Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/96 p. 3-4
  • Òkè Gị n’Iwu Ihe Maka Ọdịnihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Òkè Gị n’Iwu Ihe Maka Ọdịnihu
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Ọṅụ Na-egbo Mkpa Owuwe Ihe Ubi Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Mmụba Nọgidere Na-aga n’Ihu Na-amụba Mkpa E Nwere Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Nigeria
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze—Akụkụ Dị Mkpa nke Ozi Dị Nsọ
    Ozi Alaeze Anyi—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 7/96 p. 3-4

Òkè Gị n’Iwu Ihe Maka Ọdịnihu

1 Taa ndị Kraịst na-aga n’ihu n’ịhụ maka ọrụ ihe owuwu nke Jisọs malitere n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1,970 afọ gara aga mgbe ọ malitere ịchịkọta ndị na-eso ụzọ. (Mat. 4:17; 7:24, 25, 28; Jọn 7:46) Jehova agọziwo ọrụ a n’ụba. (Ilu 10:22) Ka anyị na-aga na-ekwusa Alaeze Chineke, anyị na-ewukwa ihe iji nabata mmụba ọdịnihu.

2 Ọ bụ ezie na a ghaghị idozigharị ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị metụworo ochie, ụlọ nzukọ ndị ọzọ dị mkpa iji nabata ọgbakọ ọhụrụ ndị a na-eguzobe. Ọgbakọ ndị dị na Nigeria ji 153 mụbaa n’ime nanị afọ gara aga. Ma ego ma ndị ọrụ afọ ofufo dị mkpa maka nrụzu na-aga nke ọma nke ọrụ ihe owuwu ndị a. A na-akwụghachi ezi àgwà a pụrụ ịja mma nke ụmụnna n’ihe metụtara igbo mkpa a ụgwọ ọrụ n’ụba.

3 Enyemaka Ịhụnanya nke Ọtụtụ Ndị Na-enye: Anyị na-egosi ịhụnanya anyị maka “òtù ndị bụ ụmụnna” site n’itinye ihe n’Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze. (1 Pita 2:17) Onyinye ndị a natara n’alaka a emewo ka e nwee ego iji nye aka n’owuwu nke 110 Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ. Ma mkpa ahụ nọgidere na-arị elu ka ọrụ nchịkọbata ahụ na-aga ọsọ ọsọ. Ya mere Jehova na-aga n’ihu ịgọzi ndokwa a, ndị okenye kwesịkwara ijide n’aka na e mere ka a mata igbe onyinye maka Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ọma, na mmadụ nile nwekwara ike ịhụ ya n’ebe dị iche iche a na-enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. A na-ezigara ọgbakọ dị iche iche onyinye ndị a natara, tinyere ego sitere ná nkwụghachi nke ego mgbazinye, maka owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ na maka ndozigharị ndị gbara ọkpụrụkpụ.

4 Society, tinyere ọgbakọ nile na-erite uru site ná ndokwa ahụ, na-ekwupụta ekele dị omimi nye ìgwè mmadụ n’otu n’otu na ezinụlọ ndị na-etinye ihe mgbe nile n’Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọgbakọ nile kwesịrị itinye ihe n’Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma hà ji ọrụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’onwe ha n’aka ma ọ bụ na ha ejighị. Kwa izu ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ ekwesịghị ịghara ịgwa ìgwè ahụ banyere ego ole a tụnyere n’izu bu ụzọ. Nke a bụ ohere dị mma ka mmadụ nile wee kere òkè, ma ndị agadi ma ụmụaka, n’agbanyeghị ihe ọnọdụ akụ̀ na ụba ha pụrụ ịbụ. Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịkwadebe tupu anyị agawa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ka anyị wee nwee ihe anyị ga-atụnye n’Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze.

5 E nwere mkpa maka onyinye chiri anya mgbe nile. Ka ọ dị ugbu a, anyị nwere 44 Ala Mgbakọ na Nigeria, a pụghịkwa iwere nke ọ bụla dị ka nke a rụchaworo. A nọwo na-arụ ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ruo ọtụtụ afọ, n’arụchabeghị ha. Ọrụ ndị a kwụsịrị n’ihi ụkọ ego. Ọ bụ ezie na ihe anyị pụrụ inye n’ụzọ ego pụrụ ịdịgasị iche iche, anyị pụrụ ịchọpụta na site n’imezigharị ihe ná mmefu onwe onye anyị, anyị pụrụ ikere òkè zuru ezu karị n’ịkwado ọrụ ihe owuwu ahụ. Ka anyị sọpụrụ Jehova site “n’akụ̀” anyị. N’ụzọ dị otú a, anyị na-egosi ịhụnanya anyị maka Ya, Ọ na-agọzikwa ndị ji afọ ofufo na-enye ihe.—Ilu 3:9; 1 Ihe Eme. 29:14-17.

6 Ì nwere nkà n’ọrụ ihe owuwu? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụrụkwa na ị dị njikere inye aka n’owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ị pụrụ ime ka ndị okenye ọgbakọ gị, ndị òtù Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè, na onye nlekọta sekit mara nke a. E nwere mkpa ndị ọrụ afọ ofufo nwere nkà ná mba a dum. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè nile na-akọ na e nwekwuru mkpa ndị ọrụ afọ ofufo. Ọzọkwa, n’okpuru nduzi nke Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè ndị Society họpụtara, a na-enye ụmụnna ndị ọzọ tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ ọzụzụ ịrụ ọrụ a chọrọ ka e wee nwee ike inyere ọgbakọ ndị ọzọ aka n’ọrụ ihe owuwu ha.

7 Òkè nke Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè: Na March 1994, Society họpụtara Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè ise maka Nigeria. Otú ọ dị, n’ihi mkpa na-arị elu dịnụ, anyị nwere ngụkọta nke 25 Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè ugbu a. N’ihi gịnị ka e ji họpụta kọmitii ndị a? A họpụtara ha iji nye aka n’ọkwá nile nke atụmatụ na owuwu ihe. Ha nwere ụkpụrụ ndị Society nyere, bụ́ ndị chere ihu n’ụkpụrụ ihe owuwu ndị dị ngwa. Ụmụnna ndị na-eje ozi na kọmitii ndị a bụ ndị okenye nwere ahụmahụ, ha pụkwara ịtụ aro ndị bara uru maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị kwesịrị ekwesị ma maa mma, ya na maka ibelata oge na ego. N’ihi ahụmahụ ha, ha pụrụ inyere ndị okenye ọgbakọ aka ikpebi ma ọ̀ ga-aka mma idozigharị Ụlọ Nzukọ Alaeze dị adị ma ọ bụ iwu nke ọhụrụ, ha pụkwara inyere ha aka ikpebi tupu a zụọ ihe ma ebe e bu n’obi iwu ihe owuwu ọhụrụ ma ọ bụ ma ụlọ dị adị ò kwesịrị ekwesị. Ha pụkwara inyere ndị okenye aka ime ezi atụmatụ ego ihe owuwu na ọnụ ego Ụlọ Nzukọ Alaeze dị adị nke a pụrụ ire.

8 E nyewo Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè ntụziaka ihe owuwu n’otú e si arụ ọrụ kọnkrit, otú e si akụ ohiere ụlọ dị mma, ọ̀tụ̀tụ̀ ngwakọta a ga-eji mee ihe maka kọnkrit na ụrọ, na akụkụ ndị ọzọ nke ọrụ ihe owuwu. Site n’ịgbaso ntụziaka Society na-enye na aro ndị ọzọ Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè na-atụ, anyị ga-enwe ike iwu ụlọ ndị siri ike, bụ́ ndị ga-adịte anya. Ọ bụ ezie na ọnụ ahịa a ga-eji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze dị mma ma sie ike ga-adị elu karị, ọ bụ ụzọ ka mma iji ihe ndị a raara nye mee ihe karịa iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-esighị ike, bụ́ nke na-agaghị adịte anya. Akụkọ egosiwo na elu ụlọ adawo ma ọ bụ bụrụ nke ifufe bupụrụ n’ihi owuwu ihe na-adịghị mma. Nke a kpataara ọgbakọ dị iche iche ịkwụ ụgwọ ugboro abụọ, na-egosi na ọ na-efukarị ihe dị ala karị imefu ego ka ukwuu ma mezie ya emezi n’oge mbụ.

9 Tupu a zụta ala, ọ bụ ihe amamihe ịkpọtụrụ Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè. E kenyere Kọmitii ndị a ọrụ inye aka n’owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe a họpụtara ahọpụta nke ọtụtụ sekit mejupụtara, ha pụkwara inye aka n’ihe metụtara ịzụta ala na ịchọpụta ihe iwu kwadoro maka ebe gaje ịbụ ala Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha nwere ntụziaka iji nyere ụmụnna aka izere ihe isi ike ha pụrụ izute n’ịzụta ala. Anyị nwere ntụkwasị obi na ndị okenye ahụ ga-azaghachi n’egbughị oge n’aro ndị òtù Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè tụrụ iji belata ihe ndị na-atụkwasị ihe n’ọrụ ma ọ bụ ndị na-ewe oké ego n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

10 Mgbe a na-ahọrọ ala maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’obodo ukwu nwere ihe karịrị otu ọgbakọ, ndị okenye ọgbakọ kwesịrị isoro Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè, onye (ndị) nlekọta sekit, onye nlekọta obodo, na ma eleghị anya ndị okenye sitere n’ọgbakọ ndị dị nso, tụlee okwu ahụ. Nke a pụrụ inyere ndị okenye ọgbakọ aka ịhọrọ ebe ga-abara ọgbakọ (dị iche iche) ọrụ ahụ e ji n’aka metụtara uru, ma eleghịkwa anya belata ọnọdụ ijubiga ókè n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị n’agbata obi ahụ, ma na-enyekwa ohere maka uto ọdịnihu n’ógbè ahụ. N’ógbè ndị mepere emepe, ọgbakọ atọ ma ọ bụ karị na-ejikarị otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe. Ọbụna n’ógbè ndị mmadụ na-ebijuchaghị nke ukwuu, a pụrụ ịhọpụta otu ebe ọgbakọ abụọ ma ọ bụ atọ pụrụ iji mee ihe.

11 N’iji ntụziaka ndị Society nyere na-eme ihe, Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè na-eje ozi bara uru ka ha na-enyere ọgbakọ dị iche iche aka ná mwuzigharị na ọrụ ihe owuwu ndị ọhụrụ. N’oge ihe owuwu, a na-ekenye ndị ọrụ afọ ofufo ọrụ maka nanị oge a ga-achọ ha n’ezie n’ebe owuwu ihe ahụ, ka ha wee kere òkè ná nzukọ na ozi ubi nke ọgbakọ ha. Nhazi na nkà a mụtara n’ọrụ ndị a ga-enyekwa aka n’ọrụ ihe owuwu Ala Mgbakọ.

12 Mmadụ nile pụrụ igosipụta mkpụrụ nke obi ọma n’isoro ndị na-elekọta ọrụ ihe owuwu ahụ arụkọ ọrụ. N’ụzọ dị otú a, a ‘na-arụzu’ ọrụ dị mkpa, a na-ejikwa ‘ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude.’ (Ọrụ 14:26; Hib. 13:17) Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè dị na Lagos kwuru nke a n’akụkọ mgbaafọ ha: “Ahụmahụ anyị na 1995 abụrụwo nke na-akpali akpali ma na-amị mkpụrụ n’ụzọ bara ụba. Society na ndị òtù Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè mere ka nghọta nke nzube na ọrụ nke Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè pụta ìhè n’ụzọ sara mbara ná nzukọ dị iche iche e so òtù ndị okenye na/ma ọ bụ kọmitii ihe owuwu ndị dị ná mpaghara dị iche iche nke ógbè ahụ mee. Ọzọkwa, a ga-arịba ama na a rụrụ ọrụ ụfọdụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ebe a na-ahazi maka ndị ọzọ ma ọ bụ na-akwadebe ha. E nyewo ụfọdụ n’ime ndị ọrụ afọ ofufo/ndị ọrụ anyị ọzụzụ n’ime afọ a, ha aghọwokwa ngwá ọrụ dị ukwuu n’ije ozi ihe ùgwù anyị dị oké ọnụ ahịa.”

13 Iji Ego Na-akwado Ọrụ Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze: E kwesịrị ime ndokwa maka nkwado ego ọ bụla dị mkpa ná mmalite. (Luk 14:28-30) Ndị okenye kwesịrị ịchọpụta ikike ọgbakọ nwere ịkwụ ụgwọ ego nile ọ ga-ewe site n’ime nnyocha iji chọpụta (1) ego ole a ga-enye n’ọnụ ego gbara ọkpụrụkpụ iji nye aka n’ịzụta ala na n’ọnụ ego ihe owuwu, (2) ego ole a pụrụ ịgbazite n’ọgbakọ na ogologo oge ọ ga-ewe iji nweta ego ahụ, na (3) ego ole ndị nkwusa bu n’obi ịdị na-enye kwa ọnwa iji kwụghachi ego mgbazite ọ bụla dị mkpa tinyere ịdị na-ahụ maka mmefu ndị ọzọ a na-enwe n’iji ya eme ihe.

14 E mesịa, ndị okenye ọgbakọ chọrọ enyemaka ego site n’Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze kwesịrị isoro Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè tụlee ọrụ ha na-eme atụmatụ ịrụ na ihe ọ ga-ewe n’ụzọ ego, bụ́ nke ga-enyere ha aka site n’iji fọm Kingdom Hall Loan Survey gwa Society banyere mkpa ha na ihe ndị ọzọ banyere ọrụ ahụ. Mgbe ndị okenye dejupụtasịrị akụkụ nke ha na fọm ahụ, onye nlekọta sekit ga-agbakwụnye okwu nke ya ma zigaghachiri Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè fọm ahụ maka okwu nke ha. Ha, n’aka nke ha ga-edejupụta fọm ahụ ma zigara Society nke mbụ. Mgbe Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè zigasịwooro Society ihe ọmụma, a na-edegara ọgbakọ ndị o metụtara kpọmkwem akwụkwọ. A na-enye enyemaka ego n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu ka ego na-apụta, na na-adabere ná mkpa dịnụ.

15 Jigide Mmụọ Ịnụ Ọkụ n’Obi: A na-aja mmadụ nile mma maka mmesapụ aka ha n’ịkwado Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze. A na-anata ọtụtụ okwu ekele site n’ọgbakọ ndị e nyewooro aka. “Nhata” na-ewere ọnọdụ n’etiti ọgbakọ dị iche iche. (2 Kọr. 8:14, 15) Otu ọgbakọ n’Ohafia dere, sị: “Anyị, bụ́ ndị òtù ọgbakọ a dum, ji obi anyị nile na-aja unu mma maka iguzobe Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze a na karịsịa Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè, bụ́ nke anyị na-erite uru site na ya ugbu a. Anyị na-echeta unu n’ekpere anyị mgbe nile, na-arịọkwa Jehova ka ọ kwado usoro ihe omume unu ndị ọzọ.” Ọgbakọ ọzọ n’Ikom, Cross River State, dekwara, sị: “Anyị ji nke a na-ekwupụta ọṅụ na ekele anyị maka iguzobe Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè Ebe Ọwụwa Anyanwụ. N’October 5, 1995, mgbe anyị na otu n’ime ndị òtù Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè nwere nzukọ, e nyere anyị ntụziaka banyere ụzọ na ebe a ga-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ịgbaso ntụziaka ahụ, anyị hụrụ mkpa nke ịchọ ala ọzọ n’abụghị nke anyị ji eme ihe na mbụ. Anyị eritewo uru site ná ndokwa a magburu onwe ya nke Jehova mere bụ́ ka e guzobe kọmitii dị ka nke a.”

16 N’oge a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ, ikpo ọkụ, ịnụ ọkụ n’obi, na mmụọ dị mma na-atụnye ụtụ n’ịga nke ọma nke ọrụ ahụ. Otu mmụọ ahụ kwesịrị ịga n’ihu ka anyị na-achọ ụzọ ịkpọrọ ọtụtụ ndị ọzọ bịa n’ihe ọmụma nke eziokwu ma na-agba ha ume isoro anyị na-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ bụ ngosipụta pụtara ìhè nke ekele nke na-arụpụta ịba ụba a rịbara ama ná ndị na-abịa nzukọ na uto dum nke ọgbakọ ahụ.

17 Ka anyị na-aga n’ihu n’ime ka ozi anyị saa mbara, na-ejisi ike n’ọrụ e ji n’aka, obi abụọ adịghị ya na ngọzi Jehova ga-anọgide na-adịkwasị anyị. (Luk 13:24) Anyị amaghị uto na mmụba na-echere anyị n’ọdịnihu. Ma ọ dị anyị mkpa ịdị njikere ịnabata nnubata ọdịnihu ọ bụla nke ndị na-efe ofufe. Nke ahụ chọrọ nkwadebe n’akụkụ anyị ugbu a. N’ihi ya, anyị na-ekpe ekpere maka ngọzi na-aga n’ihu na nduzi Jehova. N’iwu ihe maka ọdịnihu, ka anyị nile bụrụ ndị ha na Jehova na-arụkọ ọrụ—n’anụ ahụ, n’ihe onwunwe, na n’ime mmụọ. Ọ ghaghị ịgọzi anyị ka anyị na-elekọta nke ọma ndị ji ọsọ na-agbabata ná nzukọ Alaeze ya n’akụkụ ikpeazụ nke mgbe ikpeazụ a.—Aịsa. 60:8, 10, 11, 22.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya