ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 41
Anyị Na-efe Chineke Onye Ebere Ya “Na-enweghị Atụ”
“Jehova na-emere ihe niile o kere eke ihe ọma, ọrụ ya niile na-egosikwa na ọ na-eme ebere.”—ỌMA 145:9.
ABỤ NKE 44 Ekpere Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya
IHE ISIOKWU A NA-EKWUa
1. Gịnị nwere ike ịgbata anyị n’obi ma e kwuo gbasara onye na-eme ebere?
Ọ BỤRỤ na a sị anyị kọwaa onye na-emere mmadụ ebere, anyị nwere ike ịsị na ọ bụ onye dị obiọma, onye na-enwere mmadụ ọmịiko, nakwa onye na-emere ndị ọzọ ihe ọma. O nwere ike ime ka anyị cheta akụkọ Jizọs kọrọ gbasara onye Sameria ahụ bụ́ ezigbo onye agbata obi. Nwoke ahụ bụ́ onye mba ọzọ “meteere” onye Juu ndị ohi kụrụ ihe ma napụ ihe ya ebere. Onye Sameria ahụ ‘meteere ya ebere’ n’ihi ahụ́ e merụrụ ya ma hazie otú a ga-esi elekọta ya. (Luk 10:29-37) Ihe atụ a na-akụziri anyị gbasara ebere bụ́ àgwà magburu onwe ya Jehova nwere. Ebere bụ otu ụzọ Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Otú o si emeso anyị ihe kwa ụbọchị na-egosi na ọ na-emere anyị ebere.
2. Olee ụzọ ọzọ e nwere ike isi mere mmadụ ebere?
2 E nwere ụzọ ọzọ mmadụ nwere ike isi meere ibe ya ebere. Ọ bụ ịghara ịta ya ahụhụ mgbe o mere ihe e kwesịrị iji taa ya ahụhụ. Jehova na-esikwa otú ahụ emere anyị ebere. Otu ọbụ abụ sịrị: “Ọ naghị emeso anyị ihe otú anyị si emehie.” (Ọma 103:10) Ma, e nwere oge ndị Jehova nwere ike ịdọsi onye mere mmehie aka ná ntị ike.
3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?
3 N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ atọ ndị a: Gịnị mere Jehova ji eme ebere? È nwere ihe jikọrọ ịdọsi mmadụ aka ná ntị ike na ime ebere? Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-eme ebere? Ka anyị lee otú Okwu Chineke si zaa ajụjụ ndị a.
IHE MERE JEHOVA JI EME EBERE
4. Gịnị mere Jehova ji emere anyị ebere?
4 Jehova na-achọkarị imere anyị ebere. Mmụọ nsọ mere ka Pọl onyeozi dee na ‘ebere Chineke enweghị atụ.’ Ihe Pọl na-ekwu bụ otú Chineke si meere ndị na-ezughị okè e tere mmanụ ebere ha enwee olileanya ịdị ndụ n’eluigwe. (Efe. 2:4-7) Ma, ọ bụghị naanị ha ka Jehova na-emere ebere. Devid dere, sị: “Jehova na-emere ihe niile o kere eke ihe ọma, ọrụ ya niile na-egosikwa na ọ na-eme ebere.” (Ọma 145:9) Ebe ọ bụ na Jehova hụrụ ndị mmadụ n’anya, ọ na-emere ha ebere mgbe ọ bụla ọ hụrụ ihe mere ọ ga-eji mee otú ahụ.
5. Olee otú Jizọs si mụta gbasara ebere Jehova?
5 Jizọs kacha onye ọ bụla ọzọ mara otú Jehova si achọ imere ndị mmadụ ebere. Ya na Nna ya anọọla ogologo oge n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa. (Ilu 8:30, 31) Jizọs hụrụ ebe Nna ya meere ụmụ mmadụ na-eme mmehie ebere ọtụtụ ugboro. (Ọma 78:37-42) Mgbe Jizọs na-akụzi ihe, o kwuru gbasara àgwà ọma a Nna ya nwere ọtụtụ ugboro.
