Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ọ tọrọ anyị ụtọ ịmụ amụma ndị ahụ nke Daniel dị ka a tụlere ha ‘n’Ụlọ Nche.’ Ma, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka akara ụbọchị ndị nke oge atọ na nkera oge nke Mkpughe 11:3 ji dị iche site na nke akwụkwọ “Revelation Climax”?
Ee, Ụlọ Nche nke November 1, 1993, nyere mgbazi olu dị nta n’ihe banyere akara ụbọchị nke mmezu oge ugbu a nke Mkpughe 11:3. N’ihi gịnị?
Ka anyị buru ụzọ lee anya ná Mkpughe 11:2, nke ngwụsị ya kpọtụrụ “iri ọnwa anọ na abụọ.” Anyị na-aga n’ihu n’amaokwu nke 3: “M ga-enyekwa ndị àmà m abụọ ike, ha ga-ebukwa amụma [otu puku na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii], e gbokwasịwokwa ha ákwà mkpe.” Olee mgbe nke a dị irè?
Ọ dị mma, Ndịàmà Jehova amatawo eri ogologo oge na amụma a nwetara mmezu ya n’ebe ndị Kraịst e tere mmanụ nọ mgbe ngwụsị nke “oge nke mba ọzọ” (Oge Ndị Jentaịl) gasịrị na 1914. (Luk 21:24; 2 Ndị Kọrint 1:21, 22) N’ikwu okwu banyere nke a, akwụkwọ Revelation—Its Grand Climax At Hand!a (1988) na-ekwu na peji nke 164, sị: “E nwere oge a kara aka nke afọ atọ na ọkara mgbe ahụmahụ siri ike nke ndị Chineke kwekọrọ n’ihe omume ndị e buru amụma ha n’ebe a—malite ná ntiwapụ nke agha ụwa mbụ n’akụkụ ikpeazụ nke 1914, nọgidekwa ruo akụkụ mmalite nke 1918.”
Rịba ama na akara ụbọchị e nyere bụ́ “ntiwapụ nke agha ụwa mbụ n’akụkụ ikpeazụ nke 1914, nọgidekwa ruo akụkụ mmalite nke 1918.” Nke a kwekọrọ n’akara ụbọchị a na-enyekarị, dị ka n’akwụkwọ “Then Is Finished the Mystery of God,” peji nke 261-264, (1969).*
Otú ọ dị, Ụlọ Nche ahụ lekwasịrị anya n’amụma ndị nke Daniel, akwụkwọ nke kpọtụrụ uche ugboro abụọ ogologo oge a pụrụ iji tụnyere nke ahụ e mesịrị kpọtụ uche ná Mkpughe—afọ 3 1/2, ma ọ bụ 42 ọnwa. Iji kpọọ okwu aha, Daniel 7:25 na-asị na a ga-enye ndị nsọ nke Chineke nsogbu “otu oge na oge abụọ na nkera oge,” ma ọ bụ oge 3 1/2. E mesịa, Daniel 12:7 buru amụma “otu mgbe a kara aka, na mgbe abụọ a kara aka, na nkera mgbe a kara aka,” ma ọ bụ mgbe 3 1/2, nke ga-ejedebe ‘n’ịgbajisị aka nke ndị nsọ ahụ.’
Otú a anyị nwere amụma ndị na-ekwu banyere oge a pụrụ iji tụnyere ibe ha na Daniel 7:25, Daniel 12:7, na Mkpughe 11:2, 3, nakwa ná Mkpughe 13:5. Akwụkwọ anyị dị iche iche egosiwo na ndị a nile nwetara mmezu ha n’agbata oge 1914-1918. Ma n’ịtụle nke ọ bụla n’amụma ndị a iche, akara ụbọchị maka mmalite na maka ọgwụgwụ ha dịtụ iche.
Otú ọ dị, Ụlọ Nche nke November 1, 1993, jụrụ, sị: “Olee otú e si mezuo amụma nile ndị a nwere nkwekọ?” Ee, a ghọtara amụma ndị ahụ nke oge 3 1/2 e hotara na Daniel 7:25, Daniel 12:7, na Mkpughe 11:3 ịbụ ndị “nwere nkwekọ.” N’ihi ya, ha ga-ekwekọ n’ihe banyere mmalite ha na ọgwụgwụ ha.
Banyere ọgwụgwụ ha, magazin ahụ gosiri otú nsogbu a na-enye ndị Chineke e tere mmanụ (Daniel 7:25) si ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu na June 1918 mgbe J. F. Rutherford na ndị ntụzi ndị ọzọ nke Watch Tower Bible and Tract Society ghọrọ ndị ‘a tụrụ mkpọrọ ga-adịru ogologo oge site n’ebubo ụgha dị iche iche.’ Ihe omume ahụ bụ n’ezie ‘ịgbajisị aka nke ndị nsọ ahụ,’ dị ka Daniel 12:7 rịbara ama.
Ịgụghachi oge azụ site na June 1918 na-eduga anyị na December 1914 maka mmalite nke oge 3 1/2. N’ọnwa ikpeazụ ahụ nke 1914, ndị Chineke e tere mmanụ n’elu ụwa mụtara amaokwu bụ́ isi maka afọ na-esonụ: “Ùnu pụrụ ịṅụ iko m?—Matiu 20:20-23.” Isiokwu mara ọkwa ya dọrọ aka ná ntị, sị: “Ònye maara ma a ga-enwe ụdị ule pụrụ iche, iko nke ahụhụ na mweda n’ala, maka ndị ji ịnọgidesi ike n’ihe na-agbaso Nwa Atụrụ ahụ n’ime afọ 1915!” Dị ka Daniel 7:25 buru amụma ya maka ogologo oge ahụ nke oge 3 1/2, ‘inye nsogbu malitere ma nọgide megide ndị nsọ ahụ nke Onye Kachasị Elu n’onwe ha.’ Mba dị iche iche mikpuru onwe ha n’Agha Ụwa Mbụ, na-eme ka ọ kara ha mfe ịkpata nsogbu n’ụzọ ikpe na-ezighị ezi. Nkwubi okwu ya bụ: Amụma atọ ahụ dum nwere nkwekọ—Daniel 7:25, 12:7, na Mkpughe 11:3—nwetara mmezu n’ime afọ 3 1/2, ma ọ bụ 42 ọnwa ahụ, malite na December 1914 ruo June 1918.
Nke a na-akọwa nnụcha ahụ dị nta n’inye akara ụbọchị maka mmezu nke Mkpughe 11:3. Mgbazi olu nke a bụ ihe nke anyị pụrụ iburu n’uche ka anyị na-amụ ma na-eji akwụkwọ Revelation Climax eme ihe n’ọdịnihu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara ya.