Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Dị Umeala n’Obi
“Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị umeala n’obi amara.”—1 PITA 5:5.
1, 2. Olee otú Jisọs n’Ozizi Elu Ugwu ya si jikọta okwu inwe obi ụtọ na ịdị umeala n’obi?
È JIKỌRỌ inwe obi ụtọ na ịdị umeala n’obi? N’ozizi ya a kasị mara amara, Jisọs Kraịst, bụ́ nwoke kasị ukwuu nke dịtụworo ndụ ziri, kọwara obi ụtọ, ma ọ bụ nṅụrị ọṅụ itoolu ndị ahụ. (Matiu 5:1-12) Jisọs ò jikọrọ inwe obi ụtọ na ịdị umeala n’obi? Ee, o jikọrọ ha, n’ihi na ịdị umeala n’obi batara n’ọtụtụ obi ụtọ ndị ahụ o zoro aka na ha. Dị ka ihe atụ, mmadụ ga-adị umeala n’obi iji mara mkpa o nwere n’ime mmụọ ya. Nanị ndị dị umeala n’obi na-enwe agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ maka ezi omume. Ndị nganga adịghịkwa nwayọọ n’obi, ha adịghịkwa ebere, ha abụghịkwa ndị na-eme udo.
2 Ndị dị umeala n’obi nwere obi ụtọ n’ihi na ọ bụ ihe ziri ezi na ihe eziokwu ịdị umeala n’obi. Ọzọkwa, ndị umeala n’obi nwere obi ụtọ n’ihi na ọ bụ ihe amamihe ịdị umeala n’obi; ọ na-eme ka e soro Jehova Chineke na ndị Kraịst ndị ọzọ nwee mmekọrịta dị mma. Ọzọkwa, ndị dị umeala n’obi nwere obi ụtọ n’ihi na ọ bụ ngosipụta nke ịhụnanya n’akụkụ nke ha ịdị umeala n’obi.
3. N’ihi gịnị ka ime ihe n’eziokwu ji arụgide anyị ịdị umeala n’obi?
3 N’ihi gịnị ka ime ihe n’eziokwu ji chọọ ịdị umeala n’obi? Otu ihe bụ n’ihi na anyị nile ketara ezughị okè ma nọgide na-ehie ụzọ. Pọl onyeozi kwuru banyere onwe ya, sị: “Amatara m na ezi ihe adịghị ebi n’ime m, nke ahụ bụ, n’anụ ahụ m: n’ihi na ịchọ ihe ọma dị nso n’ebe aka m ga-eru, ma ịrụta ihe ọma adịghị nso n’ebe aka m ga-eru.” (Ndị Rom 7:18) Ee, anyị nile emehiewo, ghara irukwa otuto ebube nke Chineke. (Ndị Rom 3:23) Ịkwụwa aka ọtọ ga-echebe anyị pụọ n’ịdị nganga. Ịnakwere mgbe e hiere ụzọ na-achọ ịdị umeala n’obi, ime ihe n’eziokwu ga-enyekwara anyị aka ịnakwere ụta mgbe ọ bụla anyị hiere ụzọ. Ebe anyị nọgidere na-adaghachi azụ n’ime ihe anyị na-agbalị ime, anyị nwere ihe dị mma mere anyị ga-eji dị umeala n’obi.
4. Ihe na-arụgide arụgide dị aṅaa mere anyị ga-eji dị umeala n’obi ka e nwere ná 1 Ndị Kọrint 4:7?
4 Pọl onyeozi na-enye anyị ihe ọzọ mere anyị ime ihe n’eziokwu kwesịrị iji mee ka anyị dị umeala n’obi. Ọ sịrị: “Ònye na-akpa ókè n’etiti gị na mmadụ ibe gị? Ọ bụ gịnịkwa ka i nwere nke ị na-anataghị? ma ọ bụrụ na ị natara ya, gịnị mere ị na-anya isi, dị ka a ga-asị na ị nataghị ya?” (1 Ndị Kọrint 4:7) Ajụjụ ọ bụla adịghị ya, anyị inye onwe anyị otuto, ịdị nganga maka ihe ndị anyị nwere, ikike anyị, ma ọ bụ ihe ndị anyị rụzuru, agaghị abụ ime ihe n’eziokwu. Ime ihe n’eziokwu na-etinye ihe n’anyị inwe ezi akọ na uche n’ihu Chineke, ka anyị wee nwee ike “ibi obi nke ọma n’ihe nile.”—Ndị Hibru 13:18.
5. Olee otú ime ihe n’eziokwu ga-esikwa nyere anyị aka mgbe anyị hiere ụzọ?
5 Ime ihe n’eziokwu na-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi mgbe anyị hiere ụzọ. Ọ ga-eme ka anyị dị njikere karị ịnakwere ụta ya, kama ịnwa igosi na anyị ziri ezi n’onwe anyị ma ọ bụ ibufere onye ọzọ ụta ahụ. Otú a, ọ bụ ezie na Adam tara Iv ụta, Devid ataghị Bat-sheba ụta, na-asị, ‘Ọ garaghị na-asa ahụ n’ebe onye ọ bụla pụrụ ịhụ ya. M pụghị izere ịbụ onye a nwara.’ (Jenesis 3:12; 2 Samuel 11:2-4) N’ezie, a pụrụ ikwu na n’otu aka, ime ihe n’eziokwu na-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi; n’aka nke ọzọ, ịdị umeala n’obi na-enyere anyị aka ime ihe n’eziokwu.
Okwukwe na Jehova Na-enyere Anyị Aka Ịdị Umeala n’Obi
6, 7. Olee otú okwukwe na Chineke si enyere anyị aka ịdị umeala n’obi?
6 Okwukwe na Jehova ga-enyekwara anyị aka ịdị umeala n’obi. Ịghọta ókè Onye Okike ahụ, Ọkaaka Eluigwe na Ala, dịruru ukwuu n’ezie ga-egbochi anyị iji onwe anyị kpọrọ ihe gabiga ókè. Lee ka onye amụma bụ́ Aịsaịa si chetara anyị nke a nke ọma! N’Aịsaịa 40:15, 22, anyị na-agụ: “Lee, a gụwo mba nile n’otu ntụ mmiri na-atụpụ n’ite mmiri, na n’uzuzu nke ihe ọ̀tụ̀tụ̀ . . . Ọ bụ Onye ahụ Nke na-anọdụ n’elu gburugburu ụwa, ndị bi n’ime ya ewee dị ka ogugu.”
7 Okwukwe na Jehova ga-enyekwara anyị aka mgbe ọ dịrị anyị ka anyị atawo ahụhụ n’ihi ikpe na-ezighị ezi. Kama ichekasị onwe anyị banyere okwu ahụ, anyị ga-eji umeala n’obi chere Jehova, dị ka ọbụ abụ ahụ na-echetara anyị n’Abụ Ọma 37:1-3, 8, 9. Pọl onyeozi kwuru otu ihe ahụ: “Unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Mụ nwe ọbọ; Mụ onwe m ga-enyeghachi, ka Onyenwe anyị kwuru.”—Ndị Rom 12:19.
Obi Umeala—Ụzọ nke Amamihe
8. N’ihi gịnị ka obi umeala ji eme ka e soro Jehova nwee mmekọrịta dị mma?
8 E nwere ọtụtụ ihe mere ịdị umeala n’obi ji bụrụ ụzọ nke amamihe. Otu bụ na, dị ka e gosiwororịị, ọ na-eme ka e soro Onye Mere anyị nwee ezi mmekọrịta. Okwu Chineke kwuru hoo haa n’Ilu 16:5: “Ihe arụ n’anya Jehova ka onye ọ bụla bụ nke obi ya dị elu.” Anyị na-agụkwa n’Ilu 16:18: “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.” Mgbe oge na-aga, onye mpako ahụ na-adaba n’iru újú. Ọ ghaghị nnọọ ịdị otú ahụ n’ihi ihe anyị na-agụ na 1 Pita 5:5: “Unu nile were obi dị umeala kee onwe unu dị ka ákwà, ijerịtara ibe unu ozi: n’ihi na Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.” Ị ga-ahụ otu isi ihe ahụ n’ihe atụ Jisọs nyere banyere onye Farisii na onye ọna ụtụ nke nke ọ bụla n’ime ha na-ekpe ekpere. Ọ bụ onye ọna ụtụ ahụ dị umeala n’obi ka e gosipụtara na ọ bụ onye ezi omume kara.—Luk 18:9-14.
9. Enyemaka dị aṅaa ka obi umeala bụ n’oge ihe isi ike?
9 Obi umeala bụ ụzọ nke amamihe n’ihi na obi umeala na-eme ka ọ kara anyị mfe ịṅa ntị ná ndụmọdụ a na-achọta na Jemes 4:7: “Ya mere doonụ onwe unu n’okpuru Chineke.” Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị agaghị enupụ isi mgbe Jehova kwere ka anyị taa ahụhụ ihe isi ike. Obi umeala ga-enyere anyị aka inwe afọ ojuju n’ọnọdụ anyị ma na-atachi obi. Onye nganga adịghị enwe afọ ojuju, mgbe nile ọ na-achọkwu ihe, na-enupụkwa isi n’ọnọdụ ndị na-akpata mwute. N’aka nke ọzọ, onye dị umeala n’obi na-edi ihe isi ike na ule, ọbụna dị ka Job mere. Ihe onwunwe nile nke Job funahụrụ ya, e jirikwa nrịanrịa na-egbu mgbu tie ya ihe otiti, mgbe ahụ kwa ọbụna nwunye ya dụrụ ya ọdụ ka ọ gbasoo ụzọ nke nganga, na-asị: “Gbakụta Chineke azụ, nwụọ.” Olee otú o si zaghachi? Ihe ndekọ Bible na-agwa anyị: “Ọ sị ya, Dị ka otu n’ime ndị inyom nzuzu si ekwu, otú a ka ị na-ekwu. Ànyị ga-anarakwa ezi ihe n’aka Chineke, ghara ịnara ihe ọjọọ? N’ihe a nile Job ejighị egbugbere ọnụ ya mehie.” (Job 2:9, 10) N’ihi na Job dị umeala n’obi, o nupụghị isi kama o ji amamihe doo onwe ya n’okpuru ihe ọ bụla Jehova kwere ka ọ dakwasị ya. N’ikpeazụkwa, ọ natara nkwụghachi ụgwọ ọrụ bara ụba.—Job 42:10-16; Jemes 5:11.
Obi Umeala Na-eme Ka E Soro Ndị Ọzọ Nwee Mmekọrịta Dị Mma
10. Olee otú obi umeala si emeziwanye mmekọrịta anyị na ndị Kraịst ibe anyị?
10 Obi umeala bụ ụzọ nke amamihe n’ihi na ọ na-eme ka anyị soro ndị Kraịst ibe anyị nwee mmekọrịta dị mma. Pọl onyeozi dụrụ anyị ọdụ nke ọma, sị: “Unu emela ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịtanụ ibe unu ná ndị ka unu onwe unu mma; unu nile n’otu n’otu elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n’otu n’otu leekwa ihe nke mmadụ ibe unu anya.” (Ndị Filipaị 2:3, 4) Obi umeala ga-echebe anyị n’ụzọ amamihe pụọ n’ịma ndị ọzọ aka ma ọ bụ ịnwa imekarị ndị ọzọ. Àgwà nke uche ndị dị otú ahụ na-ewetara anyị, na-ewetakwara ndị Kraịst ibe anyị nsogbu.
11. N’ihi gịnị ka obi umeala pụrụ iji nyere anyị aka izere ihie ụzọ?
11 Ugboro ugboro, obi umeala ga-enyere anyị aka izere ihie ụzọ. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi na obi umeala ga-egbochi anyị inwe obi ike gabiga ókè. Kama nke ahụ, anyị ga-ewere ndụmọdụ Pọl ná 1 Ndị Kọrint 10:12 n’ihe dị oké ọnụ ahịa, nke bụ́: “Onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda.” Onye nganga na-enwe obi ike n’onwe ya gabiga ókè, ya mere ọ na-adabakarị n’ihie ụzọ n’ihi ihe ndị dị n’èzí na-emetụta ya ma ọ bụ adịghị ike ndị nke ya.
12. Obi umeala ga-akwali anyị imezu ibu ọrụ dị aṅaa nke Akwụkwọ Nsọ?
12 Obi umeala ga-enyere anyị aka iru ihe a chọrọ maka ido onwe onye n’okpuru. Ná Ndị Efesọs 5:21, a dụrụ anyị ọdụ, sị: “Na-edorịta onwe unu n’okpuru ibe unu n’ime egwu Kraịst.” N’ezie, ọ̀ bụ na ọ dịghị anyị nile mkpa ido onwe anyị n’okpuru? Ọ dị ụmụaka mkpa ido onwe ha n’okpuru ndị mụrụ ha, ndị nwunye n’okpuru di ha, na ndị bụ di n’okpuru Kraịst. (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Efesọs 5:22; 6:1) Mgbe ahụ, n’ọgbakọ ọ bụla nke ndị Kraịst, mmadụ nile, gụnyere ndị ohu na-eje ozi, ga-edo onwe ha n’okpuru ndị okenye. Ọ̀ bụ na ọ bụghịkwa eziokwu na ndị okenye nọ n’okpuru ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, karịsịa ka onye nlekọta sekit na-anọchite anya ya? Ọzọkwa, onye nlekọta sekit nwere mkpa ido onwe ya n’okpuru onye nlekọta distrikti, onye nlekọta distrikti kwa n’okpuru Kọmitii Alaka nke mba ebe ọ na-eje ozi. Gịnị banyere ndị òtù Kọmitii Alaka? Ha aghaghị ‘idorịta onwe ha n’okpuru ibe ha’ nakwa n’okpuru Òtù Na-achị Isi, nke na-anọchite anya ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, bụ́ nke n’akụkụ nke ya ga-aza Jisọs, bụ́ Eze ahụ e meworo ka ọ nọkwasị n’ocheeze, ajụjụ. (Matiu 24:45-47) Dị ka n’òtù ọ bụla nke ndị okenye, ndị so n’Òtù Na-achị Isi ga-enwe nkwanye ùgwù maka echiche ibe ha. Dị ka ihe atụ, otu onye pụrụ iche na ya nwere echiche mara mma. Ma ọ gwụla ma ọnụ ọgụgụ dị mma nke ndị ọzọ nọ n’òtù ahụ ekwenyere n’aro ya, nanị ihe ọ ga-eme bụ ichezọ okwu ahụ. N’ezie, obi umeala dị anyị nile mkpa, n’ihi na anyị nile nọ n’okpuru ndị ọzọ.
13, 14. (a) N’ọnọdụ dị aṅaa kpọmkwem ka obi umeala ga-enyere anyị aka? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa ka Pita setịpụrụ n’ihe banyere ịnakwere ndụmọdụ?
13 A na-ahụkarịsị na obi umeala bụ ụzọ nke amamihe ebe ọ bụ na obi umeala na-eme ka ọ kara anyị mfe ịnakwere ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị. Onye ọ bụla n’ime anyị na-enwe mkpa maka ịdọ aka ná ntị mgbe ụfọdụ, anyị ga-emekwa nke ọma ịnara ndụmọdụ dị n’Ilu 19:20: “Nụrụ ndụmọdụ, narakwa ịdọ aka ná ntị, ka i wee mara ihe n’ikpeazụ gị.” Dị ka e kwuworo nke ọma, obi umeala na-eme ka ịba mba ma ọ bụ ịdọ aka ná ntị ghara ịbụ ihe mwute. Ọzọkwa, Pọl onyeozi, ná Ndị Hibru 12:4-11, na-enye anyị ndụmọdụ banyere amamihe nke iji umeala n’obi na-anakwere ịdọ aka ná ntị. Nanị n’ụzọ dị otú a ka anyị pụrụ ile anya iduzi ụzọ anyị n’ọdịnihu n’amamihe, e mesịakwa nweta ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ ebighị ebi. Lee aha ihe obi ụtọ nke ahụ ga-abụ!
14 N’akụkụ nke a anyị pụrụ izo aka n’ihe nlereanya Pita onyeozi. Ọ natara ndụmọdụ siri ike site n’aka Pọl onyeozi, dị ka anyị na-amụta site n’ihe ndekọ dị ná Ndị Galetia 2:14: “Mgbe m hụrụ na ha agazighị dị ka eziokwu nke ozi ọma si dị, asịrị m Kifas [Pita] n’ihu ha nile, Ọ bụrụ na gị onwe gị adị ndụ dị ka ndị mba ọzọ, ma ọ bụghị dị ka ndị Juu, ọ bụ ezie na ị bụ onye Juu, ì si aṅaa erugide ndị mba ọzọ ka ha soo ụzọ ndị Juu?” Pita onyeozi ò were iwe? Ọ bụghị ruo ogologo oge, a sịgodi na o were ma ọlị, dị ka a pụrụ ịhụ n’aka o mesịrị zoo n’ebe “nwanna anyị anyị hụrụ n’anya, bụ́ Pọl,” nọ na 2 Pita 3:15, 16.
15. Gịnị jikọrọ anyị ịdị umeala n’obi na anyị inwe obi ụtọ?
15 E nwekwara okwu nke ihe mmadụ nwere izuru ya, inwe afọ ojuju. Anyị apụghị nnọọ inwe obi ụtọ ọ gwụla ma anyị nwere afọ ojuju n’ọnọdụ anyị, ihe ùgwù ndị anyị nwere, ngọzi anyị nile. Onye Kraịst dị umeala n’obi na-ewere àgwà nke bụ: “Chineke kwerehaala ka ọ dị, m pụrụ ịnakwere ya,” nke bụ n’ezie ihe Pọl onyeozi na-ekwu, dị ka anyị na-agụ ná 1 Ndị Kọrint 10:13: “Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla nwaworo unu ma ọ bụghị nke mmadụ na-anagide: ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, Onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karịa nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ Ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.” Ya mere anyị na-ahụkwa ọzọ otú obi umeala si bụrụ ụzọ nke amamihe, n’ihi na ọ na-enyere anyị aka inwe obi ụtọ n’agbanyeghị ihe ọnọdụ anyị pụrụ ịbụ.
Ịhụnanya Ga-enyere Anyị Aka Ịdị Umeala n’Obi
16, 17. (a) Ihe nlereanya dị aṅaa nke Akwụkwọ Nsọ na-egosipụta àgwà kasị elu n’inyere anyị aka ịdị umeala n’obi? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa n’adịghị n’Akwụkwọ Nsọ na-enyekwa ihe atụ nke isi ihe a?
16 Karịsịa ihe nile ọzọ, ịhụnanya nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị, a·gaʹpe, ga-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi. N’ihi gịnị ka Jisọs ji nwee ike iji oké umeala n’obi nagide ahụmahụ ya nke osisi ịta ahụhụ nke Pọl kọwaara ndị Filipaị? (Ndị Filipaị 2:5-8) N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị gụọ ịha ka Chineke n’ihe ọ ga-ejidesi ike? N’ihi na, dị ka ya onwe ya kwuru: “Ana m ahụ Nna m n’anya.” (Jọn 14:31) Ọ bụ ya mere o ji wegara Jehova, bụ́ Nna ya nke eluigwe, otuto na nsọpụrụ mgbe nile. Otú a, n’oge ọzọ o mesiri ya ike na nanị Nna ya nke eluigwe dị mma.—Luk 18:18, 19.
17 Ihe atụ nke isi ihe a bụ ihe mere ná ndụ nke otu n’ime ndị America na-abụ abụ uri, bụ́ John Greenleaf Whittier. Nwoke a nwere enyi nwanyị ya na ya tokọrọ, otu mgbe kwa ha nọ na-ama aka ịsụpe okwu, nwatakịrị nwanyị ahụ sụpetara otu okwu, ebe ya onwe ya na-asụpetaghị ya. O wutere nwatakịrị nwanyị nke ukwuu. N’ihi gịnị? Dị ka onye abụ uri ahụ na-echetaghachi, nwatakịrị nwanyị ahụ kwuru, sị: “Ewela iwe na m sụpetara okwu ahụ. Ọ dịghị amasị m ịka gị . . . n’ihi na leenụ, ahụrụ m gị n’anya.” Ee, ọ bụrụ na anyị hụrụ mmadụ n’anya, anyị ga-achọ ka onye ahụ nọrọ n’elu, ọ bụghị n’okpuru, anyị, n’ihi na ịhụnanya dị umeala n’obi.
18. Obi umeala ga-enyere anyị aka ịṅa ntị ná ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ dị aṅaa?
18 Nke a bụ ihe mmụta dị mma nye ndị Kraịst nile, karịsịa ụmụnna nwoke. Mgbe a bịara n’ihe banyere ihe ùgwù ije ozi, ànyị ga-aṅụrị na nwanna anyị natara ya kama anyị onwe anyị, ka anyị ga-enwetụ ekworo na anya ụfụ? Ọ bụrụ n’ezie na anyị hụrụ nwanna anyị n’anya, anyị ga-aṅụrị na e kenyere ya ọrụ ma ọ bụ mata ya ma ọ bụ nye ya ihe ùgwù ije ozi ahụ pụrụ iche. Ee, umeala n’obi ga-eme ka ọ dị mfe irube isi na ndụmọdụ ahụ bụ́: “N’akụkụ nsọpụrụ unu, na-acharanụ ibe unu ụzọ.” (Ndị Rom 12:10) Nsụgharị ọzọ na-agụ, sị: “Sọpụrụnụ ibe unu karịa onwe unu.” (New International Version) Ọzọkwa, Pọl onyeozi dụrụ anyị ọdụ, sị: “Werenụ ịhụnanya bụrịta ohu ibe unu.” (Ndị Galetia 5:13) Ee, ọ bụrụ na anyị nwere ịhụnanya, anyị ga-enwe ọṅụ ijere ụmụnna anyị ozi, ịbụrụ ha ohu, itinye mmasị na ọdịmma ndị nke ha n’ihu nke anyị onwe anyị, bụ́ ihe na-achọ obi umeala. Obi umeala ga-echebekwa anyị pụọ n’itu ọnụ wee si otú a na-akpalite n’ime ndị ọzọ mmụọ nke ekworo ma ọ bụ anya ụfụ. Pọl dere na ịhụnanya “adịghị anya isi, ọ dịghị afụli onwe ya elu.” N’ihi gịnị? N’ihi na ebumnobi dị n’itu ọnụ na ịfụli onwe onye elu bụ ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ịchọ otuto efu, ebe ịhụnanya bụ achọghị ọdịmma onwe onye nanị n’onwe ya.—1 Ndị Kọrint 13:4.
19. Ihe nlereanya dịgasị aṅaa nke Bible na-enye ihe atụ nke na obi umeala na ịhụnanya na-aga ụkwụ na ụkwụ, dị ka nganga na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị?
19 Mmekọrịta Devid na Eze Sọl na nwa ya nwoke bụ́ Jonatan bụ ihe nlereanya dị ịrịba ama nke otú ịhụnanya na obi umeala si na-aga ụkwụ na ụkwụ na ụzọ nganga na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị si agakwa ụkwụ na ụkwụ. N’ihi ihe ịga nke ọma Devid n’agha, ndị inyom Israel bụrụ abụ, sị: “Sọl etigbuwo ndị iro ya, [otu puku, otu puku], Devid kwa ndị iro ya, [iri puku, iri puku].” (1 Samuel 18:7) N’adịghị umeala n’obi ma ọlị, kama nke ahụ, na-ejupụta ná nganga, Sọl malitere mgbe ahụ nwebe ịkpọasị na-akpata igbu ọchụ maka Devid. Lee ka nke a si dị iche na mmụọ nke nwa ya nwoke bụ́ Jonatan! Anyị gụrụ na Jonatan hụrụ Devid n’anya dị ka mkpụrụ obi nke ya. (1 Samuel 18:1) Ya mere olee otú Jonatan si zaghachi mgbe, ka ihe ndị ọzọ na-eme, ọ pụtara ìhè na Jehova na-agọzi Devid nakwa na ọ gaje ịnọchị Sọl dị ka eze Israel, ọ bụghị ya onwe ya, bụ́ Jonatan? Jonatan ò kworo ekworo ma ọ bụ nwee anya ụfụ? Ee e ma ọlị! N’ihi ịhụnanya ya dị ukwuu maka Devid, ọ pụrụ ikwu, dị ka anyị na-agụ na 1 Samuel 23:17, sị: “Atụla egwu: n’ihi na aka nna m, bụ́ Sọl, agaghị achọta gị; gị onwe gị ga-abụkwa eze Israel, mụ onwe m ga-abụkwara gị onye nke abụọ; ọzọkwa, Sọl, bụ́ Nna m, maara nke a.” Ịhụnanya dị ukwuu Jonatan nwere maka Devid mere ka o jiri umeala n’obi nakwere ihe ọ chọpụtara dị ka uche Chineke banyere onye ga-anọchi nna ya dị ka eze Israel.
20. Olee otú Jisọs si gosi njikọ chiri anya nke dị n’etiti ịhụnanya na obi umeala?
20 Ihe na-emesikwu mmekọrịta dị n’etiti ịhụnanya na obi umeala ike bụ ihe mere n’abalị ikpeazụ Jisọs Kraịst nọnyeere ndị ozi ya tupu ọ nwụọ. Na Jọn 13:1, anyị na-agụ na Jisọs, “ebe Ọ hụrụ ndị nke aka Ya nọ n’ụwa n’anya, Ọ hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ ihe.” Ka nke ahụ gasịrị, anyị na-agụ na Jisọs sara ụkwụ ndị ozi ya, na-eme ihe dị ka onye oje ozi nke e weturu nnọọ ala. Lee ihe mmụta dị ike ọ bụ n’ịdị obi umeala!—Jọn 13:1-11.
21. Ná nchịkọta, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji dị umeala n’obi?
21 N’ezie, e nwere ọtụtụ ihe mere a ga-eji dị umeala n’obi. Ịdị umeala n’obi bụ ihe ziri ezi, ihe eziokwu. Ọ bụ ụzọ nke okwukwe. Ọ na-eme ka e soro Jehova Chineke na ndị kwere ekwe ibe anyị nwee mmekọrịta dị mma. Ọ bụ ụzọ nke amamihe. Karịsịa ihe nile, ọ bụ ụzọ nke ịhụnanya ma na-eweta ezi obi ụtọ.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ime ihe n’eziokwu si bụrụ ihe enyemaka n’ịdị umeala n’obi?
◻ N’ihi gịnị ka okwukwe na Jehova pụrụ iji nyere anyị aka ịdị umeala n’obi?
◻ Gịnị na-egosi na ịdị umeala n’obi bụ ụzọ nke amamihe?
◻ N’ihi gịnị ka ịhụnanya ji bụrụ oké ihe enyemaka n’anyị ịdị umeala n’obi?
[Foto dị na peeji nke 21]
Job ji umeala n’obi nyefee Jehova onwe ya. Ọ ‘kọchaghị Chineke ma nwụọ’
[Foto dị na peeji nke 23]
Pita ji umeala n’obi kwere mgbe Pọl dụrụ ya ọdụ n’ihu ọha