Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ndị Chineke Na-enye Onwe Ha n’Afọ Ofufo
AHA ya bụ Josef, ọ bụkwa onye àgwàetiti Saịprọs. O so ná ndị Kraịst narị afọ mbụ ndị rere ubi na ụlọ iji nye ego maka ọganihu nke Iso Ụzọ Kraịst. N’ihi obi ikpo ọkụ na mmesapụ aka ya, a matara ya dị ka Banabas, nke pụtara “Nwa nke nkasi obi.”—Ọrụ 4:34-37.
Ezi mmasị dị otú ahụ n’ebe ndị ọzọ nọ abụwo ihe e ji amata ezi ndị na-efe Jehova ofufe mgbe nile. Ndịàmà Jehova taa adịghịkwa iche, dị ka ahụmahụ na-esonụ nke sitere na Solomon Islands na-egosipụta.
Ìgwè nke ihe karịrị 60 Ndịàmà si Australia na New Zealand gara Honiara, isi obodo nke Solomon Islands dị na Guadalcanal. Ha bịara inye aka n’owuwu nke otu Ụlọ Mgbakọ maka mgbakọta buru ibu nke ndị Kraịst. O were ha nanị ihe dị ka izu abụọ iji wuo otu ụlọ nzukọ pụrụ ịbata ihe dị ka 1,200 mmadụ!
N’ihe dị ka n’otu oge ahụ, ndị isi ọchịchị nke obodo nta bụ Munda, n’àgwàetiti New Georgia, nyere ọgbakọ Ndịàmà Jehova otu ibé ala kpọmkwem n’etiti obodo ahụ. Ha chọrọ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ebe a na-efe ofufe. Ha nwekwara nnọọ mkpa maka ya. Ha anọwo na-ezukọ na palọ otu obere ụlọ akịrịka, ma ha enweghị ego iji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze.a Ihe mejupụtara ọgbakọ ahụ bụkarịrị ndị agadi na ndị nwere nkwarụ na ụmụaka, ọ dịghịkwa onye nwere ahụmahụ ná nkà iwu ihe owuwu.
Ihe dị ka 380 kilomita site n’ebe ahụ, n’àgwàetiti Guadalcanal, Ndịàmà nọ n’obodo Honiara nyere onwe ha n’afọ ofufo. (Abụ Ọma 110:3) Ha chere, sị: “Ọ bụrụ na ụmụnna anyị bi ná mba ndị ọzọ dị njikere iwuru anyị Ụlọ Mgbakọ n’ime izu abụọ, mgbe ahụ anyị pụrụ n’ezie inyere ụmụnna anyị na Munda aka iwuru ha Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ime izu abụọ.”
Ọ bụ ihe mere. Otu ụbọchị otu ụgbọ epeepe bu ndị ọrụ afọ ofufo bụ́ Ndịàmà nwere obi ụtọ ma na-anụ ọkụ n’obi rutere Munda. Ndị ikom na ndị inyom, ndị agadi na ndị na-eto eto, ha nile tinyere onwe ha n’ọrụ n’ibupụtasị ihe dị n’ụgbọ mmiri ahụ ma kwadebe maka ịmalite iji osisi, simenti, ígwè e ji akụ uko ụlọ, na ihe ndị ọzọ bụ́ ndị ruteworo Munda tupu ha erute wuo ụlọ.
Ngwa ngwa ka ọrụ ahụ malitesịrị, otu ajọ égbè eluigwe kpaghasịrị usoro mmiri pọmpụ nke obodo ahụ. Otú ọ dị, nke a aghọghị nsogbu a na-apụghị imeri emeri. Ndịàmà ahụ gwuru otu olulu mmiri nke nyere mmiri n’oge ọrụ owuwu ihe ahụ dum. Gịnị banyere nri maka ndị ọrụ ahụ dum? Nke ahụ abụghịkwa nsogbu. E jiwo ụba nke ihe oriri nke ọgbakọ ndị dị na Honiara nyere wee zipụ ndị ọrụ afọ ofufo ahụ sitere Honiara. Ha kpọ ọbụna ndị osi ite nke ha!
Ndị agbata obi kiriri ọganihu nke ihe owuwu ahụ n’ijuanya. Otu n’ime ha sịrị: “Ihe adịghị emekebe n’ime ụbọchị ole na ole n’ebe a. Ha na-ewe ọtụtụ afọ.” Onye agbata obi ọzọ, bụ́ onye ndú okpukpe, kwetara na chọọchị ya abụwo nke a nọ na-ewu n’afọ 20 gara aga nakwa na e wusịbeghị ya. N’ụzọ dị iche, e wusịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ nke Ndịàmà Jehova na Munda nanị n’ime ụbọchị iri!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A na-eji ihe ndị e gbuchatara n’ọhịa ewu ụlọ akịrịka. A na-eji osisi ewu ide ya, jirikwa igu nkwụ a kpakwasịrị n’elu mkpirisi osisi ma were ụdọ kedo ha kpuchite elu na mgbidi ya.
[Map ndị dị na peeji 24]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Oké Osimiri South Pacific
SOLOMON ISLANDS
Munda
GUADALCANAL
Honiara
[Map]
AUSTRALIA
NEW ZEALAND