyị bụ ndị ya, na ìgwè atụrụ nke ọzụzụ anụ ya.” N’ihe odide Hibru, n’ebe ahụ e zoro aka n’ebe ọ nọ dị ka ʼElo·himʹ, si otú a na-egosi ịdị ukwu ya n’ụzọ dị ebube, dị ùgwù, na n’ụzọ mara mma. Nanị ya bụ ezi Chineke. (Deuterọnọmi 4:39; 7:9; Jọn 17:3) Ndị ohu ya na-abịa ịmara ọbụbụ Chineke ya, ọ bụghị nanị dị ka eziokwu nke a kụziwooro ha kama dị ka ihe ha na-enwe ahụmahụ ya nakwa nke ha na-enye ihe àmà ya site ná nrubeisi, ntụkwasị obi, na nraranye.—1 Ihe Emere 28:9; Ndị Rom 1:20.

4 N’ihi na Jehova bụ Chineke nke na-adị ndụ, na-enwe ike ịhụ ọbụna obi anyị, ọ dịghị ihe zoro ezo n’anya ya. Ọ mazuru ihe na-eme ná ndụ anyị. Ọ ghọtara ihe na-akpata nsogbu ndị anyị na-eche ihu nakwa ọgba aghara uche na mmetụta nke pụrụ isi ná ndị a pụta. Dị ka Onye Okike, ọ maara anyị karịa ka anyị maara onwe anyị. Ọ makwaara ụzọ isi nyere anyị aka ịnagide ọnọdụ anyị na ụzọ isi weta ihe inyeaka na-adịgide adịgide. N’ụzọ ịhụnanya, ọ ga-enyere anyị aka—dị ka onye ọzụzụ atụrụ nke nwụ nwa atụrụ n’obi ya—ka anyị ji obi anyị nile na-atụkwasị ya obi. (Ilu 3:5, 6; Aịsaịa 40:10, 11) Ọmụmụ nke Abụ Ọma 139 pụrụ ime ihe dị ukwuu iji mee ka obi ike ahụ sie ike.

Onye ahụ nke Na-ahụ Ụzọ Anyị Nile

5. Gịnị ka Jehova ‘igwupụta ala n’obi’ anyị pụtara, n’ihi gịnịkwa ka o ji kwesị ekwesị?

5 Site n’obi ekele miri emi, onye ọbụ abụ bụ́ Devid dere, sị: “Jehova, i gwupụtawo ala obi m, i wee mara m.” (Abụ Ọma 139:1) Devid nwere obi ike na ihe Jehova maara banyere ya abụghị n’elu n’elu. Chineke ahụghị Devid dị ka ụmụ mmadụ pụrụ, na-ahụta nanị ọdịdị elu ahụ ya, ikike ikwu okwu ya, ma ọ bụ nkà ya n’ịkpọ ụbọ akwara. (1 Samuel 16:7, 18) Jehova ‘gwupụtara’ ime ime obi Devid, o mewokwa otú ahụ site ná nchegbu ịhụnanya maka ọdịmma ime mmụọ ya. Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime ndị ohu Jehova raara onwe ha nye, ọ maara gị nke ọma kpọmkwem dị ka ọ maara Devid. Ọ̀ bụ na nke ahụ adịghị akpali n’ime gị mmetụta nke inwe ekele na oké nsọpụrụ?

6. Olee ụzọ Abụ Ọma 139:2, 3 si egosi na Jehova maara ihe ọ bụla anyị na-eme, ọbụna echiche anyị nile?

6 E kpughere ihe nile Devid mere n’ihu Jehova, Devid makwaara nke ahụ. “Gị onwe gị amawo nnọdụ ala m na mbili ọtọ m,” ka onye ọbụ abụ ahụ dere. “Ị na-aghọta echiche m nile site n’ebe dị anya. Okporo ụzọ m na ndina ala m ka ị fụchaworo dị ka ọka, ọ bụkwa ụzọ m nile ka ị mawooro nke ọma.” (Abụ Ọma 139:2, 3) Eziokwu ahụ bụ na Jehova nọ n’eluigwe, ebe dịpụrụ adịpụ site n’ụwa, egbochighị ya ịmara ihe Devid na-eme ma ọ bụ ihe ọ na-eche. Ọ ‘fụchawo,’ ma ọ bụ jiri nlezianya nyochaa, ihe nile Devid na-eme, ma n’ehihie ma n’abalị, ka o wee mara ụdị ihe ha bụ.

7. (a) N’iji ihe ndị mere ná ndụ Devid mere ihe ndabere, kwuo okwu n’ụfọdụ ihe ndị na-eme ná ndụ anyị nke Chineke maara. (b) Olee otú ịmara banyere nke a kwesịrị isi metụta anyị?

7 Mgbe ịhụnanya maka Chineke na obi ike o nwere n’ike Ya ịgbapụta kpaliri Devid dị ka nwa okorobịa iwepụta onwe ya ịlụso oké dimkpa ndị Filistia bụ́ Gọlaịat ọgụ, Jehova maara nke ahụ. (1 Samuel 17:32-37, 45-47) E mesịa, mgbe ibu iro nke ụmụ mmadụ kpataara Devid oké ihe mgbu nke obi, mgbe nrụgide dị nnọọ ukwuu nke na anya mmiri pụrụ ya n’anya n’abalị, a kasiri ya obi site n’ịmara na Jehova nụrụ arịrịọ ya. (Abụ Ọma 6:6, 9; 55:2-5, 22) N’otu aka ahụ, mgbe obi nke jupụtara n’ekele mere ka Devid tụgharịa uche banyere Jehova n’oge o churu ụra abalị, Jehova maara nnọọ banyere ya. (Abụ Ọma 63:6; tụlee Ndị Filipaị 4:8, 9.) Otu uhuruchi mgbe Devid kiriri nwunye otu onye agbata obi ya ebe ọ na-asa ahụ, Jehova makwaara nke ahụ, ọ hụkwara ihe mere mgbe Devid, ọbụna n’ime mkpirikpi oge, kwere ka ọchịchọ mmehie wepụ Chineke n’echiche ya. (2 Samuel 11:2-4) E mesịa, mgbe e zijere Netan onye amụma iji ịdị ike nke mmehie Devid gakwuru ya, ọ bụghị nanị na Jehova nụrụ okwu ndị si Devid n’ọnụ pụta kamakwa ọ ghọtara obi ahụ nwere nchegharị ebe ha si pụta. (2 Samuel 12:1-14; Abụ Ọma 51:1, 17) Ọ̀ bụ na nke ahụ ekwesịghị ime ka anyị chesie echiche ike banyere ebe anyị na-aga, ihe anyị na-eme, na ihe dị anyị n’obi?

8. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ‘okwu ndị dị n’ire anyị’ na-esi emetụta nguzo anyị n’ihu Chineke? (b) Olee ụzọ a pụrụ isi merie adịghị ike ndị dị n’iji ire na-eme ihe? (Matiu 15:18; Luk 6:45)

8 Ebe Chineke maara ihe ọ bụla nke anyị na-eme, o kwesịghị iju anyị anya na ọ maara banyere ụzọ anyị na-esi eji otu akụkụ ahụ nke dị ọbụna ntakịrị dị ka ire eme ihe. Eze Devid chọpụtara nke a, o dekwara, sị: “N’ihi na ọ dịghị okwu dị n’ire m, ma, lee, Jehova, ị machasịwo ya.” (Abụ Ọma 139:4) Devid maara nke ọma na ndị a gaje ịnabata dị ka ndị ọbịa n’ụlọ ikwuu Jehova ga-abụ ndị na-ekwutọghị ndị ọzọ na ndị jụrụ iji ire ha kọsaa àsị̀rị̀ e tinyere nnụ na ose nke ga-eweta nkọcha n’ebe onye a maruru ala nọ. Ndị Jehova na-emere amara ga-abụ ndị kwuru eziokwu ọbụna n’obi ha. (Abụ Ọma 15:1-3; Ilu 6:16-19) Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nke pụrụ ịchịkwa ire anyị n’ụzọ zuru okè, ma Devid ejighị ịda mbà kwubie na ọ dịghị ihe ya pụrụ ime iji meziwanye ọnọdụ ya. O wepụtara oge dị ukwuu ide na ịbụ abụ ọma ndị na-enye Jehova otuto. O zoghịkwa ọnụ n’ikwupụta mkpa ya maka enyemaka wee kpegara Chineke ekpere maka ya. (Abụ Ọma 19:12-14) Ọ̀ dịkwa mkpa ka e jiri ekpere tụlee otú anyị si eji ire anyị eme ihe?

9. (a) Gịnị ka nkọwa ahụ dị n’Abụ Ọma 139:5 na-egosi banyere ụzọ Chineke si maruo ọnọdụ anyị ala? (b) Banyere gịnị ka nke a na-eme ka anyị nwee obi ike ya?

9 Jehova adịghị ahụ anyị ma ọ bụ ọnọdụ anyị site nanị n’ụzọ a kpaara ókè. Ọ na-ahụ ihe nile, site n’akụkụ nile. N’iji obodo nke ndị agha gbara gburugburu mere ihe atụ, Devid dere, sị: “N’azụ na n’ihu ka ị nọchigideworo m.” N’ọnọdụ Devid, Chineke abụghị onye iro nke nọchiri ụzọ; kama nke ahụ, ọ bụ onye nche ya mụ anya. “[I] wee tụkwasị ọbụ aka gị n’ahụ m,” ka Devid kwukwasịrị, si otú a na-egosi nchekwa na nchebe Chineke nke e jiworo mee ihe maka abamuru na-adịgide na-adịgide nke ndị hụrụ ya n’anya. “Ọmụma ihe dị otú a dịkarịrị m ebube; ọ dị ka elu, apụghị m iru ya,” ka Devid kwetara. (Abụ Ọma 139:5, 6) Chineke maara ndị ohu ya n’ụzọ zuru ezu, n’ụzọ ruru ala, nke na anyị apụghị ịghọtazu ya. Ma anyị maara ókè zuru ezu iji nwee obi ike na Jehova ghọtara anyị n’ezie, na enyemaka ọ na-enye ga-abụ nke kasị mma.—Aịsaịa 48:17, 18.

Ebe Ọ Bụla Anyị Nọ, Chineke Pụrụ Inyere Anyị Aka

10. Eziokwu dị aṅaa nke na-agba ume ka nkọwa ahụ doro anya dị n’Abụ Ọma 139:7-12 na-ewepụta?

10 Site n’ile nlekọta ịhụnanya Jehova anya site n’akụkụ ọzọ, onye ọbụ abụ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Olee ebe m ga-alanarị mmụọ gị? Ma ọ bụ olee ebe m ga-esi n’ihu gị gbalaga?” O nweghị ọchịchọ ọ bụla ịnwa ịgbapụ n’ebe Jehova nọ; kama, ọ maara na ebe ọ bụla ọ pụrụ ịnọ, Jehova ga-ama, sitekwa na mmụọ nsọ, ọ pụrụ inyere ya aka. “Ọ bụrụ na arịgoo m n’eluigwe,” ka ọ gara n’ihu ikwu, “n’ebe ahụ ka ị nọ: ọ bụrụkwa na agbasaa m ute m [na Sheol, “NW”], lee, ị nọ n’ebe ahụ. Ọ bụrụ na achịrị m nkù nke ụtụtụ, biri n’akụkụ dịkarịsịrị anya nke oké osimiri; ọbụna n’ebe ahụ ka aka gị ga-eduru m, aka nri gị ga-ejidekwa m. M wee sị, N’ezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m; ma abalị ghọrọ ìhè gburugburu m. Ọbụna ọchịchịrị adịghị agbachiri gị; ma abalị na-enye ìhè dị ka ehihie: dị ka ọchịchịrị si dị, otú a ka ìhè dị n’anya gị.” (Abụ Ọma 139:7-12) Ọ dịghị ebe ọ bụla anyị pụrụ ịga, ọnọdụ ọ bụla anyị pụrụ iche ihu, nke ga-ewezụga anyị n’anya Jehova ma ọ bụ n’ebe mmụọ ya na-apụghị irute iji nyere anyị aka.

11, 12. (a) Ọ bụ ezie na Jona chefuru nke a n’otu oge, olee ụzọ e si gosipụta ikike Jehova nwere ịhụ na inye aka n’ọnọdụ nke Jona? (b) Olee ụzọ ahụmahụ Jona kwesịrị isi baara anyị uru?

11 N’otu oge Jona onye amụma chefuru nke ahụ. Jehova ekenyewo ya ọrụ ime nkwusa gwa ndị Nineve. N’ihi ihe ụfọdụ o chere na ya agaghị arụli ọrụ ahụ. Eleghị anya n’ihi àgwà ime ihe ike nke e ji mara ndị Asiria, echiche nke ije ozi na Nineve tụrụ Jona egwu. Ya mere ọ nwara izopụ. N’ọdụ ụgbọ mmiri Jọpa, o nwetara ikike ngafe ịbanye n’ụgbọ mmiri nke na-aga Tashish (nke a na-ejikọtakarị ya na Spain, ihe karịrị 3,500 kilomita n’ebe ọdịda anyanwụ Nineve). Otú o sina dị, Jehova hụrụ ya ka ọ banyere n’ụgbọ mmiri ahụ na ka ọ gara ihi ụra n’okpuru ala ụgbọ ahụ. Chineke makwaara ebe Jona nọ mgbe e mesịrị tụpụ ya n’ụgbọ mmiri ahụ, Jehova nụkwara olu Jona mgbe o kwere nkwa site n’afọ oké azụ ahụ na ya ga-akwụ ihe o kwere ná nkwa. N’ịbụ onye a napụtara bịaghachi n’ala akọrọ, e nyeghachiri Jona ohere nke ịrụzu ọrụ e kenyere ya.—Jona 1:3, 17; 2:1–3:4.

12 Lee ka ọ gaara esiworị kara Jona mma isi ná mmalite dabere n’ebe mmụọ Jehova dị inyere ya aka rụzuo ọrụ ya! Otú ọ dị, mgbe e mesịrị Jona ji obi umeala dekọọ ahụmahụ ya, ihe ndekọ ya enyeworo ọtụtụ ndị aka kemgbe ahụ igosipụta obi ike na Jehova nke yiri ihe siri oké ike nye Jona inweta.—Ndị Rom 15:4.

13. (a) Ọrụ ndị dị aṅaa ka Elaịja jiworo ikwesị ntụkwasị obi rụzuo tupu ọ gbapụ n’ihu Eze Nwanyị Jezebel? (b) Olee ụzọ Jehova si nyere Elaịja aka ọbụna mgbe ọ chọrọ ịga zopụ ná mpụga ókèala nke Israel?

13 Ahụmahụ Elaịja dịtụ nnọọ iche. O jiwo ikwesị ntụkwasị obi kwupụta iwu Jehova nke na Israel ga-enwe ụkọ mmiri ozuzo dị ka ntaramahụhụ maka mmehie ha. (1 Ndị Eze 16:30-33; 17:1) O jiwo nkwuwa okwu kwadoo ezi ofufe ná mmarịta aka ahụ dị n’etiti Jehova na Beal n’Ugwu Kamel. Ọ gawokwa n’ihu imezu ihe e kpere n’ikpe n’isi 450 ndị amụma Beal ná ndagwurugwu mmiri iyi nke Kaịshọn. Ma mgbe Eze Nwanyị Jezebel ji ọnụma ṅụọ iyi na ya ga-egbu Elaịja, Elaịja gbapụrụ ná mba ahụ. (1 Ndị Eze 18:18-40; 19:1-4) Jehova ọ̀ nọ ya n’ebe ahụ inyere ya aka n’oge ihe isi ike ahụ? Ee, n’ezie. Ọ bụrụ na Elaịja arịgowo n’otu ugwu dị elu, dị ka à ga-asị na ọ gara eluigwe; ọ bụrụ na o zowo n’ime ọgbà nke dị n’ime ala, dị ka à ga-asị na ọ bụ na Sheol; ọ bụrụ na ọ gbalagawo n’otu agwaetiti dị anya na-eji ọsọ nke ìhè ụtụtụ na-eji agbasa n’elu ala—aka Jehova gaara adị n’ebe ahụ ịgba ya ume na iduzi ya. (Tụlee Ndị Rom 8:38, 39.) Jehova gbakwara Elaịja ume ọ bụghị nanị site n’inye ya nri maka njem ya kamakwa site ná ngosipụta dị ebube nke ike ọrụ Ya. N’ịbụ onye e si otú a mee ka ọ dị ike, Elaịja malitere ọrụ amụma ya nke na-esonụ.—1 Ndị Eze 19:5-18.

14. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-agaghị eji zie ezi ikwubi na Chineke nọ ebe nile? (b) N’okpuru ọnọdụ ndị dị aṅaa ka Jehova jiworo ịhụnanya kwadoo ndị ohu ya n’oge a? (ch) Olee ụzọ o si bụrụ na ọbụna ma a sị na anyị nọ na Sheol Chineke ga-anọ n’ebe ahụ?

14 Okwu amụma ndị dị n’Abụ Ọma 139:7-12 apụtaghị na Chineke nọ ebe nile, na ya onwe ya nọ n’ebe nile n’oge nile. Akwụkwọ Nsọ na-egosi n’ụzọ doro anya na ọ dịghị otú ahụ. (Deuterọnọmi 26:15; Ndị Hibru 9:24) Ma, ọ dịghị mgbe ndị ohu ya na-anọ n’ebe ọ na-apụghị iru. Nke ahụ bụ eziokwu banyere ndị ọrụ ọchịchị Chineke ha kpọgaworo n’ebe ndị dị anya. Nke a bụ eziokwu banyere Ndịàmà na-eguzosi ike n’ihe n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, nke a bụkwa eziokwu banyere ndị ozi ala ọzọ e jidere n’ogige mkpọrọ dịpụrụ adịpụ na China n’oge ngwụsị afọ ndị 1950 na mmalite afọ ndị 1960. Nke a bụ eziokwu banyere ezi ụmụnna anyị nwoke na nwanyị ná mba Central Africa bụ́ ndị gbapụrụ n’obodo ha mgbe mgbe, ọbụna gbapụkwa ná mba ha. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, Jehova pụrụ iru kpọmkwem n’ime Sheol, bụ́ ili nkịtị, ma kpọghachite ndị kwesịrị ntụkwasị obi site ná mbilite n’ọnwụ.—Job 14:13-15; Luk 20:37, 38.

Onye ahụ nke Na-aghọta Anyị n’Ezie

15. (a) Na-amalite n’oge dị ngwa dị aṅaa ka Jehova na-enwe ike ịhụ ntolite anyị? (b) Olee ụzọ e si gosi ókè Chineke maruru anyị site n’aka onye ọbụ abụ zoro n’akụrụ?

15 N’okpuru ike mmụọ nsọ, onye ọbụ abụ ahụ dọọrọ uche gaa n’eziokwu ahụ bụ na Chineke amarawo anyị ọbụna tupu oge ọmụmụ anyị, na-asị: “N’ihi na gị onwe gị enwetawo akụrụ m abụọ: ị na-akpa m n’afọ nne m dị ka e si akpa àkwá. M ga-ekele gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ. Oké ọrụ ka ọrụ gị nile dị; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma.” (Abụ Ọma 139:13, 14) Njikọ nke mkpụrụ ndụ ụkpụrụ ihe nketa sitere n’ahụ nne anyị na nna anyị n’oge ntụrụ ime na-emepụta usoro nke na-emetụta ike ịrụ ọrụ nke anụ ahụ na uche anyị n’ebe ọ dị ukwuu. Chineke na-aghọta ike ịrụ ọrụ ahụ. N’abụ ọma nke a e hotara akụrụ n’ụzọ pụrụ iche, nke a na-ejikarị eme ihe n’Akwụkwọ Nsọ iji nọchite anya akụkụ kasị dịrị n’ime nke ọdịdị mmadụ.a (Abụ Ọma 7:9; Jeremaịa 17:10) Jehova amarawo ụmụ irighiri ihe ndị a banyere anyị kemgbe tupu a mụọ anyị. Ọ bụkwa ya bụ onye ji nchegbu ịhụnanya hazie ahụ mmadụ ka mkpụrụ ndụ nke ghọworo nwa n’ime akpa nwa nke onye bụ nne wee na-emepụta ụlọ nchebe iji ‘kpachie’ obere nwa ahụ ma chebe ya ka ọ na-etolite.

16. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Abụ Ọma 139:15, 16 si eme ka ike ịhụ ụzọ na-abami abami nke Chineke pụta ìhè? (b) N’ihi gịnị ka nke a kwesịrị iji bụrụ ihe agbamume nye anyị?

16 Mgbe ahụ, n’imesi ike ikike ịhụ ụzọ na-abami abami nke Chineke, onye ọbụ abụ ahụ kwukwara, sị: “Ọkpụkpụ m ezopụghị n’anya gị, mgbe e mere m na nzuzo, mgbe a dụrụ m nke ọma, dị ka onye ọkà ọdụdụ ákwà si adụ, n’ebe nile dị ala nke ụwa [ihe àmà na-egosi na ọ bụ okwu abụ nke na-ezo aka n’akpa nwa nne ya ma na-atụ aka n’okike nke Adam site n’ájá]. Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ ka-ezughị okè, ọ bụkwa n’akwụkwọ gị ka e dere ihe nile dị m n’ahụ, nke [akụkụ ahụ nile] a kpụrụ kwa ụbọchị, mgbe ọ dịghị otu ihe [otu akụkụ ahụ] dị n’ime ha.” (Abụ Ọma 139:15, 16) E nweghị obi abụọ banyere ya—ma ụmụ mmadụ ibe anyị hà na-aghọta anyị ma ọ bụ na ha adịghị, Jehova na-aghọta anyị. Olee otú nke ahụ kwesịrị isi metụta anyị?

17. Mgbe anyị lere ọrụ nile nke Chineke anya dị ka ndị dị ebube, gịnị ka nke a na-akpali anyị ime?

17 Onye dere Abụ Ọma 139 kwetara na ọrụ Chineke ndị o dere ihe banyere ha dị ebube. Ị̀ na-echekwa otú ahụ? Ihe dị ebube na-eme ka mmadụ chee echiche miri emi ma ọ bụ ṅaa ntị nke ọma. Ma eleghị anya ị na-emeghachi omume otú ahụ banyere ọrụ Jehova nile nke ihe nkịtị e kere eke. (Tụlee Abụ Ọma 8:3, 4, 9.) Ị̀ na-eche ụdị echiche dị otú ahụ banyere ihe o meworo n’iguzobe Alaeze Mesaịa ahụ, ihe ọ na-eme n’ịhụ na e kwusara ozi ọma ahụ n’ụwa nile, nakwa n’ụzọ Okwu ya na-esi agbanwe ọdịdị nile nke mmadụ?—Tụlee 1 Pita 1:10-12.

18. Ọ bụrụ na anyị ahụ ọrụ Chineke dị ka nke na-akpali egwu, olee ụzọ ọ ga-esi metụta anyị?

18 Ọ̀ bụ ahụmahụ gị n’otu aka ahụ na ịtụgharị uche n’ọrụ Chineke na-akpali ịtụ egwu, na ọ na-eme ka i nwee egwu nke dị mma, nke na-akpali akpali n’ụzọ siri ike, nke na-enwe oké mmetụta n’ọdịdị mmadụ gị nakwa n’ụzọ i si ebi ndụ gị? (Tụlee Abụ Ọma 66:5.) Ya bụrụ otú ahụ, obi gị ga-akpali gị ikele Jehova, inye ya otuto, iwepụta ohere iji kọọrọ ndị ọzọ banyere nzube ya na ihe ndị dị ebube ọ kwadebeworo imere ndị hụrụ ya n’anya.—Abụ Ọma 145:1-3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee Insight on the Scriptures, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, Mpịakọta nke 2, peji nke 150.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

◻ Olee ụzọ anyị ịmara na ‘Jehova bụ Chineke’ si enyere anyị aka ijere ya ozi n’ọṅụ?

◻ Olee ụzọ o kwesịrị isi metụta ndụ anyị site na Chineke ịmara ihe ọ bụla anyị na-eme?

◻ N’ihi gịnị ka eziokwu ahụ bụ na ọ dịghị mgbe anyị na-apụ n’anya Chineke ji bụrụ nke na-agba ume?

◻ N’ihi gịnị ka Chineke ji nwee ike ịghọta anyị n’ụzọ ndị mmadụ ọ bụla na-apụghị?

◻ N’ihi gịnị ka ọmụmụ ihe dị otú a ji eme ka anyị kelee Jehova?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya