Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 1/15 p. 5-7
  • N’isi Nso—Ụwa Agha Na-adịghị na Ya!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’isi Nso—Ụwa Agha Na-adịghị na Ya!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịkwalite Udo n’Ime Uche
  • Ụzọ Chineke Ga-esi Weta Udo
  • Iwepụ Ihe Mgbochi Nile nke Okpukpe
  • Ezi Udo—Site n’Ebee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Chọọ Ezi Udo Ma Gbasoo Ya!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ònye Ga-eduru Ihe A Kporo Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Njedebe nke Agha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 1/15 p. 5-7

N’isi Nso​—⁠Ụwa Agha Na-adịghị na Ya!

NA DECEMBER 24, 1914, onye soja na-eto eto bụ́ onye Britain nke aha ya bụ Jim Prince gabigara ala ọ na-adịghị onye nwe ya ịgwa onye agha Germany ji ụkwụ aga okwu. “Abụ m onye Saxon. Ị bụ onye Anglo-Saxon. Gịnị mere anyị ji alụ ọgụ?” ka onye Germany ahụ jụrụ ya. Ọtụtụ afọ n’ihu, Prince kwupụtara, sị: “Amatabeghị m azịza nye ajụjụ ahụ.”

N’otu izu pụrụ iche na 1914, ndị soja nọ n’òtù agha Britain na Germany mekọrọ ihe ọnụ, gbakọọ bọl, ọbụna gbanwerịta onyinye Krismas. Otú ọ dị, nkwụsịtụ agha ahụ enweghị nkwado ndị isi. Ndị ọchịagha achọghị ka ìgwè ndị agha ha chọpụta na “onye iro” ahụ abụghị ajọ mmụọ ahụ nke okwu nkwali agha na-egosipụta ya ịbụ. Onye soja Britain bụ́ Albert Moren mesịrị chetaghachi: “À sị na nkwụsịtụ agha ahụ gara n’ihu ruo otu izu ọzọ, ọ gaara esiwori ike nke ukwuu ịmaliteghachi agha ahụ ọzọ.”

Nkwụsịtụ agha ahụ mere ná ndapụta na-egosi na ọbụna ndị soja a zụrụ azụ na-achọsi udo ike kama agha. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị soja bụ́ ndị hụworo ihe ụjọ dị iche iche nke ibu agha ga-akwado ilu ndị Spain ahụ bụ́: “Onye na-amaghị ihe agha bụ na-aga agha.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya, njụta echiche a jụrụ gburugburu ụwa n’etiti ọha mmadụ n’ozuzu ha ga-egosi na ọnụ ọgụgụ ka nnọọ elu na-ahọrọ udo karịa agha. Ma olee otú ọchịchọ a zuru ebe nile maka udo pụrụ isi weta ụwa nke agha na-adịghị na ya?

Tupu e nwee ike ikpochapụ agha, akparamagwa dị iche iche aghaghị ịgbanwe. Okwu nguzobe òtù UN Educational, Scientific, and Cultural Organization na-asị: “Ebe ọ bụ na agha na-amalite n’uche ndị mmadụ, ọ bụ n’uche ndị mmadụ ka a ga-ewulite ihe nchebe maka udo.” Ka o sina dị, ọha mmadụ e nwere ugbu a, ebe enweghị ntụkwasị obi na mkpọrọmasị juru ebe nile, na-aghọwanye nke ime ihe ike, ọ bụghị nke na-adịwanye n’udo.

Ka o sina dị, Chineke n’onwe ya kwere nkwa na otu ụbọchị udo ga-abụ nke e dekwasịrị n’uche ndị nwere obi ezi omume. Site n’onye amụma ya bụ́ Aịsaịa, ọ sịrị: “Ọ [Chineke] ga-ekpekwa ikpe n’etiti mba nile, doziekwara ọtụtụ ndị dị iche iche okwu ha: ha ga-akpụgharịkwa mmà agha ha nile ka ha bụrụ mmà ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mmà ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mmà agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”​—⁠Aịsaịa 2:4.

Ịkwalite Udo n’Ime Uche

Mgbanwe dị otú ahụ dị ịrịba ama n’echiche ọ̀ pụrụ iwere ọnọdụ? Ọ̀ dị mgbe ụmụ mmadụ ga-amụta ichebe udo kama ito agha? Tụlee ihe atụ nke Wolfgang Kusserow. Na 1942 ndị Nazi bepụrụ onye Germany nke a gbara 20 afọ isi n’ihi na ọ ‘gaghị amụta agha.’ N’ihi gịnị ka o ji họrọ ịnwụ? N’otu okwu e dere ede, o hotara ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka, “Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya di ka onwe gị” na, “Mmadụ nile ndị weere mmà agha ga-ala n’iyi site ná mmà agha.” (Matiu 22:39; 26:52) Ọ jụziri hoo haa, sị: “Onye Okike anyị ọ̀ hụrụ na e deturu ihe a dum maka osisi?”

Okwu Chineke, nke e dekọrọ n’ime Bible, “dị ike” ma kpalie Onyeàmà a na-eto eto nke Jehova ịchụso udo, n’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe. (Ndị Hibru 4:12; 1 Pita 3:11) Ma ọ bụghị nanị Wolfgang Kusserow si otú ahụ chụsoo udo. N’akwụkwọ bụ́ The Nazi Persecution of the Churches 1933-45, J. S. Conway zoro aka n’ihe mgbe ochie ndị nke ndị isi Nazi, bụ́ ndị na-agba akaebe na Ndịàmà Jehova dị ka otu ìgwè jụrụ iburu ihe agha. Dị ka Conway na-egosipụta, nguzo obi ike dị otú ahụ n’ezie pụtara ha ịbịanye aka n’akwụkwọ ọnwụ nke aka ha.

Ndịàmà Jehova taa nọgidere na-achụso udo, n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ mba ha si na ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ha amụtawo site na Bible na ezi ndị ohu Chineke aghaghị ịkpụgharị mmà agha ha ka ha bụrụ mmà ogè. Alejandro, onye Argentina bụ okorobịa nke kwalagara Israel na 1987, pụrụ ịgba akaebe n’onwe ya nye eziokwu nke a.

Ruo afọ atọ Alejandro biri n’otu obere ime obodo n’Israel mgbe ọ na-aga mahadum ma na-arụ ọrụ na họtel na ụlọ oriri dị iche iche. N’oge a, ọ malitere ịgụ Bible, na-achọkwa nzube nke ndụ. Karịsịa ihe nile, ọ chọsiri ike ịhụ ụwa ebe ụmụ mmadụ pụrụ ịnụ ụtọ udo na ikpe ziri ezi. Alejandro​—⁠bụ́ onye Juu⁠—​so ndị Juu na ndị Arab rụkọọ ọrụ ma họrọ ịhapụ ịdọnyere akụkụ nke ọ bụla úkwù.

Na 1990 otu enyi ya nke so Ndịàmà Jehova na-amụ Bible kpọrọ Alejandro òkù ịbịa otu mgbakọ otu ụbọchị na Haifa. N’ịbụ onye o juru anya ịhụ 600 ndị Juu na ndị Arab ka ha so ibe ha na-emekọ ihe ná mgbakọ ahụ, o chere n’ime onwe ya, ‘Nke a bụ ụzọ ziri ezi ụmụ mmadụ isi bie ndụ.’ N’ime ọnwa isii, ọ ghọrọ Onyeàmà n’onwe ya ma na-etinye ugbu a ihe kanụ n’oge ya n’ikwusa ozi Bible nke udo.

Ụzọ Chineke Ga-esi Weta Udo

Ọ bụ ezie na ihe atụ ndị a na-emetụ n’obi, ha bụ ihe ndị gbara iche kama ịbụ ihe e ji mara ụwa nke taa. Ọ bụ ezie na usoro ihe dị ugbu a na-achọ udo nanị n’okwu ọnụ, ọ na-agba mkpụrụ nke agha mmiri. Ị̀ ga-achọ ibi n’okporo ámá ebe ndị bi na ya na-etinye pasent 7 ruo 16 nke ihe ha na-akpata n’égbè na nchebe ụlọ? N’ikwu eziokwu, nke ahụ bụ ihe mba dị iche iche nọworo na-eme site ná mmefu nile maka ihe agha n’afọ ndị a. Ọ bụghị ihe ijuanya na amụma Aịsaịa kpughere na ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ya adịghị mgbe ọ ga-akpụgharị mmà agha ya ka ha bụrụ mmà ogè ruo mgbe Chineke ‘doziere ndị nile okwu.’ Olee otú ọ ga-esi mee nke ahụ?

Ụzọ bụ isi maka idozi okwu bụ Alaeze Jehova Chineke. Onye amụma bụ́ Daniel buru amụma na ‘Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie nke a na-agaghị emebi emebi.’ Alaeze nke a, ka o kwukwara, “ga-etipịa alaeze ndị a nile [gọọmenti nile nke ụwa] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Okwu ndị a na-ekpughe na Alaeze Chineke ga-eguzosi nchịkwa ya ike n’isi ụwa nile. Site n’iwepụsị ókèala nile nke mba, Alaeze ahụ ga-eme ka a gharakwa inwe ndị na-amarịta aka. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na ndị ọ ga-achị ga-abụ “ndị mmụta Jehova,” udo ha “ga-abakwa ụba.” (Aịsaịa 54:13) Ka a sịkwa ihe mere Jisọs ji gwa anyị ka anyị kpegara Chineke ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa”!​—⁠Matiu 6:10.

Iwepụ Ihe Mgbochi Nile nke Okpukpe

Chineke ga-ewepụkwa ihe mgbochi nile nke okpukpe n’ebe udo dị. Okpukpe kpatara esemokwu ibu agha nke kasị ogologo n’akụkọ ihe mere eme​—⁠Agha Ntụte, ma ọ bụ “Agha Nsọ” ndị ahụ, nke Pope Urban nke Abụọ malitere na 1095 O.A.a Na narị afọ nke anyị ndị ụkọchukwu abụwo ndị a maara maka ikpali na inweta nkwado maka agha, ọbụna agha ndị nke bụ kpọmkwem ihe na-emetụtaghị okpukpe.

Ka ọ na-ezo aka n’òkè chọọchị ndị bụ ndị Kraịst n’ọnụ keere n’oge Agha Ụwa Mbụ, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Paul Johnson dere: “Ndị ụkọchukwu enweghị ike, n’akụkụ kakwa ukwuu adịghị njikere, idebe okwukwe ndị Kraịst n’ihu ịhụ mba n’anya. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mere ihe ka mfe ma debe Iso Ụzọ Kraịst n’otu ọnọdụ ya na ịnụ ọkụ n’obi maka mba. A gbara ndị soja bụ́ ndị Kraịst nke okpukpe nile ume igburịta onwe ha n’aha Onye Nzọpụta ha.”

Okpukpe emewo ihe ka ukwuu n’ịkpalite agha kama ịzụlite udo. N’ezie, Bible na-egosipụta okpukpe ụgha dị ka “nwanyị na-akwa iko” nke na-eme ihe ndị ọchịchị ụwa chọrọ. (Mkpughe 17:​1, 2) Chineke na-ekwupụta na ọ bụ onye bụ isi a mara ikpe maka ịwụfu ọbara nke ndị nile e gburu n’elu ụwa. (Mkpughe 18:24) N’ihi ya, Jehova Chineke ga-ewepụ ihe mgbochi nke a nye udo ruo mgbe ebighị ebi.​—⁠Mkpughe 18:​4, 5, 8.

Ọbụna site ná mkpọchapụ nke ihe ndị dị otú ahụ na-akpata nkewa dị ka ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe ụgha, ọ dịghị mgbe a ga-enweta udo ma e wepụghị onye ahụ agha kasị egbu ka mmanya​—⁠Setan Ekwensu. Nke ahụ bụ ọrụ ikpeazụ Alaeze Chineke ga-arụ n’usoro ihe omume ya iji weta udo zuru ezu n’elu ụwa. Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-akọwa na a ‘ga-ejide’ Setan “kee ya agbụ” wee “tụba ya n’ime abyss ahụ” ka ọ “ghara iduhie mba nile ọzọ.” Mgbe nke ahụ gasịrị, a ga-ebibi ya kpam kpam.​—⁠Mkpughe 20:​2, 3, 10.

Nkwa Bible nke ọgwụgwụ nye agha abụghị nrọ onye na-enweghị ọrụ. Atụmatụ Jehova Chineke maka udo amaliteworị ọrụ. E guzobeworị Alaeze ya n’eluigwe, ọ dịwokwa njikere imekwu ihe ndị ọzọ iji hụ na e nwere udo n’ụwa nile. Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-akwado gọọmenti eluigwe nke a, amụtawo ibi ndụ n’udo.

Mgbe ahụ n’ụzọ doro anya, anyị nwere ezi ihe ndị mere anyị ga-eji kwere na agha abụghị ihe a na-apụghị izere ezere. N’ebe ọ kakwa mma, anyị pụrụ ilepụ anya gaa n’ụbọchị ahụ dị nso mgbe Jehova ga-eme ka a gharakwa ibu agha ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 46:9) Ọ ga-ahụ na n’isi nso a ga-enwe ụwa nke agha na-adịghị na ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Mgbe ụfọdụ ndị ndú okpukpe n’onwe ha aghọwo ndị dike n’agha. N’Ọgụ Hastings (1066), bishọp ndị Katọlik bụ́ Odo kwadoro aka o tinyere site n’ibu mkpọ́ agha kama iburu mmà agha. O kwuru na ọ bụrụhaala na a wụfughị ọbara, onye nke Chineke pụrụ igbu mmadụ n’adaghị iwu. Narị afọ ise mgbe nke ahụ gasịrị, Cardinal Ximenes n’onwe ya bụ onye ndú ná mwakpo ndị Spain wakporo Ebe Ugwu Africa.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ị pụrụ ibi n’ime ụwa ọhụrụ nke agha na-adịghị na ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya