Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/98 p. 3-4
  • Iji Ọṅụ Na-egbo Mkpa Owuwe Ihe Ubi Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Ọṅụ Na-egbo Mkpa Owuwe Ihe Ubi Ahụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Òkè Gị n’Iwu Ihe Maka Ọdịnihu
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Mmụba Nọgidere Na-aga n’Ihu Na-amụba Mkpa E Nwere Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Nigeria
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze—Akụkụ Dị Mkpa nke Ozi Dị Nsọ
    Ozi Alaeze Anyi—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 4/98 p. 3-4

Iji Ọṅụ Na-egbo Mkpa Owuwe Ihe Ubi Ahụ

1 Ee, nke a bụ oge owuwe ihe ubi. Anyị nọ ugbu a n’ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a, dịkwa ka Jisọs kwuru n’otu ilu ya, “owuwe ihe ubi bụ ọgwụgwụ oge a.” (Mat. 13:39) Na Jọn 5:17, Jisọs kwuru, sị: “Nna m na-arụ ọrụ ruo ugbu a, Mụ onwe m na-arụkwa ọrụ.” N’oge ọrụ owuwe ihe ubi a, ndị Jehova ji ọrụ n’aka ọ bụghị nanị n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ kamakwa n’iwu ebe ofufe. Ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ, e nwere mkpa maka Ụlọ Nzukọ Alaeze. Akụkọ ndị a natara na nso nso a site n’aka ndị nlekọta sekit na-egosi na a ka nọ na-ewu ihe karịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze 2,000, e wuwokwa ụfọdụ n’ime ha ruo ọtụtụ afọ. Ihe karịrị ọgbakọ 300 na-eji ụlọ ndị a naara na ngo eme ihe. O yiri ka e wusịala ihe dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze 400 ma a rarabeghị ha nye. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Jehova akpaliwo ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe inye nkà ha n’afọ ofufo n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụghị nanị na ha na-arụsi ọrụ ike kamakwa ha na-egbukepu na mmụọ nke ọṅụ.

2 Ọ dị ugbu a dị ka ọ dị n’ụbọchị Nehemaịa mgbe ụmụ Israel ji ọrụ n’aka n’iwu mgbidi Jerusalem. Nehemaịa 4:6 na-ekwu na “ndị Juu nwere obi ịrụ ọrụ.” Gịnị bụ isi ihe kpatara ọnọdụ ọma nke obi dị otú ahụ? A kpọtụrụ ya aha ka e mesịrị na Nehemaịa 8:10: “N’ihi na ọṅụ Jehova bụ ike unu.” N’ezie anyị nwere nnọọ ihe mere anyị ga-eji bụrụ ndị ọrụ obi ụtọ. Anyị nwere ngọzi Jehova. Anyị nwere mmụọ Jehova, ọṅụ bụkwa akụkụ nke mkpụrụ nke mmụọ ahụ.—Gal. 5:22.

3 Kpọtụrụ Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè n’Oge: Mgbe ọgbakọ na-eche echiche iwuzigharị ma ọ bụ iwu ihe owuwu ọhụrụ, ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịkpọtụrụ Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè ná mmalite nke ọrụ ahụ. Society enyewo Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè ụkpụrụ nduzi, ụmụnna ndị a nwekwara nnukwu ahụmahụ nke ga-enye aka izere ihe ọghọm mgbe a na-azụta ala ma na-eme atụmatụ iwu ihe owuwu. Ọ bụrụ na a gwa ha n’ụzọ zuru ezu banyere ihe owuwu nile dị n’ebe e kenyere ha, kọmitii ógbè ahụ pụrụ ịhazi ndị ọrụ afọ ofufo ka e wee rụsịa ọrụ ahụ dum n’adọgbughị ndị nwere nkà n’ọrụ.

4 Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè na-egosipụta ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà n’ọtụtụ ụzọ, dị ka ịga ebe ndị dị anya ileta ọgbakọ ndị kpọrọ ha òkù. Ndị okenye kwesịrị igosi ekele maka mgbalị ha site n’ichere n’ụbọchị a kara aka izute ha. Ndị okenye ga-achọ iburu n’uche na aro ndị Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè ha na-atụ dabeere n’ụkpụrụ nduzi e nyere ha. Ya mere ha kwesịrị iji nlezianya rịba aro kọmitii ahụ na-atụrụ ha ama.

5 Ọgbakọ ụfọdụ ekpebiwo iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ha n’akpọtụrụghị Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè nanị n’ihi na ha chere na aro ndị kọmitii ahụ na-atụ ga-akpata oké mmefu. Ndị ọzọ azụwo ala n’emeghị ka Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè mara ka ha wee lee ya, n’ihi nke ahụ ha azụtawo ala n’ebe apịtị na-adị ma ọ bụ zụta ala pere mpe nke ukwuu. Ọgbakọ pụrụ isite n’amamihe rite uru n’ahụmahụ nke ndị okenye a họpụtara ije ozi na Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè site n’ịkpọtụrụ ha ná mmalite, n’ezi oge tupu a zụọ ala ọ bụla.—Ilu 15:22.

6 Ndị Ọzọ Na-ahụ Ya: Pọl onyeozi kwuru, sị: “E mere anyị ihe nkiri nye ụwa na ndị mmụọ ozi na mmadụ.” (1 Kọr. 4:9) A na-ekiri ndị Kraịst ekiri taa, nke a bụ ezie karịsịa mgbe a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọrụ a na-arụ na mmụọ ọṅụ nke ndị na-arụ ya adịghị ezo ezo. N’ihi ya, ndị na-ekiri ihe na-emenụ egosiwo mmetụta ha n’ụzọ dị iche iche. N’Ozubulu, Anambra State, mgbe o kirisịrị ndị dị iche iche na-arụ ọrụ n’ihu ọrụ ahụ, otu nwanyị na-ere àkàrà n’akụkụ ebe ahụ jụrụ ajụjụ ịmata ebe ndị ahụ na-arụ ọrụ sigasị bịa. A gwara ya na ha sitere n’obodo dị iche iche na steti ahụ. Ịdị n’otu dị n’etiti Ndịàmà ahụ masịrị ya o wee kwuo, sị: “Site n’ihe m na-ahụ, ụwa ọhụrụ unu na-ekwusa bụ nnọọ ezie.”

7 Ka ụmụnna nọ na-arụ ọrụ n’ihe owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze otu ụbọchị, otu onye na-agafe agafe rutere nso ma kwuo, sị: ‘Ọ bụ ezie na abụghị m Onyeàmà, enwere m mmasị n’ọrụ unu. Ego m ji agwụla ma biko bịanụ n’ụlọ m na Saturday were ₦5,000, bụ́ onyinye m n’ịkwado ọrụ a.’ O nyere onyinye ahụ dị ka o kwere ná nkwa. N’otu ọrụ ahụ otu nwanyị dị ya nwụrụ bịarutere, mgbe o kwupụtasịkwara obi ụtọ ya o nyere ₦20. Otu Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè kwupụtara ọṅụ ha n’ịnọgide n’ọrụ ha dokwara n’agbanyeghị ihu igwe na-adịghị mma. Ha kọrọ, sị: ‘Ka ọrụ ihe owuwu ahụ na-aga n’ihu, otu onye kwuru na ebe ọ bụ na anyị na-abịaru udu mmiri nso anyị kwesịrị ịhapụ ọrụ ahụ ruo mgbe ọkọchị ga-amalite. Otú ọ dị, anyị gara n’ihu n’ọrụ ahụ. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, n’ụbọchị ọrụ nile a haziri, mmiri ezoghị ma ọlị. N’oge na-adịghị anya ógbè ahụ malitere ikwu, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ nwere ihe ọ na-achọ ime ememe ya, tinye ya n’ụbọchị Ndịàmà Jehova ga-arụ ọrụ n’ụlọ nzukọ ha, n’ihi na mmiri agaghị ezo.”’

8 Otu ọgbakọ dị na Calabar hụrụ mkpa ọ dị ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ka ibu. Onye nwe ala ha chọtara kwetara iresị ha ala ahụ n’ọnụ ₦280,000. Tupu ụmụnna enwee ike iweta ọnụ ego ahụ, onye ọchụ nta ego bịara wee kwe inye ₦300,000 maka otu ibe ala ahụ. Ma onye nwe ala ahụ soro nwunye ya tụgharịa uche, sị: “Ọ kara anyị mma ịhapụ inye nwoke ahụ ala ahụ kama ịhapụ inye Chineke.” Ọ jụrụ ọnụ ego ahụ ka ukwuu ma mesịa wepụ ego n’ọnụ ego ahụ site na ₦280,000 gbadata na ₦180,000 maka ọgbakọ ahụ. O kwuru, sị: “Ka ₦100,000 ahụ bụrụ onyinye m maka ihe owuwu ahụ.”

9 Inye Aka Afọ Ofufo nke Ịhụnanya: Ọtụtụ ndị ọrụ ruru eru na-enye oge na nkà ha n’inye aka ịzụta ala, ịtụ ụkpụrụ ihe owuwu, owuwu ihe na ọrụ injinịa, ịchọ mma, ịhado ala, ịmalite ọrụ n’ebe a na-ewu ihe owuwu, ịzụta ihe, ozi ihe oriri, nchebe na ihe ndị ọzọ. Ụmụnna na-enye ngwá ọrụ na akọrọ ngwá ha iji rụọ ọrụ n’ihe owuwu ndị a. Lee ka nke a ga-esi bụrụ ihe na-aghaghị ime Nna anyị, bụ́ Jehova obi ụtọ, mgbe ọ na-ahụ ha ka ha na-eji ihe onwunwe na ikike ha na-eme ihe n’ụzọ ịhụnanya dị otú ahụ!—Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 2:6-9 na 2 Ndị Tesalọnaịka 3:8b.

10 N’ihi mmụba ọgbakọ na-aga n’ihu, e nwere mkpa inwekwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. A chọkwuru ego na ndị ọrụ iji gboo mkpa a. N’ime afọ ije ozi gara aga, ọnụ ọgụgụ ọgbakọ na Nigeria ji 203 rịa elu, a chọkwukwara Ụlọ Nzukọ Alaeze iji nabata ọgbakọ ọhụrụ ndị a.

11 Ka ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-anọgide na-enye aka n’owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-enye oge na ike ha n’efu, a na-akpọ òkù maka inyekwu aka dị ka otú a chọkwuru ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi. (Mat. 9:37, 38) Ihe ka ọtụtụ na kọmitii ógbè na-akọ na inwekwu ndị ọrụ afọ ofufo maka ihe owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-eme ka ibu ndị nọworo na-ebu ibu ọrụ a felata.—Aịsa. 6:8; Gal. 6:2.

12 Ndị Ruru Eru: Mgbe ọ bụla a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị ọrụ afọ ofufo sitere n’ọgbakọ (ndị) ga-eji ihe owuwu ọhụrụ ahụ ma ọ bụ nke e wuzigharịrị eme ihe na ọgbakọ ndị dị ha nso ga-akpọta ndị ọrụ. Ụfọdụ n’ime ndị a na-enweta ọzụzụ, e mesịakwa ha ga-eru eru dị ka ndị nwere ahụmahụ ma ọ bụ ọbụna ndị ọrụ nwere nkà ọrụ nke ga-eme ka ha wee nwee ike itinye fọm Kingdom Hall Construction Worker Questionnaire.

13 Ndị dị Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè mkpa kpọmkwem site n’ọnwa ruo n’ọnwa bụ ndị nwere ahụmahụ n’ọrụ ihe owuwu, ndị na-enyekwa onwe ha n’afọ ofufo inye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị mkpa. Ndị a aghaghị inwe nguzo dị mma n’ọgbakọ ma bụrụ ndị òtù ndị okenye ọgbakọ kwadoro. Ọ bụrụ na ị nọ n’ọkwá a, ị̀ pụrụ ịhazi ihe omume gị inye aka n’akụkụ nke a nke ozi Jehova? (Neh. 4:6) Ọ bụrụ otú ahụ, nata otu fọm Kingdom Hall Construction Worker Questionnaire site n’aka onye isi oche ndị nlekọta ma ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ gị ma weta ya ozugbo.

14 Ọzọkwa, e nwere ụmụnna nwoke tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ ndị na-eje ozi dị ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi bụ́ ndị nwekwara ike nke nlekọta. Ọ bụ ezie na ahụmahụ ha n’ihe owuwu nwere ike ịdị obere, ndị a kwa pụrụ iweta fọm. Ọtụtụ ndị nọ n’ọkwá a na-enye aka ná ngalaba na-abụghị ha na-ewu ihe owuwu. A na-azụ ndị ọzọ ka e wee jiri ha mee ihe n’ụzọ sara mbara n’ọdịnihu. A na-agba ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ume ịtụlesi ike ma ha pụrụ iwepụta onwe ha maka ọrụ a nke na-enye Nna anyị, bụ́ Jehova, otuto.—Tụlee 1 Samuel 3:8; Matiu 4:20.

15 Mmadụ Nile Pụrụ Ikere Òkè: Mmadụ nile pụrụ igosipụta mmụọ dị mma n’ọrụ a dị mkpa site n’ibulite ebe ndị ga-adalata adalata n’ọgbakọ mgbe ụfọdụ na-arụ ọrụ n’ihe owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ná ngwụsị izu. N’ezie ọ dịghị onye n’ime anyị ga-achọ ịkụda ndị ọrụ afọ ofufo a obi n’ụzọ ọ bụla site n’inye echiche nke na ọrụ ịhụnanya ha n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze abụghị ije ozi dị nsọ. (Ilu 24:10; Hib. 6:10) Otú ọ dị, nguzozi dị mkpa, ọ bụkwa ya mere Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè ji elezi anya n’ime ndokwa ka ndị ọrụ afọ ofufo ghara ịhapụ ọgbakọ ha otú na-ekwesịghị ekwesị.

16 Ọbụna ọ bụrụ na ọnọdụ anyị apụghị inye anyị ohere inye onwe anyị n’afọ ofufo kpọmkwem n’ọrụ ihe owuwu, ọ dị akụkụ dị mkpa nke ọrụ ahụ nke mmadụ nile pụrụ ikere òkè na ya. Gịnị ka ọ bụ? Ịsọpụrụ Jehova site “n’akụ̀” anyị. (Ilu 3:9) Anyị pụrụ inwe obi ike na ọ na-amasị Jehova nke ukwuu mgbe anyị na-enye nkwado ịhụnanya n’ụzọ ego n’iwukwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. A na-enwe nnukwu ekele maka ụtụ ndị a na-atụnye n’Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze, ka a na-eguzobekwa ọgbakọ karị, a na-anọgide na-enwe mkpa nke ihe owuwu ọhụrụ dịwanyekwara mma. (Ọrụ 20:35; 2 Kọr. 9:6, 7) Na narị afọ nke mbụ, mgbe mkpa bilitere, Pọl onyeozi gbara ndị Kọrint ume, sị: “Ma dị ka unu babigara ókè n’ihe nile, bụ́ okwukwe, na okwu, na ihe ọmụma, na ịnụ ọkụ n’obi nile, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezienụ anya ka unu babigakwa ókè n’amara nke a.”—2 Kọr. 8:7.

17 Abamuru Buru Ibu: N’ezie, Jehova na-enyere anyị aka nke ukwuu iwu ọtụtụ ụlọ ofufe maka inye ya otuto. Ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà na-akpali ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị. Nke a bụ kpọmkwem ụdị ịhụnanya Jisọs kwuru ga-eme n’ụzọ doro anya ka a mara ezi ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 13:34, 35) Dị nnọọ ka Jisọs butere ọdịmma ndị ọzọ ụzọ tupu nke ya, otú ahụ ka ha na-eme. O yiri nnọọ ka a ga-etinye ọchịchọ obi na nkà ka ukwuu nke ndị ohu Jehova n’ọrụ karị n’ụwa ọhụrụ Chineke.

18 Ee, ndị na-ekere òkè n’iwu ụlọ ndị bụ maka ife Jehova ofufe na-ahụ Abụ Ọma 127:1 ịbụ ezie. Ọ bụ ezie na ndị nwere nkà na-enye oge na ike ha n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị mara mma ngwa ngwa, ọ bụ ngọzi Jehova na-eme ka a na-enwe ihe ịga nke ọma. Taa, a ka chọkwuru nnọọ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Kemgbe ọ malitere, Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze enwewo ike inyere ọtụtụ ọgbakọ aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Ka anyị nile nọgide na-enye oge na ‘akụ̀’ anyị n’efu ka anyị na-ele Jehova anya ịgọzi mgbalị anyị.—Ilu 3:9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya