Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 9/1 p. 13-18
  • Nọrọ Ọchịchị Chineke Nso

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọrọ Ọchịchị Chineke Nso
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Ezigbo Ọchịchị Chineke?
  • Nzukọ Ọchịchị Chineke
  • Otú Ọchịchị Chineke Si Ele Ịchịisi Ụwa Anya
  • Bute Otuto Chineke Ụzọ
  • “Bụrụnụ Ndị Na-eṅomi Chineke”
  • Jehova Na-achị—Site n’Ọchịchị Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ndị Ọzụzụ Atụrụ na Ụmụ Atụrụ n’Ime Ọchịchị Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Iso Onye Okike Anyị Dị Ebube Na-azụ Atụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ụzọ Ndị Kraịst Si Ele Ịbụ Isi Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 9/1 p. 13-18

Nọrọ Ọchịchị Chineke Nso

“Jehova bụ onyeikpe anyị, Jehova bụ onye na-enye anyị iwu, Jehova bụ eze anyị.”—AỊSAỊA 33:22.

1. N’ihi gịnị ka ọchịchị ji bụrụ okwu na-echegbu ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ?

OKWU banyere ọchịchị na-echegbu mmadụ nile nke ukwuu. Ọchịchị dị mma na-eweta udo na ọganihu. Bible na-asị: “Eze na-eji ikpe ziri ezi eme ka ala ya guzo.” (Ilu 29:4) N’aka nke ọzọ, ọchịchị ọjọọ na-eduje n’ikpe na-ezighị ezi, nrụrụ aka, na mmegbu. “Mgbe onye na-emebi iwu na-achị achị, ndị ala ya na-eze ume.” (Ilu 29:2) N’akụkọ ihe mere eme nile, ụmụ mmadụ anwalewo ọtụtụ ụdị ọchịchị, n’ụzọ dịkwa mwute, ọtụtụ mgbe ha ‘ezewo ume’ n’ihi mmegbu nke ndị na-achị ha na-emegbu ha. (Eklisiastis 8:9) Ò nwere ụdị ọchịchị nke ga-ewetaliri ndị ọ na-achị afọ ojuju na-adịgide adịgide?

2. N’ihi gịnị ka “ọchịchị Chineke” ji bụrụ nkọwa dị mma nke ọchịchị nke Israel oge ochie?

2 Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus kpọtụrụ uche n’otu ụdị ọchịchị pụrụ iche mgbe o dere, sị: “Ụfọdụ ndị mmadụ etinyewo ikike ọchịchị kasị ukwuu n’aka ọchịchị ndị eze, ndị ọzọ etinyewo ya n’aka ọchịchị mmadụ ole na ole na-achị, ndị ọzọkwa n’aka ọha mmadụ. Otú ọ dị, omeiwu anyị [bụ́ Mosis], enweghị mmasị n’ụdị ọchịchị ndị a, kama o nyere ụkpụrụ iwu ya ọdịdị—ọ bụrụ na e jiri okwu a na-adịghị ejikebe eme ihe kwuo ya—nke a pụrụ ịkpọ ‘ọchịchị Chineke,’ na-etinye ọbụbụeze na ikike nile n’aka Chineke.” (Against Apion, II, 164-165) Dị ka Concise Oxford Dictionary si kọwaa ya, ọchịchị Chineke pụtara “ụdị gọọmentị nke Chineke.” Okwu ahụ apụtaghị na Bible, ma ọ na-akọwa ọchịchị nke Israel oge ochie nke ọma. Ọ bụ ezie na ụmụ Israel bịara nwee eze a na-ahụ anya, onye na-achị ha n’ezie bụ Jehova. Onye amụma bụ́ onye Israel bụ́ Aịsaịa sịrị: “Jehova bụ onyeikpe anyị, Jehova bụ onye na-enye anyị iwu, Jehova bụ eze anyị.”—Aịsaịa 33:22.

Gịnị Bụ Ezigbo Ọchịchị Chineke?

3, 4. (a) Gịnị bụ ezigbo ọchịchị Chineke? (b) Otu ụbọchị n’isi nso, olee ngọzi ọchịchị Chineke ga-ewetara ihe nile a kpọrọ mmadụ?

3 Kemgbe Josephus chepụtara okwu ahụ, a kọwawo ọtụtụ obodo dị ka ọchịchị Chineke. Ụfọdụ n’ime ha yiri ndị na-adịghị ekwe ibe nọrọ, ndị na-anụbigara ihe ọkụ n’obi ókè, na ndị na-emegbu mmadụ n’ụzọ obi ọjọọ. Hà bụ ezi ọchịchị Chineke? Ọ bụghị n’echiche Josephus si jiri okwu ahụ mee ihe. Nsogbu bụ na a gbasapụwo ihe “ọchịchị Chineke” pụtara. Akwụkwọ bụ́ World Book Encyclopedia na-akọwa ya dị ka “ụdị gọọmentị ebe onye nchụàjà ma ọ bụ ndị nchụàjà na-achị obodo, nakwa ebe ndị so n’òtù ndị nchụàjà nwere ikike n’okwu ndị metụtara ọchịchị na okpukpe.” Otú ọ dị, ezigbo ọchịchị Chineke abụghị gọọmentị ndị nchụàjà na-achị. Ọ bụ n’ezie ịchịisi Chineke, gọọmentị nke Onye Okike nke eluigwe na ala, bụ́ Jehova Chineke.

4 Otu ụbọchị n’isi nso, ụwa nile ga-anọ n’okpuru ọchịchị Chineke, leekwa ngọzi nke ahụ ga-abụ! “Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara [ihe a kpọrọ mmadụ], bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) Ọ dịghị ịchịisi ndị nchụàjà nke sitere n’aka ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ iweta ụdị obi ụtọ ahụ. Nanị ịchịisi Chineke pụrụ. N’ihi ya, ezi ndị Kraịst adịghị anwa ịkpọsa ọchịchị Chineke site n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha ji ndidi na-echere ka Chineke guzobe ọchịchị ya ga-ezu ụwa ọnụ n’oge nke ya na n’ụzọ nke ya.—Daniel 2:44.

5. Ebee ka ezigbo ọchịchị Chineke na-arụ ọrụ taa, oleekwa ajụjụ ndị a na-ajụ banyere ya?

5 Otú ọ dị, ka ọ dịgodi ugbu a, ezi ọchịchị Chineke na-arụ ọrụ. N’ebee? N’etiti ndị ji obi ha doo onwe ha n’okpuru ịchịisi Chineke ma na-arụkọ ọrụ ọnụ ime uche ya. A chịkọtawo ndị dị otú ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi dị ka “mba” ime mmụọ zuru ụwa ọnụ ‘n’ala’ ime mmụọ ya. Ha bụ ihe fọdụrụnụ nke “Israel nke Chineke” nakwa ihe karịrị nde ndị enyi ha ise na ọkara bụ́ ndị Kraịst. (Aịsaịa 66:8; Ndị Galetia 6:16) Ndị a nọ n’okpuru Jisọs Kraịst, bụ́ Eze eluigwe onye Jehova Chineke, bụ́ “Eze nke mgbe nile,” chiri eze. (1 Timoti 1:17; Mkpughe 11:15) N’ụzọ dị aṅaa ka nzukọ a si bụrụ nke ọchịchị Chineke? Olee otú ndị òtù ya si na-ele ikike nke ndị ọchịchị ụwa anya? Oleekwa otú ụmụ mmadụ nwere ikike n’ime ógbè ime mmụọ ha na-esi ejigide ụkpụrụ nke ọchịchị Chineke?

Nzukọ Ọchịchị Chineke

6. Olee otú Chineke pụrụ isi achị nzukọ mmadụ, nke a na-ahụ anya?

6 Olee otú Jehova, onye nọ n’eluigwe a na-adịghị ahụ anya pụrụ isi na-achị nzukọ mmadụ? (Abụ Ọma 103:19) Ọ pụrụ ikwe omume n’ihi na ndị nọ n’ime ya na-agbaso ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị.” (Ilu 2:6; 3:5) Ha na-ekwe ka Chineke na-achị ha ka ha na-edebe “iwu Kraịst” ma na-etinye ụkpụrụ Bible ndị e dere n’ike mmụọ nsọ n’ọrụ ná ndụ ha na-ebi kwa ụbọchị. (Ndị Galetia 6:2; 1 Ndị Kọrint 9:21; 2 Timoti 3:16; lee Matiu 5:22, 28, 39; 6:24, 33; 7:12, 21.) Iji mee nke a, ha aghaghị ịbụ ndị na-amụ Bible. (Abụ Ọma 1:1-3) Dị ka ndị Beria ahụ ‘dị mma n’obi’ nke oge ochie, ha adịghị agbaso ụmụ mmadụ kama ha na-anọgide na-atụleghachi n’ime Bible ihe ndị ha na-amụta. (Ọrụ 17:10, 11; Abụ Ọma 119:33-36) Ha na-ekpe ekpere dị ka ọbụ abụ ahụ, sị: “Zi m ịdị mma nke ezi uche na ihe ọmụma; n’ihi na ọ bụ n’ihe nile I nyere n’iwu ka m kwereworo.”—Abụ Ọma 119:66.

7. Gịnị bụ usoro nke nlekọta n’ọchịchị Chineke?

7 Ná nzukọ ọ bụla, a ga-enwerịrị ndị nwere ikike ma ọ bụ na-enye nduzi. A gụpụghị Ndịàmà Jehova, ha na-agbasokwa usoro ikike nke Pọl onyeozi setịpụrụ: “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:3) N’ikwekọ na nke a, nanị ndị ikom ruru eru na-eje ozi dị ka ndị okenye n’ọgbakọ. Ọ bụkwa ezie na Jisọs—bụ́ “isi nke nwoke ọ bụla”—nọ n’eluigwe, a ka nwere ‘ihe fọdụrụ’ nke ụmụnna ya e tere mmanụ n’ụwa, bụ́ ndị nwere olileanya nke isoro ya chịa n’eluigwe. (Mkpughe 12:17; 20:6) Ndị a mejupụtara òtù “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” Ndị Kraịst na-egosi na ha na-edo onwe ha n’okpuru Jisọs, sikwa otú a na-edo onwe ha n’okpuru isi Jisọs, bụ́ Jehova, site n’ịnakwere nlekọta nke “ohu” ahụ. (Matiu 24:45-47; 25:40) N’ụzọ dị otú a, ọchịchị Chineke dị n’usoro. “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama Ọ bụ Chineke nke udo.”—1 Ndị Kọrint 14:33.

8. Olee otú ndị Kraịst bụ́ ndị okenye si akwado ụkpụrụ ọchịchị Chineke?

8 Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-akwado ụkpụrụ ọchịchị Chineke n’ihi na ha na-aghọta na ha ga-aza Jehova ajụjụ maka otú ha si jiri ikike ha a kpaara ókè mee ihe. (Ndị Hibru 13:17) N’imekwa mkpebi, ha na-adabere n’amamihe Chineke, ọ bụghị nke onwe ha. Na nke a, ha na-agbaso ihe nlereanya Jisọs. Ọ bụ nwoke kasị nwee amamihe nke dịtụworo ndụ. (Matiu 12:42) Ka o sina dị, ọ gwara ndị Juu, sị: “Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla n’Onwe ya, ma ọ bụghị ihe Ọ hụrụ na Nna Ya na-eme.” (Jọn 5:19) Ndị okenye nwekwara otu ụdị àgwà ahụ Eze Devid nwere. O nwere ikike dị ukwuu n’ọchịchị Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ chọrọ ịgbaso ụzọ Jehova, ọ bụghị nke ya. O kpere ekpere, sị: “Jehova, zi m ụzọ Gị; durukwa m n’okporo ụzọ dị larịị.”—Abụ Ọma 27:11.

9. Banyere olileanya na ihe ùgwù ije ozi dị iche iche n’ime ọchịchị Chineke, olee echiche guzoziri eguzozi nke ndị Kraịst raara onwe ha nye nwere?

9 Ụfọdụ ajụwo ma o ziri ezi na nanị ndị ikom ruru eru nwere ikike n’ọgbakọ ma ọ bụ na ụfọdụ nwere olileanya eluigwe ebe ndị ọzọ nwere olileanya elu ala. (Abụ Ọma 37:29; Ndị Filipaị 3:20) Otú ọ dị, ndị Kraịst raara onwe ha nye na-aghọta na e setịpụrụ ndokwa ndị a n’Okwu Chineke. Ha bụ nke ọchịchị Chineke. Ọ bụrụ na a gbaghaa ha, ọ na-abụkarị ndị na-amaghị ụkpụrụ Bible na-agbagha ha. E wezụga nke ahụ, ndị Kraịst maara na ndị ikom na ndị inyom hà nhata n’anya Jehova n’ihe banyere nzọpụta. (Ndị Galetia 3:28) Nye ezi ndị Kraịst, ịbụ ndị na-efe Ọkaaka nke eluigwe na ala bụ ihe ùgwù kasịnụ a pụrụ inwe, obi dịkwa ha ụtọ ịrụ ọrụ ọ bụla nke Jehova setịpụụrụ ha. (Abụ Ọma 31:23; 84:10; 1 Ndị Kọrint 12:12, 13, 18) Ọzọkwa, ndụ ebighị ebi, ma ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ̀ bụ na paradaịs elu ala, bụ olileanya dị ebube n’ezie.

10. (a) Olee àgwà ọma Jonatan gosipụtara? (b) Olee otú ndị Kraịst taa si na-egosi àgwà yiri nke Jonatan?

10 N’ihi ya, Ndịàmà Jehova yiri Jonatan, bụ́ nwa na-atụ egwu Chineke nke Eze Sọl. O yikarịrị ka Jonatan ọ gaara abụ nnọọ ezigbo eze. Otú ọ dị, n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi nke Sọl, Jehova họọrọ Devid ịbụ eze nke abụọ nke Israel. Jonatan ò nwere obi ilu n’ihi nke a? Ee e. Ọ ghọrọ ezi enyi Devid ma ọbụna chebe ya pụọ n’aka Sọl. (1 Samuel 18:1; 20:1-42) N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị nwere olileanya elu ala adịghị ekwoso ndị nwere olileanya eluigwe ekworo. Ezi ndị Kraịst adịghịkwa ekwoso ndị nwere ikike ọchịchị Chineke n’ọgbakọ ekworo. Kama nke ahụ, ha ‘na-ewere ịhụnanya sọpụrụ ha gabiga ókè nke ukwuu hie nne,’ na-aja ọrụ ha na-arụsi ike maka ụmụnna nwoke na nwanyị ime mmụọ ha mma.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:12, 13.

Otú Ọchịchị Chineke Si Ele Ịchịisi Ụwa Anya

11. Olee otú ndị Kraịst na-edo onwe ha n’okpuru ọchịchị Chineke na-esi ele ndị ọchịchị ụwa anya?

11 Ọ bụrụ na Ndịàmà Jehova nọ n’okpuru ọchịchị Chineke, olee otú ha si ele ndị na-achị mba dị iche iche anya? Jisọs sịrị na ụmụazụ ya “esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:16) Otú ọ dị, ndị Kraịst na-aghọta ụgwọ ha ji “Siza,” bụ́ ndị ọchịchị ụwa. Jisọs sịrị na ha kwesịrị ‘inyeghachi Siza ihe nke Siza, nyeghachikwa Chineke ihe nke Chineke.’ (Matiu 22:21) Dị ka Bible si kwuo, ọchịchị mmadụ “bụkwa ndị Chineke doworo.” Jehova, bụ́ Isi Iyi nke ikike nile, na-ekwe ka ọchịchị dị iche iche dịrị, ọ na-atụkwa ha anya imere ndị ha na-achị ihe ọma. Mgbe ha mere otú ahụ, ha bụ ndị “na-ejere Chineke ozi.” Ndị Kraịst nọ n’okpuru ọchịchị nke mba ha bi na ya “n’ihi akọ na uche [ha].” (Ndị Rom 13:1-7) Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọchịchị achọọ ihe megidere iwu Chineke, onye Kraịst ahụ “aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

12. Mgbe ndị ọchịchị na-akpagbu ndị Kraịst, ihe nlereanya ole ndị ka ha na-agbaso?

12 Gịnị banyere mgbe ndị ọchịchị na-akpagbu ezi ndị Kraịst? Mgbe ahụ ha na-agbaso ihe nlereanya nke ndị Kraịst oge mbụ, bụ́ ndị diri oge oké mkpagbu. (Ọrụ 8:1; 13:50) Ule ndị a nke okwukwe bụ ihe a tụrụ anya ha, ebe Jisọs dọworo aka ná ntị na ha ga-abịa. (Matiu 5:10-12; Mak 4:17) Ma, ndị Kraịst oge mbụ ahụ emegwaraghị ndị na-akpagbu ha; okwukwe ha adaghịkwa n’okpuru nrụgide. Kama nke ahụ, ha gbasoro ihe nlereanya Jisọs: “Onye, mgbe a na-ekwutọ Ya, Ọ dịghị ekwutọghachi ọzọ; mgbe Ọ na-ahụ ahụhụ, Ọ dịghị aba mba; kama Ọ raara onwe ya nye n’aka Onye ahụ Nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” (1 Pita 2:21-23) Ee, ụkpụrụ ndị Kraịst meriri mkpasu iwe nke Setan.—Ndị Rom 12:21.

13. Olee otú Ndịàmà Jehova siworo meghachi omume ná mkpagbu na mkpọsa ndị e jiworo kwutọọ ha?

13 Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Na narị afọ a, Ndịàmà Jehova atawo ahụhụ nke ukwuu n’aka ndị ọchịchị aka ike—dị nnọọ ka Jisọs buru n’amụma. (Matiu 24:9, 13) N’ụfọdụ ala, ndị na-anwa ịrụgide ndị ọchịchị ka ha mee ihe megide ezi ndị Kraịst a agbasawo ụgha na ihe ndị na-ezighị ezi banyere ha. Ma, n’agbanyeghị “nhota ọjọọ” dị otú ahụ, site n’àgwà ọma ha Ndịàmà na-eme ka ndị mmadụ mara ha dị ka ndị na-ejere Chineke ozi. (2 Ndị Kọrint 6:4, 8) Mgbe o kwere omume, ha na-ewere okwu ahụ gaa n’aka ndị ọchịchị nakwa n’ụlọikpe nke mba ahụ ka ha wee gosi na ha emeghị ihe ọjọọ. Ha na-eji ụzọ ọ bụla megheere ha agọpụrụ ozi ọma ahụ n’ihu ọha. (Ndị Filipaị 1:7) Ma mgbe ha mere ihe nile ha nwere ike ya n’ụzọ kwekọrọ n’iwu, ha na-ahapụrụ Jehova okwu ahụ. (Abụ Ọma 5:8-12; Ilu 20:22) Ọ dịrị mkpa, dị ka ndị Kraịst oge mbụ, egwu adịghị atụ ha ịta ahụhụ n’ihi ezi omume.—1 Pita 3:14-17; 4:12-14, 16.

Bute Otuto Chineke Ụzọ

14, 15. (a) Gịnị bụ ihe mbụ nye ndị na-akwado ụkpụrụ nke ọchịchị Chineke? (b) N’oge dị aṅaa ka Solomọn setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke ịdị umeala n’obi n’ọnọdụ nlekọta ya?

14 Mgbe Jisọs kụziiri ụmụazụ ya otú e si ekpe ekpere, ihe mbụ o bu ụzọ zoo aka na ya bụ ido aha Jehova nsọ. (Matiu 6:9) N’ikwekọ na nke a, ndị na-ebi n’okpuru ọchịchị Chineke na-achọ otuto Chineke, ọ bụghị nke ha. (Abụ Ọma 29:1, 2) Bible na-akọ na na narị afọ mbụ, nke a bụ ihe mkpọbi ụkwụ nye ụfọdụ ndị jụrụ ịgbaso Jisọs n’ihi na “ha hụrụ otuto mmadụ n’anya,” ọ na-amasị ha ka mmadụ too ha. (Jọn 12:42, 43) N’ezie, ọ na-achọ ịdị umeala n’obi iji mee ka Jehova bute ịdị mkpa onwe onye ụzọ.

15 Solomọn gosiri mmụọ ziri ezi n’akụkụ a. Jiri okwu ya ná nraranye nke ụlọ nsọ ahụ dị ebube nke o wuworo tụnyere nke Nebukadneza banyere ọrụ owuwu ihe ya. Site na nganga gabigara ókè, Nebukadneza turu ọnụ, sị: “Ọ́ bụghị nke a bụ Babilọn ukwu a, nke mụ onwe m wuworo ịbụ ụlọ alaeze, site n’ike nke akụ̀ m na n’ihi ebube nke ịma mma m?” (Daniel 4:30) N’ụzọ dị iche na nke ahụ, Solomọn ji obi dị ala wetuo nnọọ ihe ọ rụzuru ala, na-asị: “Ọ̀ bụ ezie na Chineke ga-ebinyere mmadụ n’elu ụwa? lee, eluigwe na eluigwe nke eluigwe agaghị anagide Gị; ụlọ a nke m wuworo, ọ̀ ga-esikwa aṅaa ruo ịnagide Gị?” (2 Ihe E Mere 6:14, 15, 18; Abụ Ọma 127:1) Solomọn ebulighị onwe ya elu. Ọ maara na ya bụ nanị onye nnọchiteanya nke Jehova ma dee, sị: “Nganga bịa, nlelị abịakwa: ma n’ebe ndị dị umeala n’obi nọ ka amamihe dị.”—Ilu 11:2.

16. Olee otú ndị okenye siworo bụrụ ezi ngọzi site n’ịghara ito onwe ha?

16 N’otu aka ahụ, ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ebuli Jehova elu, ọ bụghị onwe ha. Ha na-agbaso ndụmọdụ Pita: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eje ozi, ya jee dị ka o sitere n’ike ahụ Chineke na-enyezu: ka e wee nye Chineke otuto n’ihe nile site n’aka Jisọs Kraịst.” (1 Pita 4:11) Pọl onyeozi kọwara ‘ọnọdụ onye nlekọta,’ ọ bụghị dị ka ọnọdụ dị mkpa nke ịbụ onye a ma ama, kama dị ka “ọrụ ọma.” (1 Timoti 3:1) A na-ahọpụta ndị okenye ije ozi, ọ bụghị ịchị ọchịchị. Ha bụ ndị nkụzi na ndị na-azụ ìgwè atụrụ Chineke. (Ọrụ 20:28; Jemes 3:1) Ndị okenye dị obi umeala, na-achụ onwe ha n’àjà bụ ezigbo ngọzi nye ọgbakọ. (1 Pita 5:2, 3) “Na-asọpụrụkwanụ ndị dị otú a,” ma kelee Jehova na o nyewo ọtụtụ ndị okenye ruru eru ịkwado ọchịchị Chineke ná “mgbe ikpeazụ” ndị a.—Ndị Filipaị 2:29; 2 Timoti 3:1.

“Bụrụnụ Ndị Na-eṅomi Chineke”

17. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị nọ n’okpuru ọchịchị Chineke si eṅomi Chineke?

17 Pọl onyeozi gbara ume, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Ndị Efesọs 5:1) Ndị na-edo onwe ha n’okpuru ọchịchị Chineke na-agbalị iyi Chineke ruo n’ókè o kwere ụmụ mmadụ na-ezughị okè omume. Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu banyere Jehova, sị: “Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:3, 4) Iji ṅomie Chineke n’akụkụ a, ndị Kraịst na-achọ ikwesị ntụkwasị obi, ezi omume, na echiche ikpe ziri ezi guzoziri eguzozi. (Maịka 6:8; 1 Ndị Tesalọnaịka 3:6; 1 Jọn 3:7) Ha na-ezere ọtụtụ ihe nke ụwa na-anakwere, dị ka omume rụrụ arụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu. (Ndị Efesọs 5:5) N’ihi na ndị ohu Jehova na-agbaso ụkpụrụ Chineke, ọ bụghị nke mmadụ, nzukọ ya bụ nke ọchịchị Chineke, nke dị ọcha, na nke dị mma.

18. Gịnị bụ àgwà bụ isi nke Chineke, oleekwa otú ndị Kraịst si egosipụta àgwà a?

18 Àgwà bụ isi nke Jehova Chineke bụ ịhụnanya. “Chineke bụ ịhụnanya,” ka Jọn onyeozi na-ekwu. (1 Jọn 4:8) Ebe ọ bụ na ọchịchị Chineke pụtara ịchịisi Ya, ọ pụtara ịchịisi site n’ịhụnanya. Jisọs sịrị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Nzukọ ọchịchị Chineke egosipụtawo ịhụnanya dị ịrịba ama na mgbe ikpeazụ ndị a siri ike. N’oge esemokwu kpatara mgbuchapụ ahụ e nwere n’Africa, Ndịàmà Jehova gosiri mmadụ nile ịhụnanya, n’agbanyeghị agbụrụ ha sitere. N’oge a na-alụ agha n’ebe bụbu Yugoslavia, Ndịàmà Jehova sitere n’akụkụ nile nyeere ibe ha aka, ebe òtù okpukpe ndị ọzọ keere òkè n’ihe ahụ a kpọrọ mkpochapụ agbụrụ. N’otu n’otu, Ndịàmà Jehova na-agbalị idebe ndụmọdụ Pọl: “Ka e wepụ ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọọ nile, n’etiti unu: nwerịtanụ obiọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, dị ka Chineke werekwaara amara gbaghara unu n’ime Kraịst.”—Ndị Efesọs 4:31, 32.

19. Olee ngọzi ndị na-abịa ma ugbu a ma n’ọdịnihu maka ndị na-edo onwe ha n’okpuru ọchịchị Chineke?

19 Ndị na-edo onwe ha n’okpuru ọchịchị Chineke na-enweta ngọzi dị ukwuu. Ha na-enwe udo n’ebe Chineke na ndị Kraịst ibe ha nọ. (Ndị Hibru 12:14; Jemes 3:17) Ha nwere nzube ná ndụ. (Eklisiastis 12:13) Ha nwere nchebe ime mmụọ na olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu. (Abụ Ọma 59:9) N’ezie, ha nọ na-edetụ ire ihe ọ ga-adị ka ya mgbe ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-anọ n’okpuru ịchịisi Chineke. Mgbe ahụ, Bible na-asị, “ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:9) Lee oge dị ebube nke ahụ ga-abụ! Ka anyị nile mee ka ọnọdụ anyị na Paradaịs ọdịnihu ahụ bụrụ nke e ji n’aka site n’ịnọ ọchịchị Chineke nso ugbu a.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Gịnị bụ ezigbo ọchịchị Chineke, oleekwa ebe a na-ahụ ya taa?

◻ Olee otú ụmụ mmadụ na-esi edo onwe ha n’okpuru ọchịchị Chineke ná ndụ ha?

◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị nile nọ n’okpuru ọchịchị Chineke si na-achọ otuto Chineke tupu nke ha?

◻ Gịnị bụ ụfọdụ àgwà Chineke nke ndị na-akwado ọchịchị Chineke na-eṅomi?

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Solomọn mere ka otuto Chineke bute nke ya ụzọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya