Ọpụpụ
22 “Ọ bụrụ na mmadụ ezuo ehi ma ọ bụ atụrụ, wee gbuo ya ma ọ bụ ree ya, ọ ga-eji ehi ise kwụọ ụgwọ ehi ahụ, jirikwa atụrụ anọ kwụọ ụgwọ atụrụ ahụ.+
2 (“Ọ bụrụ na a hụ onye ohi+ ka ọ na-abanye n’ụlọ mmadụ n’abalị, a kụgbuo ya, ikpe ọbara amaghị onye gburu ya. 3 Ọ bụrụ na anyanwụ awaala mgbe onye ohi ahụ bịara, ikpe ọbara mara onye gburu ya.)
“Onye ohi ga-akwụ ụgwọ ihe o zuru. Ọ bụrụ na e nweghị ihe o nwere, a ga-ere ya kwụọ ụgwọ ihe o zuru. 4 Ọ bụrụ na a hụ ihe o zuru n’aka ya mgbe ihe ahụ ka dị ndụ, ọ ga-akwụ ụgwọ ya okpukpu abụọ, ma ọ̀ bụ ehi ma ọ̀ bụ jakị ma ọ̀ bụ atụrụ.
5 “Ọ bụrụ na mmadụ akpọpụ anụmanụ ya ka ha gaa taa nri n’ugbo ma ọ bụ n’ubi vaịn, ha ataa nri n’ugbo onye ọzọ, onye ahụ ga-eji ugbo ya kacha mma ma ọ bụ ubi vaịn ya kacha mma kwụọ ụgwọ ya.
6 “Ọ bụrụ na a mụnyere ọkụ, ya abanye n’osisi ogwu ma rechapụ ọka* ndị e kere n’ùkwù n’ùkwù ma ọ bụ ọka ndị kwụ ọtọ ma ọ bụ ubi, onye mụnyere ọkụ ahụ ga-akwụ ụgwọ ihe ọkụ ahụ mebiri.
7 “Ọ bụrụ na mmadụ enye mmadụ ibe ya ego ma ọ bụ ihe ọzọ ka o jidere ya, e wee zuru ya n’ụlọ onye ahụ, ọ bụrụ na a hụ onye zuru ya, ọ ga-akwụ ụgwọ ya okpukpu abụọ.+ 8 Ọ bụrụ na a hụghị onye zuru ya, a ga-akpọta onye nwe ụlọ ahụ n’ihu ezi Chineke+ ka a mara ma ọ̀ bụ ya weere ihe mmadụ ibe ya. 9 Mgbe ọ bụla mmadụ abụọ na-ese okwu n’ihi ehi, jakị, atụrụ, uwe, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ furu efu maka na otu onye sịrị, ‘Ọ bụ m nwe ihe a,’ ha abụọ ga-abịa n’ihu ezi Chineke.+ Onye ọ bụla Chineke kwuru na ọ bụ ya ka ikpe mara ga-akwụ onye nke ọzọ ụgwọ ihe ahụ okpukpu abụọ.+
10 “Ọ bụrụ na mmadụ kpụnyere mmadụ ibe ya jakị ma ọ bụ ehi ma ọ bụ atụrụ ma ọ bụ anụ ụlọ ọ bụla ọzọ ka o lekọtara ya, o wee nwụọ ma ọ bụ e merụọ ya ahụ́ ma ọ bụ a kpụrụ ya, ma e nweghị onye hụrụ ihe merenụ, 11 onye a kpụnyere anụ ahụ ga-aṅụ iyi n’ihu Jehova na ya emetụghị ihe mmadụ ibe ya aka. Onye nwe anụ ahụ ga-ekwere ihe o kwuru. Onye ahụ a kpụnyere ya agaghị akwụ ụgwọ ya.+ 12 Ma ọ bụrụ na e zuru anụ ahụ mgbe ọ ka nọ n’aka ya, ọ ga-akwụ onye nwe ya ụgwọ ya. 13 Ọ bụrụ na ọ bụ anụ ọhịa dọgburu ya, ọ ga-ebute ozu anụ ahụ ka ọ bụrụ ihe akaebe. Ọ gaghị akwụ ụgwọ anụ ọ bụla anụ ọhịa dọgburu.
14 “Ma ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụmanụ mmadụ ibe ya, anụmanụ ahụ emerụọ ahụ́ ma ọ bụ nwụọ mgbe ọ na-anọghị n’aka onye nwe ya, onye ahụ gbaziiri ya ga-akwụ ụgwọ ya. 15 Ọ bụrụ na ọ nọ n’aka onye nwe ya, ọ gaghị akwụ ụgwọ ya. Ọ bụrụ na a kwụrụ onye nwe ya ụgwọ gbaziri ya, ego ahụ a kwụrụ ga-abụzi ụgwọ anụ ahụ.
16 “Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-ekwebeghị nkwa ọlụlụ, ya na ya enwee mmekọahụ,* ọ ga-akwụ ụgwọ isi ya lụwa ya.+ 17 Ọ bụrụ na nna nwa agbọghọ ahụ ekweghị ka nwoke ahụ lụọ ya, ọ ga-akwụ ego ole a na-akwụ n’isi nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.
18 “Ahapụla nwaanyị na-agba afa ndụ.+
19 “A ga-egbu onye ọ bụla ya na anụmanụ nwere mmekọahụ.+
20 “Onye ọ bụla chụụrụ chi ọ bụla àjà ma e wepụ naanị Jehova, a ga-egbu ya.+
21 “Unu emesila onye mbịarambịa ike, unu emegbukwala ya,+ n’ihi na e nwere mgbe unu bụ ndị mbịarambịa n’Ijipt.+
22 “Unu emegbula nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwa na-enweghị nna.*+ 23 E nwee ka unu si megbuo ya, ya ebesara m ákwá, m ga-anụ ákwá ya.+ 24 M ga-ewesa unu ezigbo iwe, m ga-ejikwa mma agha gbuo unu. Ndị nwunye unu ga-abụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ụmụ unu ga-abụkwa ụmụ na-enweghị nna.
25 “Ọ bụrụ na i binye onye ọ bụla bụ́ ogbenye n’ime ndị m gị na ya bi ego, emesola ya otú ndị na-anara ọmụrụ nwa ma ha binye mmadụ ego si eme. Anarala ya ọmụrụ nwa.+
26 “Ọ bụrụ na ị chịrị uwe mmadụ ibe gị ka ọ bụrụ ihe ibé mgbe i binyere ya ego,+ ị ga-achịghachiri ya uwe ya mgbe anyanwụ dara. 27 N’ihi na ọ bụ naanị ákwà o nwere o ji ekpuchi ahụ́ ya. Gịnịzi ka ọ ga-eji hie ụra?+ O besara m ákwá, m ga-anụ olu ya n’ihi na m na-eme ebere.*+
28 “Akpọla Chineke iyi.*+ Akpọkwala onye na-achị* ndị gị iyi.+
29 “Ejila obi abụọ enye m onyinye mgbe ubi gị mepụtara ihe n’ụba nakwa mgbe mmanya na mmanụ juru n’ebe a na-azọchapụtara gị mmanya na mmanụ.+ Ị ga-enye m nwa nwoke mbụ ị mụtara.+ 30 Ihe a ka ị ga-eme ehi gị na atụrụ gị:+ Ya na nne ya ga-anọ ruo ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, ị ga-enye m ya.+
31 “Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ.+ Unu erikwala anụ ọ bụla anụ ọhịa dọgburu n’ọhịa.+ Unu ga-atụpụrụ ya nkịta.