Nna ahụ emenyeghị nwa ya ahụ kpafuru akpafu ihere. Ọ nabatara ya n’ụlọ ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)c
6. Olee otú Jizọs si mee ka a ghọta otú Nna ya si eme ebere?
6 Dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, Jizọs ji ihe atụ nwa mmefu mee ka a ghọta otú Jehova si achọ imere ụmụ mmadụ ebere. Nwa mmefu ahụ hapụrụ ụlọ gaa biwe “ndụ ọjọọ . . . , nke mere ka o mefuchaa ihe o nwere.” (Luk 15:13) Mgbe e mechara, o chegharịrị n’ihe ọjọọ ndị o mere, wetuo onwe ya ala ma lọghachi n’ụlọ. Gịnị ka nna ya mere? Jizọs sịrị: “Mgbe ọ ka nọ ebe dị anya, nna ya hụrụ ya ma metere ya ebere. O wee gbara ọsọ gaa makụọ ya ma jiri nwayọọ susuo ya ọnụ.” Nna ya emenyeghị ya ihere. Kama, o meere ya ebere ozugbo ma gbaghara ya, nabatakwa ya n’ezinụlọ ya. Nwa ahụ mere ezigbo ihe ọjọọ, ma, nna ya gbaghaara ya n’ihi na o chegharịala. Nna ahụ e ji mee ihe atụ ahụ nọchiri anya Jehova. Jizọs si otú a gosi otú Nna ya si achọ ịgbaghara ndị mmehie ji obi ha niile chegharịa.—Luk 15:17-24.
7. Olee otú ebere Jehova si egosi na o nwere amamihe pụrụ iche?
7 Jehova na-eme ebere n’ihi na amamihe ya enweghị atụ. Ọ na-eme mkpebi ga-abara ihe ndị o kere eke uru. Baịbụl kwuru na ‘amamihe nke si n’eluigwe na-emetere ndị ọzọ ebere, na-emekwa ihe dị mma.’ (Jems 3:17) Dị ka Nna hụrụ ụmụ ya n’anya, Jehova ma na imere ụmụ ya ebere ga-abara ha uru. (Ọma 103:13; Aịza. 49:15) Ebere Jehova na-eme ka anyị nwee olileanya n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. N’ihi ya, amamihe Jehova na-eme ka ọ na-eme ebere mgbe ọ bụla ọ hụrụ ihe mere ọ ga-eji mee otú ahụ. Ma, Jehova ma mgbe ọ na-ekwesịghị ime ebere. Ebe ọ bụ na ọ ma ihe, ọ gaghị emere mmadụ ebere mgbe ime otú ahụ ga-egosi na ọ na-akwado ihe ọjọọ.
8. Olee ihe ọ dị mkpa ka e mee mgbe ụfọdụ? N’ihi gịnịkwa?
8 Ọ bụrụkwanụ na ohu Jehova amara ụma na-ebi ndụ rụrụ arụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo ka anyị na onye dị otú ahụ “kwụsị ịna-emekọrịta ihe.” (1 Kọr. 5:11) A na-achụpụ ndị mmehie na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ. Ihe a dị ezigbo mkpa iji chebe ụmụnna anyị nakwa iji gosi na ụzọ Jehova dị ọcha. Ma, o nwere ụfọdụ ndị o nwere ike isiri ike ikweta na Chineke meere onye a chụrụ n’ọgbakọ ebere. Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke meere onye ahụ ebere? Ka anyị chọpụta.
ỊCHỤPỤ MMADỤ N’ỌGBAKỌ Ọ̀ BỤ IMERE ONYE AHỤ EBERE?
E nwere ike ịkpọpụ atụrụ na-arịa ọrịa iche, mana, onye na-azụ ya na-anọgidekwa na-elekọta ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 ruo na nke 11)
9-10. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 12:5, 6, gịnị mere e nwere ike iji kwuo na ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ bụ imere onye ahụ ebere? Nye ihe atụ.
9 Ọ bụrụ na a maa ọkwa n’ọmụmụ ihe na onye anyị na ya dị ná mma “abụghịzi Onyeàmà Jehova,” ọ na-ewute anyị nke ukwuu. Anyị nwere ike ịna-eche ma è kwesịrị ịchụ onye ahụ n’ọgbakọ. Ịchụ mmadụ n’ọgbakọ ọ̀ bụ imere onye ahụ ebere? Ee. Ọ bụrụ na a dọghị onye e kwesịrị ịdọ aka ná ntị aka ná ntị, ọ na-egosi na a hụghị ya n’anya, e metereghị ya ebere, ọ bụghịkwa ihe e kwesịrị ime. (Ilu 13:24) Ịchụ mmadụ n’ọgbakọ ò nwere ike inyere onye ahụ na-ekweghị echegharị aka ịgbanwe? Ee, o nwere ike. Ụfọdụ ndị mere mmehie dị oké njọ achọpụtala na otú ahụ ndị okenye si kata obi chụọ ha n’ọgbakọ mere ka ha ghọta onwe ha, meekwa ka ha gbanwee ma lọghachikwute Jehova.—Gụọ Ndị Hibru 12:5, 6.
10 Legodị ihe atụ a. Otu onye na-azụ atụrụ chọpụtara na ahụ́ adịghị otu atụrụ ya. Ọ ma na ọ bụrụ na ọ chọrọ ịgwọ atụrụ ahụ, o kwesịrị ịkpọpụ ya n’ebe atụrụ ndị nke ọzọ nọ. Ma, atụrụ na-achọkarị ịna-anọ ibe ha nso, o nwekwara ike obi agaghị adị ha mma ma a kpọpụ ha iche. Ọ̀ pụtara na obi tara onye ọzụzụ atụrụ ahụ mmiri maka na ọ kpọpụrụ atụrụ ahụ iche? Mba. Ọ ma na ọ hapụ atụrụ ahụ na-arịa ọrịa ka ya ndị nke ọzọ ahụ́ dị nọrọ, o nwere ike ime ka ọrịa ahụ fere ha. Mana, ọ bụrụ na ọ kpọpụ atụrụ ahụ iche, ọ ga-eme ka ọrịa ahụ ghara ife atụrụ ndị nke ọzọ.—Tụlee Levitikọs 13:3, 4.
11. (a) Olee ụzọ ndị onye a chụrụ n’ọgbakọ si yie atụrụ na-arịa ọrịa? (b) Olee ihe ndị a chụrụ n’ọgbakọ nwere ike ime, oleekwa otú e nwere ike isi nyere ha aka?
11 E nwere ike iji Onye Kraịst a chụrụ n’ọgbakọ tụnyere atụrụ ahụ ahụ́ na-adịghị. Ebe ọ bụ na ya na Jehova adịghịzi ná mma, o yiri onye na-arịa ọrịa. (Jems 5:14) Ụdị ọrịa a nwere ike ife ndị ọzọ otú ahụ ụfọdụ ọrịa nkịtị nwere ike ife ndị ọzọ. N’ihi ya, mgbe ụfọdụ, ọ dị ezigbo mkpa ka a chụpụ onye mere mmehie n’ọgbakọ. Ime otú a na-egosi na Jehova hụrụ atụrụ ya ndị nke ọzọ n’anya. Ihe a nwekwara ike ime ka onye ahụ mere mmehie ghọta na ihe o mere dị ezigbo njọ ma chegharịa. Onye a chụpụrụ n’ọgbakọ nwere ike ịna-abịa ọmụmụ ihe ka ọ na-amụta ihe ndị ga-eme ka okwukwe ya sie ike ọzọ. O nwekwara ike iwere akwụkwọ anyị ndị ọ ga-agụ n’onwe ya, na-elekwa ihe omume tiivi anyị. Ọ bụrụ na ndị okenye achọpụta na ọ na-agbanwe, ha nwere ike ha nọtụ, ha enye ya ndụmọdụ ga-enyere ya aka ka ya na Jehova dịghachi ná mma ka e nwee ike ịnabata ya n’ọgbakọ.b
12. Olee ihe ndị okenye ga-emere onye mmehie na-ekweghị echegharị iji gosi na a hụrụ ya n’anya?
12 Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị cheta na ọ bụ naanị ndị mmehie na-ekweghị echegharị ka a na-achụpụ n’ọgbakọ. Ndị okenye ma na ihe a abụghị obere okwu ma ọ bụkwanụ ihe e kwesịrị iji gwuo egwu. Ha ma na Jehova na-adọ anyị aka ná ntị “otú kwesịrị ekwesị.” (Jere. 30:11) Ha hụrụ ụmụnna ha n’anya. Ha achọghịkwa ime ihe ọ bụla ga-eme ka ụmụnna ha na Jehova ghara ịdị ná mma. Mgbe ụfọdụ, ihe a ga-emere onye mere mmehie iji gosi na a hụrụ ya n’anya ma na-emere ya ebere bụ ịchụ ya n’ọgbakọ.
13. Gịnị mere o ji dị mkpa ka a chụpụ otu Onye Kraịst nọ n’ọgbakọ Kọrịnt n’ọgbakọ?
13 Ka anyị tụlee otú Pọl onyeozi si meso otu onye mmehie na-ekweghị echegharị. E nwere otu nwanna nọ na Kọrịnt ya na nwunye nna ya na-akwa iko. Ihe a jọgburu onwe ya. Pọl ma na Jehova gwara ndị Izrel oge ochie, sị: “Nwoke ya na nwunye nna ya nwere mmekọahụ emenyela nna ya ihere. A ga-egburịrị ha abụọ.” (Lev. 20:11) Pọl enweghị ike ikwu ka e gbuo nwoke ahụ. Ma, ọ gwara ndị Kọrịnt ka a chụọ ya n’ọgbakọ. Ihe ahụ nwoke ahụ nọ na-eme nọ na-akpa ọgbakọ ahụ aka ọjọọ. Ụfọdụ ewereghịdị ihe ahụ ọ na-eme ka ihe jọgburu onwe ya.—1 Kọr. 5:1, 2, 13.
14. Olee otú Pọl si metere nwoke ahụ a chụrụ n’ọgbakọ na Kọrịnt ebere, n’ihi gịnịkwa? (2 Ndị Kọrịnt 2:5-8, 11)
14 Pọl mechara chọpụta na nwoke ahụ mere ihe ọjọọ agbanweela. O jirila obi ya niile chegharịa. N’agbanyeghị na nwoke ahụ menyere ọgbakọ ahụ ihere, Pọl gwara ndị okenye na ya achọghị “ikwu ọtụtụ okwu gbasara ya.” Ọ gwara ha, sị: ‘Gbagharanụ ya ma kasie ya obi.’ Lee ihe mere Pọl ji kwuo ihe a. Ọ sịrị: “Ka otú ọnọdụ ya si ewute ya ghara ime ka ọ daa mbà.” Pọl meteere nwoke ahụ chegharịrịnụ ebere. Pọl achọghị ka ihe ọjọọ ahụ o mere wutebiga ya ókè nke na ọ gaghịzi na-agba mbọ ka a gbaghara ya.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 2:5-8, 11.
15. Olee otú ndị okenye na-esi emeso onye mere mmehie?
15 Dịkwa ka Jehova, ndị okenye na-eme ebere. Ha na-adọsi onye mere mmehie dị oké njọ aka ná ntị ike mgbe ọ dị mkpa. Ma, ha na-agbalịkwa imere ya ebere mgbe ọ bụla o kwesịrị. Ọ bụrụ na ndị okenye adọghị onye mere mmehie aka ná ntị, ọ bụghị ebere ka ha na-emere ya, kama, ha na-akwado ihe ọjọọ. Ọ̀ bụ naanị ndị okenye kwesịrị ịna-eme ebere?
GỊNỊ NWERE IKE INYERE ANYỊ NIILE AKA ỊNA-EME EBERE?
16. Dị ka e kwuru n’Ilu 21:13, olee otú Jehova si emeso ndị na-anaghị eme ebere?
16 Ndị Kraịst niile na-agba mbọ ịna-eme ebere ka Jehova. N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na Jehova agaghị ege onye ọ bụla na-anaghị emetere ndị ọzọ ebere ntị. (Gụọ Ilu 21:13.) O nweghị onye n’ime anyị ga-achọ ka Jehova ghara ịna-anụ ekpere ya. N’ihi ya, anyị anaghị ajụ ige Onye Kraịst ibe anyị na-ata ahụhụ ntị, kama, anyị na-adị njikere mgbe niile “ịnụ ákwá onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-ebe.” Anyị na-eburu ihe a Baịbụl kwuru n’obi nke bụ́: “A ga-ekpe onye na-anaghị eme ebere ikpe n’emereghị ya ebere.” (Jems 2:13) Ọ bụrụ na anyị amata na e kwesịrị imere anyị ebere, ọ ga-eme ka anyị na-emere ndị ọzọ ebere. Anyị kwesịkwara igosi na anyị na-eme ebere, karịchaa, mgbe onye mere mmehie chegharịrị, a nabatakwa ya n’ọgbakọ.
17. Olee otú Eze Devid si gosi na ọ na-eme ebere?
17 Ihe ndị a kọrọ na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịna-eme ebere ma ghara ịna-akpọchi obi anyị. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara Eze Devid. O meteere ndị ọzọ ebere ọtụtụ ugboro. N’agbanyeghị na Sọl chọrọ igbu ya, o meteere Sọl bụ́ eze Chineke họpụtara ebere ma ghara imegwara ya ihe ndị o mere ya.—1 Sam. 24:9-12, 18, 19.
18-19. Olee oge abụọ Devid na-emeghị ebere?
18 Ma, ọ bụghị mgbe niile ka Devid mere ebere. Dị ka ihe atụ, mgbe Nebal bụ́ nwoke obi ọjọọ kparịrị Devid na ndị agha ya ma jụ inye ha nri, Devid were iwe ọkụ ma kpebie na ya ga-egbu nwoke ahụ na ụmụ nwoke niile nọ n’ụlọ ya. Nwunye Nebal bụ́ Abigel nwere obiọma, na-enwekwa ndidi. O mere ngwa ngwa bunye Devid nri nke mere ka Devid gharazie igbu Nebal na ụmụ nwoke nọ n’ụlọ ya.—1 Sam. 25:9-22, 32-35.
19 N’oge ọzọkwa, Netan onye amụma gwara Devid na e nwere otu nwoke bara ọgaranya naara onye agbata obi ya atụrụ ya ọ na-anaghị eji egwu egwu. Iwe were Devid, ya asị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, aṅụ iyi na nwoke mere ihe a kwesịrị ịnwụ!” (2 Sam. 12:1-6) Devid ma Iwu Mosis nke ọma. Onye zuru otu atụrụ kwesịrị iji atụrụ anọ ọzọ kwụọ ụgwọ ya. (Ọpụ. 22:1) Ma, gịnị mere Devid ji ma nwoke ahụ ikpe ọnwụ? Ikpe a bụ ikpe obi ọjọọ. Ma ihe mere Netan ji kọọrọ ya akụkọ ahụ bụ iji mee ka ọ mata otú ihe o mere dịruru ná njọ. O nweghị otú a ga-esi jiri ebere Jehova meere Devid tụnyere nke Devid gaara emere nwoke ahụ naara mmadụ atụrụ ya Netan ji mee ihe atụ.—2 Sam. 12:7-13.
Eze Devid emereghị nwoke ahụ Netan ji meere ya ihe atụ ebere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19 na nke 20)d
20. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Devid?
20 Mgbe ezigbo iwe ji Devid, o kpebiri na Nebal na ụmụ nwoke niile nọ n’ụlọ ya kwesịrị ịnwụ. Mgbe e mechara, o kwukwara na nwoke ahụ Netan ji mee ihe atụ kwesịrị ịnwụ n’ihi ihe o mere. Na nke abụọ a, anyị nwere ike ịna-eche ihe mere Devid bụ́ nwoke na-eme ebere ga-eji kpee ụdị ikpe a. Ka anyị lee ihe mere n’oge ahụ Devid kwuru ihe a. N’oge ahụ, obi nọ na-ama ya ikpe. Ọ bụrụ na mmadụ ejiri obi ọjọọ na-ekpe ikpe, o gosiri na ya na Jehova adịghịzi ná mma. Jizọs dọsiri ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ike, sị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. N’ihi na otú unu si ekpe ikpe ka a ga-esi kpee unu ikpe.” (Mat. 7:1, 2) N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ike anyị niile ka anyị ghara iji obi ọjọọ na-emeso ndị mmadụ ihe. Kama, ka anyị na-eṅomi Chineke anyị, onye ebere ya “na-enweghị atụ.”
21-22. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi metere ndị mmadụ ebere?
21 Imetere mmadụ ebere abụghị naanị inwe mwute maka ihe mere onye ahụ. Ndị na-emere ndị ọzọ ebere na-eme ihe iji nyere ha aka. Anyị niile kwesịrị ịna-eleru anya ka anyị mata ndị e kwesịrị inyere aka n’ezinụlọ anyị, n’ọgbakọ anyị, nakwa n’obodo anyị. N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi meere ndị mmadụ ebere. È nwere onye e kwesịrị ịkasi obi? Ànyị nwere ike inyere ya aka, dị ka ihe atụ, inye ya nri ma ọ bụ imere ya ihe ndị ọzọ dị ya mkpa? È nwere nwanna lọghachiri n’ọgbakọ e kwesịrị imeta enyi ma na-agba ume? Ànyị nwere ike izi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke iji kasie ha obi? Ihe a so n’ụzọ kacha mma anyị nwere ike isi metere ndị mmadụ ebere.—Job 29:12, 13; Rom 10:14, 15; Jems 1:27.
22 Ọ bụrụ na anyị achọpụta na e nwere ndị e kwesịrị imere ụdị ihe ndị a, ọ ga-eme ka anyị ghọta na ndị e kwesịrị imere ebere juru eju bara abara. Ọ bụrụ na anyị ana-emere ndị mmadụ ebere, ọ ga-eme Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye ebere ya “na-enweghị atụ,” ezigbo obi ụtọ.
ABỤ NKE 43 Ekpere E Ji Ekele Chineke
a Ebere bụ otu n’ime àgwà ndị magburu onwe ha Jehova nwere. Ọ bụkwa àgwà onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịmụta. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe mere Jehova ji eme ebere, ihe mere anyị nwere ike iji sị na Jehova na-eji obi ebere adọ mmadụ aka ná ntị, nakwa otú anyị ga-esi mụta ịkpa àgwà ọma a.
b Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata otú ndị a nabatara n’ọgbakọ nwere ike isi mee ka ha na Jehova dịghachi ná mma nakwa otú ndị okenye nwere ike isi nyere ha aka, gụọ isiokwu bụ́ “Otú Ị Ga-esi Eme Ka Gị na Jehova Dịghachi ná Mma” nke dị n’Ụlọ Nche a.
c NKỌWA FOTO: Ebe nna nwa mmefu ahụ nọ n’elu ụlọ ya hụ ka nwa ya ahụ kpafuru akpafu na-alọghachi. Ọ gbaturu ozugbo gaa makụọ ya.
d NKỌWA FOTO: N’ihi na akọnuche Eze Devid nọ na-ama ya ikpe, o ji iwe ma nwoke ahụ Netan ji meere ya ihe atụ ikpe ọnwụ.