Olee Otú Ị Pụrụ Isi Gosi Ezi Ịdị Umeala n’Obi?
EZI ịdị umeala n’obi dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke. Jemes dere, sị: “Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.” (Jemes 4:6) N’ebe a, ọ pụrụ ịbụworị na Jemes na-ezo aka n’ọtụtụ echiche ndị e kwupụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. “Jehova dị elu, ma ọ bụ onye dị umeala n’obi ka Ọ na-ahụ anya: ma onye mpako, Ọ na-esite n’ebe dị anya mara ya.” “A ghaghị ime anya mpako nke mmadụ ka ha dị ala, a ghaghịkwa iruda mbuli elu nke ndị nile n’ala, a ghaghịkwa ime ka Jehova, nanị Ya, dị elu.” “Ọ bụrụ na ọ bụ ndị na-akwa emo ka Ya [Chineke] onwe ya na-akwa emo, ma ọ bụ ndị dị umeala n’obi ka Ọ na-enye amara.”—Abụ Ọma 138:6; Aịsaịa 2:11; Ilu 3:34.
Pita onyeozi gbakwara ume ka a na-adị umeala n’obi. O dere: “Unu nile were obi dị umeala kee onwe unu dị ka ákwà, [ijerịtara] ibe unu ozi: n’ihi na Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.”—1 Pita 5:5.
Ihe Nlereanya Kraịst nke Ịdị Umeala n’Obi
Ị pụrụ ịjụ, Olee ihe ọma ma ọ bụ abamuru dị n’ịdị umeala n’obi? Nye onye na-agbalịsi ike ịbụ ezi onye Kraịst, azịza ya dị oké mkpa—ịdị umeala n’obi bụ ịdị ka Kraịst. Jisọs gosipụtara ịdị umeala n’obi ya site n’ịnakwere ọrụ ahụ pụrụ iche nke isi n’ógbè eluigwe bịa n’ụwa ma ghọọ mmadụ dị ala, nke dị ala karịa ndị mmụọ ozi. (Ndị Hibru 2:7) Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara Chineke, ọ tachiri obi n’ọtụtụ mweda n’ala ndị ndị iro ya bụ́ ndị okpukpe wedara ya. O jidere onwe ya n’oge ọnwụnwa ya nile, ọ bụ ezie na o nwere ike ịkpọ ọtụtụ legion ndị mmụọ ozi inyere ya aka.—Matiu 26:53.
N’ikpeazụ, a kwụbara Jịsọs n’ụzọ ihere n’elu osisi ịta ahụhụ, ma ọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Nna ya. N’ihi ya, Pọl pụrụ ide banyere ya, sị: “Nweenụ uche a n’ime onwe unu, nke dịkwa n’ime Kraịst Jisọs: Onye, ọ bụ ezie na Ọ dịrịị n’ụdị nke Chineke na mbụ, ma Ọ gụghị ya n’ihe Ọ ga-ejidesi ike, bụ́ ịha ka Chineke, kama O mere Onwe ya ihe efu, n’ịnara ụdị nke ohu, e wee mee Ya n’oyiyi nke mmadụ; ebe a hụrụ Ya ka Ọ dị ka mmadụ n’oyiyi Ya, O wedakwara Onwe ya, wee bụrụ Onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ, bụ́ ọnwụ nke [osisi ịta ahụhụ, NW].”—Ndị Filipaị 2:5-8.
Ya mere olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ezi ịdị umeala n’obi? N’ọnọdụ ndị pụrụ ịdapụta n’ezie, olee otú anyị pụrụ isi meghachi omume n’ụzọ ịdị umeala n’obi kama ịbụ nke nganga?
Otú Onye Dị Umeala n’Obi Si Emeghachi Omume
Ka anyị tụlee ịdị umeala n’obi n’ihe banyere ọrụ, ma ọ bụ n’ebe anyị na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ozi ndị Kraịst. Iji rụzuo ọrụ, ọ pụrụ ịdị mkpa inwe ndị nlekọta na ndị manịja. A ghaghị inwe onye ga-eme mkpebi. Ì si aṅaa emeghachi omume? Ị̀ na-eche, sị, “Ònye ka o chedịrị na ọ bụ ịbịa na-agwa m ihe m ga-eme? Anọwo m ọtụtụ afọ n’ọrụ a karịa ya.” Ee, ọ bụrụ na ị dị nganga, iwe ga-ewe gị ịnọ n’okpuru. N’aka nke ọzọ, onye dị umeala n’obi na-agbalị ịghara ‘ime ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịta ibe ya ná ndị ka ya.’—Ndị Filipaị 2:3.
Olee otú i si emeghachi omume mgbe onye ị tọrọ ma ọ bụ nwanyị tụụrụ gị aro? Ọ bụrụ na ị dị umeala n’obi, ma ọ dịghị ihe ọzọ ị ga-atụle ya. Ọ bụrụ na ị dị nganga, ọ ga-ewe gị iwe ma ọ bụ ị ga-ajụ ya ozugbo. Ị̀ ga-ahọrọ ịnara otuto na ịja mma efu nke na-eduga gị ná mbibi ka ọ̀ bụ ndụmọdụ na-enye aka maka iwuli gị elu?—Ilu 27:9; 29:5.
Ị̀ pụrụ imeri ihe ịma aka nke ahụhụ? Ịdị umeala n’obi ga-enyere gị aka iche ọnọdụ ndị tara akpụ ihu na ịtachi obi, ọbụna dị ka Job tachiri. Ọ bụrụ na ị dị nganga, ị ga-enwe obi nkoropụ, i nwekwara ike inupụ isi n’ọnọdụ ndị siri ike nakwa n’ihe ndị i chere na ha bụ nlelị.—Job 1:22; 2:10; 27:2-5.
Ịdị Umeala n’Obi Na-ahụ n’Anya ma Na-agbaghara
Ọ na-esiri mmadụ ụfọdụ ike ịsị, “O wutere m. Ehiere m ụzọ. I kwuru eziokwu.” N’ihi gịnị? Oké nganga! Ma, mgbe mgbe ezi arịrịọ maka mgbaghara pụrụ ịkwụsị esemokwu nke di na nwunye n’ụzọ dị mfe.
Ị̀ dị njikere ịgbaghara mgbe mmadụ mejọrọ gị? Ka ọ̀ bụ, na nganga gị, ị̀ na-ebu iwe n’obi, ikekwe ruo ọtụtụ ụbọchị na ọnwa, na-ajụ ighe onye ahụ i chere na o mejọrọ gị ọnụ? Ị̀ na-etinye aka ọbụna n’ibu iro ná mgbalị iji megwara? E gbuwo ndị mmadụ n’ibu iro ụfọdụ. Ná ndị ọzọ, e jiriwo imebi aha mmadụ mee ihe. N’ụzọ dị iche, onye dị umeala n’obi na-ahụ n’anya ma na-agbaghara. N’ihi gịnị? N’ihi na ịhụnanya adịghị agụ ihe ọjọọ e mere ya. Jehova dị njikere ịgbaghara ụmụ Israel ma ọ bụrụ na ha ga-akwụsị nganga ha. Onye na-eso ụzọ Jisọs nke dị umeala n’obi na-adị njikere ịgbaghara, ọbụna ugboro ugboro!—Joel 2:12-14; Matiu 18:21, 22; 1 Ndị Kọrint 13:5.
Onye dị umeala n’obi ‘na-ebute ụzọ n’igosi onye ọzọ nsọpụrụ.’ (Ndị Rom 12:10, NW) New International Version na-agụ, sị: “Sọpụrụnụ ibe unu karịa onwe unu.” Ị̀ na-eto ndị ọzọ ma na-enwe ekele maka ike na nkà ha? Ka ị̀ na-ahụta ntụpọ mgbe nile iji mebie aha ọma ha? Ee, ì nwere ike ito ndị ọzọ n’ụzọ ziri ezi? Ọ bụrụ na nke a na-esiri gị ike, ikekwe enweghị obi ike onwe onye na nganga bụ nsogbu gị.
Onye nganga adịghị enwe ndidi. Onye dị umeala n’obi na-enwe ndidi na ogologo ntachi obi. Gịnị banyere gị? Ị̀ na-enwe ntakasị ahụ ná mmeso ọ bụla ị chọpụtara na ọ dịghị mma? Mmeghachi omume dị otú ahụ dị iche n’ebe ogologo ntachi obi dị. Ọ bụrụ na ị dị umeala n’obi, ị gaghị eche echiche banyere onwe gị gabiga ókè. Cheta ihe mere mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs chere echiche banyere onwe ha gabiga ókè—ha banyere n’oké arụmụka banyere onye ga-akasị mkpa. Ha chefuru na ha nile bụ “ohu ndị na-abaghị n’ihe”!—Luk 17:10; 22:24; Mak 10:35-37, 41.
Onye France na-ede akwụkwọ bụ́ Voltaire kọwara ịdị umeala n’obi dị ka “obi umeala nke mkpụrụ obi . . . ọgwụ nganga.” Ee, ịdị umeala n’obi bụ inwe echiche na-adịghị elu. Onye dị umeala n’obi na-enwe mmụọ dị nwayọọ, ọ dịghị akpa nganga. Ọ na-akwanye ùgwù ma na-akpa àgwà ọma nke ukwuu.
Ya mere gịnị mere a ga-eji gbalịa ịdị umeala n’obi? N’ihi na ịdị umeala n’obi nwere nnwapụta Chineke ma na-enyere anyị aka inweta nduzi Ya. N’otu akụkụ, n’ihi ịdị umeala n’obi nke Daniel, Jehova weere onye amụma ahụ dị ka “ihe a na-achọsi ike nke ukwuu” ma jiri otu mmụọ ozi zigara ya ọhụụ! (Daniel 9:23; 10:11, 19) Ịdị umeala n’obi na-eweta ọtụtụ ụgwọ ọrụ. Ọ na-eweta ezi ndị enyi hụrụ gị n’anya. Karịa nke ahụ, ọ na-eweta ngọzi Jehova. “Ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ.”—Ilu 22:4.
[Foto dị na peeji nke 7]
Mgbaghara e ji obi umeala rịọ pụrụ ime ka ndụ dị ụtọ karị