Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 11/1 p. 7-12
  • Ụbọchị Amụma Daniel Na Okwukwe Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụbọchị Amụma Daniel Na Okwukwe Anyị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otu Mweghachite Eweta Obi Ụtọ
  • Otu Puku Ụbọchị na Narị Abụọ na Iri Isii Ahụ
  • Otu Puku Ụbọchị na Narị Abụọ na Iri Itoolu Ahụ
  • Otu Puku Ụbọchị na Narị Atọ na Iri Atọ na Ise
  • Ịmata Ndị Na-efe Ezi Ofufe na Mgbe Ọgwụgwụ
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Jehova Ekwee Daniel Nkwa Ụgwọ Ọrụ Magburu Onwe Ya
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ṅaa Ntị n’Okwu Amụma Chineke Maka Oge Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 11/1 p. 7-12

Ụbọchị Amụma Daniel Na Okwukwe Anyị

“Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ahụ bụ nke na-echere, wee bịarute [otu puku ụbọchị na narị atọ na iri atọ na ise] ahụ.”—DANIEL 12:12.

1. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji ada n’ịchọta ezi obi ụtọ, gịnịkwa ka e jikọtara ya na ezi obi ụtọ?

ONYE ọ bụla chọrọ inwe obi ụtọ. Otú ọ dị, taa, mmadụ ole na ole nwere obi ụtọ. N’ihi gịnị? N’otu akụkụ n’ihi na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-achọ obi ụtọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị. A na-achọ obi ụtọ n’ihe ndị dị ka agụmakwụkwọ, ịba ọgaranya, ọrụ, ma ọ bụ ná nchuso ike ọchịchị. Otú ọ dị, ná mmepe nke Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs jikọtara obi ụtọ na mmadụ ịmata mkpa ime mmụọ ya, ebere, ịdị ọcha n’obi, na àgwà ndị yiri ha. (Matiu 5:3-10) Ụdị obi ụtọ nke Jisọs kwuru okwu banyere ya bụ nke dị adị n’ezie na nke na-adịte anya.

2. Dị ka amụma na-ekwu, gịnị ga-eduje n’obi ụtọ n’oge ọgwụgwụ, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa na-ebilite banyere nke a?

2 Maka ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ ná mgbe ikpeazụ, e jikọtara obi ụtọ na otu ihe ọzọ. N’akwụkwọ Daniel, anyị na-agụ, sị: “Laa, Daniel: n’ihi na e zobewo okwu ndị a, kachitekwa ha akara, ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a. Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ahụ bụ nke na-echere, wee bịarute [otu puku ụbọchị na narị atọ na iri atọ na ise] ahụ.” (Daniel 12:9, 12) Ogologo oge dị aṅaa ka 1,335 ụbọchị ndị a gụnyere? N’ihi gịnị ka ndị na-adị ndụ na ha ji nwee obi ụtọ? Ò nwere ihe nke a nwere ime n’ebe okwukwe anyị dị taa? A na-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị a ma ọ bụrụ na anyị elee anya gaghachi azụ n’oge ahụ mgbe Daniel dere okwu ndị ahụ, n’oge na-adịghị anya a tọhapụsịrị Israel site ná ndọta n’agha na Babilọn nakwa n’afọ nke atọ nke eze Saịrọs nke Peasia.—Daniel 10:1.

Otu Mweghachite Eweta Obi Ụtọ

3. Ihe omume dị aṅaa nke Eze Saịrọs wetaara ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi obi ụtọ na 537 T.O.A., ma ihe ùgwù dị aṅaa ka Saịrọs na-enyeghị ndị Juu?

3 Nye ndị Juu ahụ, ntọhapụ site na Babilọn bụ oge maka ezi nṅụrị ọṅụ. Mgbe ndị Juu tachisiworo obi ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 70 afọ nke ịnọ n’ala ọzọ, Saịrọs Onye Ukwu kpọrọ ha òkù ịlaghachi Jerusalem iji wughachi ụlọ nsọ Jehova. (Ezra 1:1, 2) Ndị zaranụ ji oké olileanya malitere njem, na-erute n’ala ha na 537 T.O.A. Otú ọ dị, Saịrọs akpọghị ha òkù iweghachi alaeze n’okpuru onye sitere n’eriri Eze Devid.

4, 5. (a) Olee mgbe e kpuru ọbụbụeze nke Devid ihu? N’ihi gịnị? (b) Ihe imesi obi ike dị aṅaa ka Jehova nyere na a ga-eweghachi ọbụbụeze nke Devid?

4 Nke ahụ dị mkpa. Ihe dị ka narị afọ ise tupu oge ahụ, Jehova ekwewo Devid nkwa, sị: “Ụlọ gị na alaeze gị ga-ekwesị ntụkwasị obi n’ihu gị ruo mgbe ebighị ebi: a ga-eme ka ocheeze gị bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.” (2 Samuel 7:16) N’ụzọ na-adịghị enye obi ụtọ, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ Devid ndị bụ eze ghọrọ ndị nnupụisi, ikpe ọmụma ọbara nke mba ahụ bụkwa nke buru oké ibu nke na 607 T.O.A., Jehova kwere ka e kpuo ọbụbụeze nke Devid ihu. E wepụkwa oge dị mkpirikpi ọ nọrọ n’okpuru usoro ọchịchị Maccabees, Jerusalem nọ n’okpuru ọchịchị ndị mba ọzọ site ná mgbe ahụ ruo ná mbibi ya nke abụọ na 70 O.A. Otú a, na 537 T.O.A., “oge nke mba ọzọ,” nke ọ na-adịghị nwa ọ bụla nke Devid ga-achị dị ka eze na ya, nọ na-aga n’ihu.—Luk 21:24.

5 Otú o sina dị, Jehova echefughị nkwa o kwere Devid. Site n’usoro ọhụụ na nrọ dị iche iche, o kpughere site n’onye amụma ya bụ Daniel usoro ihe omume dị iche iche nke ụwa n’ọdịnihu bụ́ ndị ga-eme na narị afọ dị iche iche site n’oge Babilọn malitere ịchị ụwa ruo n’oge ahụ mgbe otu eze n’usoro ọmụmụ Devid ga-achịkwa n’alaeze nke ndị Jehova ọzọ. Amụma ndị a, ndị e dekọrọ na Daniel isi 2, 7, 8, na 10-12, mere ka obi sie ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi ike na, n’ikpeazụ, ocheeze Devid n’ezie ‘ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.’ N’ezie, eziokwu dị otú ahụ e kpughere wetaara ndị Juu ahụ obi ụtọ, bụ́ ndị lọghachiri n’ala ha na 537 T.O.A.!

6. Olee otú anyị si mara na a ga-emezu ụfọdụ n’ime amụma dị iche iche nke Daniel n’oge anyị?

6 Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-akọwa Bible na-azọrọ na amụma nile nke Daniel mezuru n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ozuzu ya tupu ọmụmụ Jisọs Kraịst. Ma n’ụzọ doro anya nke a abụghị otú o mere. Na Daniel 12:4, otu mmụọ ozi gwara Daniel, sị: “Kachitekwa akwụkwọ a akara, ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a: ọtụtụ mmadụ ga na-ejegharị, ihe ọmụma ga-abakwa ụba.” Ọ bụrụ na a gaje iwepụ akara ahụ n’akwụkwọ Daniel—kpughee ihe ọ pụtara n’ụzọ zuru ezu—nanị ná mgbe ọgwụgwụ, n’ezie ma ọ dịghị ihe ọzọ ụfọdụ n’ime amụma ya dị iche iche aghaghị imetụta oge ahụ.—Lee Daniel 2:28; 8:17; 10:14.

7. (a) Olee mgbe oge mba ọzọ gwụsịrị, ajụjụ dị ngwa dị aṅaa ka a na-aghaghị ịza mgbe ahụ? (b) Olee ndị na-abụghị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche”?

7 Na 1914 oge nke mba ọzọ gwụrụ, oge ọgwụgwụ maka ụwa nke a malitere. E weghachiri Alaeze Devid, ọ bụghị na Jerusalem elu ala, kama n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya “n’igwe ojii nke eluigwe.” (Daniel 7:13, 14) N’oge ahụ, n’ihi na “ata” nke Iso Ụzọ Kraịst adịgboroja jupụtara, ọnọdụ nke ezi Iso Ụzọ Kraịst apụtaghị ìhè—ma ọ dịghị ihe ọzọ n’anya ụmụ mmadụ. Otú o sina dị, a ghaghị ịza otu ajụjụ dị mkpa: “Ònyekwa bụ ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche?” (Matiu 13:24-30; 24:45) Ònye ga-anọchite anya Alaeze Devid ahụ e weghachiri eweghachi n’elu ala? Ọ bụghị ụmụnne anụ ahụ nke Daniel, bụ́ ndị Juu. A jụwo ha n’ihi na ha enweghị okwukwe ma sụọ ngọngọ n’ihi Mesaịa ahụ. (Ndị Rom 9:31-33) Ọ dịghị n’ụzọ ọ bụla e si hụ ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi n’etiti nzukọ dị iche iche nke Krisendọm! Ajọ ọrụ ha gosiri na Jisọs amaghị ha. (Matiu 7:21-23) Mgbe ahụ, ònye ka ọ bụ?

8. Olee ndị gosiworo na ha bụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na mgbe ọgwụgwụ? Olee otú anyị si mara?

8 N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla ma ọlị, ọ bụ òtù nta ahụ nke ụmụnna Jisọs e tere mmanụ, bụ ndị a maara na 1914 dị ka Ndị Mmụta Bible ma bụrụ ndị a matara dị ka Ndịàmà Jehova kemgbe 1931. (Aịsaịa 43:10) Ọ bụ nanị ha kpọsaworo Alaeze ahụ e weghachiri eweghachi n’usoro ọmụmụ Devid. (Matiu 24:14) Ọ bụ nanị ha nọpụworo iche site n’ụwa ma bulie aha Jehova elu. (Jọn 17:6, 14) Ọ bụkwa nanị n’ahụ ha ka e mezuworo amụma dị iche iche nke Bible ndị metụtara ndị Chineke n’ụbọchị ikpeazụ. Ọtụtụ oge amụma ndị ahụ e depụtara na Daniel isi 12 bụ́ nke na-agụnye 1,335 ụbọchị ndị ga-eweta obi ụtọ so n’amụma ndị a.

Otu Puku Ụbọchị na Narị Abụọ na Iri Isii Ahụ

9, 10. Olee ihe omume ndị e ji mara “otu oge na oge abụọ na nkera oge” nke Daniel 7:25, n’akụkụ akwụkwọ nsọ dịkwa aṅaa ka a kpọtụrụ oge yiri nke ahụ aha?

9 Na Daniel 12:7, anyị na-agụ banyere oge amụma nke mbụ, sị: “Ọ ga-adịru otu mgbe a kara aka, na mgbe abụọ a kara aka, na nkera mgbe a kara aka; ma mgbe a ga-agbajisi aka nke ndị nsọ ahụ, ihe nile ndị a ga-agwụsị.”a A kpọtụrụ otu oge a aha ná Mkpughe 11:3-6, nke na-ekwu na ndịàmà Chineke ga-eyiri ákwà mkpé mee nkwusa ruo afọ atọ na ọkara, e gbuokwa ha ma e mesịa. Ọzọ, na Daniel 7:25, anyị na-agụ, sị: “Okwu dị iche iche megide Onye ahụ nke Kachasị Ihe Nile Elu ka ọ ga-ekwu, ọ bụkwa ndị nsọ nke Onye Kachasị Ihe Nile Elu ka ọ ga-eme ka ha kaa nká: ọ ga-elekwa anya ịgbanwe mgbe dị iche iche a kara aka na iwu; a ga-enyekwa ha n’aka ya ruo otu oge na oge abụọ na nkera oge.”

10 N’amụma ikpeazụ nke a, “ọ” bụ ike ọchịchị ụwa nke ise na-agụ site na Babilọn. Ọ bụ ‘mpi ahụ, nke dị nta,’ nke ọ bụ n’oge ike ọchịchị ya ka Nwa nke mmadụ natara “ọchịchị, na ebube, na alaeze.” (Daniel 7:8, 14) Mpi ihe atụ nke a, nke bụ alaeze ukwu nke Britain ná mbụ, tolitere n’oge agha ụwa mbụ ịghọ ike ọchịchị ụwa abụọ nke Britain na America, nke ike United States ka na ya ugbu a. Ruo oge ma ọ bụ afọ atọ na ọkara, ike ọchịchị nke a ga-enye ndị nsọ nsogbu ma nwaa ịgbanwe oge dị iche iche na iwu. N’ikpeazụ, a ga-enye ndị nsọ n’aka ya.—Leekwa Mkpughe 13:5, 7.

11, 12. Olee ihe omume ndị dugara ná mmalite nke 1,260 ụbọchị ndị ahụ nke amụma?

11 Olee otú e si mezuo amụma nile ndị a nwere nkwekọ? Ruo ọtụtụ afọ tupu Agha Ụwa Mbụ, ụmụnna Jisọs e tere mmanụ dọrọ aka ná ntị n’ihu ọha na 1914 ga-ahụ ọgwụgwụ nke oge a kara aka nke ndị mba ọzọ. Mgbe agha dara, e nwere ihe àmà na e legharawo ịdọ aka ná ntị ahụ anya. Setan jiri “anụ ọhịa” ya, òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa nke Alaeze Ukwu Britain ka ike na ya mgbe ahụ mee ihe, ná mgbalị “ịgbanwe mgbe dị iche iche a kara aka na iwu,” iyigharị oge ahụ mgbe Alaeze Chineke ga-achị. (Mkpughe 13:1, 2) Setan dara. E guzobere Alaeze Chineke n’eluigwe, n’ebe dị anya pụọ n’ebe aka ụmụ mmadụ pụrụ iru.—Mkpughe 12:1-3.

12 Nye Ndị Mmụta Bible ahụ, agha ahụ pụtara oge ule. Kemgbe January 1914 ha anọwo na-egosi Photo-Drama of Creation (Foto Ihe Nkiri nke Okike) ahụ, ihe ngosi Bible nke dọọrọ uche gaa n’amụma dị iche iche nke Daniel. N’oge okpomọkụ nke afọ ahụ n’Ebe Ugwu Ụwa, agha tiwapụrụ. N’October, oge ahụ a kara aka gwụsịrị. Mgbe ọ na-erule ọgwụgwụ afọ ahụ, ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na-atụ anya mkpagbu, dị ka a na-ahụ site n‘eziokwu ahụ bụ na isiokwu dịịrị afọ a họọrọ maka 1915 bụ ajụjụ ahụ Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, “Ùnu pụrụ ịṅụ iko m?” nke dabeere na Matiu 20:22, King James Version.

13. Olee otú Ndị Mmụta Bible si mee nkwusa n’ákwà mkpé n’ime 1,260 ụbọchị ndị ahụ, gịnị mekwara n’ọgwụgwụ nke oge ahụ?

13 N’ihi ya, malite na December 1914, ìgwè nta nke a nke ndịàmà ‘mere nkwusa n’ákwà mkpé,’ jiri umeala n’obi na-atachi obi ka ha na-ekwusa ikpe nile nke Jehova. Ihe mara ọtụtụ ndị ahụ jijiji na 1916 bụ ọnwụ C. T. Russell, bụ́ onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Bible and Tract Society. Ka ọgba aghara agha ahụ na-agbasa, ha zutere mmegide na-arị elu. A tụrụ ụfọdụ mkpọrọ. Ndị ọchịchị obi kpọrọ nkụ mekpọrọ mmadụ ndị dị ka Frank Platt n’England na Robert Clegg na Canada ọnụ. N’ikpeazụ, na June 21, 1918, e boro J. F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche ọhụrụ, tinyere ndị na-eduzi Watch Tower Bible and Tract Society, ebubo ụgha wee tụọ ha mkpọrọ ga-adịru ogologo oge. Otú a, n’ọgwụgwụ nke oge amụma ahụ, “mpi nta” ahụ gburu ọrụ nkwusa ihu ọha ahụ a haziri ahazi.—Daniel 7:8, King James Version.

14. Olee otú ihe si gbanweere ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na 1919 na mgbe ọ gasịrị?

14 Akwụkwọ Mkpughe na-ebu amụma ihe ọzọ merenụ. Mgbe mkpirikpi oge nke arụghị ọrụ gasịrị—bụ́ nke e buru n’amụma dị ka ụbọchị atọ na ọkara nke ozu ha ịtọgbọrọ n’ámá—ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ dịrị ndụ ma na-arụ ọrụ ọzọ. (Mkpughe 11:11-13) Na March 26, 1919, a tọhapụrụ onyeisi oche na ndị nduzi nke Watch Tower Bible and Tract Society, e mesịkwara kachapụ ebubo ụgha nile e boro ha. Ozugbo a tọhapụsịrị ha, ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ malitere ịhazigharị ihe maka ịrụkwu ọrụ. Otú a, ná mmezu nke ahụhụ mbụ nke Mkpughe, ha si n’abyss nke arụghị ọrụ pụta dị ka igurube ime mmụọ nke anwụrụ ọkụ soro kwụgoo, na-enye ihe àmà nke ọdịnihu gbara ọchịchịrị maka okpukpe ụgha. (Mkpughe 9:1-11) N’ime afọ ole na ole na-esonụ, a zụrụ ha n’ụzọ ime mmụọ ma kwadebe ha maka ihe dị n’ihu. Na 1921 ha bipụtara akwụkwọ ọhụrụ, bụ́ The Harp of God, nke a haziri iji nyere ndị ọhụrụ na ụmụntakịrị aka ịmụta eziokwu ndị bụ isi nke Bible. (Mkpughe 12:6, 14) Ihe ndị a nile mere n’oge ọzọ dị oké mkpa.

Otu Puku Ụbọchị na Narị Abụọ na Iri Itoolu Ahụ

15. N’ụzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi gụkọọ mmalite nke 1,290 ụbọchị? Olee mgbe oge nke a gwụsịrị?

15 Mmụọ ozi ahụ gwara Daniel, sị: “Site na mgbe a ga-ewezụga àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum, mgbe a ga-edo ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, [otu puku ụbọchị na narị abụọ na iri itoolu] ga-adị.” (Daniel 12:11) N’okpuru Iwu Mosis, ọ bụ n’elu ebe ịchụ àjà n’ụlọ nsọ ahụ na Jerusalem ka a na-esure “àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum.” Ndị Kraịst adịghị achụ àjà nsure ọkụ, ma ha na-achụ àjà ime mmụọ a na-achụ mgbe dum. Pọl zoro aka na nke a mgbe ọ sịrị: “Ka anyị site n’aka ya na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahụ bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha ya.” (Ndị Hibru 13:15; tụlee Hosea 14:2.) E wepụrụ àjà nke a a na-achụ mgbe dum na June 1918. Mgbe ahụ, gịnị bụ “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu”—ihe nke abụọ a ga-ele anya ya? Ọ bụ òtù League of Nations, nke ike ọchịchị ndị ahụ nwere mmeri kwalitere mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị.b Ọ bụ ihe arụ n’ihi na ndị ndú Krisendọm tinyere ya n’ọnọdụ Alaeze Chineke, na-egosipụta òtù League ahụ dị ka nanị olileanya dịịrị mmadụ maka udo. Ọ bụ na January 1919 ka e chepụtara inwe òtù League ahụ. Ọ bụrụ na anyị agụọ 1,290 ụbọchị (afọ atọ, ọnwa asaa) site n’oge ahụ, anyị na-abịarute na September 1922.

16. Mgbe 1,290 ụbọchị ahụ gwụsịrị, olee ihe àmà e nwere na ihe fọdụrụ e tere mmanụ dị njikere ịrụ ọrụ?

16 Gịnị mere mgbe ahụ? Ee, Ndị Mmụta Bible enwewo ume ọhụrụ ugbu a, na-enwere onwe ha pụọ na Babilọn Ukwu ahụ, ma dịrị njikere ime ihe. (Mkpughe 18:4) N’otu mgbakọ e nwere na September 1922 na Cedar Point, Ohio, U.S.A., ha malitere ikwusa ikpe Chineke n’ahụ Krisendọm n’atụghị egwu. (Mkpughe 8:7-12) Ihe ọgbụgba nke igurube ndị ahụ malitere n’ezie ịfụ ụfụ! Nke ka njọ, ahụhụ nke abụọ nke Mkpughe malitere. Otu ìgwè nke usuu ndị agha ndị Kraịst—nke ihe mejupụtara ya ná mbụ bụ ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ ma mesịa bụrụ nke oké ìgwè mmadụ mere ka o buo ibu—sọbara n’ime ụwa. (Mkpughe 7:9; 9:13-19) Ee, ọgwụgwụ nke 1,290 ụbọchị ndị ahụ wetaara ndị Chineke ọṅụ.c Ma a ka nwere ọtụtụ ihe dịnụ.

Otu Puku Ụbọchị na Narị Atọ na Iri Atọ na Ise

17. Olee mgbe 1,335 ụbọchị ndị ahụ malitere na mgbe ọ gwụrụ?

17 Daniel 12:12 na-ekwu, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ahụ bụ nke na-echere, wee bịarute [otu puku ụbọchị na narị atọ na iri atọ na ise] ahụ.” E nwere ihe àmà na 1,335 ụbọchị ndị ahụ ma ọ bụ afọ atọ, ọnwa asatọ na ọkara malitere n’ọgwụgwụ nke oge nke ahụ bu ụzọ. Ịgụ site na September 1922, nke a na-akpọrute anyị n’ọgwụgwụ nke oge opupu ihe ubi (Ebe Ugwu Ụwa) nke 1926. Gịnị mere n’ime 1,335 ụbọchị ndị ahụ?

18. Olee eziokwu ndị na-egosi na laa azụ na 1922 na a ka nwere ọganihu a ga-enwe?

18 N’agbanyeghị ọdịdị dị oké mkpa nke ihe omume ndị ahụ na 1922, ihe àmà na-egosi na ụfọdụ ndị ka nwere ọchịchọ siri ike maka oge gara aga. Akwụkwọ Studies in the Scriptures, nke onye dere ya bụ C. T. Russell, ka bụ akwụkwọ bụ isi maka ọmụmụ ihe. Ọzọkwa, akwụkwọ nta ahụ e kesara n’ụzọ buru ibu bụ́ Millions Now Living Will Never Die wepụtara echiche ahụ bụ na na 1925, nzube Chineke banyere imeghachi elu ala ka ọ bụrụ Paradaịs na ịkpọlite ndị oge ochie kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ anwụ n’ọnwụ ga-amalite imezu. Ntachi obi nke ndị ahụ e tere mmanụ yiri ka ọ fọrọ nke nta ka o zuo. Otú o sina dị, ụfọdụ ndị so ná Ndị Mmụta Bible echeghị na ọ bụ iwu na ha aghaghị isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ.

19, 20. (a) Olee otú ọtụtụ ihe si gbanweere ndị Chineke n’ime 1,335 ụbọchị ndị ahụ? (b) Olee ihe omume ndị kara ọgwụgwụ nke oge ahụ dị 1,335 ụbọchị akara, gịnịkwa ka ha na-egosi banyere ndị Jehova?

19 Ka 1,335 ụbọchị ndị ahụ na-aga n’ihu, ihe a nile gbanwere. Iji mee ka ụmụnna sie ike, a haziri ìgwè ọmụmụ ihe Ụlọ Nche (Bekee) a na-amụ mgbe nile. E mesiri ozi ubi ike. Malite na May 1923, a kpọrọ mmadụ nile òkù ikere òkè n’ozi ubi na Tuesday mbụ nke ọnwa ọ bụla, e setịpụkwara oge ná nzukọ ọgbakọ a na-enwe n’etiti izu iji gbaa ha ume n’ọrụ a. N’August 1923, n’otu mgbakọ e nwere na Los Angeles, California, U.S.A., e gosiri na ilu Jisọs nke atụrụ na ụmụ ewu ga-emezu tupu Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ. (Matiu 25:31-40) Afọ ahụ bụ́ 1924 hụrụ mmepe nke ụlọ ọrụ redio ahụ bụ́ WBBR, bụ nke e jiri mee ihe ịkpọsa ozi ọma ahụ n’ikuku. Isiokwu ahụ bụ́ “Ọmụmụ nke Mba Ahụ” ná mbipụta March 1, 1925, nke Ụlọ Nche (Bekee) nyere nghọta ọhụrụ nke Mkpughe isi 12. N’ikpeazụ, ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ ịghọta n’ụzọ ziri ezi ihe omume ọgba aghara ndị ahụ nke 1914-1919.

20 Afọ ahụ bụ 1925 bịara n’ọgwụgwụ ya, ma ọgwụgwụ erubeghị! Kemgbe afọ ndị 1870, Ndị Mmụta Bible eburuwo otu oge n’obi na-eje ozi—nke mbụ 1914, e mesịa 1925. Ugbu a, ha aghọtawo na ha ga-eje ozi ruo ogologo oge nile Jehova chọrọ. Mbipụta January 1, 1926, nke Ụlọ Nche (Bekee) buru isiokwu ahụ dị oké mkpa bụ́ “Ònye Ga-asọpụrụ Jehova?” nke na-eme ka ịdị mkpa nke aha Chineke pụta ìhè karịa otú ọ dịtụworo ná mbụ. N’ikpeazụkwa, na May 1926 ná mgbakọ e mere na London, England, e mere otu nkwupụta okwu nke isiokwu ya bụ “Àmà A Gbaara Ndị Ọchịchị Ụwa.” Nke a kpọsara hoo haa eziokwu banyere Alaeze Chineke na mbibi na-abịanụ nke ụwa Setan. N’otu mgbakọ ahụ, e wepụtara akwụkwọ ahụ dị ike bụ́ Deliverance, na-abụ nke mbụ n’otu usoro mpịakọta nke nọchiri anya Studies in the Scriptures. Ndị Chineke nọ ugbu a na-elepụ anya n’ihu, ọ bụghị n’azụ. Otu puku ụbọchị na narị atọ na iri atọ na ise ahụ gwụsịrị.

21. Gịnị ka ntachi obi n’ime oge ahụ dị 1,335 ụbọchị pụtara nye ndị Chineke n’oge ahụ, gịnịkwa ka mmezu amụma banyere oge nke a pụtara nye anyị?

21 Ụfọdụ adịghị njikere ime mgbanwe kwekọrọ n’ihe omume ndị a, ma ndị ahụ tachiri obi nwere obi ụtọ n’ezie. Ọzọkwa, ka anyị na-eleghachi anya azụ ná mmezu nke oge amụma ndị a, anyị na-enwekwa obi ụtọ n’ihi na a na-eme ka obi ike anyị sie ike na ìgwè nta ahụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị dịrị ndụ gabiga oge ndị ahụ, bụ n’ezie ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche. N’afọ ndị gabigaworonụ kemgbe ahụ, nzukọ Jehova agbasawo n’ụzọ dị ukwuu, ma ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche ka nọ n’etiti ya, na-eduzi ya. Mgbe ahụ, lee ihe ọṅụ ọ bụ ịmara na nye ndị ahụ e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ, ọtụtụ obi ụtọ ka na-echere ha! A ga-ahụ nke a ka anyị na-atụle amụma ndị ọzọ nke Daniel.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka nkọwa nke otú e si agụkọ oge amụma ndị a, lee Our Incoming World Government—God’s Kingdom, isi 8, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b Lee mbipụta April 1, 1986, nke Ụlọ Nche, peji nke 8-18.

c Lee mbipụta January 1, 1991, nke Ụlọ Nche, peji nke 12, na 1975 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peji nke 132.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Olee otú anyị si mara na ụfọdụ amụma dị na Daniel gaje inwe mmezu n’oge anyị?

◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ bụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche”?

◻ Olee mgbe 1,260 ụbọchị ndị ahụ malitere ma gwụsịa?

◻ Ntụrụndụ na mweghachi dị aṅaa ka 1,290 ụbọchị ndị ahụ wetaara ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ?

◻ N’ihi gịnị ka ndị ahụ nwere ntachi obi ruo ọgwụgwụ nke 1,335 ụbọchị ndị ahụ ji nwee obi ụtọ?

[Igbe dị na peeji nke 11]

OGE AMỤMA DANIEL

1,260 ụbọchị:

December 1914 ruo June 1918

1,290 ụbọchị:

January 1919 ruo September 1922

1,335 ụbọchị:

September 1922 ruo May 1926

[Foto dị na peeji nke 8]

Kemgbe 1919 ọ pụtawo ìhè na “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” bụ ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ

[Foto dị na peeji nke 10]

Isi ụlọ ọrụ nke òtù League of Nations na Geneva, Switzerland

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto UN

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya