Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • od isi 11 p. 116-122
  • Inwe Ebe Ndị A Na-anọ Efe Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inwe Ebe Ndị A Na-anọ Efe Jehova
  • Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ỤLỌ NZUKỌ ALAEZE
  • ỊRỤ ỤLỌ NZUKỌ ALAEZE
  • ỤLỌ MGBAKỌ
  • Ebe A Ka Anyị Na-anọ Efe Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ka Anyị Na-edebe Ebe Anyị Na-anọ Efe Ofufe n’Ọnọdụ Dị Mma
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ị̀ Na-akwanyere Ebe Ofufe Gị Ùgwù?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Mmụba Dị Ịrịba Ama Emee Ka Iwusawanye Ihe Ngwa Ngwa Dị Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
od isi 11 p. 116-122

ISI NKE 11

Inwe Ebe Ndị A Na-anọ Efe Jehova

E NYERE ndị niile na-efe Jehova iwu ka ha na-ezukọ amụ ihe ma na-agbarịta ibe ha ume. (Hib. 10:​23-25) Mgbe Chineke họọrọ ụmụ Izrel ka ha na-efe ya, ebe mbụ ha na-ezukọ efe Chineke bụ ‘n’ụlọikwuu, ya bụ, n’ụlọikwuu nzute.’ (Ọpụ. 39:​32, 40) Mgbe e mechara, nwa Devid bụ́ Sọlọmọn rụrụ ụlọ nsọ a ga-anọ na-efe Chineke. (1 Eze 9:3) Mgbe e bibiri ụlọ nsọ ahụ n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị Juu malitere ịna-ezukọ n’ebe a na-akpọ ụlọ nzukọ na-efe Chineke. Ka oge na-aga, a rụghachiri ụlọ nsọ ahụ, e bidokwa ịnọ na ya na-efe Chineke. Jizọs kụziiri ndị mmadụ ihe ma n’ụlọ nzukọ ma n’ụlọ nsọ. (Luk 4:16; Jọn 18:20) Jizọs na ndị mmadụ nwedịrị nzukọ n’elu ugwu.​—Mat. 5:1–7:29.

2 Mgbe Jizọs nwụchara, Ndị Kraịst na-ezukọ n’ụlọ ezumeezu na n’ụlọ ndị mmadụ mụọ Akwụkwọ Nsọ, sorokwa ibe ha kparịta ụka. (Ọrụ 19:​8, 9; Rom 16:​3, 5; Kọl. 4:15; Faị. 2) O nwekwara oge ndị ha zukọrọ n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị ka ndị iro ha ghara ịkpara ha aka. O doro anya na ndị fere Chineke n’oge ochie ji obi ha niile na-ezukọ n’ebe ha na-anọ efe Chineke ka ‘Jehova kụziere ha ihe.’​—Aịza. 54:13.

3 N’ebe ụfọdụ taa, Ndị Kraịst na-anọkwa n’ụlọ ezumeezu na n’ụlọ ndị mmadụ amụ ihe. A na-anọkwa n’ụlọ ndị mmadụ enwe nzukọ ozi ubi. Ndị a na-anọ n’ụlọ ha enwe nzukọ ndị a weere ya na a kwanyeere ha ùgwù pụrụ iche. Ọtụtụ n’ime ha kwuru na ọ na-agba ha ume.

ỤLỌ NZUKỌ ALAEZE

4 Ihe a na-akpọ ebe Ndịàmà Jehova na-anọkarị amụ ihe bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. A chọọ ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, a na-azụta ala ma ọ bụkwanụ a rụzigharịa ụlọ a rụrụla arụ, ya aghọọ Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ebe ụfọdụ, ọgbakọ abụọ ma ọ bụ karịa nwere ike ịna-amụ ihe n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ na-eme ka a ghara imefu nnukwu ego, na-emekwa ka e nwee ike ịna-elekọta ya nke ọma. N’ebe ụfọdụkwa, ọgbakọ na-anọ n’ụlọ ha na-akwụ ụgwọ ya amụ ihe. A rụchaa Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ma ọ bụ rụzigharịa ihe buru ibu na nke dị adị, e kwesịrị inyefe ya Jehova. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ obere ihe ka a rụzigharịrị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, e kwesịghị iji maka ya nyefee ya Jehova ọzọ.

