Mmụba Nọgidere Na-aga n’Ihu Na-amụba Mkpa E Nwere Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze
1 Ogologo oge gara aga onye amụma Jehova buru amụma na “ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa.” (Hag. 2:7) Ugbu a anyị na-ahụ ka ọtụtụ ìgwè mmadụ na-amụta eziokwu ahụ ma na-aghọ ndị na-efe Jehova ofufe. Lee ka o si bụrụ ihe na-akpali akpali ịhụ ka e mere 11,624 baptism n’usoro mgbakọ 1996 na Nigeria nanị! Iji nọgide na-enyere ndị ọhụrụ a nile aka, ọ dị anyị mkpa ‘ịtụkwasị obi anyị n’ụzọ nile anyị’ iji jide n’aka na anyị na-akwado ọrụ Chineke ruo n’ókè zukarịsịrị ezu o kwere mee. (Hag. 1:5) Otu ụzọ dị mkpa anyị pụrụ isi mee nke a bụ site n’inye aka ime ka e nwee ụlọ ofufe ndị kwesịrị ekwesị maka ọtụtụ ndị ọhụrụ na-eto Jehova.
2 A nọwo na-eji Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme ihe ruo afọ asaa ugbu a, o mewokwa ka o kwe ọgbakọ 105 mee inweta ihe owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ma ọ bụ ndị a rụzigharịrị arụzigharị. Nzaghachi nke ndị nkwusa n’inye nkwado ego n’ụtụ ego a abụrụwo ihe na-enye obi ụtọ n’ezie. A na-akwụghachi ego ndị a gbazinyere ọgbakọ dị iche iche ka e wee nọgide jiri ego nile e nyere n’onyinye na-eme ihe, kwa afọ, iji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ.
3 Enyemaka Site n’Aka Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè: Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè 25 e nwere na Nigeria na-enyere ndị okenye tinyere aka n’ọrụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze aka. Ha na-enye aka achọpụta mkpa e nwere maka Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ma ọ bụ iwugharị ụlọ nzukọ nke dị adị na inye enyemaka sitere n’èzí dị ka a chọrọ malite mgbe a na-azụtabeghị ala ruo mgbe e wusịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze. E kenyere ọgbakọ ọ bụla n’otu n’ime kọmitii ndị a.
4 Ọtụtụ puku ndị ọrụ dị njikere ewepụtawo onwe ha n’afọ ofufo ikere òkè n’ọrụ ịrụzigharị Ụlọ Nzukọ Alaeze na iwu ndị ọhụrụ. Ndị ọrụ afọ ofufo a, gụnyere ọtụtụ ndị ọkà na ndị ọrụ aka, na-ewepụta oge na mgbalị ha n’efu n’okwu ndị dị ka ịzụta ala, ime atụmatụ ihe owuwu ahụ, na idepụta ihe ndị a ga-azụta. Ha na-enyekwa aka n’ịzụta ihe ndị bụ ọkpọka n’ọnụ ahịa dị mma, na-arụzu ọrụ mbụ n’ebe ahụ a ga-ewu ihe, na ilekọta iwu ihe ahụ kpọmkwem. Ụdị inye ihe mmesapụ aka dị otú ahụ nke ihe onwunwe ha a raara nye n’ihi ọdịmma Alaeze kwesịrị ịja mma karịsịa ma na-eweta ngọzi bara ụba site n’aka Jehova.—Ilu 11:25.
5 Ndị okenye kwesịrị ịkpọtụrụ Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè ha mgbe mbụ ọgbakọ ha na-atụle ịrụzigharị Ụlọ Nzukọ Alaeze dị adị ma ọ bụ iwu nke ọhụrụ. N’ihi gịnị? Kọmitii ógbè ndị ahụ nwere ụkpụrụ nduzi ndị pụrụ inyere ọgbakọ dị iche iche aka ná ntụle mbụ ha. Ịhọrọ ebe a ga-ewu ihe na-agụnye ọtụtụ ihe tụkwasị n’ego ole a ga-eji zụta ala ahụ. Ihe ndị ọzọ pụrụ ịmụba ọnụ ahịa nke ala ahụ kpọmkwem n’ụzọ dị ukwuu, dị ka ọrụ dị ukwuu n’ebe a ga-ewu ihe, mwepụ nke ihe ndị dị ize ndụ ma ọ bụ na-egbu egbu, ma ọ bụ okwu metụtara iwu. Ọ bụrụ na ọgbakọ chọrọ enyemaka ego site n’aka Society, kọmitii ógbè ndị ahụ nwere ọtụtụ fọm Kingdom Hall Loan Survey, ha pụkwara inyere ndị okenye ọgbakọ aka idejupụta ndị a.
6 Society enyewo Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè ụkpụrụ ala ụlọ a tụrụ aro ha maka Ụlọ Nzukọ Alaeze. Tupu a họrọ otu ụdị, ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịkpọtụrụ kọmitii ógbè ma tụlee ọdịdị ihe owuwu ahụ n’ozuzu ya, na-eji ụkpụrụ ndị ahụ Society nyere emere ihe nduzi. Ọ bụghị nanị na nke a ga-ebelata mmefu iwu ihe, kama ọ ga-enyekwara ọgbakọ aka ịhọrọ ihe owuwu dị mma nke ga-adabakwa n’ụzọ iwu ihe ngwa ngwa.
7 A ghaghị inwe ihe ndekọ ego ziri ezi na nke zuru ezu. Ụmụnna ma nke a na-akọ ewepụtawo onwe ha n’afọ ofufo iso kọmitii ógbè rụkọọ ọrụ iji nyere ọgbakọ dị iche iche aka n’iguzobe usoro ime ndekọ ego dị mkpa na ijigide ya. Nke a na-enye aka nke ukwuu, ebe ndị okenye ọgbakọ na-adịghị ejikarị ihe ndekọ ego dị otú ahụ nke Ụlọ Nzukọ Alaeze arụ ọrụ oge nile dị ka ụmụnna ndị a nwere ahụmahụ, ndị a zụkwara azụ na-eme. Mgbe a rụsịrị ọrụ ahụ, kọmitii ógbè kwesịrị ịnata otu ihe ndekọ ego zuru ezu maka ihe owuwu ahụ.
8 Ná mba ndị ọzọ, ụmụnna azụlitewo ụzọ iwu ihe ngwa ngwa iji wusịa Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ n’ime ụbọchị ole na ole nanị. Olee banyere Nigeria? O doro anya na iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị nnọọ ala karịa mkpa nke ọnụ ọgụgụ ọgbakọ nọgidere na-amụba na Nigeria. A na-ewerekarị iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ka ọrụ na-adịghị agwụ agwụ. N’etiti afọ 1996, Society malitere ime atụmatụ itinye ụzọ iwu ihe ngwa ngwa ahụ n’ọrụ. Na mbụ, ọtụtụ nwetụrụ obi abụọ ma à pụrụ ime ya n’ebe a ebe ọ bụ na ihe ndị e ji ewu ụlọ dị iche n’ihe e ji ewu ihe n’ofesi. Ma, site n’ịdabere n’ụzọ zuru ezu n’ebe Jehova nọ, ọrụ ahụ gara n’ihu. Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ e si otú a wuo na Nigeria kwụụrụ n’obodo nta bụ́ Ewossa, nke dị kilomita 51 site na Betel dị n’Igieduma. Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ nwere ohere ga-abata mmadụ 150.
9 Olee otú o si mee? E ji ụmụnna nwere ahụmahụ mee ihe n’ime atụmatụ, ịgbakọ ihe ọ ga-efu, na ịzụta ihe ndị dị mkpa. A haziri ndị ọrụ dị ka aka ọrụ ha si dị. A gwara ọgbakọ ihe ndị a chọrọ na ọrụ dị mkpa a ga-arụ tupu oge iwu ihe ahụ kpọmkwem eruo. Ụdị ọrụ mbụ ndị ahụ were ihe dị ka ọnwa isii. Iwu ihe ngwa ngwa ahụ n’onwe ya were ụbọchị 15. E ji ihe ndị e ji ewu ụlọ e nwere ná mba a mee ihe, gụnyere brik e ji ọkụ mịkpọọ ndị e ji ewu ihe, ágbá maka ahụ ájá ime, gbam gbam, na ohiere osisi maka elu ụlọ.
10 N’ime ụbọchị atọ, e wusịrị mgbidi nile nke ma Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ ma nke ụlọ mposi ahụ. N’ime ụbọchị atọ ọzọ, e tesịrị ahụ ájá ime nke ụlọ abụọ ahụ plasta. Ịkụ elu ụlọ were nanị otu ụbọchị. Uko ụlọ, itinye ngwongwo eletrik, ịhado ala, ite ágbá, itinye ibó ụzọ na window, na itinye oche kụụrụ ọnụ n’ime ụbọchị 15. A raara Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ nye na January 25, 1997.
11 O nwere Mmetụta n’Ahụ Ndị Na-ahụ Ihe Na-emenụ: Ịrụ ọrụ doro anya nke mmụọ nsọ Jehova n’ahụ ụmụnna ahụ na-arụ ọrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche abụrụwo àmà nye ndị ọzọ. N’Ewossa, otu nwa okorobịa bịara n’obodo nta ahụ hụrụ ụmụnna ka ha na-arụ ọrụ nkwadebe maka ụbọchị na-esonụ. Mgbe ọ bịaghachiri n’izu na-esonụ, ndị ikwu ya kwuru, sị: “Ndị Jehova ewusịala ụlọ ha.” Mgbe ọ na-aga ileta onye ikwu ya, o si n’okporo ámá ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ dị gafere. O guzoro otu ebe ma kwuo, sị: “Enwere m mmasị dị ukwuu n’ịrụkọ ọrụ ọnụ dị n’etiti ndị Jehova a. Ọ dị m ka ya bụrụ na m pụrụ isonyere ha n’ọrụ ahụ.”
12 Onojie (onye eze ọdịnala) nke ógbè ahụ kwuru, sị: “Nke a bụ ihe ịnya isi nye ógbè anyị. Enwere m mmasị n’ihe unu ji ịdị n’otu unu eme. Jidenụ ka unu ji. Ugbu a m ga na-agwa ndị hụrụ ihe ọma n’anya ka ha gaa hụ ihe Ndịàmà Jehova na-eme.”
13 Ma ndị agadi ma ụmụaka keere òkè n’ihe owuwu ahụ. Ndị ikwu na-emegide emegide nke otu nwoke dị afọ 70, bụ́ onye nọ mgbe nile a na-ewu ihe ahụ, gwara ya ka ọ kwụsị ịbịa n’ebe ahụ. “Ọ bụrụ na ị kwụsịghị, ihe ọjọọ ga-adakwasị gị,” ka ha kwuru. Nwoke ahụ zara, sị: “Kemgbe m nọ na-aga nzukọ ha, ọ dịbeghị ihe ọjọọ mere m. Ihe anyị na-arụzu ugbu a na-enyekwa m obi ụtọ ọ bụ ezie na mụ apụghị ime ihe dị ukwuu.” Mgbe ndị ikwu ya jere leta ebe ahụ a na-ewu ihe n’onwe ha wee hụ na ọ fọrọ nke nta ka e wusịa ụlọ ahụ, ha kwụsịrị inye ya nsogbu.
14 Ọ bụ ọchịchọ anyị ka e gosi ụzọ iwu ihe a n’akụkụ nile nke mba a. E ji ihe owuwu ahụ dị n’Ewossa zụọ ndị Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè atọ na ndị ọrụ ha nwere nkà. A kwadebewo ha ugbu a iwu ihe owuwu yiri ya n’agụnyeghị Society n’ụzọ na-adịghị mkpa. Site n’ime ezi atụmatụ a ga-eme ka ọzụzụ dị otú ahụ rute ndị nile wepụtara onwe ha n’afọ ofufo. Ọgbakọ ndị na-eche echiche iwu ma ọ bụ iwugharị Ụlọ Nzukọ Alaeze ha n’ọdịnihu ma chọọ iji ụzọ iwu ihe a mee ihe pụrụ ịgwa Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè maka ógbè ha. E nyewo ha ihe ọmụma banyere ihe ndị a chọrọ. E kwesịkwara izigara Society akwụkwọ ozi arịrịọ ma ọ bụrụ na unu chọrọ iji ụzọ iwu ihe ngwa ngwa ahụ mee ihe, ebe ọ bụ na ọ bụghị Ụlọ Nzukọ Alaeze nile ka e ji ụzọ iwu ihe ngwa ngwa na-ewu.
15 A Chọkwuru Ndị Ọrụ Afo Ofufo: Kọmitii ógbè na-akọ na a chọkwuru ọtụtụ ndị ọrụ afọ ofufo. Nke a bụ ozi dị mkpa n’ịkwado ọdịmma Alaeze. (1 Kọr. 15:58) A chọrọ ndị ọrụ nwere nkà, chọọkwa ụmụnna nwoke ndị ọzọ tozuru okè ndị nwere iru eru ime mmụọ, ọ bụrụgodị na ha enweghị nkà n’ọrụ iwu ihe. Ọ bụrụ na i ruru eru, ị̀ pụrụ ime mgbanwe ụfọdụ ka i wee nwee ike ịnọ n’ọnọdụ iwepụta onwe gị n’afọ ofufo? (Aịsa. 6:8) Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi pụrụ inwe ike inye aka n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze n’otu ngwụsị izu ma ọ bụ abụọ kwa ọnwa. Ha pụrụ ịnata ọzụzụ n’ọrụ dị iche iche, ọbụna n’ọrụ ndị na-abụghị iwu ihe. Nke a ga-abụ ihe enyemaka nye ụmụnna ahụ na-arụsi ọrụ ike bụ́ ndị na-elekọta ihe owuwu ndị a.
16 Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè na kọmitii iwu ihe nke ọgbakọ na-ahazi ndị ọrụ afọ ofufo ka ha wee nọrọ ebe a na-ewu ihe nanị mgbe a chọrọ enyemaka ha. Ndị ọrụ afọ ofufo a na-alaghachi n’ọgbakọ ha si bịa na n’ezinụlọ ha ngwa ngwa o kwere mee ma ghara ịhapụ ikere òkè ná nzukọ na n’ozi ubi n’ụzọ na-adịghị mkpa. Ndị nọ n’ebe a na-ewu ihe bụ (1) ndị ọrụ afọ ofufo a nwapụtara bụ́ ndị ndị isi ngalaba kenyere kpọmkwem ịnọ ya, na (2) ndị si n’ọgbakọ ndị dị n’ógbè ebe a na-ewu ụlọ nzukọ ahụ bụ́ ndị na-emejupụta ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ na-enweghị nkà. A na-agba ndị ọzọ ume ịkwado ije ozi ubi na nzukọ n’ọgbakọ ha.
17 Ee, ndị na-ekere òkè n’iwu ụlọ maka ofufe Jehova na-achọpụta Abụ Ọma 127:1 ịbụ eziokwu. Ọ bụ ezie na ndị ọrụ nwere nkà na-ewepụta oge na mgbalị ha n’afọ ofufo maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị mara mma ngwa ngwa, ọ bụ ngọzi Jehova na-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma. Anyị ka chọkwuru Ụlọ Nzukọ Alaeze. Kemgbe a malitere ya, Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze enwewo ike inyere ọtụtụ ọgbakọ aka n’ihe owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Ka anyị nile nọgide na-enye oge na ‘akụ̀’ anyị n’afọ ofufo ka anyị na-elegara Jehova anya ịgọzi mgbalị anyị.—Ilu 3:9.
[Foto ndị dị na peeji nke 4]
Ụlọ Nzukọ Alaeze Ọhụrụ ahụ Dị n’Ewossa
Ụbọchị nke 9 nke ihe owuwu
Ụlọ Nzukọ Alaeze e wusịrị n’ụbọchị nke 15