Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w21 Ọktoba p. 14-17
  • Otú Ị Ga-esi Eme Ka Gị na Jehova Dịghachi ná Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Eme Ka Gị na Jehova Dịghachi ná Mma
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OLEE IHE NDỊ NA-EME KA O SIE IKE?
  • KPEBIE IME IHE NDỊ Ị GA-EMELI
  • ADALA MBÀ
  • “Kpọọ Ndị Okenye”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ṅomie Obi Ebere Chineke Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Jehova Ji Gị Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Ndị Okenye, Na-emenụ Ka Pọl Onyeozi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
w21 Ọktoba p. 14-17
Ebe ike gwụrụ otu nwanna mgbe ọ na-echegbu onwe ya maka nnukwu ọrụ ọ ga-arụ na oge ọ ga-ewe ya iji rụzie ụlọ ya dakasịrị adakasị.

Otú Ị Ga-esi Eme Ka Gị na Jehova Dịghachi ná Mma

KWA afọ, a na-anabata ọtụtụ atụrụ Jehova a chụrụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Chetụgodịnụ ụdị ọṅụ ‘a na-aṅụrị n’eluigwe’ ma onye nke ọ bụla n’ime ha lọghachi. (Luk 15:​7, 10) Ọ bụrụ na a nabatala gị n’ọgbakọ, obi sie gị ike na obi dị Jizọs, ndị mmụọ ozi, na Jehova ụtọ ịhụ na ị lọghachila n’ọgbakọ. Ma, ka ị na-agbalị ime ka gị na Jehova dịghachi ná mma, e nwere ihe ndị nwere ike ime ka o siere gị ike. Olee ụfọdụ n’ime ha? Gịnịkwa nwere ike inyere gị aka?

OLEE IHE NDỊ NA-EME KA O SIE IKE?

Obi ka na-ada ọtụtụ ụmụnna mbà n’agbanyeghị na a nabatala ha n’ọgbakọ. Chetụgodị otú obi dị Eze Devid. N’agbanyeghị na a gbagharala ya mmehie ya, o kwuru, sị: “Mmehie m anyịgbuola m.” (Ọma 40:12; 65:3) Ọ bụrụ na mmadụ alọghachikwute Jehova, obi ya ka nwere ike ịna-ama ya ikpe ma ọ bụkwanụ ihere ana-eme ya ruo ọtụtụ afọ. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Isabellea a chụburu n’ọgbakọ ruo ihe karịrị afọ iri abụọ sịrị: “O siiri m ike ikweta na Jehova ga-agbaghara m.” Ọ bụrụ na obi adaa gị mbà, o nwere ike ime ka gị na Jehova ghara ịdị ná mma ọzọ. (Ilu 24:10) Ekwela ka o mee gị.

Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-echegbu onwe ha na ha agaghị enwe ike ime ihe niile ha kwesịrị ime ka ha na Jehova dịghachi ná mma. Mgbe a nabatachara otu nwanna aha ya bụ Antoine n’ọgbakọ, ọ sịrị: “M chere na mụ echefuola ọtụtụ ihe m na-eme tupu a chụọ m n’ọgbakọ.” Iche otú a nwere ike ime ka ọtụtụ ndị na-ala azụ n’ime ihe ndị a na-eme n’ofufe Jehova.

Dị ka ihe atụ, e nwee onye ajọ ifufe mebisịrị ụlọ ya, obi nwere ike ịda ya mbà ma o cheta nnukwu ọrụ ọ ga-arụ na oge ọ ga-ewe ya iji rụzie ụlọ ahụ. Ọ bụrụkwa na i mere mmehie dị oké njọ, ya emee ka gị na Jehova ghara ịdị ná mma, i nwere ike iche na ọ ga-efu gị ọtụtụ ihe iji mee ka gị na Jehova dịghachi ná mma. Mana, e nwere ihe ga-enyere gị aka.

Jehova gwara anyị, sị: “Bịanụ ka anyị kpezie.” (Aịza. 1:18) Ị gbaala ezigbo mbọ ka gị na Jehova “kpezie.” Jehova hụrụ gị n’anya maka mbọ ahụ ị gbara. Chegodị ihe a: Otú a ị lọghachikwutere Jehova mere ka Jehova nwee ezigbo ihe ọ ga-azaghachi Ekwensu.​—Ilu 27:11.

Ihe a i mere gosiri na ị bịaruola Jehova nso, yanwa kwekwara nkwa na ọ ga-abịaru gị nso. (Jems 4:8) Ma, ihe dị mkpa abụghị naanị ndị mmadụ ịmata na ị lọghachila n’ọgbakọ. I kwesịrị ịna-eme ihe ndị ga-eme ka ị na-ahụkwu Nna gị na Enyi gị bụ́ Jehova n’anya. Olee otú i nwere ike isi na-eme ya?