5 Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị anaghị ebu oké ibu, anyị anaghịkwa arụ ya ka ndị mmadụ na-eweliri anyị aka elu. N’agbanyeghị na otú e si rụọ ya n’otu obodo nwere ike ịdị iche n’otú e si rụọ ya n’obodo ọzọ, a na-eji ha eme ihe e kwo rụọ ha. (Ọrụ 17:24) N’agbanyeghị ebe a chọrọ ịrụ ya, e kwesịrị ịrụ ya otú ọ ga-abụ ụmụnna bịa ọmụmụ ihe, ahụ́ eruo ha ala.

6 Ọgbakọ ọ bụla na-enye onyinye ka e nwee ike ịna-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ha na-anọ amụ ihe. A naghị ana ndị mmadụ ego n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, a naghịkwa arịọ ndị mmadụ ego. A na-edowe igbe onyinye ka ndị bịara ọmụmụ ihe nwee ike itinye ego ha chọrọ iji enye onyinye na ya ka e jiri ya na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha na-ejikwa obi ha niile enye ya.​—2 Kọr. 9:7.

7 Onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ weere ya na ọ bụ ihe ùgwù na o so enye onyinye e ji elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, sorokwa na-edebe ya ọcha. Ọ na-abụkarị okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ka a na-ahọpụta ka ọ na-ahazi otú a ga-esi na-edebe ya ọcha. N’ọtụtụ ọgbakọ, a na-ekenye ìgwè ozi ubi ọ bụla mgbe ha ga-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha. Ọ bụkwa onye nlekọta ìgwè nke ọ bụla ma ọ bụ onye na-enyere ya aka na-ahụ na ìgwè ha rụrụ ọrụ e kenyere ha. E kwesịrị ịna-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, ma ime ya ma gburugburu ya, n’ihi na ọ ga-eme ka a na-eto Jehova, meekwa ka nzukọ ya nwee aha ọma.

Onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ weere ya na ọ bụ ihe ùgwù na o so enye onyinye e ji elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, sorokwa na-edebe ya ọcha

8 Ọ bụrụ na ihe karịrị otu ọgbakọ na-amụ ihe n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị okenye ọgbakọ ndị ahụ ga-ahọpụta Kọmitii Na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha ga-ahọpụtakwa otu nwanna ka ọ bụrụ onye na-ahaziri kọmitii a ọrụ. Kọmitii a ga na-ahụ maka ihe niile gbasara Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ na ala ya. Ndị so na kọmitii a na-arụ ọrụ n’okpuru ndị okenye ọgbakọ niile na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha na-elekọta. Ha na-ahụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze na-adị ọcha mgbe niile nakwa na a rụziri ihe ọ bụla mebiri emebi na ya. Ọ bụkwa ha na-ahụ na ihe ndị dị kpa a chọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze akọghị ụkọ. Ọgbakọ niile ahụ kwesịrị ịrụkọ ọrụ ọnụ ka ihe a niile nwee isi.

9 Ọ bụrụ na ihe karịrị otu ọgbakọ na-amụ ihe n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ha nwere ike ịna-agbanwe oge ọgbakọ nke ọ bụla ji amụ ihe kwa afọ. Mgbe ndị okenye na-ahazi oge ọgbakọ ọ bụla ga-eji na-amụ ihe, ha kwesịrị iburu ọdịmma ụmụnna ha n’uche ma mee mkpebi gosiri na ha hụrụ ha n’anya. (Fil. 2:​2-4; 1 Pita 3:8) Ọgbakọ ọ bụla ekwesịghị ikpebiri ọgbakọ ndị ọzọ ihe ha ga-eme. Onye nlekọta sekit bịa ileta otu n’ime ọgbakọ ndị ahụ na-amụ ihe n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọgbakọ ndị nke ọzọ ga-agbanwe oge na ụbọchị ọmụmụ ihe ha n’izu ahụ ma ọ bụrụ na a chọrọ ka ha mee otú ahụ.

10 E nwere ike ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ ma ọ bụ kwuo okwu olili ozu ma Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwado ya. Ndị so na kọmitii a nweta akwụkwọ ozi nwanna detara maka ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ ma ọ bụ kwuo okwu olili ozu, ha ga-eleba ya anya ma soro ntụziaka alaka ụlọ ọrụ nyere kpebie ma hà ga-akwado ya.

11 Ndị a kwadoro ka ha nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mee nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ kwesịrị ịhụ na ha kpara àgwà ka ezigbo Ndị Kraịst. Ha ekwesịghị ime ihe ọ bụla ọgbakọ na-achọghị ma ọ bụ ihe ọ bụla ga-eme ka a kọchaa aha Jehova ma ọ bụ mebie aha ọgbakọ. (Fil. 2:​14, 15) Alaka ụlọ ọrụ nwekwara ike ikwu ka a nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nwee Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze ma ọ bụ Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ ma ọ bụkwanụ ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Jehova.

12 Ọgbakọ kwesịrị ịna-eme ihe ndị na-egosi na ebe ha na-anọ amụ ihe bụ ebe a na-efe Chineke. Ejiji anyị na àgwà anyị kwesịrị igosi na anyị na-efe Jehova. (Ekli. 5:1; 1 Tim. 2:​9, 10) Anyị gbaa mbọ na-eme ihe ndị a, anyị na-egosi na anyị ji ọmụmụ ihe anyị kpọrọ ihe.

13 Mmadụ niile kwesịrị ịnọ jụụ ma a bịa ọmụmụ ihe. Ndị nne na nna na ụmụ ha kwesịrị ịna-anọ n’otu oche. E nwere ike ịgwa ndị nne na nna ụmụ ha ka dị obere ka ha nọrọ ebe ọ ga-abụ ụmụ ha nyewe nsogbu ma ọ bụ ha chọọ imere ụmụ ha ihe ụfọdụ, ha enwee ike ịkpọpụ ha èzí ozugbo n’emeghị ka uche ndị ọzọ pụọ n’ihe a na-ekwu.

14 A na-ahọpụta ụmụnna nwoke ndị ruru eru ka ha bụrụ ndị atendantị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha kwesịrị ịbụ ndị anya ruru ala, ndị na-emesapụ ihu, na ndị na-aghọta otú ihe si dịrị ndị ọzọ. Ihe ụfọdụ ha na-arụ bụ ikele ndị ọhụrụ bịara ọmụmụ ihe na ime ka ahụ́ ruo ha ala, ịchọtara ndị bịara n’azụ oge oche, idekọ mmadụ ole bịara ọmụmụ ihe, na ịhụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze ekpoghị oké ọkụ ma ọ bụ jụọ oké oyi. Mgbe ụfọdụkwa, ha nwere ike ịgwa ndị nne na nna ka ha na-elekọta ụmụ ha ka ha ghara ịna-agbagharị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, n’elu ikpo okwu ma ọ bụ n’èzí tupu a malite ọmụmụ ihe nakwa mgbe a gbasara. Ha ga-eji obiọma gwa nne ma ọ bụ nna nwa ya na-enye nsogbu ka ọ kpọpụ ya èzí ka uche ndị ọzọ ghara ịpụ n’ihe a na-ekwu. Ihe ndị a ndị atendantị na-arụ na-enye aka eme ka ahụ́ ruo ndị niile bịara ọmụmụ ihe ala, ha amụtakwa ezigbo ihe. Ọ kacha mma ka ọ bụrụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ka a ga-ahọpụta ka ha bụrụ ndị atendantị.

ỊRỤ ỤLỌ NZUKỌ ALAEZE

15 N’oge ndịozi, ụfọdụ Ndị Kraịst nwere ego karịa ibe ha. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji dee akwụkwọ ozi, sị: “Site n’ime ka ihe hara nhata, ka ihe mafọọrọ unu wee mejuo ihe kọrọ ha ka ọ dị ugbu a, ka ihe mafọọrọ ha wee mejuokwa ihe kọrọ unu, ka e wee nwee ịha nhata.” (2 Kọr. 8:14) Ndị Kraịst taa na-emekwa ka “ihe hara nhata.” A na-eji ego ọgbakọ niile nyere n’onyinye arụrụ ọgbakọ dị iche iche Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ na-arụzigharị ndị nke dị adị. Obi na-atọ ọgbakọ ndị e ji ego ndị a rụọrọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ezigbo ụtọ, na-atọkwa ụmụnna ndị ọzọ nọ ná nzukọ Jehova ụtọ.

16 Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-agwa ọgbakọ nke ọ bụla Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ga-anọ na-amụ ihe. Ha na-elekwasị anya n’ihe ụfọdụ ekpebi ya. Ọ bụkwa ha na-ekpebi mgbe a ga-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ na ebe a ga-arụ ya ma ọ bụ mgbe a ga-arụzigharị nke dị adị. Ọ bụrụ na ọdachi emee ma mebie Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ụlọ ụmụnna anyị, alaka ụlọ ọrụ na-ahazi ka a rụzie ha.

17 Alaka ụlọ ọrụ na-eduzi ụmụnna ndị na-enye aka achọta ala a ga-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị na-ese otú a ga-esi arụ ya, ndị na-anata akwụkwọ ikike ịrụ ya, nakwa ndị na-arụ ya. Ha na-ekwukwa otú a ga-esi na-elekọta ya. N’ihi otú e si chọsie Ụlọ Nzukọ Alaeze ike n’ọtụtụ mba, a chọrọ ọtụtụ ndị ga na-enye aka arụ ya. A na-agba ndị niile merela baptizim ume, bụ́ ndị ruru eru ma chọọ iso na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, ka ha dejupụta fọm maka ya ma nye ya Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ha. Ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim nwedịrị ike inye aka ma a rụwa Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ma ọ bụ ma a rụzigharịwa ya.

ỤLỌ MGBAKỌ

18 N’oge ndịozi, Ndị Kraịst na-adị ole na ole ezukọ otu ebe amụ Okwu Chineke. Ma mgbe ụfọdụ, “ìgwè mmadụ dị ukwuu” zukọkwara ka e zie ha ihe. (Ọrụ 11:26) Taa, ndị Jehova na-ezukọkwa n’ebe dị iche iche enwe mgbakọ sekit na mgbakọ ukwu. Ha na-ezukọkarị n’ụlọ ezumeezu ma ọ bụ n’ámá egwuregwu ha kwụrụ ụgwọ ya. Ma, n’ebe a na-enweghị nke dị mma a ga-anọ eme ya ma ọ bụ n’ebe ọ na-adịghịdị adị, ha nwere ike ịrụ Ụlọ Mgbakọ ha na-anọ efe Chineke.

19 Mgbe ụfọdụ, a na-azụ ụlọ, rụgharịa ya ma jiri ya mere Ụlọ Mgbakọ. Ma, ihe a na-emekarị bụ ịzụ ala jiri ya rụọ nke ọhụrụ. Ụlọ Mgbakọ anaghị aha otu. Ihe ga-ekpebi otú ọ ga-aha bụ mmadụ ole ga na-anọ na ya enwe mgbakọ. Tupu alaka ụlọ ọrụ ekpebie ma à ga-azụ ụlọ a rụrụ arụ ma ọ bụkwanụ rụọ nke ọhụrụ, ha na-ebu ụzọ gbakọọ ego ole ọ ga-ewe na ugboro ole a ga-anọ na ya na-enwe mgbakọ.

20 Alaka ụlọ ọrụ na-ahọpụta ụmụnna ndị ga na-elekọta Ụlọ Mgbakọ ma na-ahụ na ihe niile a na-anọ na ha eme na-aga nke ọma. A na-ahazi ka ọgbakọ ndị dị na sekit debe ha ọcha ma ha gbasaa mgbakọ. N’ọnwa isii ọ bụla, ọgbakọ ndị dị na sekit na-abịakwa edebe ha ọcha. O nwekwara mgbe ha na-abịa arụ ọrụ iji gbochie ihe ụfọdụ imebi. Ọ na-abara anyị uru ma ụmụnna anyị wepụta onwe ha bịa rụọ ọrụ ndị a. N’ihi ya, a na-agba ọgbakọ niile ume ka ha jiri obi ha niile na-akwado ọrụ a.​—Ọma 110:3; Mal. 1:10.

21 Mgbe ụfọdụ, e nwekwara ike ịnọ n’Ụlọ Mgbakọ nwee Ụlọ Akwụkwọ nzukọ a haziri ma ọ bụ nwee nzukọ pụrụ iche maka ndị nlekọta sekit. E nwekwara ike ịnọ na ya mee ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Chineke. A na-enyefekwa Jehova Ụlọ Mgbakọ otú ahụ e si eme Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ihi ya, mgbe ọ bụla anyị zukọrọ n’Ụlọ Mgbakọ, anyị kwesịrị ịna-akpa àgwà ọma ma na-ejike nke ọma otú anyị si eme ma anyị gawa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

22 Ọtụtụ ndị ọhụrụ na-abata n’ọgbakọ Jehova n’ike n’ike n’oge ikpeazụ a. Nke a gosiri na Jehova kwụ anyị n’azụ. (Aịza. 60:​8, 10, 11, 22) Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji na-enye onyinye a ga-eji na-arụ ebe ndị anyị na-anọ efe Chineke. Anyị kwesịkwara ịgba mbọ na-edebe ha ọcha ma na-elekọta ya nke ọma. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị a, anyị na-egosi na anyị ghọtara na ebe ndị anyị na-anọ efe Chineke na-abara anyị ezigbo uru n’ihi na anyị na-anọ na ha agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka anyị na-ahụ ụbọchị Jehova ka ọ na-eru nso.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya