Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Nigeria
1 Mgbe anyị lere anya n’ubi zuru ụwa ọnụ, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịhụ oké mmụba nke nzukọ elu ala Jehova na-enwe! N’afọ gara aga na Nigeria nanị, e hiwere ọgbakọ 172 ndị ọhụrụ, ebe a tụkwasịrị ngụkọta nke ọgbakọ 3,348 n’ụwa nile. N’ihi uto a nile, ọ bụghị ihe ijuanya na e nwere mkpa maka inwekwu Ụlọ Nzukọ Alaeze.
2 Ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-egosi ịnụ ọkụ n’obi na nkwado dị ịrịba ama maka nzukọ Jehova site n’iwepụta oge na ihe onwunwe ha n’afọ ofufo n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè 25 e nwere na Nigeria na-ahụ maka mkpa nke ihe dị ka ọgbakọ 160 dị n’ógbè ha dị iche iche. E nyefewo kọmitii ógbè ndị ahụ ọrụ ilekọta iwu na idozigharị ihe owuwu dị iche iche, anyị nwekwara ekele maka mgbalị ha. A na-emezu ndokwa ahụ dum maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze site na mmụọ inye ihe na ịchụ onwe onye n’àjà nke ndị Kraịst—nke dị iche na mmụọ a na-egosipụtakarị n’ụwa.—2 Tim. 3:2, 4.
3 Iji nye aka mee ka Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche nwee otu ụkpụrụ, Society enyewo kọmitii ógbè dị iche iche ụkpụrụ ihe osise maka Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nke a ga-enye aka belata ma oge ma iji ndị ọrụ afọ ofufo na-eme ihe. Ọ ga-enyekwa aka n’iji Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme ihe n’ụzọ amamihe. Ugbu a ndị okenye pụrụ isi n’ihe osise ndị a bụ́ isi họrọ nke ha chọrọ. Inwe ihe osise a ga-enye aka mee ka e nwee Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị yiri ibe ha, ndị nwere otu ụkpụrụ karị. Ka ọgbakọ dị iche iche na-erube isi n’ịkwado ime ka Ụlọ Nzukọ Alaeze nwee otu ụkpụrụ, anyị na-atụ anya na a ga-ebelata ibu nke ọtụtụ ndị na-atụ ụkpụrụ ụlọ, ndị na-ese ụkpụrụ, ndị injinịa, na ndị ọrụ ndị ọzọ nwere nkà bụ́ ndị raara onwe ha nye, ndị ji afọ ofufo na-enye aka.
4 Ihe Karịrị Otu Ụzọ Isi Mee Ya: Mkpebi banyere ma à ga-agbazite ma ọ bụ wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ọgbakọ dị iche iche na-eme ya n’onwe ha. Ha na-ahụkwa maka mmefu ọ bụla nke iwu ihe na nlekọta. Iji zere imefu oké ego, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ọgbakọ agbalịwo ịrụ ọrụ iwu ihe ahụ ruo n’ókè o kwere mee site n’enyemaka nke ndị ọrụ afọ ofufo nwere nkà.
5 A pụru iji brik, blọọkụ siment, ájá, osisi, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ wuo ụlọ nzukọ ndị ahụ, na-adabere n’ihe ọ ga-efu nakwa ihe e nwere na ihe a kasị ahụ n’ógbè. Ọ dị mwute ikwu na e wusịbeghị ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọgbakọ malitere ọbụna mgbe ọtụtụ afọ gafeworo. Ndị ụfọdụ nwere mmasị ejiriwo otú ma ọ bụ ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ụfọdụ dị mere ihe ngọpụ maka ịkwụsị ịga nzukọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mgbe e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị kwesịrị ekwesị na ndị dị mma, ọ ga-enye aka mee ka ọha mmadụ bi n’ógbè ahụ hụ ịdị mkpa nke ọrụ ahụ.
6 Otu ihe mere Ụlọ Nzukọ Alaeze pụrụ iji nọgide bụrụ nke a na-ewusịghị ruo ọtụtụ afọ nwere ike ịbụ n’ihi na ọgbakọ malitere ụlọ nzukọ nke bubigara ibu ókè ma ọ bụ malite ụdị ihe owuwu dị oké ọnụ, nanị imesịa chọpụta na ha apụghị iwusị ya n’ihi enweghị ego. Ọtụtụ ‘ebughị ụzọ nọdụ ala gụọ ego ọ ga-ewe’ iji hụ ma ndị nkwusa hà ga-akwụli ụgwọ ihe ọ ga-efu iji wusịa ihe owuwu ahụ. (Luk 14:28) Ndị ọzọ ji ntakịrị ego malite, bụrụkwa ndị na-aghaghị ịkwụsị ruo ọtụtụ afọ tupu ha enwee ike ịmaliteghachi. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ ahụmahụ unu, biko kpọtụrụnụ Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè nke ógbè unu. A gwawo ha ka ha tinye mgbalị ha karịsịa n’iwusị ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ka o kwere mee bụ́ ndị a na-ewusịbeghị ka e wee rara ndị a nye.
7 Iji ụzọ iwu ihe ngwa ngwa na-eme ihe bụ ụzọ ọzọ nke isi malite ma wusịa ihe owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mkpirikpi oge. Ọgbakọ ndị na-eme atụmatụ iwu ụlọ nzukọ ọhụrụ kwesịrị ịtụle ụzọ iwu ihe ngwa ngwa. Ọ ka na-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta na a pụrụ ịmalite ma wusịa ihe owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze maka ịrara ya nye n’ime otu ọnwa. Otú ọ dị, e gosipụtara nke a n’ebe abụọ na Nigeria (Ewossa, Edo State, na Dopemu, Lagos State), ụmụnna ṅụrịkwara ọṅụ ịhụ ya. Obi ga-atọ anyị ụtọ ịhụ ka e wuru ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọzọ otú a.
8 Na Lagos, a malitere iwu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze afọ 25 gara aga. Na nso nso a, ọgbakọ ndị ji ụlọ nzukọ ahụ eme ihe kpebiri iwusị ya maka ịrara ya nye. Ka a nọ na-eme nke ahụ, ha chere na ọ ga-adị mma iwu ụlọ nzukọ ọzọ iji belata njubiga ókè n’ụlọ nzukọ nke dị adị. Ebe ndị ga-eji ụlọ nzukọ ọhụrụ ahụ mee ihe sokwa n’ọgbakọ ndị ji ego na-akwado nke dị adị, ha chere na e kwesịrị iwusị ụlọ nzukọ abụọ ahụ ma rara ha nye n’otu mgbe. N’iji ụzọ iwu ihe ngwa ngwa mee ihe, iwu ụlọ nzukọ ọhụrụ ahụ were nanị ụbọchị 15, a rarakwaara ụlọ nzukọ abụọ ahụ nye otu ụbọchị ahụ.
9 Ebe oge ọ na-ewe ịmalite na iwusị ihe owuwu ngwa ngwa na-adị nnọọ mkpirikpi, a na-atụ aro na ọgbakọ ọ bụla chọrọ iji ụzọ a mee ihe kwesịrị ibu ụzọ nweta akwụkwọ kwesịrị ekwesị ndị iwu kwadoro, ụkpụrụ survey, na ụkpụrụ iwu ihe e nyere ikike ya. N’ozuzu, ọ bụ ihe amamihe dị na ya na unu natara ikike iwu ihe tupu unu amalite iwu ihe. Otú ọ dị, n’ebe nke ahụ na-ekweghị omume, unu kwesịrị itinyeworị akwụkwọ maka ikike dị otú ahụ tupu unu amalite iwu ihe, unu kwesịkwara iji ịdị uchu sochie akwụkwọ ahụ. Ọ dị mkpa na unu ziteere Society ibe akwụkwọ ala unu maka nnyocha. A pụrụ inweta ego site n’Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụrụ na ọgbakọ achọọ inweta enyemaka dị otú ahụ. Ọgbakọ ọ bụla chọrọ iji ụzọ iwu ihe ngwa ngwa mee ihe kwesịrị ibu ụzọ soro Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè nke ógbè ha kwurịta banyere ihe owuwu ahụ. E kwesịrị izitere Society arịrịọ e dere ede.
10 Ndị Ọrụ Afọ Ofufo Na-akwado Ọrụ Ọma: Society na-ekele ọtụtụ ndị ọrụ afọ ofufo na-enye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ na-enye obi ụtọ n’ezie ịhụ ka ọtụtụ ndị ọrụ afọ ofufo na-enye onwe ha n’akụkụ nile nke iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ịga nke ọma nke usoro ihe omume a nwere isi n’ihi mmụọ iwepụta onwe onye, nke mmesapụ aka, na nke nkwenye dị otú ahụ nke ndị ọrụ afọ ofufo, bụ́ ndị na-achụ oge ha gaara eji soro ọgbakọ ma ọ bụ ezinụlọ ha nọkọọ n’àjà. (Abụ Ọma 110:3; Kọl. 3:23) Nzaghachi ịhụnanya a na-eme ka ha ruo eruo inweta ịja mma, ekele, na nkwado anyị zuru ezu.—Rom 12:10; Hib. 13:1.
11 A gwawo ndị nile ruru eru inyere Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè aka ka ha dejupụta fọm bụ́ Kingdom Hall Volunteer Worker Questionnaire (S-82). Ọgbakọ na-ezigara kọmitii ógbè fọm ndị a iji gosi iru eru nke onye ọrụ na mgbe a pụrụ inweta ya. Mgbe ọnọdụ nke onye ọrụ afọ ofufo gbanwere, dị ka mgbe mmadụ kwapụrụ ma ọ bụ a họpụtara ya ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye, e kwesịrị idejupụta fọm ndị ọhụrụ ozugbo ma zipụ ya site n’aka odeakwụkwọ ọgbakọ. Ọ bụrụ na onye ọrụ afọ ofufo erukwaghị eru, ndị okenye kwesịrị iji akwụkwọ ozi gwa kọmitii ógbè ozugbo. Mgbe a chọkwuru fọm, a pụrụ ịrịọ maka ha na Literature Order Form a na-ezite kwa ọnwa. Onye nlekọta sekit nwekwara mmasị ná ndị ahụ wepụtaworo onwe ha maka akụkụ a nke ozi dị nsọ. Ya mere, o kwesịrị inyocha faịlụ e tinyere ibe fọm Kingdom Hall Volunteer Worker Questionnaire mgbe ọ bụla ọ na-eleta ọgbakọ.
12 Ime Ka Mmefu nke Iwu Ihe Dịrị n’Ọ̀tụ̀tụ̀ Kasị Ala: E nyewo Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè ntụziaka ka ha hazie ngalaba nzụta ihe n’okpuru nlekọta nke onye okenye ruru eru. Ụmụnna na-arụ ọrụ na ngalaba a na-eji ịdị uchu sochie mgbaàmà ọ bụla maka ịzụ ihe iji chọta ọnụ ahịa dị mma site n’ịzụ ihe n’ebe ọnụ ahịa kasị ala. N’ụzọ dị otú a, a pụrụ ikpebi ndị a ga na-azụ ihe na ihe ndị e kwesịrị ịzụ. Mgbe ụfọdụ, n’oge a na-arụ ọrụ n’ihe owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, a na-akpọ ụmụnna ruru eru nọ n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ inye aka na ngalaba a. Mgbe ọ bụla ọrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ bụ iwu nke ọhụrụ ma ọ bụ ndozigharị, gụnyere iji enyemaka nke ndị ọrụ afọ ofufo si n’ọgbakọ ndị ọzọ na-abụghị nke (ndị) ga-ezukọ n’ụlọ nzukọ ahụ mee ihe, kọmitii ógbè ga-ahụ maka ihe owuwu ahụ.
13 Ọ bụ ezie na ịhụnanya nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ihe a kpọrọ mmadụ ajụwo oyi na mgbe ikpeazụ a, ndị Chineke na-anọgide na-egosi ihe àmà nke ịhụnanya ha nwere n’ebe ibe ha nọ, ịhụnanya nke na-agafe ịkpa ókè agbụrụ na nke ókèala. (Mat. 24:12) N’iṅomi Nna anyị nke eluigwe, ka anyị nọgide na-egosi ụdị ịhụnanya ahụ site ná nkwado anyị sitere n’obi maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Nigeria. Anyị ime otú ahụ ga-eweta ngọzi bara ụba na nnwapụta Jehova.—Mal. 3:10; Hib. 6:10.