Ị̀ Chọtawo Ezi Okpukpe Ahụ?
“Okpukpe Chineke nke di ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, bụ nke a.”—JEMES 1:27.
1, 2. (a) N’echiche nke ọtụtụ ndị gịnị na-ekpebi ma nke ha ọ bụ ezi okpukpe ahụ? (b) Gịnị ka e kwesịrị ịtụlesi ike n’ikpebi okpukpe?
ANYỊ na-ebi n’ọgbọ mgbe ọtụtụ mmadụ nwere afọ ojuju inye okpukpe nanị akụkụ dị nta nke ndụ ha ma e ji ya tụnyere ihe ndị ọzọ. Ha pụrụ ịdị na-eje ihe omume dị iche iche nke okpukpe ma nanị ole na ole na-emechi nke ahụ anya. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ekwetaghị na okpukpe ndị ọzọ nile ezighị ezi nakwa na nke ha ziri ezi. Ha pụrụ nanị iche na okpukpe ha ziri ezi nye ha.
2 Nke a mere na ajụjụ ahụ bụ́, Ị̀ chọtawo ezi okpukpe ahụ? ọ̀ pụtara nanị, Ị̀ chọtawo okpukpe dị gị mma? Gịnị na-ekpebi ihe dị gị mma? Ọ̀ bụ ezinụlọ gị? Ndị gị na ha na-akpakọrịta? Mmetụta gị? Ruo n’okè ha aṅaa ka ị tụlesiworo echiche Chineke n’okwu ahụ ike?
Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Mata Echiche Chineke?
3. (a) Ọ bụrụ na anyị ga-amata echiche Chineke, olee ihe na-aghaghị ịdị ebe aka anyị ga-eru? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa ka anyị kwesịrị ịjụ banyere ihe mere anyị ji kwere na Bible sitere n’aka Chineke?
3 Ọ bụrụ na anyị ga-amata ihe Chineke n’onwe ya na-eche, mgbe ahụ aghaghị inwe ihe ndị o kpughere. Bible bụ akwụkwọ kasị mee ochie nke na-ekwu na o sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke. (2 Timoti 3:16, 17) Ma à pụrụ ikwu n’eziokwu na akwụkwọ nke a, n’ụzọ dị iche n’akwụkwọ ndị ọzọ nile, nwere ozi Chineke nye ihe a kpọrọ mmadụ? Olee otú ị ga-esi zaa ajụjụ ahụ, n’ihi gịnịkwa? Ọ̀ bụ n’ihi na ndị mụrụ gị nwere echiche dị otú ahụ? Ọ̀ bụ n’ihi àgwà nke ndị gị na ha na-akpakọrịta? Ị̀ nyochawo ihe àmà ahụ n’onwe gị? Gịnịkwanụ ma i mee nke ahụ ugbu a, na-eji ihe ama anọ ndị na-esonụ eme ihe?
4. N’ihe banyere ịdị ebe aka pụrụ iru ya, gịnị na-egosi na Bible, kama ịbụ akwụkwọ ọzọ, sitere n’aka Chineke?
4 Ịdị ebe aka ga-eru: Ozi nke si n’ezie n’aka Chineke nke bụkwa maka ezinụlọ nile nke mmadụ kwesịrị ịdị ebe aka ga-eru. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu banyere Bible? Tụlee nke a: A na-ebipụta Bible ugbu a n’ozuzu ya ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ n’ihe karịrị 2,000 asụsụ. Dị ka òtù American Bible Society si kwuo, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri gara aga, asụsụ dị iche iche ndị e bipụtara Bible na ha mere ka o nwee ike iru ihe dị ka 98 pasenti nke ndị bi n’ụwa aka. Dị ka akwụkwọ Guinness Book of World Records si kwuo, Bible bụ “akwụkwọ a kasị kesaa n’ụwa,” n’ụzọ na-enweghị atụ. Nke a bụ ihe anyị ga-atụ anya ya banyere ozi sitere n’aka Chineke nke bụ maka ndị sitere n’agbụrụ nile na mba nile na ìgwè asụsụ nile. (Tụlee Mkpughe 14:6.) E nweghị akwụkwọ ọ bụla ọzọ n’ụwa nke nwere ihe ndekọ yiri ya.
5. N’ihi gịnị ka ntọala akụkọ ihe mere eme nke Bible ji dị mkpa?
5 Ịkọ ihe mere eme: Iji nlezianya nyochaa akụkọ ya dị iche iche na-ekpughe ụzọ ọzọ Bible si dị iche n’ebe akwụkwọ ọ bụla ọzọ na-azọrọ ịbụ nke dị nsọ dị. Bible nwere akụkọ ihe mere eme ndị bụ eziokwu, ọ bụghị akụkọ ọdịbendị nke a na-apụghị ịnwapụta anwapụta. Irwin Linton, onye dị ka onye ọkà iwu maara nke ọma otú e si enyocha ihe a chọrọ dị ka ihe àmà n’ụlọ ikpe dere, sị: “Ebe akwụkwọ akụkọ ụtọ dị iche iche, akụkọ ifo na na akaebe ụgha na-elezi anya n’ikwu ihe ndị merenụ n’ebe dị nnọọ anya na n’oge a na-ejighị n’aka, . . . akụkọ Bible na-enye anyị ụbọchị na ebe ihe ndị ahụ mere n’ụzọ ziri ezi karịsịa.” (Maka ihe atụ, lee 1 Ndị Eze 14:25; Aịsaịa 36:1; Luk 3:1, 2.) Nye ndị na-echigharikwuru okpukpe maka ihe ndị bụ́ eziokwu, ọ bụghị iji gbanahụ ihe ndị na-eme eme, nke a bụ okwu dị mkpa ịtụle.
6. (a) Olee otú Bible si enyere mmadụ aka n’ezie ná nsogbu nile nke ndụ? (b) N’ụzọ atọ dị aṅaa ka Bible si enyere mmadụ aka ịnagide ihe isi ike ndị na-eme eme?
6 Ịdị ire: Ndị ahụ na-enyochasi Bible ike na-achọpụta ngwa ngwa na iwu na ụkpụrụ ya nile abụghị nke e mere iji rigbuo ha. Kama nke ahụ, ndị a na-egosipụta ụzọ ndụ nke na-ewetara ndị na-agbasochi ha anya uru. (Aịsaịa 48:17, 18) Nkasi obi ahụ ọ na-enye ndị nọ ná mkpagbu abụghị nke na-enweghị isi, nke dabeere na nkà ihe ọmụma efu. Kama nke ahụ, ọ na-enyere ndị mmadụ aka ịnagide ihe isi ike nile nke ndụ. N’ụzọ dị aṅaa? N’ụzọ atọ: (1) site n’inye ndụmọdụ bara uru n’ụzọ isi mee ihe banyere ihe isi ike dị iche iche, (2) site n’ịkọwa ụzọ a pụrụ isi nata nkwado ịhụnanya nke Chineke na-enye ndị na-ejere ya ozi ugbu a, na (3) site n’ikpughe ọdịnihu dị ebube nke Chineke kwadebeere ndị ahụ na-ejere ya ozi, na-enye ha ezi ihe kpatara a ga-eji nwee obi ike ná nkwa ya nile.
7. (a) Site n’iji akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e hotara ná ntụaka ala ala peji, kọwaa azịza Bible nye otu n’ime isi ihe ndị na-echegbu ndị mmadụ taa. (b) Gosi otú ndụmọdụ Bible si echebe anyị ma ọ bụ na-enyere anyị aka ịnagịde ọnọdụ ihe nrụgide.
7 Ọ bụ ezie na ndụmọdụ Bible abụghị nke ndị ahụ jụrụ ọchịchị ma na-achụso ndụ nke ịmejụ ọchịchọ onwe ha na-enwekarị mmasị na ya, ọtụtụ aghọtawo na ndụ dị otú ahụ ewetabereghị ha ezi obi ụtọ. (Ndị Galetia 6:7, 8) Bible na-enye azịza kwụ ọtọ n’ajụjụ dị iche iche banyere isikwopụ afọ ime, ịgba alụkwaghịm, na idina ụdị onwe onye. Ndụmọdụ ya bụ ihe nchebe pụọ n’iji ọgwụ ọjọọ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi nakwa pụọ n’ibute ọrịa AIDS site n’ọbara e metọrọ emetọ ma ọ bụ site n’inwe mmekọahụ aghara aghara. Ọ na-egosi anyị ụzọ isi nwee ezinụlọ obi ụtọ. Ọ na-enye azịza ndị na-enyere mmadụ aka ịnagide ọnọdụ ndị kasị na-enweta nchekasị ná ndụ, tinyere ịbụ onye ndị ikwu jụrụ, ọrịa ọjọọ, na ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. Ọ na-enyere anyị aka ịghọta ihe ndị ka mkpa ka ndụ anyị wee jupụta ná nzube ọ bụghị ịkwa ụta.a
8, 9. (a) Amụma dị aṅaa masịrị gị onwe gị dị ka ihe àmà na Bible sitere n’ike mmụọ nsọ? (b) Gịnị ka amụma ndị dị na Bible na-anwapụta dị ka ebe ha sitere?
8 Amụma: Bible pụrụ iche dị ka akwụkwọ amụma, akwụkwọ nke na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu, ọ na-emekwa nke a n’ụzọ sara mbara. O buru amụma banyere mbibi nke Taịa oge ochie, ọdịda nke Babịlọn, mwughachi nke Jerusalem, mbilite na ọdịda nke eze Medo-Peasia na Gris, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere ná ndụ nke Jisọs Kraịst. O bukwara amụma sara mbara banyere ọnọdụ ụwa ndị werewooro ọnọdụ na narị afọ nke a, ọ na-akọwakwa ihe ha pụtara. Ọ na-egosi otù a pụrụ isi gwọta nsogbu ndị rikpuworo ndị ọchịchị ụwa, na-emekwa ka a mata Onye Ọchichị ahụ nke ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ udo na ịnọ ná ntụkwasị obi na-adịghị agwụ agwụ.b—Aịsaịa 9:6, 7; 11:1-5, 9; 53:4-6.
9 N’ụzọ dị mkpa, Bible na-egosi ikike nke ịkọ ọdịnihu n’ụzọ ziri ezi dị ka ihe nnwale nke ịbụ Chi. (Aịsaịa 41:1–46:13) Onye ahụ nke pụrụ ime ya ma ọ bụ onye pụrụ inye ndị ọzọ ikike ime ya abụghị arụsị efu na-adịghị ndụ. Ọ bụghị nanị mmadụ nke ji okpukpe kpọrọ ihe. Ọ bụ ezi Chineke ahụ, akwụkwọ ahụ nke nwekwara amụma dị otú ahụ bụ Okwu ya.—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.
Ndị Nile Na-eji Bible Eme Ihe Hà Ziri Ezi?
10, 11. Dị ka Jisọs gosiri, ọ bụ ezie na onye ụkọchukwu pụrụ iji Bible na-eme ihe, gịnị pụrụ ime ka okpukpe nke ọ na-akwado bụrụ nke na-abaghị n’ihe?
10 Ezi uche ọ̀ dị na ya—nke kakwa mkpa, Akwụkwọ Nsọ ọ̀ kwadoro ya—ikwubizi, na okpukpe nile na-asị na ha na-eji Bible eme ihe na-akụzi ezi okpukpe ahụ? Onye ọ bụla nke na-ebugharị Bible ma ọ bụ na-ehota ihe sitere n’ime ya ọ̀ na-ekpe ezi okpukpe ahụ?
11 Ọtụtụ ndị ụkọchukwu, ọ bụ ezie na ha nwere Bible, na-eji okpukpe eme ihe nanị iji nye onwe ha otuto. Ha na-eji nkà ihe ọmụma nke mmadụ na omenala agwagbu eziokwu a na-emerụghị emerụ. Chineke ọ̀ na-anakwere ofufe ha? Nye ndị ndú okpukpe na narị afọ mbụ ndị nọ na Jerusalem ndị na-eme nnọọ otú ahụ, Jisọs Kraịst gwara ha okwu Chineke nke sitere n’ọnụ onye amụma bụ́ Aịsaịa, na-asị: “Ndị nke a na-asọpụrụ m n’egbugbere ọnụ ha; Ma obi ha dị anya n’ebe M nọ. Ma ha na-ebiri m isiala n’efu, na-ezi ihe mmadụ nyere n’iwu ka ha bụrụ ozizi ha.” (Matiu 15:8, 9; 23:5-10) N’ụzọ doro anya, okpukpe dị otú ahụ abụghị ezi okpukpe ahụ.
12, 13. (a) Olee otù àgwà nke ndị òtù chọọchị pụrụ isi nyere mmadụ aka ikpebi ma nke ha ọ bụ ezi okpukpe ahụ? (b) Olee otú Chineke ga-esi lee ofufe anyị anya ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ ndị ọ jụrụ ajụ dị ka ndị mkpakọrịta? (2 Ihe Emere 19:2)
12 Gịnị ma ọ bụrụ na mkpụrụ nke ozizi dị iche iche nke okpukpe ụfọdụ na-amipụta dị ka a pụrụ isi hụ ya ná ndụ nke ndị òtù ha nwere nguzo dị mma, bụ nke rere ure? N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Na-ezenụ ndị amụma ụgha . . . Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha. . . . Ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma; ma osisi na-abaghị n’ihe na-amị ajọ mkpụrụ.” (Matiu 7:15-17) Ọ bụ ezie na ndị mmadụ n’otu n’otu pụrụ imehie ihe ma chọọ mgbazi. Ma ọ dị iche mgbe ndị òtù chọọchị, ọbụna ndị ụkọchukwu, na-etinye aka n’ịkwa iko, na ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye, ịlụ ọgụ, ịṅụbiga mmanya ókè, anyaukwu, ịgha ụgha, mgbaasị, ikpere arụsị—otu ma ọ bụ ihe ndị a nile—ma adịghị enye ha ịdọ aka ná ntị ọ bụla, adịghịkwa achụpụ ndị nọgidere n’omume dị otú ahụ n’ọgbakọ. Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya na e kwesịrị ịchụpụ ndị na-eme ihe dị otú ahụ n’ọgbakọ; ha agaghị enwe okè ọ bụla n’Alaeze Chineke. (Ndị Galetia 5:19-21) Ofufe ha adịghị atọ Chineke ụtọ, nke anyị agaghịkwa atọ Chineke ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ ndị ọ jụrụ ajụ dị ka ndị mkpakọrịta anyị.—1 Ndị Kọrint 5:11-13; 6:9, 10; Mkpughe 21:8.
13 O doro anya na ọbụghị òtù nile na-azọrọ na ha na-eji Bible eme ihe na-ekpe ezi okpukpe ahụ ọ na-akọwa. Mgbe ahụ gịnị ka Bible setịpụrụ dị ka ihe ndị a ga-eji mata ezi okpukpe ahụ?
Ihe Ndị E Ji Amata Ezi Okpukpe Ahụ
14. (a) Na gịnị ka ozizi nile nke ezi okpukpe ahụ dabeere? (b) Olee otú ozizi Krisendọm banyere Chineke na mkpụrụ obi si kwụrụ n’ule nke a?
14 Ozizi ya daberesịrị ike n’Akwụkwọ Nsọ nke sitere n’ike mmụọ nsọ. “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zi ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie.” (2 Timoti 3:16) Ma olee ebe Bible Nsọ kwuru okwu banyere Atọ n’Ime Otu nke Krisendọm? Oleekwa ebe Bible na-akụzi, dị ka ndị ụkọchukwu na-eme, na mmadụ nwere mkpụrụ obi nke na-alanarị ọnwụ nke ahụ? Ị̀ jụtụwo onye ụkọchukwu ka o gosi gị ozizi ndị ahụ n’ime Bible gị? Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Ma okwu ahụ bụ Atọ n’Ime Otu ma ozizi ahụ kpọmkwem adịghị nke ọ bụla pụtara n’Agba Ọhụrụ.” (1992, Micropædia, Mpịakọta nke 11, peji nke 928) Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwetakwara, sị: “N’etiti ndị Nna Chọọchị ahụ, ọ dịghị ihe ọ bụla nke yitetụrụ ụdị echiche ma ọ bụ nghọta dị otú ahụ ma ọlị.” (1967, Mpịakọta nke XIV, peji nke 299) Banyere ozizi Krisendọm nke mkpụrụ obi na-ekewapụ mgbe ahụ nwụrụ, ndị ọkà mmụta chọọchị na-ekweta na ha gbazitere echiche ahụ site na nkà ihe ọmụma Gris. Otú ọ dị, ezi okpukpe adịghị eleghara eziokwu Bible anya n’ihi nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ.—Jenesis 2:7; Deuterọnọmi 6:4; Ezikiel 18:4; Jọn 14:28.
15. (a) Olee otú Bible si mee ka a mata Onye ọ bụ nanị ya ka a ga-efe ofufe? (b) Ụdị mmetụta dị aṅaa ka ndị na-efe ezi ofufe na-enwe banyere ịbịa Jehova nso?
15 Ezi okpukpe na-akwado ife nanị otu ezi Chineke ahụ bụ Jehova. (Deuterọnọmi 4:35; Jọn 17:3) N’ikwughachi ihe dị na Deuterọnọmi 5:9 na 6:13, Jisọs Kraịst kwuru n’ụzọ siri ike, sị: “Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị Ya ka ị ga-ekpere.” (Matiu 4:10) N’ikwekọ na nke ahụ, Jisọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya mara aha Nna ya. (Jọn 17:26) Okpukpe gị ọ̀ kụziworo gị ife Jehova ofufe? Ị̀ matawo Onye e ji aha ahụ mara—nzube ya nile, ọrụ ya dị iche iche, àgwà ya—ka i wee nwee ike inwe mmetụta na ị pụrụ iji obi ike bịa ya nso? Ọ bụrụ na nke gị bụ ezi okpukpe ahụ, azịza ya bụ ee.—Luk 10:22; 1 Jọn 5:14.
16. Gịnị ka inwe okwukwe na Kraịst pụtara nye ndị na-ekpe ezi okpukpe ahụ?
16 Akụkụ dị mkpa nke ofufe na-atọ Chineke ụtọ bụ okwukwe n’Ọkpara ya bụ́ Jisọs Kraịst (Jọn 3:36; Ọrụ 4:12) Nke a apụtaghị nanị ikwere na o biri ndụ ma ọ bụ na ọ bụ onye pụrụ iche. Ọ gụnyere nghọta nke ihe Bible na-akụzi banyere uru nke àjà ndụ mmadụ zuru okè nke Jisọs na ịmata ọkwá ya taa dị ka Eze eluigwe. (Abụ Ọma 2:6-8; Jọn 3:16; Mkpughe 12:10) Ọ bụrụ na ị na-esonyere ndị na-ekpe ezi okpukpe ahụ, ị maara na ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị ha na-etinye ezi mgbalị irubere Jisọs isi, ịṅomi ihe nlereanya ya, na iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’onwe onye n’ọrụ ahụ o kenyere ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 28:19, 20; Jọn 15:14; 1 Pịta 2:21) Ọ bụrụ na nke ahụ abụghị eziokwu banyere ndị gị na ha na-efekọ ofufe, ọ dị mkpa ka ị chọọ ebe ọzọ.
17. N’ihi gịnị ka ndị na-efe ezi ofufe ji elezi anya izere inwe ntụpọ ọ bụla site n’ụwa, gịnịkwa ka nke ahụ gụnyere?
17 Ezi ofufe abụghị nke e ji itinye aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị na esemokwu ụwa metọọ. (Jemes 1:27) N’ihi gịnị? N’ihi na Jisọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:16) Jisọs etinyeghị aka na ndọrọ ọchịchị, o gbochikwara ndị na-eso ụzọ ya ịbuli ngwa agha anụ ahụ. (Matiu 26:52) Ndị ji ihe Okwu Chineke na-ekwu kpọrọ ihe ‘adịghị amụtakwa agha ọzọ.’ (Aịsaịa 2:2-4) Ọ bụrụ na okpukpe ọ bụla nke i so emekọ ihe ọbụna n’ọnụ ekwekọghị ná nkọwa ahụ, ugbu a bụ oge ịdọbi mmekọrịta nile nke gị na ya.—Jemes 4:4; Mkpughe 18:4, 5.
18. (a) Gịnị ka Jọn 13:35 mere ka a mata dị ka ihe bụ isi e ji amata ezi okpukpe ahụ? (b) Olee otú ị pụrụ isi nyere mmadụ aka ikpebi òtù nke kwekọrọ na Jọn 13:35?
18 Ezi okpukpe na-akụzi ma na-egosi ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị. (Jọn 13:35; 1 Jọn 3:10-12) Ụdị ịhụnanya dị otú ahụ abụghị nanị nke a na-ekwu n’okwuchukwu. Ọ na-ejikọta ndị nke agbụrụ nile, ọnọdụ akụ na ụba nile, asụsụ nile, mba nile n’ezi òtù ụmụnna. (Mkpughe 7:9, 10) Ọ na-eme ka ezi ndị Kraịst dị iche pụọ n’ụwa gbara ha gburugburu. Ọ bụrụ na i mebeghị otú ahụ, na-eje nzukọ dị iche iche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, tinyekwara mgbakọ ukwu ha dị iche iche. Kirie ha ka ha na-arụkọ ọrụ ọnụ iwu otu n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Lee otú ha si emeso ma ndị agadị (gụnyere ndị inyom dị ha nwụrụ) ma ndị na-eto eto (gụnyere ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ndị na-enweghị ma ọlị). (Jemes 1:27) Jiri ihe ị na-ahụ tụnyere ihe ị hụworo n’okpukpe ọ bụla ọzọ. Mgbe ahụ jụọ onwe gị, ‘Ònye na-ekpe ezi okpukpe ahụ?’
19. (a) Ngwọta dị aṅaa nye nsogbu nke agbụrụ mmadụ ka ezi okpukpe ahụ na-akwado? (b) Gịnị ka ndị ahụ so n’ótú ahụ na-arapagide n’ezi okpukpe ahụ kwesịrị ịdị na-eme?
19 Ezi okpukpe na-akwado Alaeze Chineke dị ka ihe ngwọta na-adịgịde adịgide maka nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Daniel 2:44; 7:13, 14; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:4, 5) Ọ̀ dị okpukpe ọ bụla nke Krisendọm na-eme nke ahụ? Olee mgbe ikpeazụ ị nụrụ ka onye ụkọchukwu kọwara Alaeze Chineke na ihe Akwụkwọ Nsọ gosiri na ọ ga-arụzu? Nzukọ nke iso na ya ọ̀ na-agba gị ume ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke, ọ bụrụkwa otú ahụ, ndị òtù ya nile n’ozuzu ya hà na-ekere okè n’ime ya? Jisọs gbara àmà dị otú ahụ; ndị na-eso ụzọ ya nke oge gboo mere otú ahụ. Ị pụkwara inwe ihe ùgwù nke iso kere òkè n’ọrụ nke a. Ọ bụ ọrụ kasị mkpa a na-arụ n’elu ala taa.—Matiu 24:14.
20. Tinyere ịmata ezi okpukpe ahụ, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?
20 Ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ puku okpukpe, Bible na-enyere anyị aka ngwa ngwa iwezụga ọgba aghara ahụ iji mata nke ziri ezi. Ma ọ dị anyị mkpa ime ihe karịrị ịmata ya. Ọ dị mkpa na anyị ga-esonyere ya. A ga-atụle ihe nke a gụnyere n’ụzọ ka saa mbara n’isiokwu anyị na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Isikwopụ afọ ime: Ọrụ 17:28; Abụ Ọma 139:1, 16; Ọpụpụ 21:22, 23. Ịgba alụkwaghịm: Matiu 19:8, 9; Ndị Rom 7:2, 3. Idina ụdị onwe onye: Ndị Rom 1:24-27; 1 Ndị Kọrint 6:9-11. Iji ọgwụ ọjọọ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi: 2 Ndị Kọrint 7:1; Luk 10:25-27; Ilu 23:20, 21; Ndị Galetia 5:19-21. Ọbara na inwe mmekọahụ aghara aghara: Ọrụ 15:28, 29; Ilu 5:15-23; Jeremaịa 5:7-9. Ezinụlọ: Ndị Efesọs 5:22–6:4; Ndị Kọlọsi 3:18-21. Ịbụ onye a jụrụ: Abụ Ọma 27:10; Malakai 2:13-16; Ndị Rom 8:35-39. Ọrịa: Mkpughe 21:4, 5; 22:1, 2; Taịtọs 1:2; Abụ Ọma 23:1-4. Ọnwụ: Aịsaịa 25:8; Ọrụ 24:15. Ihe ndị ka mkpa: Matiu 6:19-34; Luk 12:16-21; 1 Timoti 6:6-12.
b Maka ihe atụ nke amụma ndị dị otú ahụ na mmezu ha, lee akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s?, peji nke 117-161; na Reasoning From the Scriptures, peji nke 60-62, 225-232, 234-240. Ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara ha abụọ.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ N’ịmata ezi okpukpe ahụ, echiche ònye kasị mkpa?
◻ Ihe àmà anọ dị aṅaa na-ezo aka na Bible dị ka Okwu Chineke?
◻ N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ okpukpe nile na-eji Bible eme ihe ka Chineke na-anakwere?
◻ Gịnị bụ ihe isii e ji amata otu ezi okpukpe ahụ?
[Igbe dị na peeji nke 10]
Ndịama Jehova . . .
◆ Na-eme ka ozizi nile ha dabere na Bible.
◆ Na-efe otu ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova.
◆ Na-ebi ndụ n’ụzọ kweekọrọ n’okwukwe ha n’ebe Jisọs Kraịst nọ.
◆ Adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na esemokwu ụwa.
◆ Na-achọ igosipụta ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị ná ndụ a na-adi kwa ụbọchị.
◆ Na-akwado Alaeze Chineke dị ka ihe ngwọta na-adịgịde adịgide maka nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ.
[Foto dị na peeji nke 9]
BIBLE—gịnị na-egosi na o nwere ozi Chineke nye agbụrụ mmadụ?