KPEBIE IME IHE NDỊ Ị GA-EMELI

Gbalịa kpebie ihe ndị ị ga-emeli. O nwere ike ịbụ na ị na-echeta ihe ndị ị mụtara gbasara Jehova na nkwa ndị o kwere maka ọdịnihu. Ma ugbu a, e nwere ihe ndị ị ga na-eme mgbe niile, dị ka ikwusa ozi ọma, ịga ọmụmụ ihe, na gị na ụmụnna gị ịna-akpakọrịta. Lee ihe ndị ọzọ i nwere ike ịna-eme.

Na-ekpe ekpere mgbe niile. Nna gị nke eluigwe ghọtara na ọ bụrụ na obi gị ka na-ama gị ikpe, o nwere ike ime ka o siere gị ike ikpe ekpere. (Rom 8:26) N’agbanyeghị ya, ‘nọgide na-ekpe ekpere.’ Na-agwa Jehova na ị chọsiri ike ka gị na ya bụrụ enyi. (Rom 12:12) Otu nwanna aha ya bụ Andrej chetara ihe mere ya n’oge gara aga. Ọ sịrị: “Obi m nọ na-ama m ezigbo ikpe, ihere ana-emekwa m. Ma, mgbe ọ bụla m kpere ekpere, obi na-aka eru m ala.” Ọ bụrụ na ị maghị ihe ị ga-ekpe n’ekpere, gụọ ekpere Eze Devid kpere mgbe o chegharịrị n’Abụ Ọma nke 51 na nke 65.

Na-amụchi Baịbụl anya. Ime otú ahụ ga-eme ka okwukwe gị sie ike, meekwa ka ị hụkwuo Jehova n’anya. (Ọma 19:​7-11) Otu nwanna aha ya bụ Felipe sịrị: “Amụchighị Baịbụl anya bụ ihe mbụ mere ka okwukwe m nyụọ ka ọkụ, meekwa ka m mejọọ Jehova. Achọghị m ka ụdị ihe ahụ mee m ọzọ. N’ihi ya, m kpebiri na m ga na-amụchi Baịbụl anya.” I nwekwara ike ime otú ahụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata isiokwu ndị ị ga na-amụ, gwa enyi gị ma nke a na-akọ ka o nyere gị aka.

Mee ka gị na ụmụnna gị dịghachi ná mma. Ụfọdụ ndị lọghachiri n’ọgbakọ na-echegbu onwe ha na ndị ọzọ ga na-ele ha anya ọjọọ. Otu nwanna aha ya bụ Larissa sịrị: “Ezigbo ihere nọ na-eme m. M chere na mụ emechuola ụmụnna m ihu. M chere otú a ruo ọtụtụ oge.” Obi sie gị ike na ndị okenye na ụmụnna ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ chọsiri ike inyere gị aka ka gị na Jehova dịghachi ná mma. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Gịnị Ka Ndị Okenye Nwere Ike Ime?”) Obi dị ha ụtọ na ị lọghachila. Ha chọkwara ka ị na-enwe obi ụtọ.​—Ilu 17:17.

Gịnị ka i nwere ike ime ka gị na ụmụnna gị dịkwuo ná mma? Soro ha na-agachi ọmụmụ ihe anya. Gị na ha na-arụkwa n’ozi ọma. Olee otú ihe a ga-esi nyere gị aka? Otu nwanna aha ya bụ Felix sịrị: “Ndị nọ n’ọgbakọ na-atụsi anya ike ka m lọghachi. O mere ka m mata na ha hụrụ m n’anya. Ha niile nyeere m aka ịlọghachi n’ọgbakọ, ịmata na Jehova hụrụ m n’anya, nakwa ịna-emekwu nke ọma n’ofufe Jehova.”​—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Gịnị Ka I Nwere Ike Ime?”

Gịnị Ka I Nwere Ike Ime?

Bido ikpe ekpere, ịmụ ihe, na gị na ụmụnna gị ịna-akpakọrịta ọzọ

Ebe otu okenye na-ekpere nwanna lọghachiri n’ọgbakọ ekpere.

NA-EKPE EKPERE MGBE NIILE

Gwa Jehova na ị chọsiri ike ka gị na ya dịghachi ná mma. Ndị okenye ga na-ekpere gị ekpere, na-etinyekwa gị n’ekpere nke ha

Ebe okenye ahụ ji akwụkwọ “Bịaruo Jehova Nso” na-amụrụ nwanna ahụ ihe.

NA-AMỤCHI BAỊBỤL ANYA

Na-amụchi Baịbụl anya, ọ ga-enyere gị aka ka ị hụkwuo Jehova n’anya

Ebe nwanna ahụ na ụmụnna ndị ọzọ na-akparịta ụka mgbe ha gara nnọkọ oriri na ọṅụṅụ.

GỊ NA ỤMỤNNA GỊ NA-AKPAKỌRỊTA

Na-aga ọmụmụ ihe niile, sorokwa ụmụnna gị na-aga ozi ọma

ADALA MBÀ

Ekwensu ga-anọgide na-ewetara gị nsogbu ndị ọzọ iji mee ka mbọ ị na-agba ka gị na Jehova dịghachi ná mma kụọ afọ n’ala. (Luk 4:13) Dị njikere ime ka okwukwe gị sie ezigbo ike ugbu a.

Jehova kwuru banyere atụrụ ya, sị: “M ga-achọ nke furu efu, dughachite nke kpafuru akpafu, kee ọkpụkpụ nke gbajiri agbaji ákwà, meekwa ka nke ike na-adịghị dị ike.” (Ezik. 34:16) Jehova enyerela ọtụtụ ndị ọzọ aka ka ya na ha dịrị ná mma. Ka obi sie gị ike na ọ chọrọ inyere gị aka ná mbọ ị na-agba ka gị na ya na-adịkwu ná mma.

Gịnị Ka Ndị Okenye Nwere Ike Ime?

Ebe otu okenye na-enyere nwanna ahụ aka ịrụzi ụlọ ya.

E nwere ọtụtụ ihe ndị okenye nwere ike ime iji nyere onye a nabatara n’ọgbakọ aka ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Lee ihe ụfọdụ ha nwere ike ime iji nyere ha aka.

Mesie ha obi ike. Pọl onyeozi ma na otú ọnọdụ onye mmehie chegharịrị echegharị si ewute ya nwere ike ime “ka ọ daa mbà.” (2 Kọr. 2:7) Ihere nwere ike ịna-emekarị ya ma ọ bụkwanụ ike ụwa ana-agwụ ya. Pọl gwara ọgbakọ Ndị Kraịst, sị: ‘Gbagharanụ ya ma kasie ya obi.’ Ọ dị mkpa ka a na-emesi ndị a nabatara n’ọgbakọ obi ike na Jehova na ụmụnna ha hụrụ ha n’anya nke ukwuu. Ịja ha mma mgbe niile na inyere ha aka nwere ike ime ka ha ghara ịda mbà.

Na-ekpere ha ekpere. Jems 5:16 sịrị: “Ekpere onye ezi omume na-ekpesi ike na-akpa ezigbo ike.” Larissa anyị kwuburu okwu ya sịrị: “M gwara ndị okenye ihe ndị na-echegbu m na ihe ndị bụ́ ụjọ m. Ha kpekwaara m ekpere. Nke ahụ mere ka m mata na ndị okenye anaghị ewere m iwe. Ha chọrọ inyere m aka ka mụ na Jehova dịghachi ná mma.” Otu nwanna aha ya bụ Theo sịrị: “Ekpere ndị okenye kpeere m mere ka obi sie m ike na Jehova hụrụ m n’anya nakwa na ọ na-ahụ ihe ọma ndị m na-eme, ọ bụghị naanị ihe ọjọọ m na-eme.”

Meta ha enyi. Ndị a nabatara n’ọgbakọ chọrọ imeta ndị enyi n’ọgbakọ. Otu okenye aha ya bụ Justin kwuru, sị: “Gị na ha na-arụ n’ozi ọma. Gbalịakwa na-aga eleta ha n’ụlọ ha. Ọ dị ezigbo mkpa imeta ha enyi.” Okenye ọzọ aha ya bụ Henry sịrị: “Ọ bụrụ na ụmụnna ana-ahụ na ndị okenye na-emeta ndị a nabatara n’ọgbakọ enyi, ha ga-agbalịkwa na-emeta ha enyi.”

Nyere ha aka ka ha na-amụ ihe. Nwanna ma nke a na-akọ nwere ike inyere onye a nabatara n’ọgbakọ aka ka ọ malite ịna-amụchi ihe anya. Otu okenye aha ya bụ Darko sịrị: “Ọ na-amasị m ịkọrọ ha ihe m mụtara mgbe m na-amụ Baịbụl nakwa igosi ha na ịmụ Baịbụl na-atọ m ezigbo ụtọ. M na-ahazikwa ka mụ na ha mụkọọ isiokwu ụfọdụ ga-agba ha ume ọnụ.” Okenye ọzọ aha ya bụ Clayton sịrị: “M na-agba ha ume ka ha gụọ gbasara ndị ụdị ihe mere ha mere na Baịbụl nakwa ka ha chọpụta ihe ha ga-amụta na ya.”

Na-agara ha nleta ọzụzụ atụrụ. Ndị a nabatara n’ọgbakọ ahụla ebe ndị okenye na-ekpe mmadụ ikpe. Ọ bụ ya mere o ji dị ezigbo mkpa ugbu a a nabatara ha ka ha hụ na ndị okenye bụ ndị ọzụzụ atụrụ. (Jere. 23:4) Na-ege ha ntị nke ọma, na-ajakwa ha mma. Gị na ha na-ekwurịta mgbe niile. Lee ihe otu okenye aha ya bụ Marcus kwuru ọ na-eme ma ọ gaa nleta ọzụzụ atụrụ. Ọ sịrị: “Anyị na-agwa onye ahụ otu ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, jaa ya mma, gwakwa ya na obi dị anyị ụtọ maka otú o si gbasie mbọ ike lọghachi n’ọgbakọ nakwa na obi dị Jehova ụtọ. Anyị na ya nọchaa, anyị na ya ekwuo mgbe ọzọ anyị ga-abịaghachi.”

a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya