Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 2/1 p. 20-25
  • Anyị Ebuwo Ụzọ Chọọ Alaeze Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Ebuwo Ụzọ Chọọ Alaeze Ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ekele Maka Eziokwu Bible
  • Ịbanye n’Ije Ozi Ọsụ Ụzọ
  • Ozi Anyị n’Afọ Ndị ahụ A Lụrụ Agha
  • Ọrụ A Rụrụ Mgbe Agha Gasịrị​—⁠E Mesịakwa Gilead
  • Ozi Anyị na Brazil
  • Ndụ Jupụtara n’Ihe Omume, nke Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ
  • Ego Ọ̀ Na-eme Ka Mmadụ Nwee Ezi Obi Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Emere M Nhọrọ Dị Mma n’Ihe Banyere Ọrụ
    Teta!—2007
  • Jehova Gọziri Nnọọ Ọchịchọ m Ịbụ Onye Ozi Ala Ọzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ihe Kasị Mma Iji Ndụ M Mee
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 2/1 p. 20-25

Anyị Ebuwo Ụzọ Chọọ Alaeze Ahụ

DỊ KA OLIVE SPRINGATE SI KỌỌ

Mama ka fụnyụsịrị ọkụ kandụl ahụ ma hapụ ọnụ ụlọ anyị mgbe ọ nụsịrị ekpere anyị. Nwanne m nwoke nke m tọrọ jụrụ m ozugbo: “Olive, olee otú Chineke pụrụ isi hụ anyị ma nụ olu anyị site ná mgbidi ájá blọkụ ndị a?”

“MAMA sịrị na ọ pụrụ ịhụ anyị ihe ọ bụla,” ka m zara, “ọbụna ruo n’ime obi anyị kpọmkwem.” Mama bụ onye na-atụ egwu Chineke na onye na-agụchi Bible anya, ọ kụnyekwara n’ime anyị bụ́ ụmụaka nkwanye ùgwù dị omimi maka Chineke na maka ụkpụrụ dị iche iche nke Bible.

Ndị mụrụ anyị bụ ndị Chọọchị Anglikan n’obodo nta bụ́ Chatham, Ógbè Kent, England. Ọ bụ ezie na Mama na-ejechi chọọchị anya, o kwenyere na ịbụ onye Kraịst karịrị nanị ịdị na-ekpo oche ọkụ n’ime chọọchị otu ugbo n’izu. O jikwa n’aka na Chineke aghaghị inwe otu ezi chọọchị.

Ekele Maka Eziokwu Bible

Na 1918, mgbe m dị ihe dị ka afọ ise, Mama nwetara mpịakọta ndị ahụ a kpọrọ Studies in the Scriptures, ndị Charles T. Russell dere, bụ́ onye isi oche mbụ nke Watch Tower Bible and Tract Society. Afọ ole na ole n’ihu, ka anyị bi n’otu obere ebe a na-akpọ Wigmore, otu n’ime Ndị Mmụta Bible, dị ka a maara Ndịàmà Jehova na mgbe ahụ, jekwuru Mama. Ọ nakweere akwụkwọ ahụ e ji amụ Bible bụ́ The Harp of God, sitekwa na ya ọ malitere ịchọta azịza nye ọtụtụ n’ime ajụjụ ndị o nwere banyere Bible. Kwa izu kaadị na-acha pinki pinki nke nwere ajụjụ ndị e biri ebi n’isiakwụkwọ nke ọ bụla na-alọta dị ka akwụkwọ ozi. Kaadị ahụ gosikwara ebe a pụrụ ịchọta azịza ha n’akwụkwọ ahụ.

Na 1926 ndị mụrụ m, nwanne m nwanyị bụ́ Beryl, na mụ hapụrụ Chọọchị Anglikan n’ihi na aka chọọchị ahụ na-etinye ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nakwa ọtụtụ nkụzi ya ezi uche na-adịghị na ha, were anyị iwe. Otu ozizi a ma ama bụ na Chineke gaje ịta ndị mmadụ ahụhụ ruo mgbe nile ebighị ebi na hell na-ere ọkụ. E mesiri mama m, bụ́ onye na-achọ eziokwu Bible n’ezie, obi ike na Chọọchị Anglikan abụghị nke ezigbo ya.

Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, dị ka azịza nye ekpere sitere n’ala ala obi nke Mama, Oriakụ Jackson, Onye Mmụta Bible, letara anyị. Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ hour abụọ, ọ gwara mụ na Mama okwu, na-aza ajụjụ anyị nile site na Bible. Obi tọrọ anyị ụtọ ịmụta, gụnyere ihe ndị ọzọ, na ekpere anyị kwesịrị ịgara Jehova Chineke, Nna nke Jisọs Kraịst, ọ bụghịkwa nye Atọ n’Ime Otu ọ bụla dị omimi. (Abụ Ọma 83:18; Jọn 20:17) Ma nye m ajụjụ kasị bụrụ nke a na-agaghị echezọ echezọ nke Mama jụrụ bụ nke a: “Gịnị ka ibu ụzọ chọọ Alaeze ahụ pụtara?”​—⁠Matiu 6:33.

Azịza ahụ dabeere na Bible metụtara ndụ anyị n’ụzọ dị omimi. Site n’izu ahụ kpọmkwem, anyị malitere ịga nzukọ Ndị Mmụta Bible na iso ndị ọzọ kerịta ihe anyị na-amụta. E mesiri anyị obi ike na anyị achọtawo eziokwu ahụ. Ọnwa ole na ole n’ihu, na 1927, e mere Mama baptism ná ngosipụta nke nraranye ya ijere Jehova ozi, na 1930 kwa, e mekwara m baptism.

Ịbanye n’Ije Ozi Ọsụ Ụzọ

Ezinụlọ anyị na-aga Ọgbakọ Gillingham, nke ihe dị ka 25 mmadụ mejupụtara. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ozi oge nile, ndị a na-akpọ ndị ọsụ ụzọ, ha nile nwekwara olileanya eluigwe. (Ndị Filipaị 3:​14, 20) Ịnụ ọkụ n’obi ndị Kraịst ha na-efe efe. Ka m ka nọ n’agbata afọ ndụ 13 ruo 19, m sụrụ ụzọ ruo nwa oge na Belgium ná mmalite afọ ndị 1930. Nke a kpalikwuru ọchịchọ m maka ije ozi Alaeze ka ukwuu. N’oge ahụ anyị keere òkè n’ikesara onye ụkọchukwu ọ bụla otu akwụkwọ nta ahụ bụ́ The Kingdom, the Hope of the World.

Mgbe oge na-aga, nna m malitere imegidesi ọrụ ndị Kraịst anyị ike, nke a na ihe ndị ọzọ mekwara ka m kwaga London na 1932 iji gaa mahadum. Emesịrị m kụzie nkụzi n’ụlọ akwụkwọ ruo afọ anọ, n’ime oge ahụkwa na-esonyere Ọgbakọ Blackheath, otu n’ime nanị ọgbakọ anọ e nwere na London n’oge ahụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka m malitere ịnụ akụkọ banyere ịtụ mkpọrọ na nhụsianya nke ụmụnna nwoke na nwanyị anyị bụ́ ndị Kraịst na Germany nke Hitler n’ihi na ha jụrụ ịkwado mgbalị agha nile nke Hitler.

Na 1938, kpọmkwem ọnwa m kwụsịrị ụgwọ m ji maka akwụkwọ ndị m nwetara, m hapụrụ ọrụ m iji mezuo ọchịchọ m ịghọ onye ọsụ ụzọ. Nwanne m nwanyị bụ́ Beryl malitere ịsụ ụzọ na London n’otu oge ahụ, ma o bi n’ebe obibi ndị ọsụ ụzọ nke dị iche. Onye mbụ mụ na ya sụkọrọ ụzọ bụ Mildred Willett, onye John Barr nke bụ ugbu a onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, mesịrị lụrụ. Tinyere ndị ọzọ nọ n’ìgwè anyị, anyị ga-agbara ịnyịnya ígwè gaa n’ókèala anyị ma nọgide ebe ahụ ụbọchị dum, ọtụtụ mgbe n’agbanyeghị mmiri ozuzo.

Agha amalitelarị ísì na Europe. A na-amụgosi ndị bi na ya iji ihe mkpuchi ihu maka ikuku ọjọọ eme ihe, a na-emekwa nkwadebe iji bupụsịa ụmụaka gaa n’ime obodo dị iche iche nke England ma ọ bụ gaa n’obodo nta dị iche iche ma agha daa. Ego m kpadoro bụ nanị nke ga-ezu iji zụta otu akpụkpọ ụkwụ, e nweghịkwa ohere ọ bụla na maka enyemaka ego site n’aka nne na nna m. Ma ọ̀ bụ na Jisọs ekwughị sị, ‘A ga-atụkwasịrị unu ihe ndị a ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ chọọ alaeze ya’? (Matiu 6:33) Enwere m okwukwe zuru ezu na Jehova ga-egbo mkpa m nile, o mewokwa otú ahụ n’ụba n’afọ ndị a dum. N’ime oge agha ahụ, mgbe ụfọdụ m na-eji akwụkwọ nri dapụrụ mgbe gwongworo ndị juru n’ọnụ gbafere mejuo nri m. Ọtụtụ mgbe m na-enwetakwa nri site n’ịnara mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri dị ka ụgwọ akwụkwọ Bible.

A mụrụ nwanne m nwanyị bụ́ Sonia na 1928. Ọ gbara nanị afọ asaa mgbe ọ raara ndụ ya nye Jehova. Sonia na-asị na ọbụna n’afọ ahụ ọ bụ nwatakịrị, ịsụ ụzọ abụwo ihe mgbaru ọsọ ya. Na 1941, ngwa ngwa o gosipụtasịrị nrara ya nye site na baptism ime mmiri, o rutere n’ihe mgbaru ọsọ ahụ mgbe e kenyere ya na Mama ọrụ dị ka ndị ọsụ ụzọ ịga Caerphilly, South Wales.

Ozi Anyị n’Afọ Ndị ahụ A Lụrụ Agha

Na September 1939, Agha Ụwa nke Abụọ malitere, ụmụnna anyị ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị Kraịst na Britain bụ ndị a na-atụ mkpọrọ n’ihi otu ihe ahụ e ji na-atụ ndị kwere ekwe ibe ha mkpọrọ na Germany ndị Nazi​—⁠nnọpụiche ha n’ihe banyere ikere òkè n’agha. Bọmbụ ndị a tụrụ n’England malitere n’etiti afọ 1940. Kwa abalị, ụda bọmbụ ndị ahụ na-azụwa ntị, ma site n’enyemaka Jehova anyị nwere ike ihitụ ụra ma nwee ume ọhụrụ maka ọrụ nkwusa ahụ n’ụbọchị na-esonụ.

Mgbe ụfọdụ, anyị ga-aga n’ókèala anyị ga-eme nkwusa nanị ịhụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụlọ ndị ahụ bụ ndị e tikpọsịrị etikpọsị. Na November, otu bọmbụ dara nanị mita ole na ole site n’ụlọ ebe ụfọdụ n’ime anyị bi, na-akụwasị window ya iberibe iberibe. Nnukwute ụzọ ihu ya dakasịrị, ebe anwụrụ si akwụpụ dakpọkwara. Mgbe anyị nọsịrị ihe fọrọ n’abalị ahụ n’ebe a na-ezere bọmbụ, anyị kesasịrị ma gaa biri n’ụlọ Ndịàmà dị iche iche.

Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị anatara m ọrụ ịga Croydon, na Greater London. Onye mụ na ya ga-asụkọ ụzọ bụ Ann Parkin, onye nwanne ya nwoke bụ́ Ron Parkin mesịrị bụrụ onye nchịkọta ọrụ nke Kọmitii Alaka na Puerto Rico. E mesịa m kwagara na Bridgend, South Wales, ebe m nọgidere na-asụ ụzọ, na-ebi n’ụlọ ịnyịnya na-adọkpụ ruo ọnwa isii. Site n’ebe ahụ anyị ga-agbara ígwè ruo kilomita isii gaa ná nnukwute ọgbakọ kasị nso, na Port Talbot.

N’oge a, ọha mmadụ na-amalite ịdị na-ewesa anyị nnọọ iwe, na-akpọ anyị ndị conchie (ndị ji obi ha jụ). Nke a mere ka o siere anyị ike ịchọta ụlọ, ma Jehova lekọtara anyị dị ka e kwere ná nkwa.

E mesịa, e kenyere anyị asatọ ọrụ dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na Swansea, obodo dị n’ikpere mmiri dị na South Wales. Ka agha ahụ siwanyere ike, otú ahụ ka asị a kpọrọ anyị kawanyere njọ. E dekwasịrị okwu ndị bụ́ “okè” na “ndị ụjọ” n’elu ájá ebe obibi ndị ọsụ ụzọ anyị. Mkpọrọmasị a bụ nke akụkọ dị iche iche nke akwụkwọ akụkọ bụ́ ndị katọrọ anyị n’ihi nguzo nnọpụiche anyị kpatakarịsịrị. E mesịa, n’otu n’otu, e zigara asaa n’ime anyị mkpọrọ. Anọrọ m otu ọnwa n’ụlọ mkpọrọ dị na Cardiff na 1942, e mesịakwa nwanne m nwanyị Beryl nọkwara oge ụfọdụ n’ebe ahụ. Ọ bụ ezie na ihe onwunwe anyị dị ntakịrị, anyị bụrụkwa ndị a kwara emo na ndị e mere akaje, anyị bara ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ.

Ka ọ dị na mgbe ahụ, Mama na Sonia na-asụ ụzọ na Caerphilly na-enwekwa ahụmahụ ndị yiri nke ahụ. Ọmụmụ Bible mbụ Sonia duziri bụ na nke otu nwaada o mere ndokwa ileta n’uhuruchi Friday. Obi siri Sonia ike na Mama ga-eso ya jee, ma Mama kọwara, sị: “Mụ na onye ọzọ akawo agba. Ọ bụ gị mere ndokwa ahụ, ya mere ị ghaghị ịga nanị gị.” Ọ bụ ezie na Sonia dị nanị afọ 13, ọ gara nanị ya, nwaada ahụ nwekwara ọganihu ime mmụọ dị mma, mesịakwa ghọọ Onyeàmà raara onwe ya nye.

Ọrụ A Rụrụ Mgbe Agha Gasịrị​—⁠E Mesịakwa Gilead

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri na 1945, m na-arụ ọrụ n’otu ókèala dịpụrụ adịpụ na Whaley Bridge, Derbyshire. N’ụtụtụ a mara ọkwa ịchịsa ngwá agha, anyị letara ma kasie ndị agha ahụ gwụsịworo nnọọ ike obi​—⁠ndị o mere ụmụ na-enweghị nne na nna, ndị inyom di ha nwụrụ, na ndị o merụsịrị ahụ.

Ọnwa ole na ole n’ihu, Society chọrọ ndị ọrụ afọ ofufo ịga mee nkwusa na Ireland, bụ́ Agwaetiti Emerald. N’oge ahụ, e nwere nanị ihe dị ka 140 Ndịàmà Jehova n’agwaetiti ahụ, ya mere e lere ya anya dị ka ókèala ndị ozi ala ọzọ. N’ime ọnwa ole na ole, e kenyere ihe dị ka 40 ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ọrụ n’ebe ahụ, esokwa m n’ime ha.

Mgbe m rụsịrị ọrụ ruo oge ụfọdụ na Coleraine na Cookstown n’ebe ugwu, e kenyere mụ na mmadụ atọ ọzọ ọrụ ịga Drogheda n’ụsọ osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ bụ ezie na ndị Ireland nwere ọdịdị ịbụ enyi ma na-ele ọbịa nke ọma, ịkpọasị okpukpe dị ukwuu. N’ihi ya, n’ime otu afọ dum, anyị nwere ike inyefe ọha mmadụ nanị akwụkwọ ọmụmụ Bible ole na ole (n’ezie nanị otu akwụkwọ ukwu na ụfọdụ akwụkwọ nta).

Mgbe anyị nọ na Drogheda, m gbaara ígwè si n’otu ugbo na-aga n’ọzọ mgbe otu onye na-eto eto na-arụ ọrụ n’ugbo si n’ogige ubi mabata n’ike n’okporo ụzọ. O legharịrị anya n’ụzọ ahụ, wee jiri olu dị ala jụọ: “Ị̀ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova?” Mgbe m zara na m bụ, ọ gara n’ihu, sị: “N’abalị gara aga mụ na nwanyị m chọrọ ịlụ rụrụ oké ụka banyere unu bụ ụmụ agbọghọ, anyị wee kesaa. Ọ nọgidere na-ekwu na unu bụ ndị Kọmunist, dị ka ndị ụkọchukwu Katọlik na akwụkwọ akụkọ dị iche iche na-ekwu, ma m rụrụ ụka na ọ pụghị ịbụ eziokwu, ebe unu na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ezoghị ezo.”

M nyere ya otu akwụkwọ nta ịgụ, nke o zoro n’akpa uwe ya, anyị wee mee ndokwa izute ma kwurịta okwu mgbe chi jiri, ebe ọ sịrị: “A hụ ka mụ na gị na-ekwurịta okwu, a ga-achụ m n’ọrụ.” N’abalị ahụ abụọ n’ime anyị zutere ya ma zaa ọtụtụ ajụjụ ya. O yiri ka o kwetara na nke a bụ eziokwu ahụ, o kwekwara nkwa ịbịa n’ụlọ anyị n’abalị ọzọ iji mụtakwuo ihe. Ọ bịaghị ma ọlị, ya mere anyị chere na ọ ghaghị ịbụ na ụfọdụ ndị ji ígwè gbafere matara ya n’abalị mbụ ahụ, ma eleghịkwa anya a chụwo ya n’ọrụ. Anyị na-eche mgbe nile ma o mesịrị ghọọ Onyeàmà.

Mgbe anyị gasịrị mgbakọ distrikti na Brighton n’akụkụ ndịda nke ụsọ osimiri England na 1949, ọtụtụ n’ime anyị natara òkù ịga ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead na New York State. Ngụkọta 26 mmadụ sitere Britain gara klasị nke 15 ahụ, bụ́ nke gụsịrị akwụkwọ na July 30, 1950, n’oge mgbakọ mba nile n’ámá egwuregwu Yankee Stadium.

Ozi Anyị na Brazil

N’afọ na-esonụ e kenyere m ọrụ ịga São Paulo, Brazil, otu n’ime obodo ukwu ndị kasị eto ọsọ ọsọ n’ụwa. N’oge ahụ o nwere nanị ọgbakọ ise nke Ndịàmà Jehova, ma ugbu a e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 600 n’ime ha! Lee ka o si dị iche pụọ n’ịrụ ọrụ na Ireland! Ọtụtụ n’ime ụlọ ndị dị n’ókèala anyị na São Paulo bụ ụlọ ndị ukwu, ndị a gbara ogige ígwè dị elu n’ụzọ dị nkà. Anyị na-eji ịkụkọta aka anyị ọnụ na-akpọ onye nwe ụlọ ma ọ bụ onye odibo nwanyị.

Ka ọtụtụ afọ na-agafe, e kenyere m ọrụ ndị ọhụrụ. Enwere m ihe ùgwù inye aka ihiwe ọgbakọ ndị ọhụrụ n’ọtụtụ ebe n’ime ime steti São Paulo, tinyere otu na Jundiaí na 1955 na ọzọ na Piracicaba na 1958. E mesịa, na 1960, nwanne m nwanyị Sonia ghọrọ onye mụ na ya na-ejekọ ozi ala ọzọ, e kenyekwara anyị ọrụ ịga Pôrto Alegre, isi obodo nke steti Rio Grande do Sul. Olee otú o si bịa Brazil, ka ị pụrụ ịjụ?

Sonia na Mama nọgidere na-asụkọ ụzọ ọnụ n’England mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị. Ma ná mmalite afọ ndị 1950, a wara Mama ahụ n’ihi ọrịa cancer bụ́ nke mere ka ike ghara ịdị ya ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ọ bụ ezie na o nwere ike iduzi ọmụmụ Bible na ide akwụkwọ ozi. Sonia nọgidere n’ọrụ ọsụ ụzọ, n’otu oge ahụkwa o nyere aka ilekọta Mama. Na 1959, Sonia nwere ihe ùgwù nke ịga klasị nke 33 nke Gilead, e kenyekwara ya ọrụ na Brazil. N’oge ahụ, Beryl lekọtara Mama ruo ọnwụ ya na 1962. Beryl alụwo di mgbe ahụ, ya na ezinụlọ ya jikwa ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi.

Na Brazil, mụ na Sonia nyeere ọtụtụ ndị aka iru nraranye na baptism. Otú ọ dị, otu n’ime nsogbu ọtụtụ ndị Brazil nwere bụ nke ime ndejupụta alụmdi na nwunye ha. N’ihi ihe isi ike nke inweta ịgba alụkwaghịm na Brazil, ọ bụghị ihe ọhụrụ mmadụ abụọ ibikọ ọnụ n’alụghị di na nwunye. Ọnọdụ dịkarịsịrị otú a mgbe otu n’ime mmadụ abụọ ahụ kewapụrụ n’onye ọzọ ya na ya nọbu n’alụmdi na nwunye nke e dejupụtara.

Otu nwaada, nke aha ya bụ́ Eva, nọ n’ọnọdụ ahụ mgbe m zutere ya. Di ya nke ya na ya mere ndejupụta kpafuuru ụwa ya, ya mere iji chọta ya, anyị mere ka a maa ọkwa na redio. Mgbe a chọtara di ya, m sooro ya jee n’obodo ọzọ ka di ya ọ bịanye aka n’akwụkwọ ndejupụta nke ga-eme ka o nwere onwe ya ka o wee nwee ike ime ndejupụta ịlụ nwoke na-alụbeghị nwunye nke ya na ya bi. Mgbe a na-anụrụ ikpe ahụ n’ihu ọkà ikpe, ọ gwara mụ na Eva ka anyị kọwaa ihe mere o ji chọọ imezi ọnọdụ alụmdi na nwunye ya. Ọkà ikpe ahụ gosipụtara ijuanya nakwa afọ ojuju mgbe a kọwaara ya nke a.

N’ọnọdụ ọzọ, m so otu n’ime ndị m na-eduziri ọmụmụ Bible jee ime ndokwa ka otu ọkà iwu hụ maka okwu ya. Ọzọ, a gbara ezi àmà banyere alụmdi na nwunye na ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke banyere omume. N’oge nke a ọnụ ahịa nke ịgba alụkwaghịm dị elu nke ukwuu nke na mmadụ abụọ ahụ aghaghị ịrụ ọrụ iji kwụọ ụgwọ ya. Ma nye ndị mmụta Bible ọhụrụ ndị a, mgbalị nile ahụ abụghị na nkịtị. Mụ na Sonia nwere ihe ùgwù ịbụ ndị akaebe nke alụmdi na nwunye ha, e mesịakwa, tinyere ụmụ ha atọ nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, anyị ṅara ntị n’otu okwu Bible n’ebe obibi ha.

Ndụ Jupụtara n’Ihe Omume, nke Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ

Mgbe mụ na Sonia raara ndụ anyị nye Jehova ma ghọọ ndị ọsụ ụzọ, anyị bu n’uche, ma o kwe omume ma ọlị, na ozi oge nile ga-abụ ọrụ anyị ga-arụ ná ndụ. Ọ dịghị mgbe anyị chere oké echiche banyere ihe ga-eme mgbe anyị mewanyere okenye ma ọ bụ ma ọrịa dapụta ma ọ bụ ma e nwee ihe isi ike ego. Ma, dị nnọọ ka Jehova kwere ná nkwa, ọ dịbeghị mgbe a gbahapụrụ anyị aka.​—⁠Ndị Hibru 13:6.

N’ezie, ụkọ ego abụwo nsogbu mgbe ụfọdụ. N’otu oge, mụ na onye ọrụ ibe m tara bredi e tinyere anụ na akwụkwọ nri ruo otu afọ dum, ma ọ dịbeghị mgbe anyị nọrọ agụụ, ọ dịghịkwa mgbe anyị nọ n’ụkọ ihe ndị dị mkpa ná ndụ.

Ka ọtụtụ afọ gafeworo, ume ọrụ anyị adalatawokwa. N’etiti afọ ndị 1980, anyị abụọ nwere ịwa ahụ ndị siri ike nke wetaara anyị ule siri ike, ebe o belatara ọrụ nkwusa anyị nke ukwuu. Na January 1987, a kpọrọ anyị isonye ná ndị na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na Brazil.

Nnukwute ezinụlọ anyị nke ihe karịrị otu puku ndị ozi dị ihe dị ka 140 kilomita ná mpụga São Paulo n’ime ogige nke nwere ụlọ ndị mara mma, ebe anyị na-ebiri Brazil na akụkụ ndị ọzọ nke Ebe Ndịda America akwụkwọ Bible. N’ebe a anyị na-enweta nlekọta ịhụnanya site n’aka ndị ji obi ha na-ejere Chineke ozi. Mgbe mbụ m bịara Brazil na 1951, e nwere ihe dị ka 4,000 ndị nkwusa nke ozi Alaeze ahụ, ma ugbu a e nwere ihe karịrị 366,000! Nna eluigwe anyị dị obi ebere atụkwasịworo anyị n’ezie ‘ihe ndị a nile’ n’ihi na anyị ebuwo ụzọ chọọ Alaeze ya.​—⁠Matiu 6:33.

[Foto dị na peeji nke 22]

Olive na Mildred Willett n’akụkụ ụgbọ mgbasa ozi, 1939

[Foto dị na peeji nke 25]

Olive na Sonia Springate

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya