Ntụleghachi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke May 5 ruo August 18, 1997. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide ahụ, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe onye gị. Nọmba peji na paragraf nwere ike ha agaghị apụta n’izo aka nile gaa n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Ọmịiko Jisọs, nke e gosipụtara na Mak 1:41, na-ese onyinyo na-emetụ n’ahụ banyere nchegbu Jehova maka ndị mmadụ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 3/1 p. 5.]
2. Mkpughe 7:16 na-egosi na ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ agaghị enweta mkpagbu site n’ụwa. [uw p. 108 para. 11]
3. Ajụjụ Jọn Onye Na-eme Baptism nke dị na Luk 7:19 na-ekpughe na o nweghị okwukwe. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w87 1/1 p. 16.]
4. N’Ememe Ngabiga ikpeazụ Jisọs so ndị na-eso ụzọ ya mee, ọ bụ nanị Pita gwara ya, sị: “Agaghị m agọnarị Gị ma ọlị.” [Ọgụgụ Bible kwa izu]
5. E nweghị ihe àmà ọ bụla sitere na Bible na-egosi na Pita onyeozi bụ nwoke lụrụ nwanyị. [Ọgụgụ Bible kwa izu]
6. A na-achọta akụkụ ụfọdụ nke mgbe ikpeazụ ahụ nanị na Matiu 24, Mak 13, na Luk 21. [kl p. 102 igbe]
7. Ma eleghị anya Mak bu ndị Juu n’uche wee dee Oziọma ya. [w89 10/15 p. 30]
8. Mgbe Jisọs gwara ndị Farisii na Alaeze Chineke nọ n’etiti ha, ọ na-ezo aka n’ebe ya onwe ya nọ dị ka Eze ọdịnihu ya. (Luk 17:21) [kl p. 91 para. 6]
9. E nweghị nkọwa ọ bụla ezi uche dị na ya banyere ihe mere akwụkwọ Luk ji nwee ìgwè okwu karịrị nke Oziọma atọ ndị nke ọzọ ma e jikọta ha ọnụ. [w89 11/15 p. 24]
10. E nweghị izo aka ọ bụla n’ime Bible n’àgwà ndị oké ìgwè mmadụ ahụ na-aghaghị igosipụta iji lanarị Amagedọn. [uw p. 105 para. 5]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. N’okpuru iwu ndị Juu, gịnị dị njọ n’alụmdi na nwunye Herọd Antipas na Herọdias? (Mak 6:18) [Ọgụgụ Bible kwa izu]
12. Gịnị na-egbochi ndị ụfọdụ ịnara ndụmọdụ? [uw p. 127 para. 4]
13. Olee akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị n’Abụ Ọma na Ndị Hibru na-egosi na Jisọs amaliteghị ịchị achị ozugbo ọ rịgoro n’eluigwe? [kl p. 96 para. 15]
14. Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Nweenụ nnu n’ime unu, unu na ibe unu dịkwa n’udo”? (Mak 9:50) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w85 11/15 p. 24 para. 12.]
15. Ihe mmụta dị aṅaa bara uru ka anyị pụrụ ịmụta site ná mmeghachi omume Jisọs n’ebe ụtụ nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ dara ogbenye dị? (Mak 12:42-44) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w87-E 12/1 p. 29 para. 7–p. 30 para. 1.]
16. Olee otú Mak si nwee ike inweta nkọwa miri emi maka ihe ndekọ Oziọma ya? [w89 10/15 p. 30]
17. Mgbe anyị jiri Matiu 6:9, 10 tụnyere Luk 11:2-4, n’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwubie na e zubeghị ka e kwughachi ekpere ihe nlereanya ahụ dị ka e si kwuo ya? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 5/15 p. 16 para. 6.]
18. N’ụzọ dị aṅaa ka e si eme ka obi ike anyị nwere na Bible ịbụ nke a pụrụ ịdabere na ya sie ike mgbe anyị gụrụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Luk 3:1, 2? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w94 6/1 p. 9 para. 5.]
19. Dị ka Mkpughe 7:14 si kwuo, gịnị ka mmadụ ịsa uwe mwụda ya n’ọbara Nwa Atụrụ ahụ na-arụpụta? [uw-IB p. 106 para. 6-7]
20. Ebe anyị maara na ọ dịghị mgbe Jisọs na-enweghị okwukwe na Chineke, gịnị mere o ji tie, sị: “Chineke m, Chineke m, gịnị mere I ji hapụ nanị Mụ?” (Mak 15:34) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w87 10/1 p. 31.]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi ahịrị okwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. Achịcha na mmanya e ji eme ihe n’Ememe Ncheta bụ nanị_________________________, ebe achịcha na-anọchite anya _________________________, mmanya na-anọchitekwa anya_________________________ ya. [uw p. 115 para. 13]
22. Mgbe anyị tụlere ihe merela n’ezie, o yiri ka ọ pụtara ìhè na ọkpụkpọ eluigwe ahụ ezuola n’ụzọ bụ isi n’ihe dị ka n’afọ_________________________, bụ́ oge a ghọtara n’ụzọ doro anya olileanya elu ala nke_________________________ ahụ. [uw p. 111 para. 6]
23. Mgbe Jọn Onye Na-eme Baptism malitere ime nkwusa, onye na-achị Judia bụ_________________________, tetrarch nke Galili bụrụkwa_________________________. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee Luk 3:1.]
24. Mmụọ nke so ike mkpali uche na obi nke ndị bụ n’ezie ụmụ Chineke wee na-agba àmà bụ_________________________. [uw p. 113 para. 9]
25. Dị ka e gosiri na Luk 10:16, mgbe anyị ji ekele nakwere ndokwa ime mmụọ ndị na-abịa site n’aka_________________________ ahụ na Òtù Na-achị Isi ya, anyị na-akwanyere_________________________ ùgwù. [uw p. 123 para. 13]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. Ndị nsọ ahụ e zoro aka na ha na Matiu 27:52 bụ (ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie ruo nwa oge; n’ezie anụ ahụ na-adịghị ndụ ndị ala ọma jijiji ahụ tụpụtara; ndị a kpọlitere gaa ná ndụ eluigwe tupu a kpọlite Jisọs). [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 9/1 p. 7.]
27. Alaeze nke Jisọs kwusara banyere ya (nọ n’ọkwá nke abụọ; kasị mkpa) n’ebe ọkaaka eluigwe na ala Chineke dị. [kl p. 91 para. 4]
28. Mmụọ nsọ kwadoro nhọpụta nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” n’afọ (33 O.A.; 1918; 1919). (Mat. 24:45) [uw p. 119 para. 6]
29. Ụkpụrụ nduzi ndị Kraịst nile kwesịrị ịgbaso, ma karịsịa ndị nọ n’ọkwá nlekọta ná nzukọ Chineke, bụ: “Onye dịkarị (mpako; mkpa; nta) n’etiti unu nile, onye ahụ bụ onye ukwu.” (Luk 9:48) [uw p. 122 para. 12]
30. Dị ka e dekọrọ na (Matiu 10; Matiu 24; Luk 21), Jisọs nyere ndị o zipụrụ ịga mee nkwusa ntụziaka ije ozi ndị doro anya. [Ọgụgụ Bible kwa izu]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Ilu 4:13; Dan. 7:9, 10, 13, 14; Mak 7:20-23; 13:10; Luk 8:31
31. Anyị kwesịrị ịmụrụ anya ịchọpụta ihe ọ bụla na-adịghị asọpụrụ Chineke ma ọ bụ nke na-emerụ emerụ nke pụrụ ịbata n’uche na n’obi anyị, anyị kwesịkwara iwepụ ya tupu ọ gbanye mkpọrọgwụ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 11/1 p. 14 para. 16.]
32. Ndị mmụọ ọjọọ ga-esonyere Setan n’ọnọdụ arụghị ọrụ yiri ọnwụ n’oge “otu puku afọ ahụ.” (Mkpu. 20:3, NW) [Ọgụgụ Bible kwa izu]
33. Mmụọ ịdị ngwa dị mkpa ka e wee rụzuo ọrụ ịgba àmà zuru ụwa ọnụ ná mkpirikpi oge. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 10/1 p. 27.]
34. Ịnara ndụmọdụ pụrụ ichebe mmadụ pụọ n’ikwu na ime ihe ndị pụrụ ịkpata ịkwa ụta. [uw p. 128 para. 6]
35. Ọ bụ ezie na anyị apụghị ịhụ ndị mmụọ e kere eke, Okwu Jehova na-enye anyị nleperetụ anya banyere nzukọ eluigwe ya a na-adịghị ahụ anya na banyere ụfọdụ n’ime ihe omume ya ndị na-emetụta ndị na-efe ya ofufe n’elu ala. [uw p. 117 para. 1]