Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 11/15 p. 12-17
  • Jiri Obi Ike Na-ejegharị N’ụzọ Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Obi Ike Na-ejegharị N’ụzọ Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Bụ Obi Ike
  • Obi Ike Iji Kwusaa Ozi Chineke
  • Obi Ike n’Okpuru Ule
  • Obi Ike Irubere Chineke Isi
  • Obi Ike Iji Soro Ndị Chineke Guzo
  • Obi Ike Iji ‘Sozuo Jehova n’Azụ’
  • Obi Ike Iji Tụkwasị Chineke Obi
  • Obi Ike Iji Sọpụrụ Jehova na Ịkwalite Ofufe Dị Ọcha
  • “Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike Nke Ukwuu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Nwee Obi Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nwee Obi Ike, Jehova Nọnyeere Gị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • “Nwee Obi Ike . . . Meekwa Ihe”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 11/15 p. 12-17

Jiri Obi Ike Na-ejegharị N’ụzọ Jehova

“Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova bụ, nke na-eje ije n’ụzọ Ya nile.”—ABỤ ỌMA 128:1.

1, 2. Enyemaka dị aṅaa ka ihe ndekọ Bible nke okwu na ọrụ nke ndị àmà mbụ nke Jehova na-enye anyị?

OKWU dị nsọ nke Jehova jupụtara n’ihe ndekọ nke ule na ọṅụ dị iche iche nke ndị na-ejere ya ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe. Ahụmahụ dị iche iche nke Noa, Abraham, Sera, Joshua, Debora, Berak, Devid, na ndị ọzọ na-adị nnọọ ka ihe na-eme anyị ana-ekiri ha ugbu a. Ha nile bụ ndị dịrị adị n’ezie bụ́ ndị nwere ihe pụrụ iche jikọrọ ha. Ha nwere okwukwe na Chineke ma jiri obi ike jegharịa n’ụzọ ya.

2 Okwu na ọrụ nke ndị àmà oge mbụ nke Jehova pụrụ ịbụrụ anyị ihe agbamume ka anyị na-agbalị ijegharị n’ụzọ Chineke. Ọzọkwa, obi ụtọ ga-abụ nke anyị ka anyị na-egosipụta nsọpụrụ ofufe maka Chineke na egwu dị mma ịghara imejọ ya. Nke a bụ eziokwu ọ bụ ezie na anyị na-eche ule ihu ná ndụ anyị, n’ihi na onye ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ bụrụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova bụ, nke na-eje ije n’ụzọ Ya nile.”—Abụ Ọma 128:1.

Ihe Bụ Obi Ike

3. Gịnị bụ obi ike?

3 Iji jegharịa n’ụzọ Jehova, anyị aghaghị inwe obi ike. N’ezie, Akwụkwọ Nsọ na-enye ndị Chineke iwu ka ha gosipụta àgwà a. Dị ka ihe atụ, ọbụ abụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “Dịnụ ike, ka obi unu nweekwa ume, unu nile ndị na-echere Jehova.” (Abụ Ọma 31:24) Obi ike bụ “ume nke uche ma ọ bụ omume ịnwale ihe, ịtachi obi, na iguzogide ihe ize ndụ, egwu, ma ọ bụ ihe isi ike.” (Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary) Onye nwere obi ike dị ike, nwee nkwuwa okwu, bụrụ dike. Na Jehova na-enye ndị na-ejere ya ozi obi ike pụtara ìhè site n’okwu ndị a nke Pọl onyeozi gwara Timoti ya na ya na-arụkọ ọrụ: “Chineke enyeghị anyị mmụọ nke ụjọ; kama ọ bụ nke ike na ịhụnanya na ime ka uche zuo okè.”—2 Timoti 1:7.

4. Olee otu ụzọ e si enweta obi ike?

4 Otu ụzọ isi nweta obi ike Chineke na-enye bụ iji ekpere tụlee Okwu Jehova, bụ́ Bible. Ọtụtụ ndekọ pụtara n’Akwụkwọ Nsọ pụrụ inyere anyị aka inwekwu obi ike. Ya mere, ka anyị buru ụzọ lee ihe anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ụfọdụ ndị ji obi ike jegharịa n’ụzọ Jehova.

Obi Ike Iji Kwusaa Ozi Chineke

5. Olee otú obi ike Inọk si abara ndị na-ejere Jehova ozi n’ụbọchị a uru?

5 Obi ike Inọk pụrụ inyere ndị na-ejere Jehova ozi n’ụbọchị a aka izi ozi Chineke n’obi ike. Tupu a mụọ Inọk, “a malitere ịkpọku aha Jehova.” Ndị ọkà mmụta ụfọdụ na-asị na ndị mmadụ “malitere n’ịrụ arụ” na-akpọku aha Jehova. (Jenesis 4:25, 26; 5:3, 6) Ọ pụrụ ịbụ na e jiwo aha Chineke mee ihe banyere ụmụ mmadụ ma ọ bụ ọbụna arụsị. N’ihi ya, okpukpe ụgha na-enwe ọganihu mgbe a mụrụ Inọk n’afọ 3404 T.O.A. N’ezie, o yiri ka ọ nọ nanị ya ‘n’iso Chineke na-ejegharị,’ na-agbaso ụzọ ezi omume nke kwekọrọ n’eziokwu Jehova nke e kpugheworo.—Jenesis 5:18, 24.

6. (a) Ozi dị ike dị aṅaa ka Inọk zisara? (b) Nchekwube dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe?

6 Inọk ji obi ike zisaa ozi Chineke, ma eleghị anya site n’ime nkwusa. (Ndị Hibru 11:5; tụlee 2 Pita 2:5.) “Lee,” ka onye àmà a ọ bụ nanị ya zisara, “Onyenwe anyị bịara, Ya na ndị nsọ Ya a na-apụghị ịgụta ọnụ, ikpe mmadụ nile ikpe, na ịtụ ndị nile ndị na-asọpụrụghị Chineke ihe n’anya, bụ́ ọrụ nile nke asọpụrụghị Chineke ha nke ha rụrụ n’asọpụrụghị Chineke, ha na okwu dị ike nile nke ndị mmehie ndị na-asọpụrụghị Chineke kwugidere Ya.” (Jud 14, 15) Inọk nwere obi ike iji aha Jehova mee ihe mgbe ọ na-ezisa ozi ahụ nke na-ama ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke ikpe. Dịkwa ka Chineke nyere Inọk obi ike izisa ozi ahụ dị ike, otú ahụ ka Jehova nyeworo Ndịàmà Ya nke oge a ike iji nkwuwa okwu kwuo okwu Ya n’ozi, n’ụlọ akwụkwọ, na n’ebe ndị ọzọ.—Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 4:29-31.

Obi Ike n’Okpuru Ule

7. Noa na-enye ihe atụ dị aṅaa nke obi ike?

7 Ihe nlereanya Noa pụrụ inyere anyị aka inwe obi ike n’ịrụ ọrụ ọma mgbe anyị nọ n’okpuru ule. Site n’obi ike na okwukwe, o ji ịdọ aka ná ntị Chineke banyere iju mmiri zuru ụwa ọnụ mee ihe wee “dozie ụgbọ ịzọpụta ezinụlọ Ya.” Site n’ọrụ nrubeisi na ezi omume, Noa mara ụwa nke ndị na-ekweghị ekwe ikpe n’ihi ọrụ ọjọọ ya nile ma nwapụta na o kwesịrị mbibi. (Ndị Hibru 11:7; Jenesis 6:13-22; 7:16) Ịtụgharị uche n’ụzọ Noa gbasoro na-enyere ndị na-ejere Chineke ozi n’ụbọchị a aka iji obi ike kere òkè n’ọrụ ezi omume ndị dị otú ahụ dị ka ozi ndị Kraịst.

8. (a) Gịnị ka Noa chere ihu dị ka “onye na-ekwusa ezi omume” n’obi ike? (b) Gịnị ka Jehova ga-emere anyị ma ọ bụrụ na anyị bụ ndị ji obi ike na-ekwusa ezi omume?

8 Ọ bụrụ na anyị na-agbaso ụzọ ezi omume ma ghara ịma ụzọ isi chee otu ọnwụnwa ihu, ka anyị kpee ekpere maka amamihe iji nagide ya. (Jemes 1:5-8) Ịnọgidesi ike n’ihe nke Noa nye Chineke n’okpuru ule na-egosi na o kwere omume izute ule n’obi ike na ikwesị ntụkwasị obi. O guzogidere nrụgide site n’ụwa ọjọọ na site n’aka ndị mmụọ ozi nwoghaara anụ ahụ na ụmụ ha na-abụchaghị mmadụ. Ee, Noa bụ “onye na-ekwusa ezi omume” n’obi ike nye “ụwa ochie” nke na-eche mbibi ihu. (2 Pita 2:4, 5; Jenesis 6:1-9) Ọ bụ ezie na o ji nkwuwa okwu kwuo okwu dị ka onye na-ama ọkwa, na-akpọsa ịdọ aka ná ntị Chineke nye ọgbọ ahụ dịrị tupu Iju Mmiri ahụ, “ha amaghịkwa ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile.” (Matiu 24:36-39) Ma ka anyị cheta na n’agbanyeghị mkpagbu na ọjụjụ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ na-ajụ ozi anyị dabeere na Bible taa, Jehova ga-ebuli anyị elu dị ka o buliri Noa ma ọ bụrụ na anyị egosipụta okwukwe na obi ike dị otú ahụ dị ka ndị nkwusa nke ezi omume.

Obi Ike Irubere Chineke Isi

9, 10. N’akụkụ ndị dị aṅaa ka Abraham, Sera, na Aịsak gosipụtara nrubeisi site n’obi ike?

9 “Enyi Jehova” bụ́ Abraham bụ ihe nlereanya ọma nke iji obi ike rubere Chineke isi. (Jemes 2:23) Abraham nwere mkpa maka okwukwe na obi ike iji rubere Jehova isi ma hapụ Ua nke ndị Kaldea, obodo jupụtara n’uru ihe onwunwe. O kwenyere ná nkwa Chineke na “agbụrụ nile nke ụwa” ga-agọzi onwe ha n’ime ya nakwa na a gaje inye mkpụrụ ya ala. (Jenesis 12:1-9; 15:18-21) Site n’okwukwe Abraham “biri dị ka ọbịa n’ala nke e kwere ya rịị ná nkwa,” o wee lepụkwa anya maka “obodo ahụ nke nwere ntọala ahụ”—Alaeze eluigwe nke Chineke, nke ọ bụ n’okpuru ya ka a gaje ịkpọlite ya ná ndụ n’elu ụwa.—Ndị Hibru 11:8-16.

10 Nwunye Abraham, bụ́ Sera, nwere okwukwe na obi ike dị mkpa iji hapụ Ua, soro di ya gaa ala ọzọ, nagidekwa ihe isi ike ọ bụla ha gaje izute n’ebe ahụ. Leekwa ka e si nyeghachi ya ụgwọ ọrụ maka nrubeisi ya n’obi ike nye Chineke! Ọ bụ ezie na ọ bụ àgà ruo ihe dị ka afọ ndụ nke 90 na “mgbe ọ gasịrị ịmụ nwa,” e nyere Sera ike ‘ịmụ nwa, ebe ọ gụrụ Ya n’Onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Onye kwererịị nkwa.’ Mgbe oge na-aga, ọ mụrụ Aịsak. (Ndị Hibru 11:11, 12; Jenesis 17:15-17; 18:11; 21:1-7) Ọtụtụ afọ n’ihu, Abraham ji obi ike rubere Chineke isi ma ‘chee Aịsak dị ka àjà.’ Mgbe otu mmụọ ozi kwụsịrị ya, nna ochie ahụ nataghachiri nwa ya nwere obi ike, nke na-erube isi site n’ọnwụ “n’ime ilu.” Ya na Aịsak si otú a n’ụzọ amụma gosi na Jehova Chineke gaje inye Ọkpara ya, Jisọs Kraịst, dị ka ihe mgbapụta ka ndị nwere okwukwe na ya wee nwee ike inwe ndụ ebighị ebi. (Ndị Hibru 11:17-19; Jenesis 22:1-19; Jọn 3:16) N’ezie, nrubeisi n’obi ike nke Abraham, Sera, na Aịsak kwesịrị ịkwali anyị irubere Jehova isi ma na-eme uche ya mgbe nile.

Obi Ike Iji Soro Ndị Chineke Guzo

11, 12. (a) Olee otú Mosis si gosipụta obi ike n’ihe banyere ndị Jehova? (b) N’ihi obi ike Mosis, ajụjụ dị aṅaa ka a pụrụ ịjụ?

11 Mosis ji obi ike were nguzo ya n’akụkụ ndị Chineke a na-akpagbu. Na narị afọ nke 16 T.O.A., ndị mụrụ Mosis n’onwe ha gosipụtara obi ike. N’atụghị egwu iwu eze nyere igbu ụmụ ọhụrụ nile bụ ikom nke ndị Hibru, ha zobere Mosis ma mesịa tinye ya n’ụgbọ ma dọba ya n’etiti amị n’ụsọ osimiri Naịl. Ebe nwa nwanyị Fero hụrụ ya, a zụlitere ya dị ka nwa nke ya, ọ bụ ezie na o bu ụzọ nata ọzụzụ ime mmụọ n’ụlọ ndị mụrụ ya. Dị ka akụkụ nke ezinụlọ Fero, ‘e ziri Mosis ihe n’amamihe nile nke ndị Ijipt,’ o wee “dị ike n’okwu ya na ọrụ ya nile,” dị ike n’ikike uche na nke anụ ahụ.—Ọrụ 7:20-22; Ọpụpụ 2:1-10; 6:20.

12 N’agbanyeghị uru ihe onwunwe nke ụlọ eze, Mosis ji obi ike họrọ iwere nguzo ya n’akụkụ ndị na-efe Jehova, bụ́ ndị na-agbara ndị Ijipt ohu mgbe ahụ. N’ịgbachitere otu onye Israel, o gburu onye Ijipt wee gbalaga Midian. (Ọpụpụ 2:11-15) Ihe dị ka 40 afọ n’ihu, Chineke jiri ya dupụta ụmụ Israel n’ohu. Mosis wee “hapụ Ijipt, n’ihi na ọ tụghị egwu ọnụma nke eze ahụ,” onye ji ọnwụ yie ya egwu maka ịnọchite anya Jehova n’isi Israel. Mosis jegharịrị dị ka ọ na-ahụ “Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya,” Jehova Chineke. (Ndị Hibru 11:23-29; Ọpụpụ 10:28) Ì nwere okwukwe na obi ike dị otú ahụ nke na ị ga-arapagide na Jehova na ndị ya n’agbanyeghị ihe isi ike na mkpagbu?

Obi Ike Iji ‘Sozuo Jehova n’Azụ’

13. Olee otú Joshua na Keleb si nye ihe nlereanya dị iche iche nke obi ike?

13 Joshua na Keleb nwere obi ike nyere ihe àmà nke na anyị pụrụ ijegharị n’ụzọ Chineke. Ha “esozuwo Jehova n’azụ.” (Ọnụ Ọgụgụ 32:12) Joshua na Keleb so ná ndị ikom 12 ahụ e zipụrụ iledo Ala Nkwa ahụ. N’ihi ịtụ ndị bi na ya egwu, ndị nledo iri nwara ịgbanwe ndị Israel obi ka ha ghara ịbanye Kenean. Otú ọ dị, Joshua na Keleb ji obi ike kwuo, sị: “Ọ bụrụ na ihe anyị atọọ Jehova ụtọ, Ọ ga-emekwa ka anyị baa n’ala nke a, Ọ ga-enyekwa anyị ya; bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru n’ime ya. Nanị, unu enupụkwala isi n’aka Jehova, unu onwe unu atụkwala egwu ndị ala ahụ; n’ihi na nri anyị ka ha bụ: ihe nchegide ha ewezụgawo onwe ya n’ahụ ha, ma Jehova nọnyeere anyị: unu atụla egwu ha.” (Ọnụ Ọgụgụ 14:8, 9) N’ihi enweghị okwukwe na obi ike, ọgbọ ahụ nke ụmụ Israel erughị ma ọlị n’Ala Nkwa ahụ. Ma Joshua na Keleb, ha na ọgbọ ọhụrụ, banyere na ya.

14, 15. (a) Ka Joshua na-etinye okwu ndị dị na Joshua 1:7, 8 n’ọrụ, gịnị ka ya na ndị Israel nwere ahụmahụ ya? (b) Ihe mmụta dị aṅaa metụtara obi ike ka anyị na-amụta site n’aka Joshua na Keleb?

14 Chineke gwara Joshua: “Dị ike, nweekwa ume nke ukwuu, ilezi anya ime dị ka iwu ahụ nile si dị, nke Mosis, bụ́ ohu m, nyere gị n’iwu: e wezụgala onwe gị na ya n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe, ka i wee nwee uche n’ebe ọ bụla ị na-eje. Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị, kama ị ga-atụgharị uche n’ime ya ehihie na abalị, ka i wee lezie anya ime dị ka ihe nile si dị nke e deworo n’ime ya: n’ihi na mgbe ahụ ị ga-eme ka ije gị gaa nke ọma, mgbe ahụ ị ga-enwekwa uche.”—Joshua 1:7, 8.

15 Ka Joshua na-etinye okwu ndị a n’ọrụ, Jeriko na obodo ndị ọzọ dara n’ihu ụmụ Israel. Ọbụna na Chineke mere ka anyanwụ kwụrụ otu ebe nke na ọ chagidere ruo mgbe Israel nwere mmeri na Gibeon. (Joshua 10:6-14) Mgbe ìgwè ndị iro “ndị bara ụba, dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri” mekpara ha ahụ, Joshua mere ihe n’obi ike, Chineke mekwara ka Israel merie ọzọ. (Joshua 11:1-9) Ọ bụ ezie na anyị bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, dị ka Joshua na Keleb, anyị pụrụ isorozu Jehova, Chineke pụkwara inye anyị ike ijegharị n’ụzọ ya n’obi ike.

Obi Ike Iji Tụkwasị Chineke Obi

16. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Debora, Berak, na Jael si gosi obi ike?

16 A na-enyeghachi ụgwọ ọrụ maka iji obi ike tụkwasị Chineke obi, dị ka ihe ndị mere n’ụbọchị ndị ahụ mgbe ndị ikpe na-ekpe ikpe n’Israel gosiri. (Rut 1:1) Dị ka ihe atụ, Onyeikpe Berak na onye amụma nwanyị bụ́ Debora ji obi ike tụkwasị Chineke obi. Eze Kenean bụ́ Jabin akpagbuwo Israel ruo 20 afọ mgbe Jehova mere ka Debora kwalie Berak ịchịkọta 10,000 ndị ikom n’Ugwu Tabor. Onye isi agha Jabin bụ́ Sisera, ji ọsọ gbaga mmiri iyi Kaịshọn, na-ejide n’aka na n’ala a dị larịị ndị ikom Israel agaghị eru ihe ọ bụla n’ihu ndị agha ya na 900 ụgbọ ala ìgwè ya. Mgbe ụmụ Israel zọbatara ije n’ala ahụ dị larịị, Chineke mere ihe n’ihi ha, oké idei mmiri mekwara ka ọgbọ agha ahụ ghọọ apịtị nke mere ka ụgbọ ala Sisera ghara ịgbakwa agba. Ike ndị ikom Berak kara, nke na “ọmụma ụlọikwuu nile nke Sisera wee daa n’ọnụ mma agha.” Sisera gbalagara n’ụlọikwuu Jael, ma ka ọ na-ehi ụra, Jael nwere obi ike igbu ya site n’ịkpọnye ya ntu ụlọikwuu n’akụkụ egedege ihu ya. Dị ka okwu amụma Debora gwara Berak si dị, “ọjịja” nke mmeri a si otú a gaara nwanyị. N’ihi na Debora, Berak, na Jael ji obi ike tụkwasị Chineke obi, Israel “wee dị jụụ [iri afọ anọ].”—Ndị Ikpe 4:1-22; 5:31.

17. Ihe nlereanya dị aṅaa nke iji obi ike tụkwasị Jehova obi ka Onyeikpe Gideon nyere?

17 Onyeikpe Gideon ji obi ike tụkwasị Jehova Chineke obi mgbe ndị Midian na ndị ọzọ wakporo Israel. Ọ bụ ezie na e ji ihe dị ka 135,000 ndị mwakpo karịa ha, 32,000 ndị na-alụru Israel agha ka nwere ike ịchọ ịsị na mmeri nke Chineke nyere sitere n’ịbụ dike ha. Site ná nduzi Jehova, Gideon n’ihi ya weturu ọnụ ọgụgụ ndị agha ya ruo ìgwè atọ nke narị ndị ikom. (Ndị Ikpe 7:1-7, 16; 8:10) Ka 300 ndị ikom ahụ na-agba ọmụma ụlọikwuu ndị Midian gburugburu n’abalị, nke ọ bụla ji opì ike na ite mmiri na ọwa nke dị n’ime ha. Mgbe e nyere ihe mgbaama, ha fụrụ opì ike ndị ahụ, tiwasịa ite ndị ahụ, welie ọwa ndị ahụ elu, wee tie mkpu, sị: “Mma agha dịịrị Jehova dịkwara Gideon.” (Ndị Ikpe 7:20) Ndị Midian ahụ e menyere egwu malitere ịgba ọsọ, e meriekwa ha. Ihe omume ndị dị otú ahụ kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na a na-enyeghachi ụgwọ ọrụ taa maka iji obi ike tụkwasị Chineke obi.

Obi Ike Iji Sọpụrụ Jehova na Ịkwalite Ofufe Dị Ọcha

18. Mgbe o tigburu Gọlaịat, gịnị ka Devid jiri obi ike mee?

18 Ihe atụ ụfọdụ nke Bible na-enye obi ike iji sọpụrụ Jehova na ịkwalite ofufe dị ọcha. Devid ka na-eto eto, onye ji anya ike napụta atụrụ nna ya, gosipụtara obi ike n’ihu agadaga dimkpa ndị Filistia bụ́ Gọlaịat. “Gị onwe gị na-ewere mma agha, werekwa ube, werekwa mkpụmkpụ ube, bịakwute m,” ka Devid kwuru, “ma mụ onwe m na-ewere aha Jehova nke usuu nile nke ndị agha bịakwute gị, bụ́ Chineke nke usoro agha nile nke Israel, Onye ị taworo ụta. Ụbọchị taa ka Jehova ga-emechibido gị nye n’aka m; m ga-etigbukwa gị, wezụga isi gị n’ahụ gị; . . . ka ụwa nile wee mara na Chineke dịịrị Israel: ya na ka mkpọkọta nke a nile wee mara na ọ bụghị mma agha na ube ka Jehova ji azọpụta: n’ihi na Jehova nwe agha nke a.” (1 Samuel 17:32-37, 45-47) Site n’enyemaka Chineke, Devid ji obi ike nye Jehova nsọpụrụ, tigbuo Gọlaịat, wee si otú ahụ kere òkè dị oké mkpa n’iwepụ ihe iyi egwu ndị Filistia na-eyi ofufe dị ọcha.

19. Maka ihe owuwu dị aṅaa ka Solomọn nwere mkpa obi ike, oleekwa ụzọ a pụrụ isi tinye ụzọ o si mee ihe n’ọrụ n’ụbọchị anyị?

19 Mgbe nwa Eze Devid bụ́ Solomọn na-achọ iwu ụlọ nsọ Chineke, nna ya meworo agadi gbara ya ume, sị: “Dị ike, nweekwa ume, mee ya: atụla egwu, atụkwala ụjọ: n’ihi na Jehova Chineke, bụ́ Chineke m, nọnyeere gị; Ọ gaghị aha gị aka, Ọ gaghị ahapụkwa gị, ruo mgbe i jezuru ozi nile nke ofufe ụlọ Jehova.” (1 Ihe Emere 28:20) N’ime ihe n’obi ike, Solomọn nwere ihe ịga nke ọma n’iwuzu ụlọ nsọ ahụ. Mgbe usoro ihe omume nke ihe owuwu ọchịchị Chineke ghọrọ ihe ịma aka taa, ka anyị cheta okwu Devid: “Dị ike, nweekwa ume, mee ya.” Lee ụzọ mara mma ọ bụ isi sọpụrụ Jehova ma kwalite ofufe dị ọcha!

20. N’akụkụ dị aṅaa ka Eze Esa gosiri obi ike?

20 N’ihi ọchịchọ siri ike Eze Esa nwere inye Chineke nsọpụrụ na ịkwalite ofufe dị ọcha, o wepụsịrị na Juda arụsị na ndị ikom e doro nsọ ịkwa iko. O wepụkwara nne ya ochie si n’ezi ofufe dapụ pụọ n’ọkwá ya dị elu ma suo “ihe ya kpatara ịma jijiji” ọkụ. (1 Ndị Eze 15:11-13) Ee, Esa “mere onwe ya ka ọ dị ike, wee mee ka ihe arụ nile si n’ala Juda na Benjamin nile, sikwa n’obodo nile nke ọ napụtara n’ugwu Efraim, gabiga; o meekwa ebe ịchụàjà Jehova dị ọhụrụ, bụ́ nke dị n’ihu ụzọ mbata Jehova.” (2 Ihe Emere 15:8) Ị̀ na-ejikwa obi ike ajụ ndapụ n’ezi ofufe ma na-akwalite ofufe dị ọcha? Ị̀ na-eji ihe onwunwe ndị i nwere na-akwado ọdịmma Alaeze? Ị̀ na-achọkwa inye Jehova nsọpụrụ site n’ikerechi òkè anya n’ikwusa ozi ọma dị ka otu n’ime Ndịàmà ya?

21. (a) Olee otú ihe ndekọ nke ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe tupu oge ndị Kraịst pụrụ isi nyere anyị aka? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 Lee ka anyị si nwee obi ekele na Chineke echekwawo ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ ndị metụtara ndị ji obi ike na-eguzosi ike tupu oge ndị Kraịst! N’ezie, ihe nlereanya ọma ha pụrụ inyere anyị aka ijere Jehova ozi dị nsọ site n’obi ike na egwu Chineke. (Ndị Hibru 12:28) Ma Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst nwekwara ihe atụ ụfọdụ nke inwe obi ike n’ụzọ nke Chineke. Olee otú ụfọdụ n’ihe ndekọ ndị a pụrụ isi nyere anyị aka ijegharị n’obi ike n’ụzọ nke Jehova?

Olee Otú Ị Ga-esi Zaghachi?

◻ Gịnị bụ obi ike?

◻ Olee otú Inọk na Noa si gosipụta obi ike?

◻ N’akụkụ ndị dị aṅaa ka Abraham, Sera, na Aịsak mere ihe n’obi ike?

◻ Ihe nlereanya obi ike ndị dị aṅaa ka Mosis, Joshua, na Keleb setịpụrụ?

◻ Olee otú ndị ọzọ si gosipụta na ha nwere obi ike ịtụkwasị Chineke obi?

[Foto dị na peeji nke 15]

Gideon na ìgwè ndị agha ya dị nta ji obi ike tụkwasị Jehova obi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya