Ndị Ọrụ nke Ihe Ọjọọ
NKỌWA Bible nke òkè ndị mmụọ ọjọọ na-ekere n’ihe omume ụmụ mmadụ na-aza ajụjụ ndị bụ isi banyere ihe ọjọọ nke ma ọ bụghị ya, a pụghị inweta azịza ha. Tụlee, dị ka ihe atụ, okwu nke a sitere n’akwụkwọ bụ́ International Herald Tribune banyere agha na-aga n’ihu na Balkan: “Ìgwè ndị nchọpụta nke òtù European Community ekwubiwo na [ndị soja] edinawo ihe ruru 20,000 ụmụ nwanyị ndị Alakụba n’ike . . . dị ka akụkụ nke ụkpụrụ a haziri ahazi nke imenye ụjọ bụ́ nke e wepụtara iji menye ha egwu, mee ka obi ghara isikwa ha ike, ma chụpụ ha n’ebe obibi ha.”
Otu edemede dị na magazin bụ́ Time nwara inye nkọwa: “Mgbe ụfọdụ, ụmụ okorobịa na-alụ agha pụrụ idina nwanyị n’ike iji mee ihe na-atọ ndị okenye ha na ndị isi agha ha ụtọ, wee nweta nnwapụta nke dị ka nke nna nye nwa ya nwoke. Ndina n’ike ahụ bụ ihe nnwapụta nke nrara nye n’ịdị ụjọ nke ìgwè ahụ. Nwa okorobịa dị njikere ime ihe arụrụala dị iche iche arụgbuwo akọ na uche nke ya iji kwekọọ ná nzube ndị a na-apụghị ịgọnarị agọnarị nke ìgwè ya. Onye ahụ na-egosipụta nrara ọ raara onwe ya nye site n’ịkpa arụ.”
Ma gịnị mere “nzube ndị a na-apụghị ịgọnarị agọnarị nke ìgwè ya” ji rụọ arụọ karịa akọ na uche nke ndị òtù ya n’otu n’otu? Dị ka mmadụ n’otu n’otu, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla chọrọ isoro onye agbata obi ya biri n’udo. Ya mere n’ihi gịnị ka, n’oge agha, ndị mmadụ ji edina ibe ha n’ike, emekpọ ha ọnụ, na-egbukwa ha? Otu isi ihe kpatara ya bụ na ikike dị iche iche nke ndị mmụọ ọjọọ nọ n’ọrụ.
Ịghọta òkè ndị mmụọ ọjọọ na-ekere na-enyekwa ihe ngwọta maka ihe ụfọdụ na-akpọ “nsogbu onye ọkà mmụta okpukpe.” Nsogbu ahụ bụ ụzọ isi mee ka ụzọ okwu atọ kwenyekọta: (1) Chineke nwere ike ime ihe nile; (2) Chineke na-ahụ n’anya, dịkwa mma; na (3) ihe ndị jọrọ njọ na-eme. Ụfọdụ na-eche na na a pụrụ ime ka abụọ ọ bụla n’ime ụzọ okwu ndị a kwenyekọta, ma a pụghị ma ọlị ime ka ha atọ dum kwenyekọta. Okwu Chineke n’onwe ya na-enye azịza ya, azịza ahụ gụnyekwara ndị mmụọ anya na-adịghị ahụ, ndị ọrụ nke ihe ọjọọ.
Onye Nnupụisi Mbụ
Bible na-agwa anyị na Chineke bụ mmụọ n’onwe ya. (Jọn 4:24) Mgbe oge na-aga ọ ghọrọ Onye Okike nke ọtụtụ nde ndị mmụọ ndị ọzọ, ụmụ ndị ikom bụ́ ndị mmụọ ozi. N’ọhụụ, ohu Chineke bụ́ Daniel hụrụ otu narị nde ndị mmụọ ozi. Ndị mmụọ nile Jehova kere bụ ndị ezi omume, na-ekwekọkwa n’uche ya.—Daniel 7:10; Ndị Hibru 1:7.
E mesịa, mgbe Chineke “tọrọ ntọala ụwa,” ụmụ ndị ikom ndị a bụ́ ndị mmụọ ozi nke Chineke “na-etikọ mkpu ọṅụ,” ha wee “tisie mkpu ọṅụ ike.” (Job 38:4-7) Ma otu n’ime ha zụlitere ọchịchọ inwetara onwe ya ofufe nke n’ụzọ ziri ezi kwesịrị ịgara Onye Okike ahụ. Site n’inupụrụ Chineke isi, mmụọ ozi nke a mere onwe ya setan (nke pụtara “onye mmegide”) na ekwensu (nke pụtara “onye nkwutọ”).—Tụlee Ezikiel 28:13-15.
Site n’iji otu agwọ n’Iden gwa nwanyị mbụ ahụ, Iv, okwu, Setan rụgidere ya inupụ isi n’iwu Chineke nyere hoo haa ka a ghara iri mkpụrụ sitere kpọmkwem n’otu osisi n’ogige ahụ. E mesịa, di ya sonyeere ya. Otú a, di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ sonyeere mmụọ ozi ahụ n’inupụrụ Jehova isi.—Jenesis 2:17; 3:1-6.
Ọ bụ ezie na ihe ndị mere n’Iden pụrụ iyi ihe mmụta doro anya ná nrubeisi, Setan welitere ihe iseokwu abụọ dị mkpa n’ebe ahụ banyere omume ọma. Nke mbụ, Setan rụrụ ụka ma è gosipụtara ịchịisi Jehova n’elu ihe ndị o kere eke n’ezi omume na maka abamuru ha kasị mma. Ma eleghị anya ụmụ mmadụ pụrụ ime nke ọma karị n’ịchị onwe ha. Nke abụọ, Setan mara aka ma ọ̀ dị ihe ọ bụla e kere eke nwere ọgụgụ isi ga-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ma na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke mgbe nrubeisi yiri ka ọ dịghị eweta abamuru ọ bụla nke a na-ahụ anya.a
Nghọta doro anya nke ihe iseokwu ndị e welitere n’Iden, tinyere ihe ọmụma nke àgwà dị iche iche nke Jehova, na-enyere anyị aka ịghọta ihe ngwọta nye “nsogbu nkà mmụta okpukpe” ahụ, nke bụ ijikọta ịdị adị nke ihe ọjọọ na àgwà dị iche iche nke Chineke ndị bụ ike na ịhụnanya. Ọ bụ eziokwu na Jehova nwere ike a na-akparaghị ókè, ọ bụkwa ịhụnanya n’onwe ya, o nwekwara amamihe, na-ekpekwa ikpe ziri ezi. Ọ na-egosipụta àgwà anọ ndị a ná nhazi zuru okè. Otú a, o jighị ike ya na-enweghị ihe mgbochi bibie ndị nnupụisi atọ ahụ ozugbo. Nke ahụ gaara abụwo ihe ikpe ziri ezi ma ọ gaghị abụcha nke amamihe ma ọ bụ ịhụnanya. Ọzọkwa, ọ gbagharaghị ha nnọọ ma chezọọ, ụzọ nke ụfọdụ pụrụ iche na ọ ga-abụ nhọrọ nke ịhụnanya. Ime nke ahụ gaara abụwo nke amamihe ma ọ bụ ikpe ziri ezi na-adịghị ya.
A chọrọ oge iji dozie ihe iseokwu ndị Setan welitere. Ọ ga-ewe oge iji nwapụta ma ụmụ mmadụ hà pụrụ ịchị onwe ha nke ọma n’adabereghị na Chineke. Site n’ikwere ka ndị nnupụisi atọ ahụ nọgide ndụ, Jehova mekwara ka o kwe omume ka ihe ndị e kere eke kere òkè n’igosipụta na nzọrọ Setan bụ ụgha site n’ijere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi n’okpuru ọnọdụ ndị siri ike.b
Jehova gwara Adam na Iv hoo haa na ọ bụrụ na ha erie mkpụrụ ahụ a machibidoro iwu, ha ga-anwụ. Ha nwụkwara, ọ bụ ezie na Setan emesiwo Iv obi ike na ọ gaghị anwụ. Setan nọkwa n’okpuru ikpe ọnwụ; ka ọ dị ugbu a ọ nọgidere na-eduhie ihe a kpọrọ mmadụ. N’ezie, Bible na-asị: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19; Jenesis 2:16, 17; 3:4; 5:5.
Ndị Mmụọ Ozi Ndị Ọzọ Enupụ Isi
Oge na-adịghị anya mgbe ihe ndị mere n’Iden gasịrị, ndị mmụọ ozi ndị ọzọ sonyere ná nnupụisi megide ọkaaka Jehova. Bible na-asị: “O ruo, mgbe mmadụ malitere ịba ụba n’elu ala, mgbe a mụkwara ụmụ ndị inyom nye ha, na ụmụ ndị ikom nke Chineke hụrụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ na ha mara mma; ha wee lụtara onwe ha ndị inyom site na ndị nile ha họpụtara.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndị mmụọ ozi ndị a “hapụrụ ebe obibi nke aka ha [n’eluigwe]” wee bịa n’ụwa, nwoghaa n’ụdị mmadụ, wee sọrọ ndị inyom nwee ụtọ mmekọahụ.—Jenesis 6:1, 2; Jud 6.
Ihe ndekọ ahụ na-aga n’ihu na Jenesis 6:4: “Nefilim nọ n’ụwa na mgbe ahụ, ha nọkwa ma e mesịa, mgbe ụmụ ndị ikom nke Chineke na-abakwuru ụmụ ndị inyom nke mmadụ, mgbe ha na-amụkwara ha ụmụ: ndị ahụ bụ ndị dike ahụ ndị nọrịị site na mgbe ebighị ebi gara aga, ndị a maara aha ha.” Ụmụ ndị ikom ndị a ụmụ nwanyị mụrụ, bụ́ ndị ndị mmụọ ozi bụ nna ha, dịbigara ike ókè, “ndị dike ahụ.” Ha bụ ndị ikom na-eme ihe ike, ma ọ bụ Nephi·limʹ, okwu Hibru pụtara “ndị na-eme ka ndị ọzọ daa n’ala.”
Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na e mesịrị gosipụta ihe ndị a merenụ n’akụkọ ọdịbendị dị iche iche nke ndị oge ochie. Dị ka ihe atụ, otu akụkọ ifo dịworo 4,000 afọ nke Babilọn na-akọwa mwakpo ndị ikom karịrị mmadụ wakporo Gilgamesh, onye na-abụchaghị chi nke dị ike, nke na-eme ihe ike, onye “ajọ ọchịchọ ya na-adịghị [ahapụ] nwanyị ọ bụla na-amaghị nwoke nye onye ọ hụrụ n’anya.” Ihe atụ ọzọ, site n’akụkọ ọdịbendị ndị Grik, bụ Hercules (ma ọ bụ Heracles) karịrị mmadụ. Dị ka onye Alcmene, bụ́ mmadụ, mụrụ, na onye nna ya bụ chi Zeus, Hercules banyere n’usoro nke ime ihe ike mgbe o gbusịrị nwunye ya na ụmụ ya mgbe ara gbara ya. Ọ bụ ezie na e tinyere akụkọ ifo ndị dị otú ahụ nnu na ose dị ukwuu mgbe a na-akọ ha site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ, ha na-ejikọta n’ihe Bible na-ekwu banyere ndị Nefilim na ndị nna ha bụ́ ndị mmụọ ozi nupụrụ isi.
N’ihi mmetụta nke ajọ ndị mmụọ ozi ahụ na ụmụ ha ndị ikom karịrị mmadụ, ụwa jupụtara n’ime ihe ike nke na Jehova kpebiri ibibi ụwa ahụ site n’otu nnukwute iju mmiri. Ndị Nefilim ahụ lara n’iyi ha na mmadụ nile ọzọ na-adịghị asọpụrụ Chineke; nanị ụmụ mmadụ lanarịrị bụ onye ezi omume bụ́ Noa na ezinụlọ ya.—Jenesis 6:11; 7:23.
Otú ọ dị, ajọ ndị mmụọ ozi ahụ anwụghị. Kama nke ahụ, ha nwoghapụrụ ahụ mmadụ ha ma laghachi n’ógbè ndị bụ mmụọ. N’ihi nnupụisi ha, e kweghị ka ha batakwa ọzọ n’ezinụlọ Chineke nke ndị mmụọ ozi na-eme ezi omume; e nyeghịkwa ha ohere ọzọ iyikwasị anụ ahụ mmadụ dị ka ha mere n’ụbọchị Noa. Ma, ha nọgidere na-akpa ike mbibi n’ihe omume ụmụ mmadụ, n’okpuru ikike nke “onye isi ndị mmụọ ọjọọ,” Setan Ekwensu.—Matiu 9:34; 2 Pita 2:4; Jud 6.
Ndị Iro nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ
Setan na ndị mmụọ ọjọọ abụwo mgbe nile ndị na-egbu mmadụ na ndị obi ọjọọ. Setan, site n’ụzọ dị iche iche, chịịrị ìgwè anụ Job, gbuokwa ihe kanụ ná ndị ozi ya. Ọzọ, o gburu ụmụ iri nke Job site n’ime ka “oké ifufe” tikpọọ ụlọ ha nọ n’ime ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, Setan ji “ihe ofifi ọjọọ tie Job, site n’ọbụ ụkwụ ya ruo opu n’isi ya.”—Job 1:7-19; 2:3, 7.
Ndị mmụọ ọjọọ na-egosikwa obi ime ihe ọjọọ dị otú ahụ. N’ụbọchị Jisọs, ha napụrụ ndị mmadụ ike ikwu okwu na ịhụ ụzọ ha. Ha mere ka otu nwoke jiri nkume bekasịa onwe ya ahụ. Ha tụdara otu nwa okoro n’ala “sesie ya ike.”—Luk 9:42; Matiu 9:32, 33; 12:22; Mak 5:5.
Akụkọ ndị a na-enweta gburugburu ụwa na-egosi na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ka dị arụrụala dị ka mgbe ọ bụla ọzọ. Ha na-ewetara ụfọdụ ọrịa. Ndị ọzọ ka ha na-emenye ụjọ site n’ịnapụ ha ụra ma ọ bụ inye ha nrọ ọjọọ dị iche iche ma ọ bụ imetọ ha n’ụzọ mmekọahụ. Ndị ọzọkwa ka ha meworo ka isi gbakaa ha, ka ha gbuo mmadụ, ma ọ bụ gbuo onwe ha.
Ruo Ogologo Oge Hà Aṅaa Ka A Ka Ga-anagide Ha?
A gaghị anagide Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ezi ihe mere Jehova jiworo nye ha ohere ịdịrị ruo ụbọchị anyị, ma ugbu a oge ha dị mkpụmkpụ. Ná mmalite narị afọ a, e weere otu nzọụkwụ gbara ọkpụrụkpụ iji kpaara gburugburu ebe ha na-akpa ike ókè. Akwụkwọ Mkpughe na-akọwa: “Agha wee pụta n’eluigwe: Maịkael [Jisọs Kraịst a kpọlitere n’ọnwụ] na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide dragọn [Setan] ahụ; dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya wee buo agha; ha enweghịkwa ike, a hụghịkwa ọnọdụ ha ọzọ n’eluigwe. E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya.”—Mkpughe 12:7-9.
Gịnị si n’ime ya pụta? Ihe ndekọ ahụ na-aga n’ihu: “N’ihi nke a, ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha.” Ndị mmụọ ozi na-eme ezi omume pụrụ ịṅụrị ọṅụ n’ihi na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya anọkwaghị n’eluigwe. Ma gịnị banyere ndị nọ n’ụwa? Bible na-asị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”—Mkpughe 12:12.
N’ọnụma ha Setan na ndị arụrụala ya kpebisiri ike ịkpata ọtụtụ ahụhụ dị ka o kwere omume tupu ọgwụgwụ ha nke na-eru nso. Na narị afọ nke a e nwewo agha ụwa abụọ na ihe karịrị 150 agha ndị dị nta karị eri ngwụsị nke Agha Ụwa nke Abụọ. Mkpirikpi ahịrị okwu ndị na-akọwa ime ihe ike nke ọgbọ nke a abatawo n’usoro okwu anyị ji eme ihe: “agha nje,” “Oké Mgbukpọ ahụ,” “ọgbọ mgbukpọ,” “ogige ndina n’ike,” “ndị ogbu n’ahịrị,” na “bọmbụ ahụ.” Akụkọ ụwa jubigara ókè n’akụkọ ọgwụ ọjọọ, igbu mmadụ, ịtụ bọmbụ, ndị isi na-adịghị mma iri anụ mmadụ, igbu ọchụ, ụnwụ nri, na mmekpọ ọnụ.
Ozi ọma e nwere bụ na ihe ndị a bụ na nwa oge. N’ọdịnihu dị nso, Chineke ga-eme ihe ọzọ megide Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. N’ikọwa otu ọhụụ sitere n’aka Chineke, Jọn onyeozi sịrị: “M wee hụ mmụọ ozi ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, na-eji mkpịsị ugodi nke abyss ahụ n’aka ya, ya na oké mkpọrọ. O wee jide dragọn ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, o wee kee ya agbụ [otu puku afọ], wee tụba ya n’ime abyss ahụ, mechie ya, kaakwa ya akara n’elu ya, ka o wee ghara iduhie mba nile ọzọ, ruo mgbe [otu puku afọ] ahụ ga-agwụsị.”—Mkpughe 20:1-3.
Mgbe nke ahụ gasịrị, Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya bụ ndị ‘a ga-atọhapụ ruo nwa oge,’ e mesịzịa a ga-ebibi ha ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 20:3, 10) Lee aha oge magburu onwe ya nke ahụ ga-abụ! Ebe Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya pụworo nnọọ n’anya, Jehova ‘ga-abụ ihe nile n’ime ihe nile.’ ‘Ịba ụba nke udo ga-atọkwa onye ọ bụla ụtọ’ n’ezie.—1 Ndị Kọrint 15:28; Abụ Ọma 37:11.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E mesịrị mee ka nke a doo anya mgbe Setan kwuru banyere ohu Chineke bụ́ Job, sị: “Akpụkpọ ahụ laara akpụkpọ ahụ, ọbụna ihe nile nke mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ ndụ ya. Otú ọ dị, biko, setịpụ aka Gị, metụ ọkpụkpụ ya metụkwa anụ ahụ ya, ọ ghaghịkwa ịgbakụta Gị azụ n’ihu Gị.”—Job 2:4, 5.
b Maka ntụle sara mbara nke ihe mere Chineke ji kwere ka ajọ omume dịrị, lee akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ọ̀ bụ nanị mmadụ na-akpata ihe ndị dị otú ahụ, ka ikike anya na-adịghị ahụ, nke dị obi ọjọọ, ọ̀ na-eketa òkè n’ụta ahụ?
[Ebe e si nweta foto]
Olulu mmanụ ndị na-agba ọkụ na Kuwait, 1991: Chamussy/Sipa Press
[Foto dị na peeji nke 7]
Lee oge magburu onwe ya ọ ga-abụ mgbe ndị mmụọ ọjọọ na-adịkwaghị emenye ihe a kpọrọ mmadụ ụjọ!