Ka Anyị Na-edebe Ebe Anyị Na-anọ Efe Ofufe n’Ọnọdụ Dị Mma
1. Nzube dị aṅaa ka e ji enwe Ụlọ Nzukọ Alaeze?
1 N’ụwa nile, e nwere ihe karịrị ọgbakọ 94,000 nke Ndịàmà Jehova. Ọnụ ọgụgụ ọgbakọ ka ukwuu na-ezukọ maka ọmụmụ Bible na mkpakọrịta Ndị Kraịst n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ ebe bụ́ isi a na-efe ofufe dị ọcha n’ógbè ọ bụla.
2. Gịnị mere o ji dị mkpa idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha na ime ka ọ dị mma n’anya?
2 Ime Ndokwa Iji Na-edebe Ya Ọcha Mgbe Nile: Ọrụ a na-arụ iji na-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha bụ akụkụ dị oké mkpa nke ozi dị nsọ anyị na-eje. Akwụkwọ Ozi Anyị na-ekwu na peeji nke 61, sị: “Ụmụnna kwesịrị iwere ya dị ka ihe ùgwù ọ bụghị nanị iji ego kwadoo Ụlọ Nzukọ Alaeze kamakwa ije ozi n’afọ ofufo iji debe ya ọcha, ime ka ọ dị mma ile anya, na-edozikwa ya edozi. Ma n’ime ma n’èzí, Ụlọ Nzukọ Alaeze kwesịrị ịbụ ihe nnọchianya kwesịrị ekwesị nke nzukọ Jehova.” Ebe ọ bụ na a na-eji Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe ọtụtụ ugboro n’izu ọ bụla, ọ dị mkpa ka a na-edebe ya ọcha ma na-elekọta ya anya mgbe nile. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụ ndị wepụtara onwe ha n’afọ ofufo, bụ́ ndị si n’ọgbakọ ndị na-enwe nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, na-ahụ maka ihe ndị a. Dịkwa ka ọ dị n’oge Bible, ndị ohu Jehova taa kwesịrị ịdị uchu ‘n’imezi’ ebe ha na-anọ efe ofufe.—2 Ihe 34:10.
3. Olee otú e si ahazi ọrụ nke idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, oleekwa ndị pụrụ ikere òkè n’ihe ùgwù a?
3 E kwesịrị ịmapawa ndepụta nke usoro e ji edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha kwa izu na bọọdụ ịma ọkwa. E kwesịrị ịdị na-eme ìgwè ọmụmụ akwụkwọ nke a debe ụlọ nzukọ ahụ ọcha n’izu a, ìgwè ọzọ edebe ya ọcha n’izu ọzọ, na-agbaso usoro nke ihe ndị e depụtara a ga-eme na ya. Ọ dị mkpa ka ndị nile ọ pụrụ ikwe mee na-ekere òkè n’ihe ùgwù a na-enwe kwa izu nke idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha na ime ka ọ dị mma n’anya. Site ná nduzi nke ndị nne na nna, ụmụaka pụrụ ikere òkè na ya, ha ewee si otú ahụ bụrụ ndị a na-akụziri iji ihe ùgwù a kpọrọ ihe. Karịsịa, mgbe ihe karịrị otu ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ọ dị mkpa ka ha na-emekọ ihe ọnụ iji hụ na a hapụrụghị nanị mmadụ ole na ole ilekọta akụkụ a dị mkpa nke ofufe anyị.
4. Gịnị ka e kwesịrị ime iji mee ka ọgbakọ mara ihe ha ga-eme mgbe ha na-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha?
4 A pụrụ ịmapawa ndepụta nke ihe ndị a ga-eme, ikekwe n’ebe a na-edebe ihe ndị e ji edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha. E kwesịrị ide ihe ndị a ga-arụ kwa izu n’ihe ndepụta a, gụnyere nzacha, ihicha windo na ebe ndị a na-edebe akwụkwọ, ikpofu ihe ndị a tụnyere na nkata mkpofu ihe, ịsa ala ụlọ, na idebe ụlọ mposi nakwa enyo ọcha. Ọ gaghị adịcha mkpa ịrụ ọrụ ụfọdụ mgbe nile, dị ka ite ágbá (pọlish) n’ihe ndị e ji osisi rụọ; ihicha oche, bench, fan, na arịa ọkụ eletrik nke ọma, nakwa ịsa kọtịn nke ọma; igbu àkị́kà, ọchịcha, òké, na ihe ndị ọzọ. E kwesịrị idebe kemikal nile e ji mee ihe n’ebe aka ụmụaka na-agaghị eru, e kwesịrị ide ihe mapawa n’ahụ́ ihe ndị e ji tinye ha iji kọwaa ihe dị n’ime ha. E kwesịkwara ide n’ụzọ dị nkenke otú a ga-esi jiri kemikal nke ọ bụla mee ihe.
5. Olee ókè ọ dịruru ná mkpa ime ka Ụlọ Nzukọ Alaeze ghara ịdị ize ndụ, oleekwa ihe ndị e kwesịrị inyocha site n’oge ruo n’oge? (Lee igbe dị na peeji nke 4.)
5 Ọ dị oké mkpa ime ka Ụlọ Nzukọ Alaeze ghara ịdị ize ndụ. (Deut. 22:8) Iji mee nke a, n’igbe dị na peeji nke 4, e depụtara ihe ụfọdụ ọ dị mkpa ka e nyochaa site n’oge ruo n’oge ka e wee nwee ike igbochi ihe ọghọm.
6. Olee otú e si ahazi ọrụ nke ịrụzi ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?
6 Ịrụzi Ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze: Ọ bụ ọrụ dịịrị òtù ndị okenye ịhazi ọrụ nke ịrụzi ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Dị ka ọ na-adịkarị, a na-ahọpụta otu okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ịhazi ọrụ ahụ. Ọ na-elekọta ụzọ e si eji Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, na-ejide n’aka na e debere ya ọcha ma rụzie ihe ndị mebiri na ya nakwa na e nwere ihe ndị zuru ezu a ga-eji rụọ ọrụ. Ọ dị mkpa ịhụ na e nweghị ihe ma ọ bụ ebe ọ bụla dị ize ndụ n’ụlọ nzukọ ahụ ma ọ bụ na mbara èzí ya. Mgbe ọgbakọ abụọ ma ọ bụ karị na-eji otu ụlọ nzukọ eme ihe, òtù ndị okenye ga-ahọpụta kọmitii ọrụ ka ha na-ahazi ndokwa maka ilekọta ụlọ nzukọ ahụ na ihe nile dị na ya. Kọmitii a na-arụ ọrụ ná nduzi nke òtù ndị okenye.
7. (a) Olee ihe a na-eme kwa afọ iji hụ na e debere Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ọnọdụ dị mma? (b) Olee ihe ndị chọrọ nlebara anya site n’oge ruo n’oge? (Lee igbe dị na peeji nke 5.)
7 Kwa afọ, a na-enyocha Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ụzọ zuru ezu. Ndị okenye na-esochi nke a site n’ime ndokwa maka ịrụzi ihe ọ bụla ọ dị mkpa ka a rụzie. A pụrụ ịgwa ndị nkwusa ka ha nye aka n’ịrụzi ihe ọ bụla chọrọ nrụzi. Anya kwesịrị iru mmadụ nile ala n’imezi ụmụ obere ihe mebirinụ, ha kwesịkwara ịdị ngwa n’ịhụ na a rụziri ihe ndị chọrọ nlebara anya.
8. Olee mgbe ndị okenye pụrụ ịkpọtụrụ Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ihe ndị metụtara ịrụzi ihe?
8 Ọ bụrụ na ọ dị ndị okenye mkpa inweta ndụmọdụ banyere otú ha ga-esi arụzi ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ha pụrụ ịkpọtụrụ Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze.
9. Olee usoro e kwesịrị ịgbaso ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa igo ndị ọrụ?
9 Iji Ego Ọgbakọ Eme Ihe n’Ụzọ Amamihe: Ọ bụ ndị ọrụ afọ ofufo na-arụ ihe ka ọtụtụ n’ọrụ ndị a na-arụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa na mbara èzí ya. Mgbalị ndị ha ji ịchụ onwe ha n’àjà eme na-egosipụta ezi ịhụnanya ha nwere ma na-enye aka nke ukwuu n’ibelata mmefu. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa igo ndị ọzọ ka ha rụọ ọrụ ụfọdụ, ndị okenye ga-achọ ndị ga-eji ọnụ ego dị ala rụọ ọrụ dị otú ahụ. Ha na-eme nke a site n’ibu ụzọ depụta ihe nile a ga-arụ na ya na ngwá ọrụ ọ bụla a ga-eji rụọ ya. A ga-enyecha ndị ọrụ ngo ga-achọ ịrụ ọrụ ahụ otu n’ime ihe ndepụta ndị ahụ ka ha nile wee ghọta ihe a chọrọ n’aka ha tupu ha ekwuo ego ole ha ga-ana. Mgbe ndị okenye nwetasịrị akwụkwọ ndị chọrọ ịrụ ọrụ ahụ ji kwuo ego ole ha ga-ana, ha pụziri ịhọrọ onye nke ọnụ ego ya kasị mma. E kwesịrị ịgbaso usoro a ọbụna ma a sị na ọ bụ nwanna kwuru ego ole ọ ga-ana iji rụọ ọrụ ahụ ma ọ bụ iji bute ngwá ọrụ ndị a chọrọ.
10. Gịnị ka a na-eme iji jide n’aka na e ji ego ọgbakọ eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị?
10 Ndị okenye na-emekwa ihe ndị kwesịrịnụ iji nweta akwụkwọ ikike nile dị mkpa na akwụkwọ ndekọ banyere ala na ụlọ. N’ebe ihe karịrị otu ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, kọmitii ọrụ ga-enwe ihe ndekọ ego nke ha, ha ga na-enyekwa òtù ndị okenye nile ji Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ eme ihe akụkọ ndekọ ego kwa ọnwa, si otú ahụ na-eme ka ndị okenye mara ụzọ ha si emefu ego ndị ha na-enweta. Ọ dị ndị okenye n’aka ịhụ na e ji ego ọgbakọ eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị.
11. Gịnị ka e kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ịrụzi nnukwu ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?
11 Ịrụzi Nnukwu Ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze: Mgbe ọ dị kọmitii ọrụ ka ọ̀ dị nnukwu ihe dị mkpa ka e mee ka ihe wee na-aga nke ọma n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ iji debe ya n’ọnọdụ dị mma, kọmitii ahụ na-agwa òtù ndị okenye banyere ya ka ha wee nye ntụziaka. Ọ bụrụ na e kpebie na ọ ga-adị mkpa ka a rụzie nnukwu ihe na ya ma ọ bụ na ọ ga-adị mkpa inweta enyemaka n’aka ndị na-anọghị n’ọgbakọ ndị na-eji Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ eme ihe, ndị okenye ga-akpọtụrụ Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze iji nweta aro na nduzi ndị ga-aba uru maka ọrụ ahụ. Ọ bụrụ na ọ ga-eri ezigbo ego, ọ ga-adị mkpa ịmata ego ole ọ pụrụ iri ma depụta okwu mkpebi nke a ga-eche ọgbakọ n’ihu maka nkwado.—Lee Igbe Ajụjụ nke Ozi Alaeze Anyị nke May 1994.
12. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị nwere ekele maka ihe ùgwù nke ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?
12 Lee ka anyị si eji ihe ùgwù anyị nke izukọta ọnụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze akpọrọ ihe! Anyị ekwesịtụghị ileghara nzukọ anyị anya ma ọ bụ were ha dị ka ihe na-adịchaghị mkpa. Mmadụ nile pụrụ iso mee ka ndokwa a e mere iji na-agba anyị ume gaa nke ọma site n’ikere òkè zuru ezu n’ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị. Nke a na-ebuli ofufe dị ọcha elu ma na-ewetara aha Jehova otuto. Ka anyị kpebisie ike idebe ebe anyị na-anọ efe ofufe n’ọnọdụ dị mma.
Igbe dị na peeji nke 4]
Ihe Ndepụta Maka Nchebe
◻ E kwesịrị idebe ihe ndị e ji agbanyụ ọkụ ebe aka ga-eru ngwa ngwa, e kwesịkwara ịdị na-arụ ha ọrụ kwa afọ.
◻ E kwesịrị ide ihe otú a ga-ahụ ya n’ọnụ ụzọ na-eduga na steepụ, tinye ọkụ na-enwu nke ọma na steepụ, ma mee ka ọ dị mfe isi na ya gafee, meekwa ka okporo ígwè ndị a na-ejide aka sie ike.
◻ Ebe a na-edebe ihe na ụlọ mposi kwesịrị ịdị ọcha ma bụrụ nke a haziri nke ọma, e kwesịghịkwa idebe ihe ndị pụrụ inwuru ọkụ ngwa ngwa, ihe onwunwe ndị mmadụ, na nkịkara ihe na ya.
◻ E kwesịrị inyocha elu ụlọ na ọwara mmiri e nwere na ya ma mee ka ha dị ọcha mgbe nile.
◻ A ghaghị ime ka ebe ndị e ji ụkwụ aga na ebe a na-adọba ụgbọala ghara ịbụ nke na-amị amị ma ọ bụ nke pụrụ ịkwatu mmadụ.
◻ E kwesịrị inyocha ngwá ọrụ eletrik na fan ma rụọ ha ọrụ nke ọma.
◻ E kwesịrị imezi ebe ọ bụla na-ehi mmiri ngwa ngwa iji mee ka ebe ahụ ghara ịma ebu.
◻ E kwesịrị ịkpọchi ụlọ ahụ mgbe ọ na-adịghị onye nọ ya.
[Igbe dị na peeji nke 5]
Ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze na Èzí Ya
◻ Èzí ya: Elu ụlọ, ahụ́ ụlọ, ágbá, windo, na saịn bọdụ Ụlọ Nzukọ Alaeze hà nọ n’ọnọdụ dị mma?
◻ Gburugburu ebe ahụ: À na-elekọta gburugburu ebe ahụ anya nke ọma? Ebe ndị e ji ụkwụ aga, ogige, na ebe a na-adọba ụgbọala hà nọ n’ọnọdụ dị mma?
◻ Ime ya: Oche ma ọ bụ bench, kọtịn, ebe ndị a na-akwụnye bọlb eletrik na paịpụ mmiri, ágbá, na shelf akwụkwọ hà dị mma n’anya?
◻ Ngwá ọrụ: Ọkụ, ígwè okwu, na fan hà na-arụ ọrụ nke ọma?
◻ Ụlọ mposi: Hà dị ọcha ma na-arụ ọrụ nke ọma?
◻ Akwụkwọ ọgbakọ: Akwụkwọ ndị iwu chọrọ ka e nwee hà zuru ezu ma zie ezi?