Jehova Na-achị—Site n’Ọchịchị Chineke
“Jehova ga-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi.”—ABỤ ỌMA 146:10.
1, 2. (a) N’ihi gịnị ka mgbalị mmadụ n’ịchị achị jiworo kụọ afọ n’ala? (b) Olee ụdị gọọmenti nke nanị ya nweworo ihe ịga nke ọma n’ezie?
KEMGBE oge Nimrọd, ụmụ mmadụ anwalewo ụzọ dị iche iche isi chịa usoro ọha mmadụ. E nwewo ọchịchị aka ike, ọchịchị ndị eze, ọchịchị dị n’aka mmadụ ole na ole, na ụdị dị iche iche nke ọchịchị onye kwuo uche ya. Jehova ekwewo ka ha nile dịrị. N’ezie, ebe Chineke bụ Isi Iyi kasị elu nke ịbụ isi nile, n’otu ụzọ, o debere ndị ọchịchị dị iche iche n’ọnọdụ ha a kpaara ókè. (Ndị Rom 13:1) Otú o sina dị, mgbali nile nke mmadụ banyere ịchị ọchịchị akụwo afọ n’ala. Ọ dịghị onye ọchịchị ọ bụla bụ mmadụ nke meworo ka e nwee usoro ọha mmadụ na-adịgide adịgide, nke guzosiri ike, nke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọtụtụ mgbe karị, “mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.”—Eklisiastis 8:9.
2 Nke a ò kwesịrị ịtụ anyị n’anya? N’ezie o kwesịghị! E meghị mmadụ na-ezughị okè ịchị onwe ya. “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Ọ bụ nke ahụ mere na n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ, ọ bụ nanị otu ụdị gọọmenti nweworo ihe ịga nke ọma n’ezie. Olee nke ọ bụ? Ọchịchị Chineke n’okpuru Jehova Chineke. N’asụsụ Grik nke Bible, “ọchịchị Chineke” pụtara ịchị achị [kraʹtos] site n’aka Chineke [the·osʹ]. Olee gọọmenti ka mma a pụrụ inwe karịa nke ahụ Jehova Chineke n’onwe ya na-achị?—Abụ Ọma 146:10.
3. Olee ihe atụ ndị mbụ nke ọchịchị Chineke ndị dịrị n’ụwa?
3 Ọchịchị Chineke chịrị isi n’Iden ruo nwa oge, ruo mgbe Adam na Iv nupụrụ isi megide Jehova. (Jenesis 3:1-6, 23) N’oge Abraham, o yiri ka e nwere ọchịchị Chineke n’obodo Salem, nke nwere Melkizedek dị ka eze na onye nchụàjà. (Jenesis 14:18-20; Ndị Hibru 7:1-3) Otú ọ dị, e guzobere ọchịchị Chineke mbụ nke zuru mba ọnụ n’okpuru Jehova Chineke n’ọzara Saịnaị na narị afọ nke 16 T.O.A. Olee otú nke ahụ si mee? Oleekwa otú gọọmenti nke ọchịchị Chineke ahụ si rụọ ọrụ?
A Mụrụ Ọchịchị Chineke
4. Olee otú Jehova si guzobe mba ọchịchị Chineke nke Israel?
4 Na 1513 T.O.A., Jehova napụtara ndị Israel site n’ịgba ohu n’Ijipt ma bibie ndị agha Fero ndị na-achụ ha n’Osimiri Uhie. Mgbe ahụ O duuru ndị Israel gaa n’Ugwu Saịnaị. Mgbe ha mara ụlọikwuu n’ala ugwu ahụ, Chineke gwara ha site n’ọnụ Mosis, sị: “Unu onwe unu ahụwo ihe M mere ndị Ijipt, ebukwaara m unu n’elu nkù ugo, mee ka unu bịakwute m. Ma ugbu a, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu m n’ezie, ọ bụrụkwa na unu edebe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụkwara m ihe nke aka m karị ndị nile.” Ndị Israel zaghachiri, sị: “Ihe nile Jehova kwuru, anyị ga-eme ya.” (Ọpụpụ 19:4, 5, 8) A gbara ndụ, a mụkwara mba ọchịchị Chineke bụ́ Israel.—Deuterọnọmi 26:18, 19.
5. Olee otú a pụrụ isi kwuo na Jehova chịrị achị n’Israel?
5 Otú ọ dị, n’ụzọ dị aṅaa ka Jehova, onye anya mmadụ na-adịghị ahụ, si chịa Israel? (Ọpụpụ 33:20) Ọ bụ na Jehova nyere iwu na usoro ndị nchụàjà nke mba ahụ. Ndị rubere isi n’iwu ndị ahụ ma fee ofufe dị ka ndokwa ndị sitere n’aka Chineke si dị jeere Onye Ọchịchị Ukwu ahụ, bụ́ Jehova ozi. Tụkwasịkwa, onye isi nchụàjà nwere Ìhè na Izu Okè, nke Jehova Chineke si na ya nye nduzi n’oge ndị e nwere ọnọdụ mberede. (Ọpụpụ 28:29, 30) Ọzọkwa, ndị okenye tozuru etozu bụ ndị nnọchiteanya Jehova n’ọchịchị Chineke ahụ ma hụkwa na e tinyere Iwu Chineke n’ọrụ. Ọ bụrụ na anyị atụlee ihe ndekọ nke ụfọdụ ná ndị ikom ndị a, anyị ga-aghọta n’ụzọ ka mma ihe mere ụmụ mmadụ ga-eji doo onwe ha n’okpuru ịchịisi Chineke.
Ịbụ Isi n’Okpuru Ọchịchị Chineke
6. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ịma aka nye ụmụ mmadụ inwe ike n’ime ọchịchị Chineke, oleekwa ụdị ndị ikom a chọrọ maka ibu ọrụ nke a?
6 Ndị nọ n’ọnọdụ nke ịbụ isi n’Israel nwere ihe ùgwù dị ukwuu, ma ọ bụụrụ ha ihe ịma aka ịnọgide na-enwe ezi nguzo ha. Ha aghaghị ịkpachara anya ka mpako nke onwe ha ghara ịghọ ihe dị mkpa karịa ido aha Jehova nsọ. Okwu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke bụ na “ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị” bụ eziokwu n’ebe ndị Israel nọ dịkwa ka ọ bụ n’ebe ihe fọdụrụ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ nọ. Israel nwere ihe ịga nke ọma nanị mgbe ndị okenye chetara na Israel bụ mba nke ọchịchị Chineke nakwa na ha kwesịrị ime uche Jehova, ọ bụghị nke onwe ha. Nwa oge mgbe e guzobesịrị Israel, nna nwunye Mosis, bụ́ Jetro, kọwara nke ọma ụdị ndị ikom ha kwesịrị ịbụ, ya bụ, “ndị dimkpa, ndị na-atụ egwu Chineke, ndị na-ekwu eziokwu, ndị na-akpọ uru na-ezighị ezi asị.”—Ọpụpụ 18:21.
7. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Mosis ji bụrụ ezi ihe nlereanya nke onye bụrụ isi n’okpuru Jehova Chineke?
7 Onye mbụ nke ji ịbụ isi dị elu mee ihe n’Israel bụ Mosis. Ọ bụ ezi ihe nlereanya nke onye bụrụ isi n’ime ọchịchị Chineke. N’eziokwu, n’otu mgbe ezughị okè mmadụ bilitere. Otú ọ dị, Mosis dabeere n’ebe Jehova nọ oge nile. Mgbe okwu nke a na-ebubeghị ụzọ dozie bilitere, ọ chọrọ nduzi Jehova. (Tụlee Ọnụ Ọgụgụ 15:32-36.) Olee otú Mosis si guzogide ọnwụnwa nke iji ọkwá ya dị elu mee ihe maka otuto nke onwe ya? Ọ dị mma, ọ bụ ezie na o duru mba nke ọtụtụ nde ndị mmadụ mejupụtara, ọ “dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) O nweghị ọchịchọ onwe onye ọ bụla, kama ọ na-eche banyere otuto nke Chineke. (Ọpụpụ 32:7-14) Mosis nwekwara okwukwe siri ike. N’ikwu okwu banyere ya tupu ọ ghọọ onye ndú nke mba ahụ, Pọl onyeozi sịrị: “Ọ nọgidesiri ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya.” (Ndị Hibru 11:27) N’ụzọ doro anya, Mosis echefughị na Jehova bụ Onye Ọchịchị nke mba ahụ n’ezie. (Abụ Ọma 90:1, 2) Lee ihe nlereanya ọma ọ bụụrụ anyị taa!
8. Olee iwu Jehova nyere Joshua, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji kwesị ịrịba ama?
8 Mgbe ilekọta Israel ghọrọ ọrụ dị ukwuu karị maka nanị Mosis, Jehova tinyere mmụọ ya n’ahụ 70 ndị okenye ndị ga-akwado ya n’ikpe mba ahụ ikpe. (Ọnụ Ọgụgụ 11:16-25) N’afọ ndị dị n’ihu obodo ọ bụla ga-enwe ndị okenye nke ya. (Tụlee Deuterọnọmi 19:12; 22:15-18; 25:7-9.) Mgbe Mosis nwụsịrị, Jehova mere Joshua onye ndú nke mba ahụ. Anyị pụrụ ikwu na site n’ihe ùgwù dị otú a, Joshua nwere ọtụtụ ihe ime. Otú o sina dị, Jehova gwara ya na ọ dị otu ihe ọ na-ekwesịghị ịhapụ ime: “Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị, kama ị ga-atụgharị uche n’ime ya ehihie na abalị, ka i wee lezie anya ime dị ka ihe nile si dị nke e deworo n’ime ya.” (Joshua 1:8) Rịba ama na ọ bụrịị ezie na Joshua ejewo ozi ruo ihe karịrị 40 afọ, ọ dị ya mkpa ịnọgide na-agụ Iwu ahụ. Ọ dịkwa anyị mkpa ịmụ Bible ma na-echetaghachiri onwe anyị ihe ndị bụ iwu na ụkpụrụ Jehova—n’agbanyeghị ogologo oge anyị jeworo ozi ma ọ bụ ihe ùgwù ole anyị nwere.—Abụ Ọma 119:111, 112.
9. Gịnị mere n’Israel n’oge ndị ikpe?
9 Usoro nke ndị ikpe sochiri Joshua. N’ụzọ dị mwute, n’oge ha, ndị Israel ‘mere ihe ọjọọ n’anya Jehova’ ugboro ugboro. (Ndị Ikpe 2:11) Banyere oge ndị ikpe ahụ, ihe ndekọ ahụ na-asị: “Na mgbe ahụ eze adịghị n’Israel, onye ọ bụla na-eme ihe ziri ezi n’anya ya.” (Ndị Ikpe 21:25) Onye ọ bụla mere mkpebi nke ya banyere àgwà na ofufe, akụkọ ihe mere eme na-egosikwa na ọtụtụ ndị Israel mere mkpebi ndị dị njọ. Ha dabara n’ife arụsị ma mee mpụ ndị jọgburu onwe ha mgbe ụfọdụ. (Ndị Ikpe 19:25-30) Otú ọ dị, ụfọdụ gosipụtara okwukwe kwesịrị nlereanya.—Ndị Hibru 11:32-38.
10. Olee otú gọọmenti Israel si nwee mgbanwe dị ịrịba ama n’oge Samuel, gịnịkwa dujere na nke a?
10 N’oge onye ikpe nke ikpeazụ, bụ́ Samuel, dị ndụ, Israel nwere ọgba aghara n’ihe banyere gọọmenti. N’ịbụ ndị mba ndị iro gbara ha gburugburu, ndị nke ọ bụla n’ime ha nwere eze na-achị ya, nwere mmetụta n’ahụ ha, ndị Israel tụgharịrị uche na eze dịkwa ha onwe ha mkpa. Ha chefuru na ha adịwo mbụ nwee Eze, na gọọmenti ha bụ nke ọchịchị Chineke. Jehova gwara Samuel, sị: “Ọ bụghị gị ka ha jụworo, kama ọ bụ Mụ ka ha jụworo, ka M ghara ịbụrụ ha eze.” (1 Samuel 8:7) Ihe nlereanya ha na-echetara anyị otú o si dị mfe ụzọ anyị si ele ihe anya n’ime mmụọ ifunahụ anyị wee bụrụ ndị ụwa anyị bi n’ime ya nwere mmetụta n’ahụ ha.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 2:14-16.
11. (a) N’agbanyeghị mgbanwe na gọọmenti, olee otú a pụrụ isi kwuo na Israel nọgidere na-abụ mba ọchịchị Chineke n’okpuru ndị eze? (b) Olee iwu Jehova nyere ndị eze Israel, gịnị bụkwa nzube ya?
11 Otú o sina dị, Jehova kwenyere n’ihe ndị Israel rịọrọ ma họpụta ndị eze abụọ mbụ ha, bụ́ Sọl na Devid. Israel nọgidere na-abụ mba nke ọchịchị Chineke, nke Jehova na-achị. Ka ndị eze ya wee cheta nke a, nke ọ bụla n’ime ha aghaghị inwe akwụkwọ Iwu nke aka ya na ịgụ ya kwa ụbọchị, “ka o wee mụta ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke ya, idebe okwu nile nke iwu a na ụkpụrụ ndị a, ime ha: ka obi ya wee ghara ịdị elu karịa ụmụnne ya.” (Deuterọnọmi 17:19, 20) Ee, Jehova chọrọ ka ndị nwere ike n’usoro ọchịchị ya ghara ibuli onwe ha elu nakwa na omume ha kwesịrị igosipụta Iwu ya.
12. Olee ihe ndekọ ikwesị ntụkwasị obi nke Eze Devid mere?
12 Eze Devid nwere okwukwe pụrụ iche n’ebe Jehova nọ, Chineke gbakwara ndụ na ọ ga-abụ nna nke usoro ndị eze nke ga-adịru ebighị ebi. (2 Samuel 7:16; 1 Ndị Eze 9:5; Abụ Ọma 89:29) Obi umeala nke Devid ji doo onwe ya n’okpuru Jehova kwesịrị nṅomi. Ọ sịrị: “Jehova, n’ike Gị ka eze na-aṅụrị ọṅụ; leekwa otú ọ na-etegharị egwú ọṅụ nke ukwuu ná nzọpụta Gị!” (Abụ Ọma 21:1) Ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ Devid erughị ihe a chọrọ n’ihi adịghị ike nke anụ ahụ, n’ụzọ bụ isi, ọ dabeere n’ike Jehova, ọ bụghị na nke ya.
Omume na Àgwà Ndị Na-ekwekọghị n’Ọchịchị Chineke
13, 14. Gịnị bụ ụfọdụ n’omume na-ekwekọghị n’ọchịchị Chineke nke ndị sochiri Devid mere?
13 Ọ bụghị ndị ndú nile nke Israel yiri Mosis na Devid. Ọtụtụ gosiri enweghị nsọpụrụ jogburu onwe ya maka ndokwa nke ọchịchị Chineke, na-ekwe ka ofufe ụgha dịrị n’Israel. Ọbụna ụfọdụ n’ime ndị ọchịchị kwesịrị ntụkwasị obi mere ihe n’ụzọ na-ekwekọghị n’ọchịchị Chineke n’oge ụfọdụ. Nke dị nnọọ nwute nke ukwuu bụ nke Solomọn, onye e nyere amamihe na akụ na ụba dị ukwuu. (1 Ndị Eze 4:25, 29) Ma, n’ileghara iwu Jehova anya, ọ lụrụ ọtụtụ nwunye ma kwere ka ofufe arụsị bata n’Israel. N’ụzọ ihe àmà dị na ya, ịchịisi Solomọn bụ nke mmegbu n’afọ ndị ikpeazụ ya.—Deuterọnọmi 17:14-17; 1 Ndị Eze 11:1-8; 12:4.
14 Nwa Solomọn bụ́ Rehoboam chere arịrịọ nke ibelata ibu nke ndị ọ na-achị ihu. Kama iji nwayọọ mee ihe banyere ọnọdụ ahụ, o ji àgwà nke ibu iro gosipụta ike ya—ma bụrụ onye ebo 10 n’ime ebo 12 funahụrụ. (2 Ihe Emere 10:4-17) Eze mbụ nke alaeze ebo iri ahụ kewapụrụ ekewapụ bụ Jeroboam. Ná mgbalị iji hụ na ọ dịghị mgbe alaeze ya ga-esonyeghachiri mba nwanne ya, o guzobere ofufe nwa ehi. Nke a gaara eyi nzọụkwụ nke ọgụgụ isi dị na ya n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma o gosiri enweghị nsọpụrụ ma ọlị maka ọchịchị Chineke. (1 Ndị Eze 12:26-30) Ka e mesịrị, n’ọgwụgwụ nke ogologo ndụ nke ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, Eze Esa kwere ka mpako bibie ezi ndụ o biri. O mesoro onye amụma ji ndụmọdụ sitere n’aka Jehova bịakwute ya omume ọjọọ. (2 Ihe Emere 16:7-11) Ee, ọbụna ndị nọworo ogologo oge nwere mkpa maka ndụmọdụ mgbe ụfọdụ.
Njedebe nke Ọchịchị Chineke
15. Mgbe Jisọs nọ n’ụwa, olee otú ndị ndú Juu si daa ada dị ka ndị bụrụ isi n’ọchịchị Chineke?
15 Mgbe Jisọs Kraịst nọ n’ụwa, Israel ka bụ mba nke ọchịchị Chineke. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ná ndị okenye ya nwere ibu ọrụ ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. N’ezie ha ewuliteghị ịdị umeala n’obi nke Mosis gosipụtara. Jisọs zoro aka n’ịrụ arụ ime mmụọ ha mgbe ọ sịrị: “N’oche Mosis ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisi nọdụrụ: ya mere, ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke ha ga-asị unu mee, meenụ ihe ndị a, debekwa ha: ma unu emela dị ka ọrụ nile ha si dị; n’ihi na ha na-ekwu, ma ha adịghị eme.”—Matiu 23:2, 3.
16. Olee otú ndị ndú Juu narị afọ nke mbụ si gosi na ha enweghị nsọpụrụ maka ọchịchị Chineke?
16 Mgbe ha nyefesịrị Jisọs n’aka Pọntịọs Paịlet, ndị ndú Juu gosiri ókè hà aṅaa ha kpafuworo site n’ido onwe ha n’okpuru ọchịchị Chineke. Paịlet nyochara Jisọs ma kwubie na aka ya dị ọcha. N’ịkpọpụta Jisọs n’ihu ndị Juu, Paịlet sịrị: “Lee, Eze unu!” Mgbe ndị Juu tisiri mkpu ike ka e gbuo Jisọs, Paịlet jụrụ, sị: “M̀ [ga-akpọgbu, NW] eze unu?” Ndị isi nchụàjà ahụ zara, sị: “Anyị enweghị Eze ma ọ bụghị Siza.” (Jọn 19:14, 15) Ha matara Siza dị ka eze, ọ bụghị Jisọs, bụ́ ‘Onye ahụ nke bịara n’aha Onyenwe anyị’!—Matiu 21:9.
17. N’ihi gịnị ka Israel anụ ahụ ji kwụsị ịbụ mba nke ọchịchị Chineke?
17 N’ịjụ Jisọs, ndị Juu jụrụ ọchịchị Chineke, n’ihi na ọ na-aga ịbụ onye bụ isi ná ndokwa ọdịnihu nke ọchịchị Chineke. Jisọs bụ nwa nwoke sitere n’ezinụlọ eze nke Devid, onye ga-achị ruo ebighị ebi. (Aịsaịa 9:6, 7; Luk 1:33; 3:23, 31) Otú a, Israel anụ ahụ kwụsịrị ịbụ mba nke Chineke họpụtara.—Ndị Rom 9:31-33.
Ọchịchị Chineke nke Dị Ọhụrụ
18. Olee usoro ọchịchị ọhụrụ nke Chineke a mụpụtara na narị afọ mbụ? Kọwaa.
18 Otú ọ dị, ọjụjụ Chineke jụrụ Israel anụ ahụ abụghị njedebe nke ọchịchị Chineke n’ụwa. Site n’aka Jisọs Kraịst, Jehova guzobere ọchịchị Chineke nke dị ọhụrụ. Nke a bụ ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ, nke bụ mba ọhụrụ n’ezie. (1 Pita 2:9) Pọl onyeozi kpọrọ ya “Israel nke Chineke,” n’ikpeazụkwa, ndị òtù ya sitere “n’ebo nile ọ bụla, na asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla, na mba nile ọ bụla.” (Ndị Galetia 6:16; Mkpughe 5:9, 10) Ọ bụ ezie na ha nọ n’okpuru gọọmenti mmadụ ndị na-achị isi n’ebe ha bi, ọ bụ Chineke n’ezie na-achị ndị òtù nke usoro ọchịchị ọhụrụ nke a nke Chineke. (1 Pita 2:13, 14, 17) Nwa oge mgbe a mụpụtasịrị ọchịchị Chineke ahụ dị ọhụrụ, ndị ọchịchị nke Israel anụ ahụ gbara mbọ ịrụgide ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ka ha kwụsị irube isi n’iwu nke Jisọs nyeworo ha. Gịnị bụ azịza ha? “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) N’ezie, ọ bụ inwe echiche nke ọchịchị Chineke!
19. N’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ịkpọ ọgbakọ narị afọ mbụ nke ndị Kraịst nke ọchịchị Chineke?
19 Ma olee otú ọchịchị Chineke ahụ dị ọhụrụ si rụọ ọrụ? Ọ dị mma, e nwere Eze, bụ́ Jisọs Kraịst, onye na-anọchite anya Onye Ọchịchị Ukwu ahụ, bụ́ Jehova Chineke. (Ndị Kọlọsi 1:13) Ọ bụ ezie na Eze ahụ bụ onye a na-adịghị ahụ anya nke bi n’eluigwe, ọchịchị ya bụ nke dị adị n’ezie nye ndị ọ na-achị, okwu ya chịkwara ndụ ha. Banyere nlekọta nke a na-ahụ anya, a họpụtara ndị okenye toruru etoru n’ụzọ ime mmụọ. Na Jerusalem ìgwè ndị ikom dị otú a rụrụ ọrụ dị ka òtù na-achị isi. Ndị nọchitere anya òtù ahụ bụ ndị okenye na-ejegharị ejegharị, dị ka Pọl, Timoti, na Taịtọs. Òtù ndị okenye lekọtakwara ọgbakọ nke ọ bụla. (Taịtọs 1:5) Mgbe nsogbu siri ike bilitere, ndị okenye ahụ gakwuuru òtù na-achị isi ma ọ bụ otu n’ime ndị nnọchiteanya ya, dị ka Pọl. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 15:2; 1 Ndị Kọrint 7:1; 8:1; 12:1.) Ọzọkwa, onye ọ bụla n’ọgbakọ keere òkè n’ịnakwere ọchịchị Chineke. Onye ọ bụla nwere ibu ọrụ n’ihu Jehova itinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ná ndụ ya.—Ndị Rom 14:4, 12.
20. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ọchịchị Chineke n’oge ndị sochiri oge ndị ozi?
20 Pọl dọrọ aka ná ntị na mgbe ndị ozi nwụsịrị, ndapụ n’ezi ofufe ga-ebilite, nke bụ kpọmkwem ihe merenụ. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3) Ka oge na-aga, ọnụ ọgụgụ nke ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst rịrị elu ruo ọtụtụ nde, ruokwa ọtụtụ narị nde. Ha guzobere ụdị dị iche iche nke ọchịchị chọọchị, dị ka nke usoro ndị isi, ọchịchị ìgwè ndị ụkọchukwu, na ọchịchị ọgbakọ dum. Otú ọ dị, ma omume ma nkwenkwe nke chọọchị ndị a adịghị nke na-egosipụta ịchịisi nke Jehova. Ha abụghị ndị ọchịchị Chineke na-achị!
21, 22. (a) Olee otú Jehova siworo weghachite ọchịchị Chineke n’oge ọgwụgwụ? (b) Olee ajụjụ metụtara ọchịchị Chineke ndị a na-aga ịza?
21 N’oge ọgwụgwụ usoro ihe dị ugbu a, a na-aga inwe nkewa nke ezi ndị Kraịst pụọ ná ndị Kraịst ụgha. (Matiu 13:37-43) Nke a mere na 1919, bụ́ afọ dị oké mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke ọchịchị Chineke. N’oge ahụ amụma dị ebube nke Aịsaịa 66:8 mezuru: “Ònye hụworo ihe dị ka ndị a? Ime ala [ọ̀] ga-eme ya n’otu ụbọchị? à ga-amụ mba n’otu mgbe?” Azịza nke ajụjụ ndị ahụ bụ ee nke dara ụda! Na 1919 ọgbakọ ndị Kraịst dịrị adị ọzọ dị ka “mba” nke dịịrị onwe ya. N’ezie, a mụrụ “ala” nke ọchịchị Chineke dị ka a ga-asị na ọ bụ n’otu ụbọchị! Ka oge ọgwụgwụ na-aga n’ihu, e dozigharịrị nhazi nke mba ọhụrụ nke a iji weta ya nso ruo otú o kwere mee n’ihe e nwere na narị afọ mbụ. (Aịsaịa 60:17) Ma ọ bụ nke ọchịchị Chineke na-achị mgbe nile. N’omume na ihe e kwere, ọ na-egosipụta mgbe nile iwu na ụkpụrụ ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ site n’ike mmụọ Chineke. Ọ na-edokwa onwe ya mgbe nile n’okpuru Eze ahụ nọkwasịworo n’ocheeze, bụ́ Jisọs Kraịst.—Abụ Ọma 45:17; 72:1, 2.
22 Ì so usoro ọchịchị nke a nke Chineke na-akpakọrịta? Ì nwere ọnọdụ nke ịbụ isi n’ime ya? Ya bụrụ otú ahụ, ị̀ maara ihe ọ pụtara bụ́ ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ọchịchị Chineke? Ị̀ maara ọnyà ndị a ga-ezere? A ga-atụle ajụjụ abụọ ndị ikpeazụ ahụ n’isiokwu nke na-esonụ.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Gịnị bụ ọchịchị Chineke?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka Israel si bụrụ mba nke ọchịchị Chineke?
◻ Olee ndokwa Jehova mere iji chetara ndị eze ahụ na Israel bụ mba nke ọchịchị Chineke?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka ọgbakọ ndị Kraịst si bụrụ nke ọchịchị Chineke, oleekwa otú e si hazie ya?
◻ Olee nzukọ ọchịchị Chineke nke e guzobeworo n’oge anyị?
[Foto dị na peeji nke 12]
N’ihu Pọntịọs Paịlet, ndị ọchịchị Juu nakweere Siza kama Eze Jehova nke e ji ụkpụrụ ọchịchị Chineke họpụta