Nwee Echiche Ziri Ezi Banyere Ebere Chineke
DỌKỊTA ahụ nwere obi ọma na oké nchegbu. Dị ka nchọpụta ya kasị mma si dị, onye ọrịa ya nọ n’oké mkpa nke ịwa ahụ iji zọpụta ndụ ya. Mgbe ọ gbatụrụ nkịtị ma welite okwu banyere mmịnye ọbara, o juru dọkịta ahụ anya. Mgbe ọ kọwara na n’ihi ihe ndị metụtara okpukpe na ya apụghị ịnakwere ịwa ahụ nke a ga-eji mmịnye ọbara mee, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ gbalịsiri ike ichepụta ụzọ isi nyere ya aka. N’ikpeazụ, o chere na ya achọtawo otu. Ọ sịrị: “Ọ kwa ịma, ọ bụrụ na ị naraghị mmịnye ọbara, ị ga-anwụ. Ị chọghị nke ahụ, ị̀ chọrọ?”
“Ee e, achọghị m,” ka onye ọrịa ya kwuru.
“Ma, eleghị anya, ọ bụrụ na ị nara otu, ị ga-emegide ihe okpukpe gị kwere na ya, bụ́ ndị dịkwa mkpa nye gị. Otú ọ dị, nke a bụ aro m na-atụ. Gịnị ma ị nara mmịnye ọbara wee si otú a zọpụta ndụ gị. Mgbe ahụ ị kọọrọ Chineke na i mehiewo, ma chegharịa. N’ụzọ dị otú ahụ, a ga-eweghachikwa gị n’okpukpe gị.”
Dọkịta ahụ nwere ezi nzube chere na ya achọtawo azịza nke zuru okè. Ọ maara na onye ọrịa ya kwenyere na Chineke nke na-eme ebere. N’ezie, nke a bụ oge kwesịrị ekwesị irite uru n’ebere Chineke! Ma aro ya ọ̀ bụ nke ezi uche dị na ya dị ka o si daa ná ntị?
Ọ̀ Dị Mgbe Anyị Na-eche Echiche Otú A?
Mgbe ụfọdụ anyị pụrụ ịchọta onwe anyị ka anyị na-atụgharị uche n’ụzọ ahụ dọkịta si mee. Eleghị anya egwu ji anyị n’ihi ntiwapụ a na-atụghị anya ya nke mmegide n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ. Ma ọ bụ anyị pụrụ ịchọta onwe anyị n’ọnọdụ na-eme ihere ebe anyị nọ ná nrụgide ime ihe nke na-emejọ akọ na uche anyị. N’ịbụ ndị ọ bịara ná mberede, anyị pụrụ ịchọ ịhọrọ ụzọ kasị dịrị mfe wee mee ihe anyị maara na ọ dị njọ, na-eburu n’uche ịrịọ maka mgbaghara ma e mesịa.
Ma ọ bụ a pụrụ ịnwa ndị mmadụ n’otu n’otu site n’ọchịchọ ọjọọ ha. Dị ka ihe atụ, nwa okorobịa pụrụ ịhụ onwe ya n’ọnọdụ ebe a na-anwasi ya ike ime omume rụrụ arụ. Kama ịlụso ọchịchọ ọjọọ ahụ ọgụ, ọ pụrụ ịdaba na ya, na-eburu n’uche idozi okwu ahụ n’etiti ya na Chineke ma e mesịa. Ụfọdụ eruwo ọbụna n’ókè nke ime mmehie dị oké njọ n’agbanyeghị na ha maara na a pụrụ ịchụpụ ha n’ọgbakọ ndị Kraịst. O doro anya na ha atụgharịwo uche, sị, ‘M ga-echeretụ nke nta. Mgbe ahụ m ga-echegharị, bụrụkwa onye a kpọbataghachiri.’
Ọnọdụ ndị a nile nwere ihe abụọ ha ji yie onwe ha. Nke mbụ, ndị mmadụ na-adaba n’ihe ọjọọ kama ịgba mbọ ime ihe ziri ezi. Nke abụọ, ha na-eche na mgbe ha mesịworo ihe ọjọọ, Chineke ga-agbaghara ha ozugbo ahụ ma ọ bụrụ nnọọ na ha arịọ.
Gịnị Bụ Echiche Ziri Ezi?
Nke a ọ̀ na-egosi nghọta ziri ezi maka ebere Chineke? Cheedị echiche banyere ebere ahụ ná mkpirikpi oge. Jisọs sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Jọn onyeozi kọwara ụzọ ebere ahụ si arụ ọrụ mgbe ọ sịrị: “Ihe ndị a ka m na-edegara unu n’akwụkwọ, ka unu wee ghara imehie. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emehie, anyị nwere otu onye na-ekwu ọnụ anyị n’ebe Nna anyị nọ, ya bụ Jisọs Kraịst, bụ́ onye ezi omume.” (1 Jọn 2:1) Ya mere, ọ bụrụ na n’ihi ezughị okè anyị adaba ná mmehie, anyị pụrụ ịbịakwute Chineke n’ekpere ma rịọ maka mgbaghara ná ndabere nke àjà Jisọs.
Otú ọ dị, nke a ọ̀ pụtara na ọ dịghị ihe o mere ma ànyị mere mmehie ma ọ bụ na anyị emeghị, ọ bụrụhaala na anyị arịọ maka mgbaghara ma e mesịa? Ọ dịghị ma ọlị. Cheta okwu ndị mbụ nke ebe ahụ e hotara: “Ihe ndị a ka m na-edegara unu n’akwụkwọ, ka unu wee ghara imehie.” Ihe Jọn gara n’ihu ikwu n’amaokwu ahụ na-egosi ndokwa ịhụnanya Jehova maka imeso ezughị okè anyị ihe. Otú o sina dị, anyị aghaghị ịgbalịsi ike ruo ókè anyị pụrụ iji zere ime mmehie. Ma ọ bụghị otú ahụ anyị na-egosi enweghị nkwanye ùgwù jọgburu onwe ya maka ịhụnanya Chineke, na-eme dị ka ndị ahụ Jud kwuru banyere ha bụ́ ndị ji amara Chineke mere ihe ngọpụ maka agụụ ihe ọjọọ.—Jud 4.
Ile ebere Chineke anya dị ka ihe yiri ụgbụ nchedo nke na-aghaghị ịghọgide anyị n’agbanyeghị ihe anyị mere na-ewetu ebere Chineke ala ma na-eme ka o yie ka mmehie adịchaghị oké njọ. Nke a abụghị eziokwu ma ọlị. Pọl onyeozi gwara Taịtọs, sị: “E gosiri amara nke Chineke, na-ewetara mmadụ nile nzọpụta, na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị wee jụ asọpụrụghị Chineke na agụụ ihe ọjọọ dị n’ụwa, wee dị ndụ uche zuru okè na nke ezi omume na nke ịsọpụrụ Chineke n’oge dị ugbu a.”—Taịtọs 2:11, 12.
Pọl gosiri ekele o nwere maka ebere Chineke n’ụzọ o si gbaa mgba megide ezughị okè nke ya. Ọ sịrị: “Ana m etipụta ahụ m ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu m: ka mụ onwe m ghara ịghọ onye a jụrụ ajụ n’ụzọ ọ bụla, mgbe m kwusasịrị okwu Chineke nye ndị ọzọ.” (1 Ndị Kọrint 9:27) Pọl ejighị egwuregwu were ya dị ka ihe efu na ya aghaghị ime mmehie site n’oge ruo n’oge. Ànyị kwesịrị ime otú ahụ?
Echiche nke Jisọs
N’otu oge, Jisọs gosiri ụzọ o si were echiche nke imebi ihe ziri ezi na ịgbaso ụzọ dị mfe karị iji wee zere ịta ahụhụ. Mgbe ọ malitere ịgwa ndị na-eso ụzọ ya banyere ọnwụ ịchụ àjà nke na-abịanụ, Pita nwara ịgbanwe uche ya, na-asị: “Chineke meere gị ebere, Onyenwe anyị: ihe a agaghị adịrị gị ma ọlị.” Gịnị ka Jisọs zaghachiri? “Gaa n’azụ m, Setan: ị bụ ihe na-eme ka m maa n’ọnyà: n’ihi na ị dịghị atụkwasị uche gị n’ihe Chineke, kama ọ bụ n’ihe mmadụ.”—Matiu 16:22, 23.
Mba siri ike Jisọs baara Pita gosiri n’ụzọ pụtara ìhè na Jisọs jụrụ ịgbaso ụzọ dị mfe nke metụtara ime ihe megidere uche Chineke. Ihe ndekọ na-egosi na ọ gbasoro ụzọ ziri ezi n’adaghị mbà, na-anata mmeso ọjọọ mgbe nile n’aka Setan. N’ikpeazụ, a kwara ya emo, tisie ya ihe ike, ọ nwụọkwa ọnwụ ihe mgbu. Otú o sina dị, o mebighị okwukwe ya, n’ihi nke a kwa o nwere ike inye ndụ ya dị ka ihe mgbapụta n’ihi anyị. N’ezie ọ tachighị obi n’ihe ndị a nile ka anyị wee ‘meere onwe anyị ebere’ mgbe ihe isi ike ma ọ bụ ọnwụnwa bilitere!
Banyere Jisọs a sịrị: “Ị hụrụ ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị.” (Ndị Hibru 1:9) Ịgbaso ụzọ dị mfe na-emetụtakarị mmebi iwu. Ya mere, ọ bụrụ na anyị kpọrọ nke a asị n’ezie—dị ka Jisọs mere—anyị ga-ajụ mgbe nile imebi okwukwe anyị. N’akwụkwọ Ilu, Jehova na-asị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” (Ilu 27:11) Ezi omume Jisọs nke kwesịrị ekwesị ma ghara imebi imebi wetaara obi Jehova oké ọṅụ. Anyị pụrụ inye Jehova obi ụtọ yiri nke ahụ ma ọ bụrụ na anyị agbasoo ụzọ Jisọs nke iguzosi ike n’ezi ihe.—1 Pita 2:23.
Inweta Ọzụzụ Site ná Ntachi Obi
Pita onyeozi dere, sị: “Nke obi na-atọ unu ụtọ nke ukwuu n’ime ya, ọ bụ ezie na e mere ka o wute unu n’ọnwụnwa dị iche iche nwa oge ugbu a, ma a sị na ọ dị mkpa, ka nnwapụta nke okwukwe unu, ebe ọ dịkarịrị ọlaedo oké ọnụ ahịa nke ukwuu, bụ́ ọlaedo nke na-ala n’iyi, ọ bụ ezie na a na-eji ọkụ nwapụta ya, ka e wee hụ nnwapụta ahụ na ọ na-eweta otuto na ebube na nsọpụrụ n’ime mkpughe nke Jisọs Kraịst.” (1 Pita 1:6, 7) N’ihi na anyị ezughị okè ma na-ebi n’ime ụwa nke Setan, anyị ga-anọgide na-eche ule na ọnwụnwa dị iche iche ihu. Dị ka Pita gosiri, nke a pụrụ imezu nzube dị mma. Ha na-etinye okwukwe anyị n’ule, na-egosi ma ọ̀ dara mbà ma ọ bụ dị ike.
Ha na-arụkwa ọrụ nke inye anyị ọzụzụ. Jisọs “mụtara ịṅa ntị ya site n’ahụhụ nile ọ hụrụ.” (Ndị Hibru 5:8) Anyị pụkwara ịmụta ịṅa ntị, tinyere ịdabere n’ebe Jehova nọ, ma ọ bụrụ na anyị atachie obi n’okpuru ule. Usoro mmụta nke a ga-anọgidekwa ruo mgbe o zuru ezu, dị ka Pita sịrị: “Chineke . . . onwe ya ga-eme ka unu zuo okè, meekwa ka unu guzosie ike, meekwa ka unu dị ike.”—1 Pita 5:10.
Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị emebie okwukwe anyị n’okpuru ule, anyị na-egosi onwe anyị ịbụ ndị ụjọ ma ọ bụ ndị na-adịghị ike, ndị na-enweghị ịhụnanya siri ike maka Jehova na maka ezi omume ma ọ bụ ndị na-enweghị njide onwe onye. Adịghị ike ọ bụla dị otú ahụ na-etinye mmekọrịta anyị na Chineke n’ihe ize ndụ. N’ezie, ịdọ aka ná ntị Pọl pụrụ ịbụ eziokwu n’ọnọdụ anyị: “A sị na anyị were ọchịchọ obi na-anọ ná mmehie mgbe anyị nataworo mmazu nke eziokwu, àjà a ga-achụ banyere mmehie dị iche iche afọdụghị ọzọ.” (Ndị Hibru 10:26) Lee ka o si ka mma ịghara ime mmehie ma ọlị karịa ịdaba n’adịghị ike na ịbanye n’ihe ize ndụ nke ịtụfu olileanya nile nke ndụ!
Iguzosi Ike n’Ezi Ihe nke Na-enweghị Ịkpa Ókè
N’ụbọchị Daniel onye amụma, e yiri ndị Hibru atọ egwu iji ọkụ gbuo ha ma ọ bụrụ na ha agaghị efe arụsị. Gịnị bụ nzaghachi ha? “A sị na ọ dị ụzọ ọ bụla Chineke ahụ onye anyị onwe anyị na-efe pụrụ ịnapụta anyị, ọ bụ n’oké ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu na n’aka gị, eze, ka ọ ga-anapụta anyị. Ma a sị na ọ pụghị ịnapụta anyị, ka ị mara, eze, na chi gị nile ka anyị na-agaghị adị na-efe, ọ bụkwa onyinyo ọlaedo ahụ nke i guzobeworo ọtọ ka anyị na-agaghị akpọ isiala nye.”—Daniel 3:17, 18.
Ha weere nguzo ahụ n’ihi na ha chọrọ ime ihe ziri ezi. Ọ bụrụ na o duje n’ọnwụ ha, ya dịrị otú ahụ. Obi ike ha dị ná mbilite n’ọnwụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na Chineke agbapụta ha, nke ahụ ga-aka mma. Ma nguzo ha siri ike enweghị ịkpa ókè. Otú ahụ ka o kwesịrị ịdị mgbe nile n’ebe ndị ohu Chineke nọ.
N’ụbọchị anyị ụfọdụ ndị jụworo imebi okwukwe ha abụwo ndị a tụrụ mkpọrọ, mekpaa ahụ, ọbụna gbuo. Ndị ọzọ achụwo àjà ihe onwunwe, na-ahọrọ ịnọ dị ka ogbenye kama ịba ọgaranya site n’ịchụ ezi ụkpụrụ n’àjà. Gịnị mere nwanyị onye Kraịst ahụ e hotara ná mmalite nke isiokwu a? O nwere ekele maka ebumnuche obi ọma nke dọkịta ahụ ọ bụ ezie na o hiere ụzọ, ma o mebighị okwukwe ya. Kama, nsọpụrụ o nwere maka iwu Jehova dujere ya n’ịjụ ịwa ahụ ahụ. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, o mesịrị gbakee ma nọgidesie ike n’ijere Jehova ozi. Otú ọ dị, mgbe o weere nguzo ya, ọ maghị ihe ga-esi na ya pụta, ma ọ dị njikere ịhapụ okwu ahụ dum n’aka Jehova.
Gịnị nyeere ya aka ịnọgidesi ike n’okpuru nrụgide? Ọ gbalịghị ịdabere n’ike nke onwe ya, onye ohu Chineke ọ bụla ekwesịghịkwa ime otú ahụ. Cheta, “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike, o mewo ka a chọta ya n’inyeaka nke ukwuu ná mkpagbu nile.” (Abụ Ọma 46:1) Lee ka o si ka mma ịgakwuru Chineke maka enyemaka mgbe a nọ n’okpuru ule karịa ime mmehie ma mesịa gakwuru ya maka ebere!
Ee, ka anyị ghara mgbe ọ bụla iji oké ebere Chineke mere ihe egwuregwu. Kama, ka anyị zụlite ezi ọchịchọ maka ime ihe ziri ezi, ọbụna n’ọnọdụ ihe isi ike. Nke a ga-eme ka mmekọrịta anyị na Jehova dị omimi, nye anyị ọzụzụ nke dị anyị mkpa maka ndụ ebighị ebi, ma gosipụta nkwanye ùgwù ziri ezi maka ebere Chineke. Omume amamihe dị otú ahụ ga-ewetara obi nke Nna anyị nke eluigwe ọṅụ.
[Foto dị na peeji nke 24]
Obi ike zuru ezu ná mbilite n’ọnwụ nyeere ndị Hibru atọ ahụ aka iguzosi ike n’ezi ihe