Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 2/1 p. 8-13
  • Izi Ihe Chineke Na-enwe Mmeri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Izi Ihe Chineke Na-enwe Mmeri
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọchịchọ A Na-achọ Amamihe
  • Akwụkwọ Ọgụgụ Ukwu nke Jehova
  • Nghọta Na-aga n’Ihu
  • N’ime Ìhè Dị Ebube nke Chineke
  • Fee Ofufe n’Ime Mmụọ na Eziokwu
  • Imeri Ọnwụnwa Dị Iche Iche na Ụwa
  • Nweta Abamuru nke Izi Ihe Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Mgbakọ Ndị Na-akpali Akpali Na-akwalite Izi Ihe Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ndị Jehova Na-akụziri Ihe Ruo Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 2/1 p. 8-13

Izi Ihe Chineke Na-enwe Mmeri

“Anya gị abụọ ga na-ahụ [Onye Ozizi gị Kasị Ukwuu, “NW”]: ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.” ​—⁠AỊSAỊA 30:​20, 21.

1. N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji zie ezi ịkpọ ntụziaka Jehova izi ihe Chineke?

JEHOVA CHINEKE bụ Isi Iyi nke izi ihe kasị mma nke onye ọ bụla pụrụ inweta. Ọ bụrụ na anyị egee ntị mgbe ọ na-ekwu okwu, karịsịa site n’Okwu Nsọ ya, ọ ga-abụ Onye Ozizi anyị Kasị Ukwuu. (Aịsaịa 30:​20, NW) Akụkụ Bible Hibru ahụ na-akpọkwa ya ‘onye kachasị chi nile.’ (Abụ Ọma 50:1) N’ihi ya, ntụziaka Jehova bụ izi ihe Chineke.

2. N’echiche dị aṅaa ka ọ bụ eziokwu na nanị Chineke nwere amamihe?

2 Ụwa na-akpa nganga n’ihi ọtụtụ ebe mmụta akwụkwọ ya, ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha na-ezi ozizi Chineke. Ee, amamihe nile nke ihe a kpọrọ mmadụ nwetaworo n’akụkọ ihe mere eme nile bụ ihe dị ntakịrị mgbe e jiri ya tụnyere ntụziaka Chineke bụ́ nke dabeere n’amamihe na-adịghị agwụ agwụ nke Jehova. Ndị Rom 16:27 na-ekwu na ọ bụ nanị Chineke nwere amamihe, nke a bụkwa eziokwu n’echiche nke bụ na ọ bụ nanị Jehova nwere amamihe na-enweghị nsọtụ.

3. N’ihi gịnị ka Jisọs Kraịst ji bụrụ onye ozizi kasị ukwu nke dịworo ndụ n’ụwa?

3 Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, bụ ezi ihe nlereanya zuru okè nke amamihe, bụrụkwa onye ozizi kasị ukwuu nke dịworo ndụ mgbe ọ bụla n’ụwa. Nke ahụ abụghịkwa ihe ijuanya! Ruo ogologo oge Jehova abụrụwo Onye Ozizi ya n’eluigwe. N’ezie, izi ihe nke Chineke malitere mgbe Chineke malitere izi ihe okike mbụ ya, Ọkpara ya ọ mụrụ nanị ya, ihe. N’ihi ya Jisọs pụrụ ikwu, sị: “Dị ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a.” (Jọn 8:28; Ilu 8:​22, 30) Okwu ndị Kraịst kwuru n’onwe ya bụ́ ndị e dekọrọ n’ime Bible na-eme ka anyị nwekwuo ihe ọmụma nke izi ihe nke Chineke. Site n’ịkụzi ihe Jisọs kụziri, ndị Kraịst e tere mmanụ na-erubere Onye Ozizi ha Kasị Ukwuu isi, onye ọ bụ uche ya na a ga-eme ka a mara “ọtụtụ okpukpu amamihe Chineke dị iche iche” site n’ọgbakọ ya.​—⁠Ndị Efesọs 3:10, 11; 5:1; Luk 6:40.

Ọchịchọ A Na-achọ Amamihe

4. Gịnị ka e kwuworo banyere ikike ụbụrụ?

4 Inweta amamihe na-esite n’izi ihe Chineke chọrọ ịdị uchu n’iji ike iche echiche nke Chineke nyere anyị na-eme ihe. Nke a kwere omume n’ihi na ụbụrụ mmadụ nwere ike dị ukwuu. Akwụkwọ bụ́ The Incredible Machine na-ekwu, sị: “Ọbụna ígwè kọmputa kasị bụrụ ọgbara ọhụrụ ndị anyị pụrụ ichepụta n’echiche dị nnọọ ala ma e jiri ha tụnyere ịdị mgbagwoju anya a na-akparaghị ókè na ike ime ihe dị iche iche ụbụrụ mmadụ nwere​—⁠ọdịdị ndị ihe mere ha ji kwee mee bụ ozizi ndị a na-ebu n’usoro ya nke njikọ mmiri ọgwụ na ikike eletrik, bụ́ nke e kewasịrị ekewasị na nke ọtụtụ akụkụ dị iche iche mejupụtara n’ụzọ dị mgbagwoju anya. . . . Ọtụtụ nde ozi dị iche iche ndị na-abata n’ụbụrụ gị n’otu mgbe ọ bụla na-ebu ihe ọmụma dị ukwuu. Ha na-eweta ozi banyere gburugburu ime ahụ gị na n’ebe ndị dị n’èzí: banyere ụta ngwere ná mkpụrụ ụkwụ gị, ma ọ bụ ísìsì ọma nke kọfị, ma ọ bụ okwu enyi nke na-atọ ọchị. Ka ozi ndị ọzọ na-anụcha ma na-ahazi ihe ọmụma, ha na-akpali mmetụta uche ụfọdụ, ncheta ihe, echiche, ma ọ bụ atụmatụ ndị na-eduje n’ime mkpebi. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ, ozi ndị sitere n’ụbụrụ gị na-agwa akụkụ ndị ọzọ nke ahụ gị ihe ha ga-eme: megharịa mkpụrụ ụkwụ gị, ṅụọ kọfị ahụ, chịa ọchị, ma ọ bụ ma eleghị anya zaghachi n’ụzọ na-atọ ọchị. N’otu mgbe ahụ, ụbụrụ gị na-achịkwakwa iku ume gị, ngwakọta ọbara gị, ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ dị n’ahụ gị, na usoro ihe omume ndị ọzọ dị mkpa ndị ị na-amaghị ihe banyere ha. Ọ na-enye iwu ndị na-eme ka ahụ gị kwụrụ chịm ma na-arụ ọrụ n’ụzọ na-aga were were n’agbanyeghị mgbanwe ndị na-ewere ọnọdụ na gburugburu gị n’esepụghị aka. Ọ na-akwadebekwa maka mkpa ndị a ga-enwe n’ọdịnihu.”​—⁠Page 326.

5. N’echiche Akwụkwọ Nsọ, gịnị bụ amamihe?

5 Ọ bụ ezie na ụbụrụ mmadụ nwere ikike dị ịtụnanya, olee otú anyị pụrụ isi jiri uche anyị mee ihe n’ụzọ kasị mma? Ọ bụghị site n’imikpu onwe anyị n’ọmụmụ ihe siri ike nke asụsụ, akụkọ ihe mere eme, nkà mmụta sayensị, ma ọ bụ ọdịiche ndị e nwegasịrị n’okpukpe. Anyị kwesịrị iji ikike iche echiche anyị mee ihe n’ụzọ bụ isi iji nata izi ihe Chineke. Ọ bụ nanị ya na-arụpụta ezi amamihe. Ma gịnị bụ ezi amamihe? N’echiche nke Akwụkwọ Nsọ, okwu ahụ bụ amamihe na-emesi okwu ike banyere ikpe ziri ezi nke dabeere n’ezi ihe ọmụma na nghọta ziri ezi. Amamihe na-enyere anyị aka iji ihe ọmụma na nghọta na-eme ihe n’ụzọ na-enwe ihe ịga nke ọma n’igbo mkpa dị iche iche, izere ma ọ bụ ịgbanahụ ihe ize ndụ, inyere ndị ọzọ aka, na iru ihe mgbaru ọsọ dị iche iche. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Bible gosipụtara ọdịiche dị n’etiti amamihe na nzuzu na uche gbagọrọ agbagọ​—⁠àgwà ndị o doro anya na anyị chọrọ izere.​—⁠Deuterọnọmi 32:6; Ilu 11:29; Eklisiastis 6:8.

Akwụkwọ Ọgụgụ Ukwu nke Jehova

6. Ọ bụrụ na anyị ga-egosipụta ezi amamihe, gịnị ka a na-aghaghị iji mee ihe nke ọma?

6 E nwere ụba nke amamihe ụwa gburugburu anyị. (1 Ndị Kọrint 3:​18, 19) Ee, ụwa nke a jupụtara n’ụlọ akwụkwọ na ebe ndebe akwụkwọ dị iche iche ndị nwere ọtụtụ nde akwụkwọ! Ọtụtụ n’ime ndị a bụ akwụkwọ ọgụgụ ndị na-akụzi asụsụ, mmụta mgbakọ na mwepụ, sayensị, na akụkụ ndị ọzọ nke ihe ọmụma. Ma Onye Ozizi ahụ Kasị Ukwuu emewo ka e nwee akwụkwọ ọgụgụ nke karịrị ndị ọzọ nile​—⁠Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible. (2 Timoti 3:​16, 17) O ziri ezi ọ bụghị nanị mgbe ọ na-ekwu ihe ndị metụtara isiokwu ndị dị ka akụkọ ihe mere eme, nkà mmụta ọdịdị mbara ụwa, na mmụta nke ahịhịa ndụ kamakwa mgbe ọ na-ebu amụma banyere ọdịnihu. Ọzọkwa, ọ na-enyere anyị aka ibi ndụ nke kasị enye obi ụtọ na nke kasị arụpụta ihe kpọmkwem ugbu a. N’ezie, dị nnọọ ka ọ dị mkpa ka ụmụ akwụkwọ nke ụlọ akwụkwọ ụwa na-eji akwụkwọ ha na-eme ihe, anyị aghaghị ịghọ ndị maara ma jiri Akwụkwọ Ọgụgụ ukwu nke Chineke na-eme ihe nke ọma ma ọ bụrụ na anyị ga-egosipụta ezi amamihe dị ka ndị “Chineke ziworo ihe.”​—⁠Jọn 6:45.

7. N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na inwe ihe ọmụma ọgụgụ isi nke ihe ndị dị n’ime Bible ezughị ezu?

7 Ma, inwe ihe ọmụma ọgụgụ isi nke Bible na ezi amamihe na ime ihe kwekọrọ n’izi ihe Chineke abụghị otu ihe ahụ. Iji mee ihe atụ: Na narị afọ nke 17 O.A., otu nwoke onye Katọlik aha ya bụ Cornelius van der Steen chọrọ ịghọ onye Jesuit ma a jụrụ ya ajụ n’ihi na ọ sụrụ mkpụmkpụ nke ukwuu. Manfred Barthel kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ The Jesuits​—⁠History & Legend of the Society of Jesus, sị: “Kọmitii ahụ mere ka van der Steen mara na ha dị njikere iwezụga ihe banyere ogo nke ha chọrọ ya n’aka, kama ọ ga-abụ nanị ma ọ̀ ga-amụ iburu Bible nile n’isi na-agụ. Akụkọ ahụ agaghị adị mma ma ọlị ịkọ ma a sị na van der Steen emeghị ihe kwekọrọ n’arịrịọ mpako nke a.” Lee aha mgbalị o were ibu Bible nile n’isi! Ma, n’ezie, ọ dị mkpa nke ukwuu karị ịghọta Okwu Chineke karịa iburu ya n’isi.

8. Olee ihe ga-enyere anyị aka irite uru site n’izi ihe Chineke ma gosipụta ezi amamihe?

8 Ọ bụrụ na anyị ga-erite uru zuru ezu site n’izi ihe Chineke ma gosipụta ezi amamihe, ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ dị anyị mkpa. Anyị aghaghịkwa ịbụ ndị mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ, Jehova na-eduzi. Nke a ga-enyere anyị aka ịmụta eziokwu ndị miri emi, “ihe nile dị omimi nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 2:10) N’ihi ya, ka anyị dị uchu n’ịmụ Akwụkwọ Ọgụgụ ukwu ahụ nke Jehova ma kpee ekpere maka nduzi ya site na mmụọ nsọ. N’ikwekọ n’Ilu 2:​1-⁠6, ka anyị gee amamihe ntị, nye obi anyị inweta ihe ọmụma, ma kpọkuo nghọta. Ọ dị anyị mkpa ime nke a dị ka à ga-asị na anyị na-achọ akụ̀ zoro ezo, n’ihi na ọ bụ nanị mgbe ahụ ka anyị ‘ga-aghọta egwu Jehova ma chọta ihe ọmụma Chineke.’ Ntụle nke mmeri na uru ụfọdụ nke izi ihe Chineke ga-eme ka anyị nwekwuo ekele maka amamihe Chineke na-enye.

Nghọta Na-aga n’Ihu

9, 10. Olee ihe Chineke kwuru, dị ka e dekọrọ ya na Jenesis 3:15, gịnịkwa bụ nghọta kwesịrị ekwesị nke okwu ndị ahụ?

9 Izi ihe Chineke na-enwe mmeri site n’inye ndị Jehova nghọta na-aga n’ihu nke Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, anyị amụtawo na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu bụ onye kwuru okwu site n’agwọ n’Iden wee boo ebubo ụgha na Chineke kwuru okwu ụgha mgbe Ọ sịrị na ọnwụ ga-abụ ntaramahụhụ maka iri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro n’iwu. Otú o sina dị, anyị na-ahụ na nnupụisi megide Jehova Chineke wetaara agbụrụ mmadụ ọnwụ. (Jenesis 3:​1-⁠6; Ndị Rom 5:12) N’agbanyeghị nke ahụ, Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ olileanya mgbe ọ gwara agwọ ahụ, si otú ahụ gwa Setan, sị: “Iro ka m ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.”​—⁠Jenesis 3:15.

10 Okwu ndị ahụ nwere ihe omimi nke e jiworo nke nta nke nta kpughee site n’izi ihe Chineke. Jehova akụziworo ndị ya na isiokwu bụ isi nke Bible bụ iwepụ ọkaaka ya n’ụta site ná Mkpụrụ ahụ, bụ́ nwa Abraham na Devid, onye ịchịisi Alaeze ahụ ruuru n’ụzọ iwu. (Jenesis 22:15-⁠18; 2 Samuel 7:​12, 13; Ezikiel 21:​25-⁠27) Onye Ozizi anyị Kasị Ukwuu akụziworo anyị na Jisọs Kraịst bụ Mkpụrụ bụ́ isi nke “nwanyị” ahụ, bụ́ nzukọ eluigwe na ala nke Chineke. (Ndị Galetia 3:16) N’agbanyeghị ule nile Setan wetaara ya, Jisọs guzosiri ike n’ezi ihe​—⁠ọbụna ruo ọnwụ, bụ́ ichifịa Mkpụrụ ahụ n’ikiri ụkwụ. Anyị amụtawokwa na 144,000 mmadụ bụ́ ndị nketakọ nke Alaeze ahụ bụ́ ndị sitere n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ ga-esoro Kraịst kere òkè n’ichifịa isi Setan, “agwọ ochie ahụ.” (Mkpughe 14:1-⁠4; 20:2; Ndị Rom 16:20; Ndị Galetia 3:29; Ndị Efesọs 3:​4-⁠6) Lee nnọọ aha ekele anyị nwere maka ihe ọmụma dị otú ahụ nke Okwu Chineke!

N’ime Ìhè Dị Ebube nke Chineke

11. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji sị na izi ihe Chineke na-enwe mmeri site n’iwebata ndị mmadụ n’ìhè ime mmụọ?

11 Izi ihe Chineke na-enwe mmeri site n’iwebata ndị mmadụ n’ime ìhè ime mmụọ. Ndị Kraịst e tere mmanụ enwewo ahụmahụ ahụ ná mmezu nke 1 Pita 2:9: “Unu onwe unu bụ ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara, ka unu wee kwusaa ịdị mma nile nke Onye ahụ Onye kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.” Taa, “oké ìgwè mmadụ” ndị ga-ebi ndụ ebighị ebi n’elu ụwa paradaịs na-enwetakwa ìhè ahụ Chineke na-enye. (Mkpughe 7:9; Luk 23:43) Ka Chineke na-ezi ndị ya ihe, Ilu 4:18 na-abụ eziokwu: “Okporo ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ na-aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.” Usoro ọmụmụ ihe nke a na-aga n’ihu n’ihu na-anụcha nghọta anyị na-aghọta izi ihe Chineke, ọbụna dị ka ụmụ akwụkwọ na-enwe ọganihu n’ihi ezi enyemaka nke onye nkụzi mgbe ha na-amụ ụtọ asụsụ, akụkọ ihe mere eme, ma ọ bụ ihe ọmụmụ ọ bụla ọzọ.

12, 13. Megide ihe ize ndụ dị iche iche dị aṅaa nke ozizi ka izi ihe Chineke chebeworo ndị Jehova?

12 Mmeri ọzọ nke izi ihe Chineke na-enwe bụ na ọ na-echebe ndị ji obi umeala na-anabata ya pụọ ‘n’ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ.’ (1 Timoti 4:1) N’aka nke ọzọ, leedị Krisendọm! Laa azụ na 1878, onye ụkọchukwu ndị Roman Katọlik bụ́ John Henry Newman dere, sị: “N’ịdabere mgbe ahụ n’ike nke Iso Ụzọ Kraịst iji guzogide mwakwasị nke ihe ọjọọ, na ịgbanwe kpọmkwem ihe ọrụ na omume dị iche iche metụtara ofufe ndị mmụọ ọjọọ gaa n’ihe ndị e ji agbasa okwuchukwu, . . . ndị ọchịchị nke Chọọchị site n’oge gboo dị njikere ịnabata, ma ọ bụ iṅomi ma ọ bụ ịkwado omume na omenala ndị dị adị nke ọha mmadụ, tinyere nkà ihe ọmụma nke òtù ndị gụrụ akwụkwọ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.” Newman kwukwara na ihe ndị dị ka mmiri nsọ, uwe ndị ụkọchukwu, na ihe oyiyi dị iche iche “malitechara n’aka ndị ọgọ mmụọ, ma bụrụ ndị e doro nsọ site n’ịbụ ndị a nabatara n’ime Chọọchị.” Ndị Chineke nwere nnọọ obi ekele na izi ihe Chineke na-echebe ha pụọ ná ndapụ n’ezi ofufe dị otú ahụ. Ọ na-enwe mmeri n’elu ụdị nile nke ofufe ndị mmụọ ọjọọ.​—⁠Ọrụ 19:20.

13 Izi ihe Chineke na-emeri ndahie n’okpukpe n’ụzọ ọ bụla. Dị ka ihe atụ, dị ka ndị Chineke kụziwooro ihe, anyị ekweghị n’Atọ n’Ime Otu kama anyị na-ekweta na Jehova bụ Onye Kasị Ihe Nile Elu, Jisọs bụ Ọkpara ya, mmụọ nsọ bụkwa ike ọrụ Chineke. Anyị adịghị atụ ọkụ ala mmụọ egwu, n’ihi na anyị na-aghọta na hell nke Bible bụ ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụkwa ezie na ndị okpukpe ụgha na-ekwu na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ, anyị matara na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị. Ndepụta nke eziokwu dị iche iche anyị nwetaworo site n’izi ihe Chineke enweghị ọgwụgwụ. Lee aha ngọzi ọ bụ ịbụ ndị nweere onwe ha pụọ n’agbụ ime mmụọ nke Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha!​—⁠Jọn 8:​31, 32; Mkpughe 18:​2, 4, 5.

14. N’ihi gịnị ka ndị na-ejere Chineke ozi pụrụ iji nọgide na-ejegharị n’ìhè ime mmụọ?

14 N’ihi na izi ihe Chineke na-emeri ndahie n’okpukpe, ọ na-enyere ndị na-ejere Chineke ozi aka ijegharị n’ìhè ime mmụọ. Ya bụ na ha na-anụ okwu n’azụ ha nke na-asị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.” (Aịsaịa 30:21) Izi ihe Chineke na-echebekwa ndị na-ejere ya ozi pụọ ná nchepụta ụgha. Mgbe “ndị ozi ụgha” na-akpata nsogbu n’ime ọgbakọ dị na Kọrint, Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe agha nke ibu agha anyị abụghị nke anụ ahụ, kama ha sitere na Chineke bụ́ ihe pụrụ ịkwada ebe e wusiri ike; ebe anyị na-eweda ihe a na-atụle n’obi, na ihe nile ọ bụla dị elu nke e weliri elu imegide ọmụma Chineke, anyị na-adọtakwa ihe nile ọ bụla a na-echepụta n’agha ịṅa ntị Kraịst.” (2 Ndị Kọrint 10:4, 5; 11:13-⁠15) A na-eji ntụziaka ndị e ji ịdị nwayọọ na-enye n’ime ọgbakọ na site ná nkwusa anyị na-ekwusa ozi ọma ahụ nye ndị nọ n’èzí na-ekpu echiche ndị na-emegide izi ihe Chineke ihu n’ala.​—⁠2 Timoti 2:​24-⁠26.

Fee Ofufe n’Ime Mmụọ na Eziokwu

15, 16. Gịnị ka ife Jehova ofufe n’ime mmụọ na eziokwu pụtara?

15 Ka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na-aga n’ihu, izi ihe Chineke na-enwe mmeri n’igosi ndị dị umeala n’obi ụzọ e si efe Chineke ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.” N’olulu mmiri Jekọb n’ebe dị nso n’obodo Saịka, Jisọs gwara otu nwanyị onye Sameria na ya pụrụ inye mmiri nke na-enye ndụ ebighị ebi. O kwukwara, na-ezo aka n’ebe ndị Sameria nọ, sị: “Unu onwe unu na-akpọ isiala nye ihe unu na-amataghị . . . Oge hour na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye ya.” (Jọn 4:​7-15, 21-⁠23) Mgbe ahụ Jisọs mere ka a mara ya onwe ya dị Mesaịa ahụ.

16 Ma olee otú anyị pụrụ isi fee Chineke n’ime mmụọ? Site n’ife ofufe dị ọcha nke sitere n’obi nwere ekele nke jupụtara n’ịhụnanya maka Chineke bụ́ nke dabeere n’ezi ihe ọmụma nke Okwu ya. Anyị pụrụ ife ya ofufe n’eziokwu site n’ịjụ ihe ụgha nile nke okpukpe na ime uche Chineke, dị ka e kpughere ya n’Akwụkwọ Ọgụgụ ukwu nke Jehova.

Imeri Ọnwụnwa Dị Iche Iche na Ụwa

17. Olee otú ị pụrụ isi nwapụta na izi ihe Chineke enyeworo ndị na-ejere Jehova ozi aka iche ọnwụnwa ihu?

17 Mgbe ndị Chineke na-eche ọnwụnwa ihu, izi ihe Chineke na-enwe mmeri ọtụtụ ugbo. Tụlee nke a: Ná mmalite nke Agha Ụwa nke Abụọ, na September 1939, ndị na-ejere Jehova ozi nwere mkpa inweta nghọta pụrụ iche nke Akwụkwọ Ọgụgụ ukwu ya. Ihe nyere aka dị ukwuu bụ isiokwu dị n’Ụlọ Nche (Bekee), nke November 1, 1939, nke gosipụtara n’ụzọ pụtara ìhè izi ihe Chineke n’okwu banyere nnọpụiche nke ndị Kraịst. (Jọn 17:16) N’otu aka ahụ, n’afọ ndị mbụ nke 1960, isiokwu dị iche iche nke Ụlọ Nche n’okwu banyere ido onwe onye n’okpuru “ndị na-achị isi” nke gọọmenti n’ụzọ a kpaara ókè nyeere ndị Chineke aka ime ihe kwekọrọ n’izi ihe Chineke n’ihu ọgba aghara nke ọha mmadụ.​—⁠Ndị Rom 13:​1-⁠7; Ọrụ 5:29.

18. Olee otú ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst na narị afọ nke abụọ na atọ O.A. si lee ntụrụndụ rụrụ arụ anya, enyemaka dịkwa aṅaa ka izi ihe Chineke na-enye banyere nke ahụ taa?

18 Izi ihe Chineke na-enyere anyị aka imeri ọnwụnwa, dị ka ihe ndọta dị iche iche nke ịchọ ntụrụndụ rụrụ arụ. Rịba ama ihe ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst na narị afọ nke abụọ na nke atọ nke Oge Anyị kwuru. Tertullian dere, sị: “Ọ dịghị ihe anyị na ara ọgbụgba nke ama egwuregwu ahụ, enweghị ihere nke ebe ihe nkiri ahụ, na ime ihe ike nke ọgbọ egwuregwu ahụ nwere ime, n’okwu ọnụ, n’ọhụhụ ụzọ ma ọ bụ n’ọnụnụ ntị.” Onye ọzọ nke dere akwụkwọ n’oge ahụ jụrụ, sị: “Gịnị ka onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nwere ime n’etiti ihe ndị a, ebe ọ bụ na ọ pụghị ọbụna iche ajọ ihe n’echiche? N’ihi gịnị ka o ji achọta obi ụtọ ná ngosipụta nile nke mmekọahụ rụrụ arụ?” Ọ bụ ezie na ndị a dere akwụkwọ biri ndụ afọ ole na ole mgbe ndị Kraịst nke narị afọ mbụ gabigasịrị, ha katọrọ ihe ntụrụndụ ndị rụrụ arụ. Taa, izi ihe Chineke na-enye anyị amamihe iji jụ ntụrụndụ rụrụ arụ, nke omume rụrụ arụ, na nke ime ihe ike.

19. Olee otú izi ihe Chineke si enyere anyị aka imeri ụwa?

19 Ime ihe kwekọrọ n’izi ihe Chineke na-enyere anyị aka imeri ụwa n’onwe ya. Ee, itinye nkụzi nke Onye Ozizi anyị Kasị Ukwuu n’ọrụ na-eme ka anyị nwee mmeri n’elu ikike ọjọọ dị iche iche nke ụwa nke a nke na-atọgbọ n’ike Setan. (2 Ndị Kọrint 4:4; 1 Jọn 5:19) Ndị Efesọs 2:​1-⁠3 na-ekwu na Chineke emewo ka anyị dị ndụ ọ bụ ezie na anyị bụ ndị nwụrụ anwụ n’ime njehie na mmehie mgbe anyị jere ije n’ụzọ kwekọrọ na nke onye ọchịchị nke ike nke mbara eluigwe. Anyị na-ekele Jehova na izi ihe nke Chineke na-enyere anyị aka imeri ọchịchọ dị iche iche nke ụwa na mmụọ nke na-apụta site n’aka onye iro ya na nke anyị​—⁠onye isi nduhie ahụ, Setan bụ́ Ekwensu!

20. Olee ajụjụ ndị kwesịrị ka anyị tụlekwuo ha?

20 Mgbe ahụ, o doro anya na izi ihe Chineke na-enwe mmeri n’ọtụtụ ụzọ. N’ezie, ọ ga-eyi ihe na-ekweghị omume ịrụtụ aka ná mmeri ya nile. Ọ na-emetụta ndị mmadụ gburugburu ụwa. Ma gịnị ka ọ na-emere gị? Olee otú izi ihe Chineke si emetụta ndụ gị?

Gịnị ka Ị Mụtaworo?

◻ Olee otú a pụrụ isi kọwaa ezi amamihe?

◻ Gịnị ka Chineke jiworo nwayọọ nwayọọ kpughee banyere Jenesis 3:15?

◻ Olee otú izi ihe Chineke siworo nwee mmeri n’ihe ndị metụtara ihe ime mmụọ?

◻ Gịnị ka ife Chineke n’ime mmụọ na eziokwu pụtara?

◻ Olee otú izi ihe Chineke siworo nyere ndị na-ejere Jehova ozi aka imeri ọnwụnwa dị iche iche na ụwa?

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Jisọs nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe ruo ọnwụ​—⁠nchifịa e chifịara Mkpụrụ ahụ n’ikiri ụkwụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya