Ihe Kasị Mma Iji Ndụ M Mee
ḌỊ KA BOB ANDERSON SI KỌỌ
Ihe dị ka afọ iri gara aga, ụfọdụ ndị enyi m jụrụ m sị: “N’ihi gịnị ka i ji na-aga n’ihu ogologo oge otú a dị ka ọsụ ụzọ, Bob?” “Eem,” amụmụrụ m ọnụ ọchị wee sị, “ị̀ pụrụ iche echiche ihe ka mma ime karịa ịsụ ụzọ?”
M DỊ 23 afọ na 1931 mgbe m banyere n’ije ozi ọsụ ụzọ. Ugbu a anọ m n’afọ ndụ m nke 87 ma ka na-asụ ụzọ. Amaara m na m pụghị ijiwo ndụ m mee ihe ọ bụla ka mma. Ka m kọwaa ihe kpatara ya.
Na 1914 a hapụrụ otu traktị n’ụlọ anyị. Ndị bipụtara ya bụ Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. Mgbe Onyeàmà ahụ laghachitere, nne m ji nlezianya gbaa ya ajụjụ banyere ọkụ ala mmụọ. A zụlitewo ya dị ka onye Metọdist Wesley nke ji okpukpe kpọrọ ihe ma ọ dịghị mgbe ọ pụrụ ijikọta ozizi nke ntaramahụhụ ebighị ebi na Chineke nke ịhụnanya. Ozugbo ọ mụtara eziokwu dị n’okwu ahụ, ọ sịrị: “Ana m enwe obi ụtọ karịa ka m nweworo mgbe ọ bụla ọzọ ná ndụ m!”
Nne m kwụsịrị ozugbo izi ihe n’ụlọ akwụkwọ Sunday school ndị Metọdist ma sonyere ìgwè nta nke Ndị Mmụta Bible. Ọ malitere ime nkwusa n’obodo anyị bụ́ Birkenhead, nke chere ọdụ ụgbọ mmiri Liverpool dị ná ngafe Osimiri Mersey ihu, n’isi nso kwa na-eji ịnyịnya ígwè na-agbaga mgbe mgbe n’obodo ndị dị nso. O mere nkwusa n’ókèala a sara mbara n’ihe fọrọ ná ndụ ya wee ghọọ onye a maara nnọọ nke ọma, na-esetịpụrụ ụmụ ya ezi ihe nlereanya. Ọ nwụrụ na 1971 n’afọ ndụ agadi nke 97, bụrụ Onyeàmà na-arụsi ọrụ ike ruo ngwụsị ya.
A kpọọrọ mụ na nwanne m nwanyị, Kathleen, site na Sunday school ndị Metọdist ahụ isonyere mama anyị ná nzukọ ya na Ndị Mmụta Bible. E mesịa, mgbe nna m sonyekwara, nne na nna m dokwara maka ọmụmụ Bible ezinụlọ kwa mgbe n’akwụkwọ bụ́ The Harp of God. Ọmụmụ ihe dị otú ahụ bụ ihe ọhụrụ n’ụbọchị ndị ahụ, ma ntọala a a tọrọ n’oge n’eziokwu ndị bụ́ isi nke Bible nyeghachiri ụgwọ ọrụ bara ụba, ebe mụ na nwanne m nwanyị banyere n’ije ozi ọsụ ụzọ mgbe oge na-aga.
Mama m jigidere echiche nke na ịhụ “Foto Ihe Nkiri nke Okike” ahụ na Liverpool na 1920 bụ ebe ihe nọ gbanweere anyị bụ́ ụmụaka n’ụzọ ime mmụọ, o kwuzikwara ekwuzi. Ọ bụ ezie na m bụ nwata, ihe nkiri ahụ nwere mmetụta ndị miri emi n’uche m. Ihe gbara ọkpụrụkpụ m na-echeta bụ akụkụ na-egosi ndụ Jisọs, karịsịa ka ọ na-egosi ya ka ọ na-aga n’ọnwụ ya. Ahụmahụ ahụ dum nyeere m aka ilekwasị anya n’ọrụ kasị mkpa ná ndụ—ime nkwusa!
Ná mmalite afọ ndị 1920, amalitere m iso nne m na-ekesa traktị n’ehihie Sunday. Na mbụ e nyere anyị ntụziaka ịhapụ ha n’ụlọ ndị mmadụ; e mesịa a gwara anyị ka anyị nyefee ha n’aka ndị nwe ụlọ ma kpọtụghachiri ndị nwere mmasị. Mgbe nile elewo m nke a anya dị ka ntọala mbụ nke ọrụ nletaghachi na ọmụmụ Bible anyị, nke na-amị mkpụrụ nke ukwuu taa.
Ịbanye n’Ije Ozi Ọsụ Ụzọ!
E mere mụ na Kathleen baptism na 1927. M na-arụ ọrụ dị ka onye nnyocha mmiri ọgwụ na Liverpool mgbe, na 1931, m nụrụ nkwupụta okwu ahụ ịnakwere aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ mgbe ahụwo m ndị colporteur (a na-akpọ ha ugbu a ndị ọsụ ụzọ) nke Society ka ha na-arụ ọrụ n’ógbè ịchụ nta ego dị na Liverpool, ihe nlereanya ha masịrị m nke ukwuu. Lee ka o si agụsi m ike inwere onwe m pụọ ná mmekọrịta ndị ụwa, itinye ndụ m n’ije ozi Jehova!
N’oge okpomọkụ nke otu afọ ahụ, enyi m bụ́ Gerry Garrard gwara m na ya anakwerewo otu ọrụ site n’aka onye isi oche nke abụọ nke Watch Tower Society, bụ́ Joseph F. Rutherford, ime nkwusa n’India. Kpọmkwem tupu ọ kwọpụ n’ụgbọ mmiri, ọ bịara leta m ma kwuo okwu banyere ihe ùgwù nke ije ozi oge nile. Ka ọ na-asị ka o mesịa, ọ gbakwuru m ume site n’ịsị, “Eji m n’aka na n’isi nso ị ga-abụ ọsụ ụzọ, Bob.” Otú ahụ ka o mekwara. Edebanyere m aha m n’October ahụ. Lee ihe ọṅụ ọ bụ, lee aha nnwere onwe ọ bụ, ịgba ígwè gabiga okporo ámá ndị dị n’ime ime obodo, na-eme nkwusa n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ! Amatara m mgbe ahụ na m na-etinye aka n’ọrụ kasị mkpa m pụrụ ịrụ.
Ọrụ ọsụ ụzọ mbụ e kenyere m bụ na South Wales ebe m sonyeere Cyril Stentiford. Cyril mesịrị lụọ Kathleen, ha sụkọkwara ụzọ ruo ọtụtụ afọ. Ada ha, Ruth, mesịkwara banye n’ije ozi ọsụ ụzọ. Ka ọ na-eru 1937, anọ m na Fleetwood, Lancashire—bụrụ onye ya na Eric Cooke na-arụkọ ọrụ. Ruo mgbe ahụ, ndị ọsụ ụzọ na-arụ ọrụ nanị n’ime ime obodo dị iche iche nke Britain, ná mpụga ókèala ọgbakọ. Ma Albert D. Schroeder, onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ Society nke dị na London mgbe ahụ, mere mkpebi ịgbanwere anyị ọrụ gaa n’obodo ukwu bụ́ Bradford, Yorkshire. Nke a bụ nke mbụ e kenyeworo ndị ọsụ ụzọ na Britain ọrụ inyere otu ọgbakọ kpọmkwem aka.
Na 1946, Eric gara ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead, e wee ziga ya Southern Rhodesia, nke bụ ugbu a Zimbabwe, ya na nwunye ya ka na-ejekwa ozi n’ikwesị ntụkwasị obi dị ka ndị ozi ala ọzọ na Durban, South Africa.
Afọ ahụ bụ́ 1938 nwetara m n’ọrụ ọzọ e kenyere m, oge nke a dị ka ohu zonu (nke a na-akpọ onye nlekọta sekit ugbu a) maka ebe ugwu ọdịda anyanwụ Lancashire na Lake District mara mma. N’ebe ahụ ezutere m Olive Duckett, mgbe anyị gbasịkwara akwụkwọ, o sonyeere m n’ọrụ sekit ozugbo.
Ireland n’Afọ Ndị ahụ A Lụrụ Agha
Ngwa ngwa mgbe Britain kpọsasịrị agha megide Germany na September 1939, a gbanwere ọrụ m gaa na Ireland. Idebanye aha n’ìgwè ndị agha amalitewo na Britain ma ọ malitebeghị na Republic of Ireland dị n’ebe ndịda, nke nọgidere na-abụ mba nọpụrụ iche n’oge agha ahụ dum. Republic of Ireland na Northern Ireland gaara abụ otu sekit. Otú ọ dị, ihe mgbochi dị iche iche dị irè, ọ dịkwara mkpa ịnata akwụkwọ ikike ime njem iji hapụ Britain maka akụkụ ọ bụla nke Ireland. Ndị isi gwara m na m pụrụ ịgawa, kama m ga-ekwenye ịlọghachite n’England ozugbo mgbe a kpọrọ ndị ọgbọ m idebanye aha n’òtù ndị agha. Ekwenyere m nanị n’ọnụ, ma dị ka ihe ijuanya nye m, mgbe akwụkwọ ikike m bịara, e denyeghị ihe ọ bụla a chọrọ na ya!
N’oge ahụ, e nwere ihe ji ntakịrị gafee 100 Ndịàmà na Ireland nile. Mgbe anyị rutere Dublin na November 1939, Jack Corr, onye sụworo ụzọ ruo ogologo oge, zutere anyị. Ọ gwara anyị na e nwere ndị ọsụ ụzọ abụọ ọzọ n’obodo dị nso na ole na ole ndị nwere mmasị na Dublin, ihe dị ka 20 ná ngụkọta. Jack nwetara otu ọnụ ụlọ na Dublin maka otu nzukọ bụ́ ebe mmadụ nile kwekọrịtara izukọ kwa Sunday. Ndokwa nke a gara n’ihu ruo mgbe e hiwere ọgbakọ na 1940.
Northern Ireland, dị ka akụkụ nke United Kingdom, na-alụso Germany agha, ya mere ka anyị na-akwagharị gaa Belfast, anyị aghaghị iche akwụkwọ ndị e tinyere tiketi e ji enweta nri na ịgba itiri n’abalị ihu. Ọ bụ ezie na ụgbọ elu ndị Nazi aghaghị ifefe 1,600 kilomita n’elu iji ruo Belfast ma laghachi n’ogige ha na Europe, ha jisiri ike tụkasịa obodo ahụ bọmbụ. N’oge mwakpo nke mbụ, e bibiri Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na ụlọ anyị ka anyị na-eleta ụmụnna n’akụkụ ọzọ nke obodo ahụ, ya mere anyị nwere mgbapụ dị ịrịba ama. N’otu abalị ahụ, otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà gbagara n’ebe mgbaba e nwere n’ógbè ahụ. Mgbe ha ruru n’ebe ahụ, ha chọpụtara na o juru eju, ha aghaghịkwa ịlaghachi n’ụlọ ha. A tụrụ ebe mgbaba ahụ kpọmkwem bọmbụ, e gbukwara ndị nile nọ n’ime ya, ma ụmụnna anyị lanarịrị e wezụga mmerụ ahụ ole na ole. N’afọ ndị a siri ike nke agha, ọ dịghị otu n’ime ụmụnna anyị e merụrụ ahụ nke ukwuu, bụ́ ihe anyị na-enye Jehova ekele maka ya.
Inweta Nri Ime Mmụọ
Ka agha ahụ na-aga n’ihu, ihe mgbochi siwanyere ike, e mesịakwa maa iwu inyocha akwụkwọ ozi nile. Nke a pụtara na a na-anọchiri Ụlọ Nche ụzọ ma ghara ikwe ka ọ bata ná mba a. Ọ bụ ezie na anyị chere banyere ihe anyị pụrụ ime, aka Jehova adịghị mkpụmkpụ. N’otu ụtụtụ anatara m akwụkwọ ozi sitere n’aka otu “deede” nọ na Canada bụ́ onye detaara m akwụkwọ banyere ihe ndị metụtara ezinụlọ. Amaghị m onye ọ bụ, ma n’ihe o dere ná ngwụsị akwụkwọ ozi ahụ ọ sịrị na ya na-etinye “otu isiokwu Bible na-akpali mmasị” ka m gụọ. Ọ bụ otu Ụlọ Nche, ma ebe ọ bụ na ihu ya adịghị ka ọ na-adịbu, ndị nnyocha akwụkwọ ozi ewepụghị ya.
Ozugbo mụ na nwunye m, site n’enyemaka Ndịàmà obodo ahụ, tinyere Maggie Cooper onye nọworo n’ọrụ “Foto Ihe Nkiri” ahụ, malitere ibipụtaghachi isiokwu ndị ahụ. Ngwa ngwa anyị haziri onwe anyị izipụ 120 n’ime ya gburugburu mba ahụ, ka magazin Ụlọ Nche ndị ihu ha na-adịghị ka ha na-adịbu nọgidere na-erute site n’aka ọtụtụ ndị enyi ọhụrụ na Canada, Australia, na United States. N’ihi ịdị uchu na obi ọma ha, ọ dịghị mbipụta kwara anyị n’oge agha ahụ dum.
Anyị nwere ike inwekwa mgbakọ. Nke pụrụ iche bụ mgbakọ 1941 mgbe e wepụtara akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Children. O yiri ka onye nnyocha akwụkwọ ozi ahụ emegideghị akwụkwọ nke o chere na ọ bụ banyere ụmụaka, ya mere anyị nwere ike ibubata ùkwù nke anyị ná mba ahụ n’enweghị nsogbu ọ bụla! N’oge ọzọ, anyị biri akwụkwọ nta bụ́ Peace—Can It Last? ná mba a n’ihi na o kweghị omume ibubata ya site na London. N’agbanyeghị ihe mgbochi nile e tinyeere anyị, e lekọtara anyị nke ọma n’ụzọ ime mmụọ.
Imeri Mmegide
Otu ụkọchukwu nọ n’ụlọ ọgwụ ebe a na-elekọta ndị nwere nkwarụ na Belfast bụ́ nke otu n’ime Ndịàmà Jehova na-ahụ maka ya zigaara nwunye ya nọ n’England otu akwụkwọ Riches. Nwunye ya na-eguzogide eziokwu ahụ, ná nzaghachi ya o mekwara ka o doo anya. O bokwara ebubo bụ na anyị bụ “nzukọ na-adịghị ahụ mba n’anya.” Onye nnyocha akwụkwọ ozi ahụ weere ya ma kpee okwu ahụ ná Ngalaba Na-enyocha Mpụ. N’ihi ya, a kpọrọ m òkù ịbịa n’ogige ndị uwe ojii inye nkọwa, a gwakwara m ka m weta otu akwụkwọ Riches. N’ụzọ na-akpali mmasị, mgbe e mesịrị weghachi akwụkwọ ahụ, achọpụtara m na akụkụ ndị a kara ihe n’okpuru bụcha banyere Chọọchị Roman Katọlik. Echere m na nke a kwesịrị ịrịba ama, ebe m maara na ndị uwe ojii nọ ná nche megide ọrụ ndị IRA (Irish Republican Army).
A jụkasịrị m ahụ banyere nnọpụiche anyị n’oge agha, n’ihi na nguzo anyị siiri ndị uwe ojii ike ịghọta. Ma ndị isi adịghị mgbe ha mere ihe ọ bụla megide anyị. E mesịa, mgbe m chọrọ ikike inwe mgbakọ, ndị uwe ojii siri ọnwụ na ha ga-ezite ndị uwe ojii abụọ na-achụ nta akụkọ. Asịrị m, “Anyị ga-anabata ha!” Ya mere ha bịara nọrọ oche ná nzukọ ehihie ahụ dum, jiri aka akwụkwọ pụrụ iche na-edetu ihe. Ná ngwụsị nke nnọkọ ahụ, ha jụrụ, sị, “N’ihi gịnị ka e ji zite anyị n’ebe a? Ọ tọgbuola anyị!” Ha bịara ọzọ n’ụbọchị na-esonụ ma jiri obi ụtọ nara akwụkwọ nta bụ́ Peace—Can It Last? nke e nyere n’efu. Ihe fọrọ ná mgbakọ ahụ gabigara n’enweghị ihe merenụ.
Ozugbo agha ahụ biri, e wepụkwa ihe mgbochi ime njem, Pryce Hughes si Betel nke London bịara Belfast. Harold King, onye e mesịrị ziga China dị ka onye ozi ala ọzọ, so ya bịa. Mgbe afọ isii nke esoghị alaka ụlọ ọrụ London nwee mmekọrịta gasịrị, a gbara anyị nile ume nke ukwuu site n’okwu ụmụnna ndị a kwuru. Ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị, e si England zite Harold Duerden, onye ọsụ ụzọ ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi iwusi ọrụ Alaeze ahụ ike na Belfast.
Ịlaghachi England
Anyị etolitewo ịhụ ụmụnna anyị bụ́ ndị Ireland n’anya, ọ bụkwa ihe siri ike ịlaghachi England. Ma e kenyere mụ na nwunye m ọrụ ịgaghachi Manchester, e mesịakwa ziga anyị Newton-le-Willows, obodo ọzọ nke Lancashire ebe e nwere mkpa ka ukwuu. A mụrụ Lois, ada anyị, na 1953, ọ bụkwa ihe obi ụtọ ịhụ ka ọ banyere n’ozi ọsụ ụzọ n’afọ ndụ nke 16. Mgbe ọ lụsịrị David Parkinson na-asụ ụzọ, ha gara n’ihu n’ije ozi oge nile ha na Northern Ireland, n’ọtụtụ ụzọ na-azọgharị ije n’otu ụzọ ndị ahụ mụ na Olive zọworo ije. Ugbu a, ha na ụmụ ha alaghachitewo n’England, anyị nile na-ejekwa ozi n’otu ọgbakọ.
N’agbanyeghị mgbanwe n’ọnọdụ anyị, ọ dịghị mgbe m kwụsịrị ịsụ ụzọ—Olive achọghị ya ma ọlị, achọghịkwa m ya. Ọ dịwo m mgbe nile ka mụ na nwunye m ànyị kerịtara ihe ndekọ ozi ọsụ ụzọ m n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ihi na e wezụga nkwado ịhụnanya ya na-adị mgbe nile, m garaghị enwe ike ịnọgide n’ije ozi oge nile. N’ezie, ike na-agwụ anyị abụọ ngwa ngwa karị ugbu a, ma ịgba àmà ka bụkwa ihe ọṅụ, karịsịa mgbe anyị abụọ nọkọrọ ọnụ, na-eduziri ndị agbata obi anyị ọmụmụ Bible. N’afọ ndị ahụ, anyị enwewo ihe ùgwù nke inyere ihe dị ka otu narị mmadụ aka ịghọ ndị ohu raara onwe ha nye, e mere baptism, nke Jehova. Lee aha ihe ọṅụ ọ bụworo! Ọ dịkwa m ka ka ọ dị ugbu a, à ga-amụbawo ọnụ ọgụgụ a ugboro ugboro ka ezinụlọ dị iche iche na-eru ọgbọ nke atọ na anọ ghọwokwara Ndịàmà.
Ọtụtụ mgbe mụ na Olive na-ekwu banyere ọtụtụ ihe ùgwù na ahụmahụ anyị n’ọtụtụ afọ ndị a. Lee aha afọ ndị na-enye obi ụtọ ha bụworo, leekwa ka ha siworo gabiga ngwa ngwa! Amaara m na m garaghị achọtawo ihe ka mma iji ndụ m mee karịa ijere Chineke m, Jehova, ozi dị ka ọsụ ụzọ n’afọ ndị a dum. Ugbu a, ma ọ̀ bụ n’iji obi ekele leghachi anya azụ ma ọ bụ n’iji atụmanya na-elepụ anya n’ihu, ana m achọpụta na okwu Jeremaịa dị irè nke ukwuu: “O sitere n’ebere nile nke Jehova na e meghị ka anyị gwụsịa, n’ihi na obi ebere Ya nile agwụghị. Ha dị ọhụrụ kwa ụtụtụ. . . . N’ihi nke a ka m ga-echere Ya.”—Abụ Ákwá 3:22-24.
[Foto dị na peeji nke 26]
Bob na Olive Anderson