Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Mba Philippines
AGWAETITI ndị ahụ dị 7,083 nke ebe okpomọkụ bụ́ ndị mejupụtara Republic of the Philippines bụ akụkụ dị n’ebe elu nke usoro ugwu ndị otu akụkụ ya banyere na mmiri.a Ọnụ ọgụgụ 62,000,000 nke ndị bi na Philippines na-enwekwa mmasị ikwu okwu n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ isiokwu ọ bụla. Mmụọ nke a nke ịtụsara ahụ ma soro ndị ọzọ kwurịta okwu na-akpata inwe ala ubi dị mma maka ịgba àmà Alaeze.
Ịgba Àma n’Ụlọ Akwụkwọ
N’agwaetiti Masbate, otu onye na-eto eto nke na-aga akwụkwọ sekọndrị gbaara onye nkụzi ya na ndị klasị ya àmà n’oge a na-ajụ ajụjụ ndị azịza ha na-abụ eziokwu ma ọ bụ ụgha. Ọ na-akọ, sị:
“Okwu e kwuru bụ, ‘Ọ bụrụ na Chineke hụrụ m n’anya, ọ gaghị ewetara m nsogbu ma ọ bụ kwe ka m na-ata ahụhụ.’ Mgbe onye nkụzi m nyochara ihe ndị anyị dere, ọ chọpụtara na mmadụ m nile zara eziokwu ma e wezụga m. Onye nkụzi m nyere m ohere ịkọwara klasị ihe mere m ji zaa na ọ bụ okwu ụgha. Ekwuru m na ọ bụghị Chineke na-ewetara anyị nsogbu, ọ bụ ezie na ọ na-ekwe ka ntaramahụhụ dịrị ma na-enye ohere ka a nwaa anyị. N’iji Bible m mee ihe, bụ́ nke m ji eje akwụkwọ mgbe nile, m sooro ụmụ klasị m tụgharịa uche n’okwu ndị ahụ dị na 1 Jọn 4:8, ‘Chineke bụ ịhụnanya.’ Mgbe m nyesịrị nkọwa m, afọ juru onye nkụzi m, ọ kụtụrụ aka nke nta n’elu table ya ma sị: ‘Ihe Marilou kwuru ziri ezi.’ Ọ bụ nanị m nwetara azịza ziri ezi nye ajụjụ a ma nweta akara mmụta kasị elu.”
Ozi Alaeze ahụ Dị Ebe Nile
Mgbe ọ nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ n’akụkụ ọzọ nke Philippines, otu onye ọsụ ụzọ (onye nkwusa oge nile nke ozi ọma ahụ) zutere otu nne nke mụrụ obere ụmụaka atọ. Nwanyị ahụ gosiri ezi mmasị n’ozi Alaeze ahụ, nke a mekwara ka ọ dị mfe ịmalitere ya omụmụ Bible. Ọ bụ ezie na obi adịghị di ya mma na ọ na-anara ihe ọmụmụ Bible, karịsịa site n’aka Ndịàmà Jehova, ọmụmụ ihe ahụ gara n’ihu.
Nwoke ahụ kpọọrọ ezinụlọ ya gaa n’obodo ukwu ọzọ, na-eche na nke a ga-akwụsị mkpakọrịta nke nwunye ya na Ndịàmà ahụ. Otú ọ dị, ọ dịghị anya tupu ha achọta nwanyị a, o wee maliteghachi ọmụmụ Bible ya. N’ezie, o wutere di ya nke ukwuu. O buuru iwe ya gaa n’ebe ọrụ ya, ebe ọ wụkwasịrị otu onye ahịa ya ọ na-arụziri ụgbọ ala mmetụta ndị ọ na-enwe. Nwoke ahụ amaghị na onye ahịa ya nke a bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.
Onyeàmà ahụ kọwara na ọ ga-abara ezinụlọ ahụ nile uru nke ukwuu ma ọ bụrụ na nwunye ya anọgide n’ọmụmụ Bible ya. Ọ pụrụ ịmalite itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’ụlọ ha kpọmkwem. A tụkwara aro na onye ahụ bụ di pụrụ irite uru site n’ịmụ banyere Alaeze Chineke.
Gịnị si ná mkparịta ụka nke a pụta? Nwunye nwoke ahụ nwetakwuru nnwere onwe ịmụ Bible, nwoke ahụ kpebikwara ịkpọrọ ezinụlọ ya laghachi n’ebe ha bibu. N’ebe ahụ nwanyị ahụ nwere ọganihu ime mmụọ ruo n’ókè nke ịghọ onye nkwusa Alaeze a na-emebeghị baptism. Di ya nabatakwara ọmụmụ Bible, ezinụlọ ahụ nile malitekwara ije nzukọ ndị Kraịst.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee 1994 Calendar of Jehovah’s Witnesses.
[Igbe dị na peeji nke 8]
IHE ỌMỤMA BANYERE MBA AHỤ
Afọ Ije Ozi 1993
ỌNỤ ỌGỤGỤ KASỊ ELU NKE NDỊ NA-AGBA ÀMÀ: 116,576
NKEZI: 1 Onyeàmà maka 549
NDỊ BỊARA EMEME NCHETA: 357,388
NKEZI NKE NDỊ NKWUSA BỤ́ ỌSỤ ỤZỌ: 22,705
NKEZI ỌMỤMỤ BIBLE: 94,370
ỌNỤ ỌGỤGỤ E MERE BAPTISM: 7,559
ỌNỤ ỌGỤGỤ ỌGBAKỌ: 3,332
ALAKA ỤLỌ ỌRỤ: MANILA
[Foto dị na peeji nke 9]
Ịgba àmà n’ọma ahịa na-arụpụta ihe ndị dị mma
[Foto dị na peeji nke 9]
Alaka ụlọ ọrụ Watchtower Society dị na Manila